Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 7/8 p. 24-28
  • Nkwa M Kpebisiri Ike Imezu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nkwa M Kpebisiri Ike Imezu
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Imezu Nkwa M
  • Ọnwụnwa M Amalite
  • Site n’Otu Ogige Gaa n’Ọzọ
  • Nnwere Onwe, na Ezinụlọ
  • Ịlaghachi Ukraine
  • Ikpe, Ogige Ọrụ Mmanye, na Nchụpụ
  • Ọṅụ nke Nnwere Onwe Okpukpe
  • Emeriri M Ihe Ịma Aka Nke Ijere Chineke ozi
    Teta!—2005
  • A Mara M Ikpe Ugboro Abụọ Ịrụ Ọrụ Ahụhụ Ruo Afọ 25
    Teta!—2006
  • Nchegbu M Bụ́ Isi—Ịnọgide Na-eguzosi Ike n’Ihe
    Teta!—2000
  • Ọkara Narị Afọ n’Okpuru Ọchịchị Aka Ike
    Teta!—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 7/8 p. 24-28

Nkwa M Kpebisiri Ike Imezu

DỊ KA MARIAN TSIBOULSKI SI KỌỌ

NA February 1945, abụ m onye agha dị afọ 20 n’òtù ndị agha Soviet, nke chụghachiworo ndị Germany azụ ruo ọtụtụ narị kilomita gaa ná mba ha. Kwa ụbọchị ahụrụ m oké nhụjuanya nke agha, ka ọtụtụ ndị òtù m na-anwụ gburugburu m. Anyị abịaruwo nso Breslau, Germany, nke bụ́ ugbu a Wrocław, Poland. N’otu uhuruchi n’ebe ahụ, n’ịbụ onye igbu mmadụ na ahụhụ gwụworo ike, ekwere m Chineke nkwa na ọ bụrụ na ọ ga-ekwe ka m laghachi ụlọ n’udo, m ga-arara ndụ m nye ime uche ya.

Ọnwa atọ ka e mesịrị, e meriri Germany. Mgbe a tọhapụsịrị m n’ọrụ agha, na December 1945, azọọrọ m ije banye Rogizno, bụ́ obodo nta dị nso na Lvov (nke bụ́ Lviv ugbu a), Ukraine, bụ́ ala nna m. N’ụtụtụ echi ya ezutere m otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ gbakwaara m àmà nke ọma banyere Alaeze Chineke. Ọ bụ ezie na mụ amaralarị ihe banyere Bible, ọbụnakwa gụọ akwụkwọ ụfọdụ nke Ndịàmà, o metụrụ m n’obi ugbu a. Amatara m na ọ dị ihe jikọtara nzute a na nkwa m kwere.

Imezu Nkwa M

N’oge na-adịghị anya enwetara m ọrụ ịkụzi nkụzi n’ụlọ akwụkwọ elementrị. Ma ihe na-erughị afọ abụọ n’ihu, mgbe onyeisi ụlọ ọrụ agụmakwụkwọ n’ógbè ahụ nyere iwu na a ghaghị ịkụziri ụmụaka mmụta ekweghị na Chineke, a chụrụ m n’ọrụ. Ihe dị ka n’otu oge ahụ, na May 1947, amalitere m iso Ndịàmà Jehova na-ekere òkè n’ọrụ ime nkwusa n’ihu ọha. Ndịàmà ahụ gbara m ume ịkwaga n’ebe ndịda n’obodo bụ́ Borislav, bụ́ ebe m chọtara ọrụ n’egbughị oge dị ka onye ọrụ ọkụ eletrik.

Na Borislav, ezutere m ndị ghọrọ Ndịàmà n’afọ ndị 1930. Ha nwere ọtụtụ mbipụta dabeere na Bible, bụ́ ndị m gụrụ ọtụtụ n’ime ha, gụnyere mpịakọta nke Studies in the Scriptures, nakwa ihe ka ukwuu n’akwụkwọ ndị Joseph F. Rutherford, onye bụbu onyeisi oche nke Watch Tower Society, dere. Agụkwara m Ụlọ Nche na The Golden Age (nke bụ́ Teta! ugbu a) ndị ochie, ndị ụfọdụ Ndịàmà nwere. Ma ihe kasị metụ m n’obi bụ nchịkọta nke akwụkwọ ozi Ndịàmà bụ́ ndị Germany, ndị a mara ikpe ọnwụ n’oge ọchịchị Hitler, dere. A sụgharịwo akwụkwọ ozi ndị a gaa na Polish, jiri ígwè mimeograph mepụta ha, mepụtazie ha n’ụdị akwụkwọ nta. Ka e mesịrị, n’icheta iguzosi ike n’ezi ihe nke ụmụnna ahụ bụ́ ndị Germany, enwetara m ume ịtachi obi n’ọnwụnwa.

N’ikpeazụ, na 1949, e mere m baptism n’otu n’ime ọdọ mmiri ndị dị na Borislav, si otú ahụ na-emezu n’ụzọ pụtara ìhè nkwa m kweworo n’ihu agha ijere Chineke ozi. Ma ugbu a ọ bụ nkwa dabeere n’ezi ihe ọmụma.

Ọnwụnwa M Amalite

N’oge na-adịghị anya a chụrụ m n’ọrụ m. Ya mere na February 1950, akwagara m n’obodo ukwu dị nso bụ́ Stry, ebe m chọtara ọrụ ọzọ dị ka onye ọrụ ọkụ eletrik. Ụmụnna m ndị Kraịst nabatara m n’ụzọ na-ekpo ọkụ ọbụnakwa gwa m ka m kwuo okwu Ememe Ncheta nke ọnwụ Jisọs Kraịst a na-eme kwa afọ bụ́ nke e mere izu ole na ole ka m bịasịrị.

N’oge a, ịkpasu Ndịàmà iwe na iyi ha egwu siwanyere ike. Ndị òtù KGB, bụ́ Kọmitii Nchebe Obodo, na-esogharị anyị. Ya mere anyị na-akpachara anya ka anyị na-ejikere maka njide na ịgba ajụjụ ọnụ bụ́ nke pụrụ ịdapụta. Ịbụ abụ Alaeze ná nzukọ nyeere anyị aka ịnọsi ike n’ime mmụọ.

Na July 3, 1950, a gwara m ka m bịanye aka n’akwụkwọ Arịrịọ Stockholm, bụ́ arịrịọ megide ngwá agha nuklia bụ́ nke a sịrị na ihe karịrị mmadụ 273,000,000 bịanyere aka na ya, ndị ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ụmụ amaala nke mba ndị Kọmunist. Mgbe m jụrụ ime otú ahụ, na-akọwa na m na-anọpụ iche n’ihe banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị, a chụrụ m ọzọ n’ọrụ. Mgbe ihe a mesịrị, e jidere m, kpee m ikpe, makwa m ikpe ije mkpọrọ afọ 25 n’ogige ọrụ mmanye.

Site n’Otu Ogige Gaa n’Ọzọ

Na December 1950, e tinyere ọtụtụ n’ime anyị n’ụgbọ okporo ígwè na-ebu ehi ma buga anyị ihe dị ka kilomita 3,000 n’ógbè dịdewere ebe ugwu nke Usoro Ugwu Ural, bụ́ nke kewatụrụ Russia nke Esia na Russia nke Europe. N’ebe ahụ a tụrụ m mkpọrọ n’ogige dị iche iche. Ọ bụ otu ihe ahụ ebe ọ bụla—ọrụ ike na ntakịrị ihe oriri. Ọnwa abụọ ma ọ bụ atọ ezuola ime ka ụmụ okorobịa ji ahụ ghọọ ọ dị ndụ ọnwụ ka mma. Ọtụtụ nwụrụ. Anyị arọtụghị nrọ ịdị ndụ, karịsịa anyị bụ́ ndị a mara ikpe ịnọte aka n’ụlọ mkpọrọ.

Afọ m na-enweghị akwụkwọ e ji amụ Bible, m na-esoghịkwa Ndịàmà ndị ọzọ nwee mmekọrịta bụ nke kasị siere m ike. Nkewapụ ahụ bụ oké ahụhụ. Ma e wusiri m ike n’ime mmụọ mgbe ndị mkpọrọ ụfọdụ gere ntị ka m so ha na-ekwurịta banyere Alaeze Chineke. N’ikpeazụ, a zara ekpere m sitere n’obi, e bufekwara m n’ebe dị ihe dị ka kilomita 2,000 n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ n’otu ogige ukwu dị n’obodo ukwu ọhụrụ bụ́ Angarsk, n’ebe ọwụwa anyanwụ Siberia. A nọ na-ewu otu nnukwute ụlọ ọrụ na-emepụta mmiri ọgwụ n’ebe ahụ, ọ bụkwa ndị mkpọrọ na-arụ ihe ka ukwuu n’ọrụ ahụ.

E kenyere m n’Ogige nke 13, na nso nso ebe ahụ a na-ewu ihe. Ezutere m Ndịàmà ndị ọzọ n’ebe ahụ ozugbo, bụ́ ndị nyere m Ụlọ Nche na Informant, dị ka a na-akpọ Ozi Alaeze Anyị n’oge ahụ, ndị kasị ọhụrụ. Lee oriri ime mmụọ ọ bụ! Ma ebee ka ha nile si?

N’April 1951, a chụgara ọtụtụ puku Ndịàmà nọ na Ukraine na Siberia, ọtụtụ n’ime ha n’ógbè ndị dị nso n’Angarsk. Ụmụnna ndị a nwetara ma mepụtaghachi Ụlọ Nche na mbipụta ndị ọzọ na nzuzo, mgbe ahụ ha zobatakwara ha n’ogige ndị ahụ. Anyị nwere ike inwetakwa otu Bible. Anyị kewara ya ná nkebi ná nkebi, bụ́ ndị anyị kesara n’etiti onwe anyị. Otú a, ọ bụrụ na e mee nnyocha, nanị otu akụkụ Bible ka a ga-ewere. Ọbụna na anyị duziri Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche na Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’ogige ndị ahụ!

Ná ngwụsị 1952, e bufere m n’Ogige nke 8. Na March na-esonụ anyị mere Ememe Ncheta n’otu ntakịrị ọnụ ụlọ ebe ndị mkpọrọ na-edebe ihe onwunwe ha. Nanị mmadụ 12 bịara—Ndịàmà 3 na mmadụ 9 nwere mmasị. N’ụzọ ụfọdụ ndị isi chọpụtara banyere nzukọ anyị, a chụgakwara m n’Ogige nke 12 bụ́ ebe ịta ahụhụ n’ihi ịbụ ihe ha kpọrọ “ajọ onye mkpasu ọgba aghara.” Ndịàmà ise ndị ọzọ, ndị a na-atakwa ahụhụ maka ime nkwusa ha, anọrọlarị n’ogige a. Mgbe anyị nọ n’ebe ahụ, a manyere anyị iji nanị mbazụ na shọvel gwuo ntọala buru ibu.

Ọtụtụ ndị mkpọrọ nọ n’Ogige nke 12 bụ ụdị ndị omekome kasị njọ. O doro anya na ndị isi ahụ chere na itinyekọta anyị na ha ga-eme ka ike gwụ anyị. Ma anyị na ha kwurịtara banyere Alaeze Chineke, anyị na-abụkwa abụ Alaeze n’ogige ndị agha. N’otu oge, mgbe anyị kwụsịchara ịbụ abụ, a kpaliri onye isi ndị omekome nọ n’ogige ahụ ijekwuru otu Onyeàmà, sị: “Onye ọ bụla kpaa unu aka, m ga-ebiwa ya isi!” Ọbụna ndị omekome ụfọdụ mụtara uri olu ụtọ Alaeze anyị ma soro na-abụ ha!

N’etiti afọ 1953, e si n’ogige ndị ọzọ buga ọtụtụ Ndịàmà n’Ogige nke 1. Na mbụ, anyị nwere Ndịàmà 48 n’Ogige nke 1, ma n’ihe na-erughị afọ atọ, ọnụ ọgụgụ anyị amụbawo ruo 64. Ee, n’ime oge ahụ mmadụ 16 weere nguzo ha maka eziokwu Bible, e mekwara ha baptism! Ọ bụ ezie na ndị isi ogige ahụ na-achọ ihe àmà nke ihe omume okpukpe mgbe nile, anyị nwere ike inwe nzukọ anyị na ime baptism n’ụlọ ịsa ahụ nke ogige ahụ n’ihi na onye na-elekọta ya bụ Onyeàmà.

Nnwere Onwe, na Ezinụlọ

Na 1956 a tọhapụrụ ihe ka ukwuu ná Ndịàmà nọ n’ogige ndị ahụ, si otú ahụ na-efesasị ndị ozi nke ozi ọma n’akụkụ nile nke ókèala sara mbara nke Soviet. E gbubilatawo ikpe a mara m ije mkpọrọ ruo afọ 25 ịbụ afọ 10, n’ikpeazụkwa ịbụ afọ 6 na ọnwa 6. Ya mere na February 1957, a tọhapụkwara m.

Ebu m ụzọ gaa Biryusinsk, bụ́ obodo dị na Siberia, ihe dị ka kilomita 600 n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ Angarsk. A gbaworo ọtụtụ Ndịàmà bụ́ ndị Ukraine ụgbọ nwa mkpi gaa n’ógbè ahụ, ọ tọkwara m ụtọ iso ha kerịta ahụmahụ dị iche iche na ịnụ banyere Ndịàmà bụ́ ndị anyị nile ma. Esi m ebe ahụ kwara laghachi Borislav, na Ukraine, bụ́ ebe otu Onyeàmà bụ́ onye Ukraine aha ya bụ Eugenia Bachinskaja bi. A tọhapụwo ya n’ụlọ mkpọrọ n’afọ bu afọ a tọhapụrụ m ụzọ.

Eugenia bụ Onyeàmà kwụsiri ike, onye a mara ikpe ọnwụ na 1950 maka ọrụ ime nkwusa ya. Otú ọ dị, mgbe ọ nọsịrị ụbọchị 18 n’ebe ndị a mara ikpe ọnwụ na-anọ, e gbubilatara amamikpe ya ịbụ ịnọ afọ 25 n’ogige pụrụ iche. Ka ọ na-eru ná ngwụsị 1957, mgbe m laghachiri Ukraine, anyị lụrụ. Mgbe anyị lụsịrị, anyị zubere ibi na Borislav, bụ́ ebe e mere m baptism afọ itoolu gara aga. Kama nke ahụ, e nyere m hour 48 ịhapụ Ukraine!

Akwagara m Caucasus, na ndịda Russia, bụ́ ebe Eugenia mesịrị bịakwute m. Otú ọ dị, mgbe anyị bisịrị n’ebe ahụ n’otu ntakịrị ụlọ ndebe ihe ruo ihe dị ka ọnwa isii, anyị gawara Biryusinsk ịga sonyere ụmụnna anyị ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị Kraịst a chụpụrụ achụpụ. E nwere ihe dị ka 500 n’ime ha na Biryusinsk na ọgbakọ ise, a họpụtakwara m ịbụ onyeisi oche ndị nlekọta nke otu n’ime ọgbakọ ndị ahụ. Na 1959 a mụrụ ada anyị bụ́ Oksana, Marianna sochikwara na 1960. Malite na nwa ọhụrụ ha na-anọ ná nzukọ mgbe nile, ha tolitere ma mara usoro ihe omume ime mmụọ ọgbakọ na Siberia.

Ndị ọchịchị Siberia adịghị enyecha nsogbu maka ihe omume ọgbakọ anyị, ma ọ dịghị ihe ọzọ ma e jiri ya tụnyere oké ihe mgbochi e tinyere n’ọrụ anyị na Ukraine. Ma, ọ dịghịrị ọgbakọ anyị dum mfe ịdị na-ezukọta ọnụ. Ememe olili ozu nyere anyị ohere ịnọkọta ọnụ n’ìgwè. N’oge ndị a, ọtụtụ ụmụnna ga-ekwu okwu Bible ndị na-enye ihe ọmụma. Ma mgbe ndị ọchịchị matara ihe na-emenụ, ha mere ihe. Dị ka ihe atụ, n’otu oge, a kwụsịrị ndị na-aga ili ozu ma jiri ike bughara igbe ozu ahụ gaa n’ebe a na-eli ozu ma lie ya.

Ịlaghachi Ukraine

Na 1965 anyị laghachiri Ukraine, biri na Kremenchug. Obodo ukwu a, nke dị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kilomita 800 n’akụkụ ọwụwa anyanwụ Borislav, nwere nanị Ndịàmà 12. Anyị biri ebe ahụ ihe dị ka afọ ise; n’ihe ka ukwuu n’oge ahụ, eletere m ọgbakọ dị iche iche dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. Na 1969, mgbe ụmụ anyị nwanyị dị afọ itoolu na iri, a gwara anyị ka anyị kwaga ndịda ịga nyere ụmụnna nọ ná ntakịrị obodo bụ́ Molochansk aka.

Na Molochansk ndị KGB kpọrọ m òkù ịbịa maka otu nkwurịta okwu were ọtụtụ hour. N’ezie, a kpọrọ m òkù ugboro isii! N’oge nkwurịta okwu nke ọ bụla, e kwere m nkwa ọdịnihu dị mma ma ọ bụrụ na m ga-ahapụ mmekọrịta mụ na “Ndị Jehova.” N’ikpeazụ, ike gwụrụ ndị KGB, a makwara mụ na Onyeàmà ọzọ ikpe ịga mkpọrọ otu afọ.

Mgbe m nọsịrị oge m, na 1973 mụ na ezinụlọ m kwagara n’otu obere obodo dịdewere Kremenchug. Anyị nwere nzukọ ndị Kraịst na nzuzo n’ụlọ anyị, gụnyere Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst, na 1974. N’ụtụtụ echi ya, e nyochara ụlọ anyị, e jidekwara m.

Ikpe, Ogige Ọrụ Mmanye, na Nchụpụ

A machibidoro ọha na eze ịbịa kirie ikpe m, ọ bụ nanị ndị a kpọrọ akpọ bịara. Ndị bịaranụ bụ ndị isi na ndị ndú obodo, ndị nwere àgbà n’obodo. Ekpebiri m na m gaghị enwe onye ọkàiwu, e nyekwara m minit 45 iji zara ọnụ m. Ụbọchị fotere ụbọchị ikpe ahụ, Eugenia na ụmụ anyị ndị nwanyị gburu ikpere n’ala kpee ekpere, na-arịọ, ọ bụghị ka a ghara ịma m ikpe siri ike ma ọ bụ ka a gbaghara m, kama ọ bụ nanị ka a gbaara Alaeze ahụ na aha nsọ Jehova ezi àmà.

Iji malite ikpe ahụ ọkàikpe gụpụtara ọtụtụ ihe site na magazin Ụlọ Nche na Teta! Mmeghachi omume nke ndị na-ege ntị abụghị ihe ọkàikpe ahụ tụrụ anya ya. Mgbe ndị mmadụ nụrụ na ajọ ụwa a ga-agabiga n’Amagedọn nakwa na Alaeze Chineke ga-achị ụwa, ọ gbagwojuru ha anya—n’amaghị ihe ha ga-ekwere ekwere. N’oge na-adịghị anya ọkàikpe ahụ chọpụtara ihie ụzọ ya, n’oge m na-ekwukwa okwu ikpeazụ m, ọ gbalịrị imechapụ onwe ya ihu site n’ịdị na-anapụ m okwu n’ọnụ mgbe nile. Ma, site n’ịgụ ihe kpọmkwem site ná mbipụta anyị, ọkàikpe ahụ enyewo aka gbaa ezi àmà, obi m jupụtakwara n’ekele. Ka o sina dị, a mara m ikpe ije nga ọrụ ahụhụ ruo afọ ise, nke ihe ga-esochi ya bụ afọ ise nke nchụpụ.

