Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 10/1 p. 21
  • E Buru Amụma Ụnwụ Nri

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • E Buru Amụma Ụnwụ Nri
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Bụ Ihe Ngwọta Ya?
    Teta!—1996
  • Ọnụ Ọgụgụ Na-arị Elu nke Ndị Gbara Ọsọ Ndụ
    Teta!—1996
  • Ịchọta Ebe Ha Ga-akpọ nke Ha
    Teta!—2002
  • Na-enyere “Ndị Mbịarambịa” Aka Ka Ha ‘Jiri Ọṅụ Na-ejere Jehova Ozi’
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 10/1 p. 21

E Buru Amụma Ụnwụ Nri

N’AFỌ ndị na-adịbeghị anya onyinyo ọjọọ nke ụnwụ nri aghọwo nke a na-ahụkarị n’ụzọ na-eweta ihe mgbu n’akụkọ ụwa. Site n’Etiopịa na n’ebe ndị ọzọ, a hụwo onyinyo ndị a na-apụghị ichefu echefu nke nhụjuanya. Na 1992 ụwa tụkwasịrị uche ya ná ndị ọdachi ụnwụ nri dakwasịrị na Somalia, nke ụkọ mmiri ozuzo na agha kpatara. Akwụkwọ The International Herald Tribune kọrọ na September 1992, sị: “Ọ dịghị onye ma ndị Somalia ole nwụworonụ, ma òtù Red Cross na-ekwu na ọnụ ọgụgụ ha karịrị 100,000. Ọtụtụ narị, ma ọ bụghị ọtụtụ puku, na-anwụ kwa ụbọchị.”

Ọnụ ọgụgụ ndị ahụ adịghị egosipụta n’ezie nhụjuanya na ihe mgbu nke ndị o metụtara. Yvette Pierpaoli, bụ́ onye Europe nke na-anọchite anya òtù Refugees International, dere na magazin òtù UN bụ́ Refugees, sị: “Na New York ma ọ bụ Geneva, okwu banyere ndị gbara ọsọ ndụ yiri nnọọ nke doro anya; a na-enye ọtụtụ ọnụ ọgụgụ, ọnụ ọgụgụ ndị ahụ na-ebukwa ọtụtụ nọtụ nke na ọ na-esi ike ịghọta. Ma ọtụtụ kilomita n’ebe dị anya, n’ókèala nke mba ndị nọ n’ọgba aghara, mmetụta na-eme ka akpịrị kpọchie gị, ịdị ukwuu nke nhụjuanya ahụ na-emekwa ka ị chọọ iti mkpu.”

Ọ bụ ezie na òtù Red Cross na-asị na mgbalị ya nile inyere Somalia aka bụ ọrụ ebere inyeaka kasị ukwuu ọ rụworo, ọtụtụ ndị hụrụ ihe merenụ na-eme mkpesa na onyinyo ahụ n’ozuzu ya bụ nke metụtara ntakịrị ihe inyeaka, nke na-abịaghị n’oge. Pierpaoli kwara arịrị, sị: “Mba ndị nyere onyinye na-ala azụ ịnọgide na-eme otú ahụ, ike agwụwo ha ịkwado Africa nke na-adakasị adakasị. . . . Ha na-ata ndị Africa ụta maka ajọ nhazi ha, anyaukwu nke ndị ndú ha, esemokwu ndị yiri ndị na-adịghị agwụ agwụ.”

Bible buru amụma banyere oge mgbe a ga-enwe ụkọ nri “n’ebe dị iche iche.” Ụkọ nri ndị a, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-emenụ, dị ka agha, ala ọma jijiji, na ọrịa na-efe efe, na-egosi na Alaeze Chineke dị nso. (Luk 21:11, 31) Bible gakwara n’ihu igosi na n’okpuru Alaeze Chineke nke a dị obi ọma, a ga-enwe ụba ihe oriri maka ihe nile a kpọrọ mmadụ. “Ọtụtụ ọka [ga-adị] n’ala,” ka onye ọbụ abụ ahụ dere. “N’elu ugwu nile; mkpụrụ ya ga na-eme mkpatụ.”—Abụ Ọma 72:16.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya