Ndị Amụma Ụgha Taa
JEREMAỊA jere ozi dị ka onye amụma Chineke na Jerusalem n’oge mgbe ikpere arụsị, omume rụrụ arụ, mmerụ, na iwufu ọbara ndị na-emeghị ihe ọjọọ jupụtara n’obodo ahụ. (Jeremaịa 7:8-11) Ọ bụghị nanị ya bụ onye amụma na-arụ ọrụ n’oge ahụ, ma ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị ọzọ na-ejere onwe ha ozi, rụọkwa arụ. N’ụzọ dị aṅaa? Jehova na-ekwupụta, sị: “Site n’onye amụma wee ruo onye nchụàjà onye ọ bụla na-eme ihe n’ụgha. Ha wee gwọọ mgbaji ụkwụ na aka nke ndị m n’akpọghị ya ihe, sị, Udo, udo; mgbe udo na-adịghị.”—Jeremaịa 6:13, 14.
Ndị amụma ụgha nwara ime ka o yie ka n’agbanyeghị mmerụ nile dị n’ala ahụ, ihe na-aga nke ọma, ìgwè mmadụ ahụ na Chineke nọkwa n’udo; ma ọ dịghị otú ahụ. Ikpe Chineke na-echere ha, dị ka Jeremaịa kpọsara n’atụghị egwu. Ezi onye amụma ahụ bụ Jeremaịa, ọ bụghị ndị amụma ụgha, ka e gosipụtara dị ka onye na-ekwu eziokwu mgbe ndị agha Babilọn kpochapụrụ Jerusalem n’afọ 607 T.O.A., bibie ụlọ nsọ ahụ, ìgwè mmadụ ahụ bụrụ ndị e gburu ma ọ bụ kpụrụ ha laa n’agha gaa na Babilọn dị anya. Ole na ole ndị dị imere ebere bụ́ ndị fọrọ n’ala ahụ gbalagara n’Ijipt.—Jeremaịa 39:6-9; 43:4-7.
Gịnị ka ndị amụma ụgha ahụ meworo? “Mụ na-emegide ndị amụma, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), bụ́ ndị na-ezu okwu m nile n’ohi, onye ọ bụla n’aka ibe ya.” (Jeremaịa 23:30) Ndị amụma ụgha ahụ zuuru ikike na mmetụta nile nke okwu Chineke site n’ịgba ndị mmadụ ume ka ha ṅaa ntị nye okwu ụgha dị iche iche kama ịbụ nye ezi ịdọ aka ná ntị sitere n’aka Chineke. Ọ bụghị “oké ọrụ nile nke Chineke” ka ha na-ekwupụta, kama ọ bụ echiche ndị nke ha, bụ́ ihe ndị mmadụ ahụ chọrọ ịnụ. Ozi Jeremaịa n’eziokwu sitere n’aka Chineke, a sịkwa na ndị Israel mere ihe kwekọrọ n’okwu ya ndị ahụ, ha gaara alanarịwo. Ndị amụma ahụ ‘zuuru okwu Chineke’ ma duba ndị ahụ n’ọdachi. Ọ bụ nnọọ dị ka Jisọs kwuru banyere ndị ndú okpukpe na-adịghị ekwesị ntụkwasị obi n’ụbọchị ya, sị: “Ha bụ ndị ndú kpuru ìsì. Ma ọ bụrụ na onye ìsì eduo onye ìsì, ha abụọ ga-adaba n’olulu.”—Ọrụ 2:11; Matiu 15:14.
Dị ka ọ dị n’ụbọchị Jeremaịa, e nwere ndị amụma ụgha taa, bụ́ ndị na-eme nzọrọ na ha na-anọchite anya Chineke nke Bible; ma ha onwe ha kwa na-ezuru okwu Chineke n’ohi site n’ikwusa ihe ndị na-adọpụ uche ndị mmadụ pụọ n’ihe Chineke na-ekwu n’ezie site na Bible. N’ụzọ dị aṅaa? Ka anyị zaa ajụjụ ahụ site n’iji ozizi bụ isi nke Bible nke bụ Alaeze ahụ mee ihe dị ka nkume iji tụọ ihe.
Eziokwu Banyere Alaeze ahụ
Alaeze Chineke bụ isiokwu bụ isi nke ozizi Kraịst, a kpọtụkwara ya uche ihe karịrị otu narị ugboro n’ime Oziọma ndị ahụ. Ná mmalite ozi ya, Jisọs sịrị: “Aghaghị m izikwa obodo nile ọzọ ozi ọma alaeze Chineke: n’ihi na e zitere m ime nke a.” Ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa.”—Luk 4:43; 11:2.
Mgbe ahụ, gịnị bụ Alaeze ahụ? Dị ka akwụkwọ The New Thayer’s Greek English Lexicon si kwuo, okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “alaeze” n’ime Bible pụtara nke mbụ ya, “ike ịbụ eze, ịbụ eze, ịchị achị, ịchịisi” na nke abụọ, “ókèala nke nọ n’okpuru ịchịisi onye eze.” Site na nke a anyị pụrụ ikwubi site n’ezi echiche na Alaeze Chineke bụ n’ụzọ nkịtị gọọmenti nke onye Eze na-elekọta. Ọ̀ bụ otú a ka ọ dị?
Ee, ọ bụ ya, Eze ya abụghịkwa onye ọzọ e wezụga Jisọs Kraịst. Tupu ọmụmụ Jisọs mmụọ ozi bụ́ Gebriel gwara Meri, sị: “Nwa nwoke ahụ ga-abụ onye ukwu, a ga-akpọkwa ya Ọkpara nke Onye Kachasị Ihe Nile Elu: Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] Chineke ga-enyekwa ya ocheeze nna ya Devid.” (Luk 1:32) Jisọs ịnata ocheeze na-egosipụta na ọ bụ Eze, Onye Na-achị Isi gọọmenti. Ihe ọzọ na-egosipụtakwa na Alaeze ahụ bụ gọọmenti n’ụzọ nkịtị bụ amụma nke Aịsaịa: “Anyị ka a mụwooro otu nwa, anyị ka e nyeworo otu nwa nwoke: gọọmenti ahụ ga-adịkwasịkwa n’ubu ya . . . A gaghị enwe ọgwụgwụ nke ịba ụba nke gọọmenti ya na udo ya.”—Aịsaịa 9:6, 7, King James Version.
Olee ebe Jisọs na-achị isi? Ọ̀ bụ na Jerusalem? Ee e. Daniel onye amụma hụrụ ọhụụ ebe Jisọs na-anata Alaeze, ọhụụ ya na-egosikwa na Jisọs nọ n’eluigwe. (Daniel 7:13, 14) Nke a kwekọrọ n’ụzọ Jisọs si kwuo okwu banyere Alaeze ahụ. Ọtụtụ mgbe ọ kpọrọ ya “alaeze eluigwe.” (Matiu 10:7; 11:11, 12) O kwekọkwara n’okwu ndị Jisọs gwara Paịlet mgbe a na-ekpe Jisọs ikpe n’ihu ya: “Alaeze m esiteghị n’ụwa nke a: ọ bụrụ na alaeze m sitere n’ụwa nke a, ndị na-ejere m ozi ga-alụ ọgụ, ka a ghara ịrara m nye n’aka ndị Juu: ma ugbu a alaeze m esighị n’ebe a pụta.” (Jọn 18:36) Onye na-eje ozi na chọọchị gị ma ọ bụ ụkọchukwu gị ò ziwo gị na Alaeze Jisọs bụ gọọmenti n’ezie, nke na-achị isi site n’eluigwe? Ka ò ziwo gị na Alaeze ahụ bụ nanị ihe dị adị n’ime obi? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ nọwo na-ezunarị gị okwu Chineke.