Anọrọ m afọ ise sochirinụ n’etiti ajọ ndị omekome n’ime ime ebe ugwu n’ogige ọrụ mmanye Yodva dị na Komi Autonomous Soviet Socialist Republic. N’oge ahụ enwere m ọtụtụ ohere nke ịgbara ihe dị ka ndị mkpọrọ 1,200 tinyere ndị nlekọta ogige ahụ àmà banyere Alaeze ahụ. Mgbe a tọhapụsịrị m na 1979, a chụgara m Vorkuta, n’elu elu Ógbè Arctic. N’oge na-adịghị anya mgbe m nwetasịrị ọrụ na ebe m ga-ebi na Vorkuta, ezinụlọ m sonyeere m.

A ma Vorkuta ama ịbụ nke ọtụtụ ndị mkpọrọ ya nwụrụ mgbe a na-ewu ya, gụnyere ọtụtụ Ndịàmà bụ́ ndị mkpọrọ ọtụtụ iri afọ tupu mgbe ahụ. Taa ọ bụ obodo ukwu dị otú o kwesịrị, ọ dịghịkwa ebe e nwere ogige ọrụ mmanye. Ma ọkpụkpụ nke ọtụtụ ndị nwụrụ n’ihi okwukwe ha bụ́ ndị tinyere ndụ ha iji too Jehova jupụtara n’ime ala kpụkọrọ akpụkọ mgbe nile n’ihi oyi ndị dị n’ime na gburugburu obodo ukwu ahụ.

Ọṅụ nke Nnwere Onwe Okpukpe

Na 1989 anyị si Vorkuta gaa Poland iji gaa mgbakọ mba nile abụọ nke Ndịàmà Jehova. Ihere emeghị anyị ibe ákwá obi ụtọ ka anyị na-ekiri ka ọtụtụ iri puku ụmụnna nwoke na nwanyị ndị Kraịst nọ na Warsaw na Katowice na-enwe mkpakọrịta obi ụtọ n’atụghị egwu ịbụ ndị e jidere. Otu nrọ emezuwo. Anyị jiri mkpebisi ike e mere ka ọ dị ọhụrụ ije ozi maka ọdịmma Alaeze laghachi Vorkuta.

Otú ọ dị, ọnọdụ ihu igwe dị n’elu elu Ógbè Arctic siri ike, ahụ ike Eugenia adalatawokwa. Ya mere ka afọ ahụ gatụkwuru anyị kwaara laghachi Kremenchug, bụ́ ebe anyị na-aṅụrị ọṅụ n’ozi anyị na-ejere Jehova ná nnwere onwe ka ukwuu anyị nwere ugbu a. Di ụmụ anyị nwanyị abụọ bụcha ndị okenye n’ọgbakọ dị n’ebe a na Ukraine. Ụmụ anyị ndị nwanyị, ọ bụ ezie na ha na-azụlite ụmụ anọ, bụkwa ndị ọsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ndị ozi oge nile.

Site n’oge ruo n’oge, m ka na-echeta ihu agha nke 1945 na nkwa m kwere ihe karịrị iri afọ ise gara aga. Ka m wee nwee ike imezu ya, Jehova nyere m ezi ihe ọmụma, otu ihe ọmụma ahụ nke nyewooro ọtụtụ nde ndị ọzọ aka ikwe nkwa yiri ya—ijere Jehova ozi ruo mgbe ebighị ebi.

[Map/Foto dị na peeji nke 27]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

UKRAINE

Borislav

Vorkuta

Kremenchug

Molochansk

Biryusinsk

Angarsk

Lviv

RUSSIA

Caucasus

Anyị na ụmụ anyị ndị nwanyị abụọ, di ha, na ụmụ ha anọ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya