Echiche Nke Bible
Gịnị Dị Njọ n’Ime Mfegharị?
“Gịnị mere anyị ji eche banyere ime mfegharị dị ka ihe ji aghụghọ achịkwa mmadụ ma ọ bụ ihe aghụghọ ma ọ bụ ihe na-ezighị ezi? Ọ dịghị otú ahụ! Ọ bụ egwuregwu! Ọ bụkwa egwuregwu onye ọ bụla na-erite uru na ya n’ihi na ị na-eme ka onye nke ọzọ nwee obi ụtọ.”—Susan Rabin, bụ́ onye nduzi nke Ụlọ Akwụkwọ Ime Mfegharị, New York City.
ỌTỤTỤ ndị na-ele ime mfegharị anya dị ka ihe dị otú o kwesịrị, nke ihe ọjọọ na-adịghị na ya, ọbụnakwa nke dị mkpa n’iwulite na ịnọgide na-enwe mmekọrịta ụmụ mmadụ. Ná mba ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ, na nso nso a e nwere oké mmụba nke akwụkwọ, isiokwu magazin, na usoro ọmụmụ ihe ndị pụrụ iche ndị na-akụzi mmegharị ahụ, omume, igwu anya, na ilegide anya ndị dị mkpa maka “nkà ime mfegharị.”
Gịnị bụ mfegharị? E nwere nkọwa dị iche iche. Otu akwụkwọ ọkọwa okwu na-akọwa ya dị ka akparamàgwà “mmekọrịta ịhụnanya egwuregwu ma ọ bụ nke na-ara ụra n’ụzọ mmekọahụ.” Akwụkwọ ọkọwa okwu ọzọ na-akọwa ime mfegharị dị ka ịkpa àgwà “n’ụzọ ịhụnanya n’enweghị nzube.” N’ihi ya, o yiri ka ọ bụ echiche a nakweere n’ọha na onye na-eme mfegharị bụ onye na-egosi mmasị ịhụnanya n’ebughị alụmdi na nwunye n’obi. È kwesịrị ile ime mfegharị anya dị ka ihe na-adịghị emerụ ahụ? Gịnị bụ echiche Bible banyere ime mfegharị?a
Ọ bụ ezie na a kpọghị ime mfegharị aha kpọmkwem n’Akwụkwọ Nsọ, anyị pụrụ ịmata echiche Chineke. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’inyocha ụkpụrụ Bible ndị metụtara okwu ahụ. N’ụzọ dị otú a anyị na-azụlite ike ‘nghọta anyị ịtụle ihe ọma na ihe ọjọọ.’ (Ndị Hibru 5:14) Nke mbụ, ka anyị tụlee ma ime mfegharị ọ̀ bụ akparamàgwà kwesịrị ekwesị maka ndị nwere di ma ọ bụ nwunye.
Ọ Bụrụ na Mmadụ Nwere Di Ma Ọ Bụ Nwunye
Ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị ndị di na nwunye ịkpaso onwe ha àgwà n’ụzọ ịhụnanya mgbe nanị ha nọ. (Tụlee Jenesis 26:8.) Ma igosi ndị na-anọghị n’alụmdi na nwunye ahụ mmasị dị otú ahụ na-emegide ụkpụrụ Chineke. Jehova zubere ka ndị di na nwunye nwee mmekọrịta chiri anya na nke a tụkwasịrị obi. (Jenesis 2:24; Ndị Efesọs 5:21-33) Ọ na-ele alụmdi na nwunye anya dị ka njikọ dị nsọ, nke na-adịgide adịgide. Malakaị 2:16 na-ekwu banyere Chineke, sị: “Ọ kpọwo nchụpụ nwunye asị.”b
Onye nwere di ma ọ bụ nwunye ime mfegharị ò kwekọrọ n’echiche Chineke banyere alụmdi na nwunye? Ma ọ dịghị nnọọ ihe ọzọ, onye nwere di ma ọ bụ nwunye nke na-eme mfegharị na-egosi enweghị nkwanye ùgwù maka ịdị nsọ nke ndokwa alụmdi na nwunye nke Chineke mere. Mgbe ahụkwa, Ndị Efesọs 5:33 na-enye di bụ́ onye Kraịst iwu ka ọ ‘hụ nwunye nke aka ya n’anya, dị ka ọ na-ahụ onwe ya n’anya’ na nwunye ka ọ “na-atụ egwu di ya.” Ime mfegharị, bụ́ nke na-akpali ekworo, ọ̀ na-egosi ịhụnanya ma ọ bụ nkwanye ùgwù maka di ma ọ bụ nwunye mmadụ?
Ihe na-akpali iche echiche ọbụna karị bụ eziokwu ahụ bụ́ na ime mfegharị pụrụ iduga n’ịkwa iko, bụ́ mmehie nke Jehova katọrọ kpam kpam ma kọwaa ya dị ka ịghọ aghụghọ. (Ọpụpụ 20:14; Levitikọs 20:10; Malakaị 2:14, 15; Mak 10:17-19) N’ezie, Jehova na-ewere ịkwa iko ịbụ ihe dị oké njọ nke na ọ na-enye ndị ekwesịghị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye metụtara ohere ịgba alụkwaghịm. (Matiu 5:32) Ànyị pụrụ ichezi na Jehova ga-akwado ihe e ji egbu oge dị nnọọ ize ndụ dị ka ime mfegharị? Chineke agaghị akwado ya dị nnọọ ka nne ma ọ bụ nna nke na-ahụ n’anya na-agaghị akwado obere nwa ya iji mma ekwu dị nkọ na-egwuri egwu.
Banyere ịkwa iko nke ndị lụrụ di ma ọ bu nwunye, Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Mmadụ, ọ̀ ga-agụrụ ọkụ tinye n’uwe obi ya, ma uwe ya agaghị ere ọkụ? Ma ọ bụ mmadụ, ọ̀ ga-eje ije n’elu icheku ọkụ, ma ọkụ agaghị ahụ ya n’ụkwụ ya abụọ? Otú a ka onye na-abakwuru nwunye mmadụ ibe ya dị; a gaghị agụ onye ọ bụla nke na-emetụ nwanyị ahụ aka n’onye na-emeghị ihe ọjọọ.” (Ilu 6:27-29) Otú ọ dị, ọ bụrụgodị na a kwaghị iko, onye nwere di ma ọ bụ nwunye nke na-eme mfegharị na-akpọ nsogbu ọzọ òkù—itinye aka n’ihe a kpọworo “ime enyi n’obi.”
Ime Enyi n’Obi
Ndị ụfọdụ azụlitewo mmekọrịta na-abụghị n’alụmdi na nwunye ha bụ́ nke mmetụta ịhụnanya na-esi na ya malite, ọ bụ ezie na e nweghị mmekọahụ. Otú ọ dị, Jisọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Nwoke ọ bụla nke na-ele nwanyị anya ka agụụ ya wee gụọ ya, ọ kwasịwo ya iko n’obi ya ugbu a.” (Matiu 5:28) N’ihi gịnị ka Jisọs ji katọọ agụụ nke na-anọgide n’obi?
Otu ihe bụ na “n’obi ka . . . ịkwa iko nile . . . si apụta.” (Matiu 15:19) Otú ọ dị, mmekọrịta dị otú ahụ na-emerụ ahụ ma ọ bụrụgodị na o rubeghị n’ọnọdụ ebe ọ fọrọ nke nta ka a kwaa iko. N’ụzọ dị aṅaa? Otu akwụkwọ tụlere isiokwu a na-akọwa, sị: “Ihe omume ma ọ bụ mmekọrịta ọ bụla nke na-ewere oge na ike dị ukwuu ná ndụ nke gị na onye òtù ọlụlụ gị bụ otu ụdị nke ekwesịghị ntụkwasị obi.” Ee, ime enyi n’obi na-anapụ di ma ọ bụ nwunye mmadụ oge, nlebara anya, na mmetụta ịhụnanya. N’ihi iwu Jisọs nyere ka anyị na-emeso ndị ọzọ dị ka anyị ga-achọ ka e si na-emeso anyị, onye nwere di ma ọ bụ nwunye nke na-eme mfegharị ga-eme nke ọma ịjụ onwe ya sị, ‘Olee otú ọ ga-adị m ma ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye m akpasoo onye ọzọ àgwà n’ụzọ dị otú a?’—Ilu 5:15-23; Matiu 7:12.
Ọ bụrụ na mmadụ azụlitewo nkekọ mmetụta uche na-ekwesịghị ekwesị dị otú a, gịnị ka o kwesịrị ime? Onye nwere di ma ọ bụ nwunye nke nwere nkekọ mmetụta uche na-ekwesịghị ekwesị yiri ọkwọ ụgbọala malitere ihi ụra ka ọ na-anya ụgbọala. Ọ dị ya mkpa ịghọta ọnọdụ ya ma mee ihe ozugbo, n’ụzọ doro anya tupu e bibie alụmdi na nwunye ya na mmekọrịta ya na Chineke. Jisọs mere ihe atụ nke mkpa ọ dị ime ihe siri ike mgbe ọ sịrị na e kwesịrị ịghụpụ ọbụna ihe dị oké ọnụ ahịa dị ka anya ma ọ bụ gbupụ otu aka ma ọ bụrụ na ọ ga-emebi ezi nguzo mmadụ n’ebe Chineke nọ.—Matiu 5:29, 30.
Ya mere, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ịkpa ókè ebe na ugboro ole ị na-ahụ onye nke ọzọ ahụ. N’ezie, zere gị na onye ahụ ịdị na-anọpụ iche, ọ bụrụkwa na ọ bụ n’ebe ọrụ, kpaara ụdị mkparịta ụka unu ókè. Ọ pụrụ ọbụna ịdị mkpa ịkwụsị mkpakọrịta nile nke gị na onye ahụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, a ghaghị inwe njide onwe onye siri ike banyere anya, echiche, mmetụta, na akparamàgwà mmadụ. (Jenesis 39:7-12; Abụ Ọma 19:14; Ilu 4:23; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:4-6) Job, bụ́ nwoke nwere nwunye, setịpụrụ ihe nlereanya magburu onwe ya mgbe ọ sịrị: “Mụ na anya m abụọ gbara ndụ; m̀ ga-esikwa aṅaa lekwasị nwa agbọghọ na-amaghị nwoke anya?”—Job 31:1.
N’ụzọ doro anya, ọ dị ize ndụ ma bụrụ ihe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị nye onye nwere di ma ọ bụ nwunye ime mfegharị. Otú ọ dị, gịnị bụ echiche Bible banyere ime mfegharị n’etiti ndị na-enweghị di ma ọ bụ nwunye? À ga-ewere ya dị ka ihe dị otú o kwesịrị, nke ihe ọjọọ na-adịghị na ya, ma ọ bụ nke dị mkpa iji soro onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe mmadụ malite mmekọrịta? Ọ̀ dị mmerụ ahụ pụrụ isi na ya pụta n’ezie?
Gịnị Banyere Onye Na-enweghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye?
Ọ dịghị ihe ọjọọ dị na mmadụ abụọ na-enweghị di ma ọ bụ nwunye igosirịta onwe ha mmasị ịhụnanya, ma ọ bụrụhaala na ha na-eche echiche ịlụ di ma ọ bụ nwunye nakwa na ha na-ezere àgwà na-adịghị ọcha. (Ndị Galetia 5:19-21) Mmasị dị otú ahụ pụrụ iwere ọnọdụ n’oge mmalite nke mbedo mgbe alụmdi na nwunye ka pụrụ nanị ịdịtụ ka ọ̀ ga-ekwe omume. Nke a abụchaghị ihe na-ekwesịghị ekwesị mgbe nzube ya dị mma. Akparamàgwà dị otú ahụ abụchaghị ime mfegharị.
Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na ndị na-enweghị di ma ọ bụ nwunye na-egosirịta onwe ha ihe mgbaàmà ịhụnanya nanị maka ntụrụndụ? Ọ pụrụ iyi ihe na-adịghị emerụ ahụ, ebe ha na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye. Otú ọ dị, tụlee mmerụ ahụ mmetụta uche nke pụrụ isi na ya pụta. Ọ bụrụ na e jirikwuo àgwà onye ahụ na-eme mfegharị kpọrọ ihe karịa otú o zubere, ọ pụrụ ịrụpụta oké ihe mgbu na obi ilu. Lee otú okwu ndị ahụ dị n’Ilu 13:12 si bụrụ eziokwu: “Nchere a na-echere ogologo mgbe dị anya na-eme ka obi na-arịa ọrịa: ma osisi nke na-enye ndụ ka ihe a na-achọsi ike bụ, mgbe ọ bịaruworo”! Ọ bụrụgodị na mmadụ abụọ ekwuo na ha ghọtara na ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha nwere mmasị siri ike n’ebe ibe ya nọ—ọ̀ dị nke ọ bụla n’ime ha pụrụ ijide n’aka ihe onye nke ọzọ na-eche ma ọ bụ mmetụta ọ na-enwe n’ezie? Bible na-aza, sị: “Obi dị aghụghọ karịa ihe nile, ihe na-adịghị ngwọta ka ọ bụkwa: ònye ga-amara ya?”—Jeremaịa 17:9; tụlee Ndị Filipaị 2:4.
Tụleekwa ihe ize ndụ nke ịkwa iko, ya na ọrịa ma ọ bụ ime ọkwa pụrụ isi na ya pụta. A machibidoro ịkwa iko iwu n’Akwụkwọ Nsọ, ndị na-akpacharakwa anya eme ya na-atụfu ihu ọma Chineke. Pọl onyeozi dọrọ ndị Kraịst aka ná ntị n’ụzọ amamihe na iji guzogide ọnwụnwa, ha kwesịrị ‘ime ka ihe nile dị ha n’ahụ nwụọ, bụ́ ịkwa iko,’ ma zere ‘ọchịchọ ọjọọ nke agụụ ihe ọjọọ,’ bụ́ nke na-eduga n’ịkwa iko. (Ndị Kọlọsi 3:5; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:3-5) Ná Ndị Efesọs 5:3, ọ na-adụ anyị ọdụ “ka a ghara ịkpọ ọbụna” ịkwa iko aha, ya bụ, n’ụzọ nke ịkpali ọchịchọ ọjọọ. Ime mfegharị ekwekọghị na ndụmọdụ a. Chineke ọbụna na-amachibido mkparịta ụka na-adịghị mma banyere mmekọahụ iwu.
Ụkpụrụ Bible na-ekpughe na ime mfegharị pụrụ ịkpatara mmadụ ibe anyị ihe mgbu, ọ dịghịkwa akwanyere Jehova, bụ́ Onye Malitere alụmdi na nwunye ùgwù. Echiche Bible banyere ime mfegharị nke na-ekwesịghị ekwesị bụ nke ịhụnanya na ihe ezi uche dị na ya n’ezie, ebe ọ na-echebe ndị mmadụ pụọ ná mmerụ ahụ. Ya mere, ndị hụrụ Chineke n’anya ga-ezere ime mfegharị nke na-ekwesịghị ekwesị ma na-emeso ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha ihe n’ịdị ọcha na ná nkwanye ùgwù.—1 Timoti 2:9, 10; 5:1, 2.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a E kwesịghị ịghọtahie ime mfegharị na inwe omume enyi ma ọ bụ àgwà nke iso ndị ọzọ na-akpakọrịta, n’ebughị mmekọrịta ịhụnanya ọ bụla n’obi.
b Lee isiokwu bụ́ “Ụdị Ịgba Alụkwaghịm Dị Aṅaa Ka Chineke Kpọrọ Asị?” ná mbipụta Teta! nke May 8, 1994.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 20]
© The Curtis Publishing Company