Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/02 p. 1
  • “Olee Otú Ha Ga-esi Anụ?”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Olee Otú Ha Ga-esi Anụ?”
  • Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Kwadebe Maka Mgbapụta Banye n’Ime Ụwa Ọhụrụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • “Àmà Nye Mba Nile”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Cheta Nwunye Lọt
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-ele Ndị Mmadụ Anya Ka Ụbọchị Jehova Na-eru Nso?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2002
km 1/02 p. 1

“Olee Otú Ha Ga-esi Anụ?”

1 Jizọs kwuru hoo haa, sị: “A ghaghị ibu ụzọ kwusaa ozi ọma ahụ ná mba nile.” (Mak 13:10) N’agbanyeghị mgbalị anyị ji ịdị uchu na-eme, a ka nwere ọtụtụ narị nde mmadụ a na-agbabeereghị àmà. Gọọmenti ụfọdụ machibidoro ọrụ anyị iwu. Ọtụtụ ala nwere ụba mmadụ na-amụba amụba n’ụzọ dị ngwa. N’ihi ya, “olee otú ha ga-esi anụ?”—Rom 10:14.

2 Nwee Obi Ike n’Ebe Jehova Nọ: Anyị aghaghị icheta na Jehova maara ọnọdụ uche nke mmadụ nile. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ọnọdụ mmadụ, ọ bụrụ na o jiri ezi obi chọọ eziokwu banyere Chineke, ọ ga-achọta ya.—1 Ihe 28:9.

3 Ebreham nwere nchegbu banyere ndị bi na Sọdọm na Gọmọra. Ma Chineke mesiri ya obi ike na a gaghị ebibi Sọdọm ma ọ bụrụ na a hụ nanị ndị ezi omume iri n’ebe ahụ. (Jen. 18:20, 23, 25, 32) Ọ dịtụbeghị mgbe Jehova bibikọtara ndị ajọ omume na ndị ezi omume, dị ka nnapụta ọ napụtara Lọt na ụmụ ya ndị inyom gosiri.—2 Pita 2:6-9.

4 N’otu oge, Elaịja chere na ya nọ nanị ya n’ife Chineke. Otú ọ dị, Jehova mesiri ya obi ike na ọ nọghị nanị ya ma ọlị nakwa na ọ ga-arụzu ọrụ ọ maliteworo. (1 Eze 19:14-18) Gịnị banyere ọnọdụ e nwere n’oge anyị?

5 Jiri Ọrụ n’Aka n’Ozi Chineke: Anyị amaghị ókè a ka ga-arụru ọrụ ịgba àmà ahụ. Ọ bụ Jehova ka ọrụ a dị n’aka, ọ na-ejikwa ndị mmụọ ozi ya elekọta ya. (Mkpu. 14:6, 7) Ọ bụ ya ga-ekpebi ókè a ga-agbaru àmà a ná mba nile. Ọ bụrụ na Jehova achọọ, ọ pụrụ ịhụ na a gbasara ozi Alaeze ahụ n’ụzọ ndị anyị na-apụtụghị ichetụ n’echiche ka ọtụtụ ndị ọzọ wee nwee ike ‘ịnụ okwu nke ozi ọma ma kwere.’ (Ọrụ 15:7) Ihe Jehova ga-eme ga-ekwekọ n’ụzọ zuru ezu n’ụdị onye ọ bụ—Chineke na-ahụ n’anya, onye maara ihe, ma na-ekpe ikpe ziri ezi.

6 Ọ bụ ihe ùgwù nye anyị ịrụ ọrụ n’ụzọ kwekọrọ n’uche Jehova, na-eme ihe nile anyị pụrụ ime iji mee ka mmadụ nile nụ ozi ọma ahụ.—1 Kọr. 9:16.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya