Chineke Ọ̀ Na-aṅa Ntị Mgbe Ị Na-ekpe Ekpere?
ONYE isi ụlọ ọrụ na-ekpebi ma ya ga-ezipụ onye ọzọ ka o meere ya ihe ma ọ bụ ma ọ ga-eji aka ya mee ya. N’otu aka ahụ, Eze Onyenwe eluigwe na ala nwere ohere ikike ikpebi ókè ọ ga-etinyeru aka n’okwu ọ bụla. Akwụkwọ nsọ na-akụzi na Chineke ahọrọwo itinye aka n’onwe ya n’ekpere anyị wee si otú a na-enye anyị ntụziaka ka anyị na-ekpegara ya ekpere.—Abụ Ọma 66:19; 69:13.
Nhọrọ Chineke n’okwu a na-ekpughe mmasị o nwere n’onwe ya n’ekpere ndị ohu ya bụ mmadụ. Kama ọ na-agaghị agba ndị ya ume ịbịakwute ya site n’echiche na nlezianya ọ bụla, ọ na-arịọ ha, sị: “Na-ekpenụ ekpere n’ewepụghị aka,” ‘na-anọgidesinụ ike n’ekpere,’ “tụkwasị Jehova ihe o nyeworo gị dị ka ibu,” “na-atụkwasịnụ [Chineke] nchegbu nile unu na-echegbu onwe unu.”—1 Ndị Tesalonaịka 5:17; Ndị Rom 12:12; Abụ Ọma 55:22; 1 Pita 5:7.
Ọ bụrụ na Chineke achọghị ilebara ekpere ndị ohu ya anya, ọ garaghị emeworị ndokwa ụzọ e si abịakwute ya ma na-agba ume iji ya na-eme ihe n’enweghị mgbochi. Mgbe ahụ, nhọrọ nke a Chineke họọrọ ime ka ndị ya nwee ike na-abịakwute ya bụ otu ihe na-enye anyị obi ike na ọ na-aṅa ntị n’ezie. Ee, ọ na-echebara ekpere nke onye ohu ya ọ bụla echiche.
Ihe a na-agaghị elefuru anya bụ eziokwu ahụ bụ na Bible kwuru hoo haa na Chineke na-aṅa ntị n’ekpere. Dị ka ihe atụ, Jọn onyeozi dere, sị: “Nkwuwa okwu ahụ nke anyị nwere n’ebe ọ nọ bụ nke a, na ọ bụrụ na anyị arịọ ihe ọ bụla dị ka ọchịchọ ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.” (1 Jọn 5:14) Eze Devid zoro aka n’ebe Jehova Chineke nọ dị ka “Onye na-anụ ekpere” ma jiri obi ike kwuo, sị: “Ọ ga-anụkwa olu m.”—Abụ Ọma 55:17; 65:2.
Ya mere ebe ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na omume nke ikpe ekpere bara uru n’onwe ya, Akwụkwọ nsọ na-egosi na ọ dị ọtụtụ ihe ọ gụnyere mgbe onye ezi omume na-ekpe ekpere. Ọ dị onye na-aṅa ntị. Onye ahụ na-aṅa ntị bụ Chineke.—Jemes 5:16-18.
Ekpere Ndị A Nụrụ
Bible jupụtara n’ihe ndekọ nke ndị Chineke nụrụ ekpere ha n’ezie ma zaakwa. Ahụmahụ ha na-emesi ya ike n’ụzọ doro anya na abamuru nke ekpere karịrị mmetụta na-agwọ ọrịa nke inyocha na ikwupụta echiche mmadụ. Ha karịrị mgbalị ndị mmadụ na-eme n’onwe ya n’ikwekọ n’ekpere ya.
Dị ka ihe atụ, mgbe o chere atụmatụ Absalọm nke iweghara ọchịchị Israel ihu, Eze Devid kpere ekpere, sị: “Biko, Jehova, mee ka ịdụ ọdụ Ahitofel [onye ndụmọdụ Absalọm] ghọọ ihe nzuzu.” Nke ahụ abụghị obere arịrịọ, ebe ọ bụ na ‘ndụmọdụ Ahitofel dị ka a ga-asị na a jụrụ n’okwu Chineke. Otú a ka ịdụ ọdụ nile nke Ahitofel dị.’ Absalọm mesịrị jụ ịnara ụkpụrụ Ahitofel tụrụ n’aro maka ịkwatu Eze Devid n’ọchịchị. N’ihi gịnị? “Jehova nyere iwu imebi ezi ịdụ ọdụ nke Ahitofel, ka Jehova wee mee ka ihe ọjọọ bịakwasị Absalọm.” N’ụzọ doro anya, a nụrụ ekpere Devid.—2 Samuel 15:31; 16:23; 17:14.
N’otu aka ahụ, mgbe Hezekaịa kpekuru Chineke ekpere maka nnapụta pụọ n’ọrịa ya nke na-ekweghị ala ala, ọ gbakere. Nke a ọ̀ bụ n’ihi abamuru ọnọdụ uche nye Hezekaịa dị ka ihe na-esi n’ekpere o kpere pụta? N’ezie ọ dịghị otú ahụ ma ọlị! Ozi Jehova zijeere Hezekaịa, dị ka Aịsaịa onye amụma kwupụtara, bụ: “Anụwo m ekpere gị, ahụwo m anya mmiri gị: lee, m na-eme ka ahụ gị dị ike.”—2 Ndị Eze 20:1-6.
Daniel, onye a zara ekpere ya mgbe oge gara karịa ka ọ tụrụ anya ya, bụ onye mmụọ ozi Jehova mesiri obi ike, sị: “A nụrụ okwu gị nile.” A zara ekpere nke ndị ọzọ, ndị dị ka nke Hana, ndị na-eso ụzọ Jisọs, na onye ọchịagha bụ Kọniliọs, n’ụzọ ndị na-apụghị iwetara ikike mmadụ nanị otuto. Ya mere, n’ụzọ doro anya Bible na-akụzi na Chineke na-anara, na-anụ, ma na-aza ekpere ndị e kpere n’ụzọ kwekọrọ n’uche Chineke.—Daniel 10:2-14; 1 Samuel 1:1-20; Ọrụ 4:24-31; 10:1-7.
Ma olee ụzọ Chineke si aza ekpere ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi taa?
Ọzịza Ndị A Zara Ekpere
A zara ekpere ndị ahụ e kwuru okwu ha n’elu n’ụzọ na-akpali akpali na n’ụzọ ọrụ ebube. Otú ọ dị, biko buru n’uche na ọbụna n’oge Bible, ọzịza ndị a na-aza ekpere abụchaghị ndị dị mfe ịchọpụta. Nke a bụ n’ihi na ha metụtara inye ike ime omume ọma na inye nghọta, na-eme ka ndị ohu Chineke nwee ike ịnọgide n’ụzọ ezi omume. Karịsịa nye ndị Kraịst, ọzịza a na-aza ekpere metụtara okwu ndị bụ ihe ime mmụọ n’ụzọ bụ isi, ọ bụghị ihe omume ndị na-adọrọ mmasị ma ọ bụ dị ike.—Ndị Kọlọsi 1:9.
Ya mere, enwela nkụda mmụọ ma ọ bụrụ na a dịghị aza ekpere gị mgbe nile n’ụzọ ị tụrụ anya ma ọ bụ chọọ. Dị ka ihe atụ, kama iwepụ ọnwụnwa, Chineke pụrụ ịhọrọ inye gị “ọkịka nke ike” iji nagide ya. (2 Ndị Kọrint 4:7; 2 Timoti 4:17) Ka ọ ghara inwe mgbe ọ bụla anyị ga-eleda abamuru nke ike dị otú ahụ anya, anyị ekwesịghịkwa ikwubi na n’ezie Jehova azaghị ekpere anyị ma ọlị.
Tụlee ihe mere n’ọnọdụ nke Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst. Ná nchegbu ọ na-echegbu onwe ya ka ọ ghara ịnwụ dị ka a ga-asị na ọ bụ onye nkwulu, Jisọs kpere ekpere, sị: “Nna, ọ bụrụ na ọ dị gị mma, nara m iko a.” Chineke ọ̀ zara ekpere nke a? Ee, dị ka e mere ka ọ pụta ìhè ná Ndị Hibru 5:7. Jehova emeghị ka Ọkpara ya ghara ịnwụ n’elu osisi ịta ahụhụ. Kama nke ahụ, ‘mmụọ ozi si n’eluigwe bịa, na-enye ya ike.’—Luk 22:42, 43.
Nke ahụ ọ̀ bụ ịza ekpere n’ụzọ na-akpali akpali na n’ụzọ ọrụ ebube? Nye onye ọ bụla n’ime anyị, ọ ga-abụ! Ma nye Jehova Chineke, bụ́ ebe ike dị otú ahụ si bịa, nke a abụghị ọrụ ebube ọ bụla. Jisọs matakwara, site ná ndụ ọ dịburu n’eluigwe, banyere oge ndị gara aga mgbe ndị mmụọ ozi mere ka ndị mmadụ hụ ha anya. Ya mere mpụta nke mmụọ ozi agaghị enwe mmetụta na-akpali akpali n’ebe ọ nọ dị ka ọ ga-enwe n’ebe anyị nọ. Otú o sina dị, mmụọ ozi nke a, onye o doro anya na Jisọs maara n’onwe ya n’ọdịdị ya tupu ọ ghọọ mmadụ, nyere aka ịgba Ya ume maka ọnwụnwa nke ọ gaje izute.
N’ịza ekpere nke ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi taa, Jehova nọgidere na-enye ume dị mkpa iji nwee ntachi obi. Nkwado nke a pụrụ ịbịa n’ụdị agbamume site n’aka ndị ofufe ibe anyị bụ́ ndị anyị na ha na-akpakọrịta. Ọ̀ dị onye ọ bụla n’ime anyị ga-ajụ ịnara agbamume ahụ, ma eleghị anya na-ekwubi na ebe ọ bụ na ndị ohu ibe anyị enwetabeghị ọnwụnwa yiri nke anyị na-enwe, ha anọghị n’ọnọdụ ịgba anyị ume? Jisọs gaara enweworị nnọọ echiche dị otú ahụ n’ebe mmụọ ozi ahụ bịakwutere ya nọ. Kama nke ahụ, ọ nakweere agbamume ahụ dị ka ọzịza Jehova zara ekpere ya wee si otú a nwee ike imezu uche Nna ya n’ikwesị ntụkwasị obi. Anyị onwe anyị ga-achọkwa iji obi ọma nakwere ume nke Chineke na-enye n’ịza ekpere anyị. Chetakwa, na oge ndị ahụ ọ dị mkpa iji ndidi tachie obi na-abụkarị ndị ọtụtụ ngọzi na-esochi.—Eklisiastis 11:6; Jemes 5:11.
Nwee Obi Ike na Chineke Na-aṅa Ntị
Ya adịla mgbe obi na-agaghị esi gị ike n’ịdị irè nke ekpere ma ọ bụrụ na a zaghị ekpere gị ozugbo. Azịza nye ekpere ụfọdụ, ndị dị ka ndị ahụ metụtara nnapụta onwe onye pụọ ná mkpagbu ma ọ bụ inwetakwu ibu ọrụ n’ozi mmadụ na-ejere Chineke, pụrụ ichere ruo oge Chineke maara na o ziri ezi ma kasị mma. (Luk 18:7, 8; 1 Pita 5:6) Ọ bụrụ na ị na-ekpe ekpere banyere ihe na-ewetara gị nchegbu dị omimi, gosi Chineke site ná nnọgidesi ike gị na ọchịchọ gị siri ike, na ebumnuche gị dị ọcha ma zie ezi. Jekọb gosipụtara mmụọ nke a mgbe, ka ya na otu mmụọ ozi gbatere mgba aka, ọ sịrị: “M gaghị aha gị ka ị laa, ma ọ bụrụ na ị gọzighị m.” (Jenesis 32:24-32) Anyị aghaghị inwe obi ike yiri nke ahụ na ọ bụrụ na anyị anọgide na-arịọ, anyị ga-anata ngọzi mgbe oge ya ruru.—Luk 11:9.
Otu ihe ọzọ a na-agaghị echefu. Ịbụ onye Ọkaaka eluigwe na ala nụrụ ekpere ya bụ ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa. N’iburu nke a n’uche, ànyị na-eji nlezianya aṅa ntị mgbe Jehova Chineke, site n’Okwu ya, na-agwa anyị okwu banyere ihe ndị ọ chọrọ anyị n’aka? Ka ekpere anyị na-eme ka anyị bịaruo Onye Okike anyị nso karị, anyị ga-achọ ilebara ihe nile o nwere ịgwa anyị anya n’ụzọ dị mkpa.
[Foto dị na peeji nke 6]
Chineke na-aṅa ntị n’ekpere. Ànyị na-aṅa ya ntị site n’Okwu ya?