Echiche nke Bible
Ọ̀ Bụ Eze Atọ Letara Jisọs na Betlehem?
MGBE a mụsịrị Jisọs, ndị a maara aha ha si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa bịara Betlehem ịkwanyere ya ùgwù dị ka eze ndị Juu. Ruo taa ọtụtụ ndị na-agba Krismas n’ụwa nile na-eme ememe ncheta nke nleta ahụ.
N’ebe ụfọdụ, ndị mmadụ na-eme Ihe Ngosi Ọmụmụ Jisọs nke na-akọwa ndị ọbịa ahụ si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa dị ka ndị eze atọ ji onyinye na-ejekwuru Jisọs ahụ a mụrụ ọhụrụ. N’ala ndị ọzọ, ụmụaka na-eji ejiji “Ndị Eze Nsọ ahụ” ejegharị n’ógbè ha. Ọbụna mgbe narị afọ 20 gasịrị, ndị mmadụ n’ebe nile ka na-echeta ndị ọbịa ahụ pụrụ iche. Hà bụkwanụ ole ndị?
Hà Bụ Ndị Eze?
Ihe ndekọ nke akụkọ ihe omume a dị n’akwụkwọ Bible bụ́ Matiu. N’ebe ahụ anyị na-agụ: “Mgbe a mụsịrị Jisọs . . . ndị na-agụ kpakpando bú ndị si n’ebe ọwụwa anyanwụ bịarutere Jerusalem otu ụbọchị na-ajụ, ‘Olee ebe eze ndị Juu a mụrụ ọhụrụ nọ? Anyị hụrụ kpakpando ya ka ọ na-awa, anyị abịawokwa ịkwanyere ya ùgwù.’” (Matiu 2:1, 2, New American Bible) N’ihi gịnị ka nsụgharị Bible a ji kpọọ ndị ọbịa ahụ si n’ebe ọwụwa anyanwụ ndị na-agụ kpakpando ma ghara ịkpọ ha ndị eze?
N’ebe a, akwụkwọ nsọ ji okwu Grik na-egosi ihe karịrị otu, bụ́ maʹgos, mee ihe. Nsụgharị Bible dị iche iche sụgharịrị ya ịbụ “ndị amamihe,” “ndị na-agụ kpakpando,” ma ọ bụ “ndị na-ekiri kpakpando” ma ọ bụ ha na-edegharị ya nanị ná mkpụrụ okwu ọzọ ịbụ “Ndị Magi.” Okwu a na-ezo aka ná ndị na-enye ndụmọdụ ma na-ebu amụma na-adabere n’ọnọdụ kpakpando na mbara ụwa. Bible si otú a mee ka a mata ndị ọbịa ahụ gara Betlehem dị ka ndị na-ajụ ndị mmụọ ase, ndị na-eme anwansi bụ́ nke Chineke na-akwadoghị.—Deuterọnọmi 18:10-12.
Hà bụkwu ndị eze? Ọ bụrụ na ha bụ, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ịtụ anya na Bible gaara eme ka a mata ha otú ahụ. Matiu 2:1-12 ji okwu ahụ bụ́ “eze” mee ihe ugboro anọ, na-ezo aka otu ugboro n’ebe Jisọs nọ na ugboro atọ n’ebe Herọd nọ. Ma ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ kpọrọ ndị Magi ahụ ndị eze. Banyere nke a The Catholic Encyclopedia na-ekwu, sị: “Ọ dịghị Nna Chọọchị kwuru na ndị Magi ahụ bụ ndị eze.” Bible ekwughịkwa otú ahụ.
Hà Dị Atọ?
Ihe ndekọ Bible ekwughị ole ndị Magi ahụ dị. Ka o sina dị, Ihe Ngosi Ọmụmụ Jisọs na ukwe Krismas na-akwado nkweta ọtụtụ ndị nwere bụ́ na ha dị atọ. O doro anya na nke a dabeere n’eziokwu ahụ bụ́ na e nyere ụdị onyinye atọ. Banyere nke a, Bible na-ekwu, sị: “Ha wee kpughee igbe akụ̀ ha, chee onyinye n’ihu [Jisọs], ọlaedo na frankincense na myrrh.”—Matiu 2:11.
Ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwubi na ebe ọ bụ na ndị Magi ahụ nyere onyinye atọ dịgasị iche, na ha ga-adịrịrị ndị Magi atọ? Ka anyị tụlee ihe ndekọ nke onye ọbịa ọzọ a ma ama gara Israel. Eze nwanyị Sheba letara Eze Solomọn n’otu oge ma nye ya “ụda dị iche iche, na ọlaedo bara ụba nke ukwuu, na nkume dị oké ọnụ ahịa.” (1 Ndị Eze 10:2) Ọ bụ ezie na a kpọtụrụ ụdị onyinye atọ dịgasị iche aha, nanị onye e kwuru nyere ha bụ eze nwanyị Sheba. Ole onyinye ya dị adịghị egosi na ọ bụ mmadụ atọ bịakwutere Solomọn n’oge ahụ. N’ụzọ yiri nke ahụ, onyinye atọ ahụ e nyere Jisọs enwechaghị ihe jikọrọ ya na mmadụ ole wetara ha.
The Catholic Encyclopedia na-ekwu, sị: “Nkọwa Oziọma ahụ ekwughị ole ndị Magi ahụ dị, ọ dịghịkwa nkweta ọ bụla pụtara ìhè n’okwu a. Ụfọdụ ndị Nna na-ekwu banyere ndị Magi atọ; o yiri ka ọ bụ ole onyinye ahụ dị metụtara ha.” Ọ gara n’ihu ikwu na ihe osise dị iche iche na-egosi abụọ, atọ, anọ, na ọbụna asatọ na-eleta Jisọs. Nkweta ụfọdụ na-egosi na ha ruru 12. E nweghị nnọọ ụzọ a pụrụ isi mata ole ndị Magi ahụ dị.
Akụkọ A Ma Ama ma Bụrụ nke Na-ezighị Ezi
N’ụzọ dị iche n’ihe ọha kweere, ndị Magi ahụ bu ụzọ gaa Jerusalem, ọ bụghị Betlehem, mgbe a mụsịrị Jisọs. Ha anọghị ya mgbe a mụrụ Jisọs. Ka e mesịrị, mgbe ha gara Betlehem, Bible na-ekwu na ‘ha bara n’ime ụlọ, hụ Nwatakịrị ahụ.’ (Matiu 2:1, 11) Ya mere, o doro anya na mgbe ndị Magi ahụ letara Jisọs, ezinụlọ ya akwagawo n’ezigbo ụlọ. Ha ahụghị ya ka o dina n’ihe a na-etinye nri anụ ụlọ.
N’ile ya anya n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ si kọọ ya, akụkọ ahụ a ma ama banyere ndị eze atọ sọpụụrụ Jisọs n’oge a mụrụ ya ezighị ezi. Dị ka a kpọtụrụ uche n’elu, Bible na-akụzi na ndị Magi ahụ letara Jisọs abụghị ndị eze kama ndị na-agụ kpakpando bụ́ ndị na-eme anwansi. Ihe ndekọ Akwụkwọ Nsọ ekwughị mmadụ ole ha dị. Ọzọ, ha eletaghị Jisọs n’oge a mụrụ ya, mgbe e tinyere ya n’ihe a na-etinye nri anụ ụlọ, kama nke ahụ, ọ bụ mgbe e mesịrị, mgbe ezinụlọ ya bi n’ezigbo ụlọ.
A na-ele akụkọ ndị a ma ama banyere ndị eze atọ ahụ na akụkọ ọdịnala Krismas ndị ọzọ anya n’ozuzu ha dị ka akụkọ ifo oge ezumike nke na-enweghị ihe o mere, n’agbanyeghị na Akwụkwọ Nsọ kwuru na ha ezighị ezi. Otú ọ dị, ndị Kraịst ji ụdị ofufe nke ụgha na-adịghị na ya akpọrọ ihe nke ukwuu. Ọ bụ otú a ka ọ dị Jisọs n’onwe ya. N’ekpere nye Nna ya, o kwuru n’otu oge, sị: “Okwu Gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) O kwuru na “ndị na-akpọ isiala n’ezie ga-akpọ isiala nye Nna m n’ime mmụọ na eziokwu: n’ihi na ndị dị otú ahụ ka Nna m na-achọkwa ka ha bụrụ ndị na-akpọ isiala nye Ya.”—Jọn 4:23.
[Foto dị na peeji nke 25]
“Ịsọpụrụ ndị Magi”