Gịnị bụ njikọ e nwere n’etiti gọọmenti Alaeze ahụ na ụdị nile nke gọọmenti ụmụ mmadụ? Dị ka akwụkwọ The Encyclopedia of Religion nke Mircea Eliade bụ editọ ya si kwuo, Onye Mgbanwe Usoro bụ Martin Luther, mgbe ọ na-atụle Alaeze ahụ, tụrụ aro, sị: “A pụkwara ịkpọ gọọmenti ụwa . . . alaeze Chineke.” Ụfọdụ na-akụzi na ụmụ mmadụ, site ná mgbalị nke onwe ha, pụrụ ime ka gọọmenti dị iche iche nke ụmụ mmadụ yikwuo Alaeze Chineke. Na 1983, òtù World Council of Churches kwusiri ike, sị: “Ka anyị na-agba àmà nye ezi ọchịchọ anyị maka udo na ime ihe ndị a hụrụ anya, Mmụọ Chineke pụrụ iji mgbalị ndị dị nta anyị na-etinye mee ihe iji mee ka alaeze nile nke ụwa nke a yikwuo alaeze Chineke.”
Otú ọ dị, rịba ama na n’Ekpere Onyenwe Anyị (“Nna Anyị”), Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa, ọ bụkwa nanị mgbe ahụ ka ọ gwara ha ka ha kpee ekpere, sị: “Ka e mee ihe ị [Chineke] na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” (Matiu 6:10) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ụmụ mmadụ adịghị eme ka Alaeze ahụ bịa site n’ime uche Chineke. Ọ bụ ọbịbịa Alaeze ahụ na-eme ka e mee uche Chineke n’ụwa. N’ụzọ dị aṅaa?
Gee ntị n’ihe amụma Daniel isi nke 2, amaokwu nke 44, na-ekwu: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a, ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, . . . ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa.” Ka a sịkwa ihe mere Jisọs ji sị na Alaeze ya esiteghị n’ụwa nke a! Kama nke ahụ, Alaeze ahụ gaje ibibi alaeze nile, gọọmenti nile, nke ụwa nke a ma weghara ọnọdụ ha n’ịchịisi n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ. Dị ka gọọmenti Chineke nyere ihe a kpọrọ mmadụ, ọ ga-ahụzị mgbe ahụ na e mere uche Chineke n’ụwa.
Ihe mere Alaeze ahụ ga-eji mee ihe n’ụzọ dị ike otú ahụ na-edowanye anya mgbe anyị chere echiche banyere onye na-achịkwa ụwa. Jọn onyeozi dere, sị: “Ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) “Ajọ onye ahụ” bụ Setan Ekwensu, onye Pọl kpọrọ “chi nke oge a.” (2 Ndị Kọrint 4:4) Ọ dịghị ụzọ ọ bụla a pụrụ isi jikọọ òtù dị iche iche dị n’ụwa nke Setan Ekwensu bụ chi ya na Alaeze Chineke.
Nke a bụ otu ihe mere Jisọs ji ghara itinye aka ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Mgbe ndị Juu hụrụ mba ha n’anya nwara ime ya eze, o zeere ha. (Jọn 6:15) Dị ka anyị hụworo, o ji obi eziokwu gwa Paịlet, sị: “Alaeze m esiteghị n’ụwa nke a.” N’ikwekọkwa na nke a, o kwuru banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ha esiteghị n’ụwa, dị ka mụ onwe m na-esiteghị n’ụwa.” (Jọn 17:16) Ya mere, ndị ndú okpukpe na-akụzi na ọbịbịa Alaeze Chineke bụ nke a na-eme ka ọ dịwanye ngwa site ná mgbanwe usoro n’ime usoro ihe dị ugbu a nakwa ndị na-agba ìgwè atụrụ ha ume ka ha rụọ ọrụ maka nke a bụ ndị amụma ụgha. Ha na-ezuru ikike na mmetụta nke ihe Bible na-ekwu n’ezie.
N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Mkpa?
Ihe a dum ọ̀ bụ nanị arụmụka oké agụmakwụkwọ? Ọ bụghị ya ma ọlị. Ozizi ụgha banyere Alaeze Chineke eduhiewo ọtụtụ ndị, o metụtawokwa ọbụna ọnọdụ akụkọ ihe mere eme. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ bụ Théo, ensaịklopedia ndị Roman Katọlik, na-asị: “Ndị Chineke na-aga n’ihu inweta Alaeze Chineke nke Kraịst malitere n’elu ụwa . . . Chọọchị bụ mkpụrụ nke Alaeze nke a.” Ijikọ Chọọchị Katọlik na Alaeze Chineke nyere chọọchị ike ọchịchị dị ukwuu Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya nke jupụtara ná nkwenkwe ụgha. Ọbụna taa, ndị isi chọọchị na-anwa ịgbazi otú ihe si aga n’ụwa, na-arụ ọrụ n’ụzọ na-enye usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụfọdụ nkwado na n’ụzọ na-emegide ndị ọzọ.
Otu onye ọkà okwu nyere echiche ọzọ nke gbasazuru ebe nile taa mgbe ọ sịrị: “Ụzọ nke mgbanwe ọchịchị n’ike bụ alaeze ahụ n’ihi na mgbanwe ọchịchị n’ike bụ ndị mmadụ ịbịakọta ọnụ n’òtù ụmụ mmadụ ọhụrụ, nke ihe mgbaama Chineke na-enye site n’onye na-ekwu eziokwu na-akpali—Jisọs . . . Gandhi . . . ụmụnna Berrigan ahụ.” Ịkụzi na a pụrụ ịgbasakwu Alaeze Chineke site n’ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ileghara ihe ndị bụ ezie banyere Alaeze ahụ anya edubawo ndị ndú okpukpe n’ịchụso ọkwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị. O dubawo ndị ọzọ n’itinye aka n’ọgba aghara obodo na ọbụna n’ikere òkè ná mburịta agha okpuru. Ọ dịghị nke n’ime ihe ndị a kwekọrọ n’eziokwu ahụ nke bụ na Alaeze ahụ esiteghị n’ụwa nke a. Ndị ndú okpukpe na-etinyekwa aka n’ụzọ miri emi ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị anọpụghị iche n’ụwa ma ọlị, dị ka Jisọs kwuru na ezi ndị na-eso ụzọ ya ga-anọpụ iche. Ndị na-akụzi na a ga-eji ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị nweta Alaeze Chineke bụ ndị amụma ụgha. Ha na-ezunarị ụmụ mmadụ okwu Chineke.
Ọ bụrụ na ndị ndú okpukpe nọ na Krisendọm na-akụzi ihe Bible na-ekwu n’ezie, ìgwè atụrụ ha nile ga-amata na Alaeze Chineke n’ezie ga-edozi nsogbu nile dị ka ịda ogbenye, nrịanrịa, ikpe na-ezighị ezi n’ihi agbụrụ, na mmegbu. Ma ọ ga-abụ n’oge Chineke kara aka na n’ụzọ nke Chineke. Ọ gaghị abụ site ná mgbanwe usoro nke usoro ihe omume nile nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị, bụ́ nke ga-agabiga mgbe Alaeze ahụ ga-abịa. Ọ bụrụ na ndị ụkọchukwu ndị a bụ ezi ndị amụma, ha gaara akụziri ìgwè atụrụ ha na ka ha na-echere ka Alaeze Chineke mee ihe, ha pụrụ inweta ezi enyemaka, nke Chineke na-enye, nke bara uru, iji dozie nsogbu nile nke ekpeghị ikpe ziri ezi nke ụwa nke a na-akpata.
N’ikpeazụ, ha gaara akụziworo ìgwè atụrụ ha na ọnọdụ ụwa ndị na-adịwanye njọ bụ́ ndị na-akpata oké ntaramahụhụ dị otú a bụ ndị e buru amụma ha n’ime Bible, ha bụkwa ihe àmà nke na ọbịbịa Alaeze ahụ dị nso. Ee, Alaeze Chineke ga-eme ihe n’isi nso wee nọchie nhazi ndọrọ ndọrọ ọchịchị nile e nwere ugbu a. Lee aha ngọzi nke a ga-abụ!—Matiu 24:21, 22, 36-39; 2 Pita 3:7; Mkpughe 19:11-21.
Ihe A Kpọrọ Mmadụ n’Okpuru Alaeze Chineke
Gịnị ka ọbịbịa Alaeze Chineke ga-apụtara ihe a kpọrọ mmadụ? Ị̀ pụrụ nnọọ iche echiche banyere onwe gị iteta ụra kwa ụtụtụ na-enwe ume ndụ zuru ezu? Ọ dịghị onye ị maara nke na-arịa ọrịa ma ọ bụ na-anwụ anwụ. Ọbụna na e weghachiworo gị ndị ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ site ná mbilite n’ọnwụ. (Aịsaịa 35:5, 6; Jọn 5:28, 29) E nwekwaghị nchegbu akụ na ụba nke azụmahịa site n’ọchịchọ onwe onye ma ọ bụ usoro akụ na ụba dị iche iche ndị na-ahaghị nhata. I nwere ebe obibi nke gị na-edo ahụ na ala buru ibu iji kọpụta nri nile dị gị mkpa iji zụọ ezinụlọ gị. (Aịsaịa 65:21-23) Ị pụrụ ịgagharị n’ebe ọ bụla n’oge ọ bụla nke ụbọchị ma ọ bụ anyasị n’atụghị egwu mwakpo. E nwekwaghị agha—ọ dịghị ihe ga-eyi ịnọ ná ntụkwasị obi gị egwu. Onye ọ bụla bu ọdịmma gị n’obi. Ndị ajọ omume agwụsịwo. Ịhụnanya na ezi omume jupụtara ebe nile. Ị̀ pụrụ iche echiche banyere oge dị otú ahụ? Nke a bụ ụdị ụwa nke Alaeze ahụ ga-eweta.—Abụ Ọma 37:10, 11; 85:10-13; Maịka 4:3, 4.
Nke a ọ̀ bụ nanị oké nrọ efu? Ee e. Gụọ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ahụ e depụtara na paragraf bu ụzọ, ị ga-ahụkwa na ihe nile e kwuru n’ebe ahụ na-egosipụta nkwa ndị doro anya nke Chineke. Ọ bụrụ na ruo ugbu a e gosibeghị gị onyinyo nke a bụ ezie nke ihe Alaeze Chineke pụrụ imere ihe a kpọrọ mmadụ, bụ́ ihe ndị ọ ga-emere ha, mgbe ahụ ọ dị onye zunarịworo gị okwu Chineke.
Ọ bụ ihe obi ụtọ na ọ bụghị iwu na ihe ga-anọgide na-adị otú ahụ. Jisọs kwuru na n’ụbọchị anyị “a ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14) Magazin nke ị na-agụ bụ akụkụ nke ọrụ nkwusa ahụ. Anyị na-agba gị ume ka i zeere ịbụ onye ndị amụma ụgha dufuru. Lebakwuo anya n’ime Okwu Chineke iji chọta eziokwu banyere Alaeze Chineke. Mgbe ahụ, doo onwe gị n’okpuru Alaeze ahụ, bụ́ ndokwa Onye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu ahụ, bụ́ Jehova Chineke na-eme. N’ikwu eziokwu, ọ bụ olileanya e nwere nanị ya maka ụmụ mmadụ, ọ gaghịkwa ada ada.
[Foto dị na peeji nke 5]
Luther ziri na a pụrụ ile gọọmenti ụmụ mmadụ anya dị ka Alaeze Chineke
[Ebe E Si Nweta Foto]
A natara ikike Trustees of the British Museum
[Foto dị na peeji nke 7]
Dị ka Onye Ọzụzụ Atụrụ na-ahụ n’anya, Jehova ga-eji Alaeze ya weta ọnọdụ ndị ọ na-adịghị mmadụ pụrụ iweta ha