Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Telivishọn Dịruru Ize Ndụ?
Na December 18, 1997, isi akụkọ nke akwụkwọ akụkọ dị iche iche kọrọ na otu ihe nkiri nke ihe osise na-atọ ọchị e gosiri na telivishọn kpataara ọtụtụ ndị ọrịa na Tokyo, Japan. E bugara ọtụtụ narị n’ụlọ ọgwụ. “Ụmụaka ụfọdụ gbọrọ ọbara, ihe ọdịdọ dọkwara ndị ọzọ ma ọ bụ ha ghara ịmakwa onwe ha,” ka The New York Times kọrọ. “Ndị dọkịta na ndị ọkà n’akparamàgwà mmadụ na-adọ aka ná ntị na ihe a merenụ bụ ihe ncheta na-awụ akpata oyi n’ahụ nke ókè ihe ngosi ụfọdụ nke oge a nke telivishọn pụrụ imetụtaru ụmụaka.”
Akwụkwọ akụkọ bụ́ Daily News nke New York kwuru, sị: “Ụjọ jidere Japan ụnyaahụ mgbe otu anụ ọjọọ e sere ese nke na-emegharị ahụ na TV saghepụrụ anya ya na-acha ọbara ọbara, ihe ọdịdọ dọtukwara ọtụtụ narị ụmụaka ná mba ahụ dum.
“E bugara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụmụaka 600 na ndị okenye ole na ole ngwa ngwa n’ọnụ ụlọ ụlọ ọgwụ maka ọnọdụ mberede n’abalị Tuesday mgbe ha kirisịrị . . . otu ihe nkiri nke ihe osise na-atọ ọchị e gosiri na TV.” E nyere ụfọdụ ndị nwere nsogbu iku ume àkwà n’ebe a na-enye nlekọta siri ike.
Yukiko Iwasaki, bụ́ nne nke otu nwatakịrị dị afọ asatọ, kọwara, sị: “Ọ wụrụ m akpata oyi n’ahụ ịhụ ka nwa m nwanyị tụbọrọ. Ọ malitere iku ume nanị mgbe m kụrụ ya ihe n’azụ.”
Ndị na-emepụta usoro ihe omume maka ụmụaka apụghị ịkọwa otú usoro ime ka ihe na-emegharị ahụ nke ha sịrị na e jiriwo mee ihe “ọtụtụ narị ugboro” pụrụ isi kpata mmeghachi omume dị ize ndụ, nke siri ike otú ahụ.
N’ịmata mmetụta dị ize ndụ dị n’ikiri telivishọn, ndị nne na nna ụfọdụ ejiriwo nlezianya chịkwaa nkiri TV ma ọ bụ ọbụna bupụ TV n’ebe obibi ha. Otu nna n’Allen, Texas, U.S.A., kwuru na tupu ha ebupụ TV n’ebe obibi ha, ụmụ ya gosipụtara “ịtụkwasị uche n’ihe ruo nwa mkpirikpi oge, ahụ mgbakasị, emekọghị ihe ọnụ, na oké ịtụ ọ̀bọ̀.” Ọ gara n’ihu ịkọwa, sị: “Taa, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nke ọ bụla n’ime ụmụ anyị ise—ndị dị malite n’afọ 6 ruo 17—bụ ụmụ akwụkwọ na-enwe akara A. Ebe ha kwụsịworo ile TV, n’egbughị oge ha zụlitere mmasị n’ihe dị iche iche gụnyere egwuregwu, ịgụ akwụkwọ, nkà, iji kọmputa eme ihe, na ihe ndị ọzọ.
“Otu ihe kwesịrị ncheta karịsịa mere n’ihe dị ka afọ abụọ gara aga. Nwa m nwoke, onye dị afọ 9 mgbe ahụ, kpọrọ na fon site n’ebe nnọkọ oriri na ọṅụṅụ nke otu enyi ya bụ́ ebe ha ga-ehibọ chi, na-achọ ịlọta . . . Mgbe m jere bute ya ma jụọ ya ihe merenụ, ọ sịrị, ‘Ọ na-agwụ nnọọ ike. Ihe ha chọrọ ime agwụla ịnọrọ na-ekiri TV!’”