Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 9/15 p. 3-4
  • Ị̀ Na-agbaghara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-agbaghara?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbaghara Bụ Ihe Ịma Aka
  • ‘Werenụ Amara Na-agbaghara Onwe Unu’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Gbaghara Site n’Obi Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Na-agbagharanụ Ibe Unu Kpamkpam
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • N’ihi Gịnị Ka Ị Ga-eji Na-agbaghara Mmehie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 9/15 p. 3-4

Ị̀ Na-agbaghara?

BILL na nwa ya nwanyị dị afọ 16, bụ́ Lisa, nwere ihe isi ike ibi n’udo. Ụmụ obere nghọtahie dị n’etiti ha na-etokarị gaa n’itirịta mkpu. N’ikpeazụ, ọnọdụ ahụ erughị ala ahụ rịrị elu ruo n’ókè nke na a gwara Lisa ka ọ hapụ ụlọ ahụ.a

Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, Lisa bịara ghọta na ọ bụ ya ka ụta dịịrị ma chọọ ka nna ya gbaghara ya. Ma kama ileghara njehie ndị Lisa mere n’oge gara aga anya, nna ya nke nwere obi ilu jụrụ mgbalị ndị o mere ime udo. Leenụ! Ọ dịghị njikere imere nwa ya nwanyị ebere!

Ọtụtụ narị afọ gara aga a mara otu nwoke ikpe ọnwụ maka mpụ ọ na-emeghị. Ndị àmà gbara akaebe ụgha, ndị ọchịchị kwa maara ụma ghara ime ihe n’ikpe ziri ezi. Nwoke ahụ aka ya dị ọcha bụ Jisọs Kraịst. Ntakịrị oge tupu ya anwụọ, ọ rịọrọ Chineke n’ekpere, sị: “Nna, gbaghara ha; n’ihi na ha amataghị ihe ha na-eme.”​—⁠Luk 23:34.

Jisọs weere amara gbaghara, site n’obi ya, a gbakwara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha ṅomie ya n’akụkụ a. (Ndị Efesọs 4:32) Otú ọ dị, dị ka Bill, ọtụtụ n’ụzọ obi ịta mmiri adịghị njikere ịgbaghara. Olee otú i si na-eme n’akụkụ nke a? Ị̀ dị njikere ịgbaghara ndị ọzọ mgbe ha mehiere megide gị? Gịnịkwa banyere mmehie ndị siri ike? À ga-agbagharakwa ndị a?

Mgbaghara Bụ Ihe Ịma Aka

Inye mgbaghara abụghị ihe dị mfe mgbe nile. N’oge nke a dịkwa oké egwu, mmekọrịta ụmụ mmadụ aghọwo ihe na-enye nsogbu karị. Nchekasị na nrụgide na-ejupụtakarị ná ndụ ezinụlọ karịsịa. Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi kwuru ogologo oge gara aga na ụdị ọnọdụ ndị ahụ ga-adị na “mgbe ikpeazụ.” O kwuru, sị: “Mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, . . . ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fụliworo elu.”​—⁠2 Timoti 3:​1-⁠4.

Ya mere, anyị nile na-echerịrị nrụgide na-esi n’ebe ndị ọzọ nọ ihu, bụ́ nke na-ele ikike anyị nwere ịgbaghara ndị ọzọ ule. Tụkwasị na nke ahụ, anyị na-agbasokwa nrụgide dị anyị n’ime mgba. Pọl kwara arịrị, sị: “Ezi ihe nke m na-achọ ka m na-emeghị: kama ihe ọjọọ nke m na-achọghị, ihe ahụ ka m na-eme. Ma ọ bụrụ na ihe m na-achọghị, ihe ahụ ka m na-eme, ọ bụghị mụ onwe m na-arụtakwa ya ọzọ, kama ọ bụ ihe ahụ nke na-ebi n’ime m, bụ́ mmehie.” (Ndị Rom 7:​19, 20) Dị ka ihe na-esi na nke a pụta, ọtụtụ n’ime anyị adịghị agbaghara dị ka ọ ga-amasị anyị ime. E kwuwerị, ezughị okè e ketara eketa na mmehie na-enwe mmetụta siri ike n’ahụ anyị nile, mgbe ụfọdụ na-anapụ anyị ọmịiko n’ebe mmadụ ibe anyị nọ.

Mgbe a gbara ya ume ka ọ gbaghara onye ọzọ maka obere mmejọ e mere, otu nwanyị zaghachiri: “Ọ dịghị onye ruru eru itinyere mgbalị ọ na-ewe ịgbaghara mmehie.” E lee ya anya elu elu, ụdị okwu dị otú ahụ pụrụ iyi ihe na-egosi enweghị mmetụta, obi ọjọọ, ọbụna inwe echiche na-ezighị ezi banyere ndị ọzọ. Otú ọ dị, e lebamie ya anya, anyị na-ahụ na ọ na-ekpughe nkụda mmụọ nke ọtụtụ ndị mmadụ na-enwe mmetụta ya mgbe ha na-eche ụwa nke ha na-ele anya dị ka nke na-achọ ọdịmma onwe onye nanị, nke na-adịghị echebara mmadụ echiche, na nke dị obi ọjọọ ihu. Otu nwoke kwuru, sị: “Ndị mmadụ na-eji gị eme ihe ha chọrọ mgbe ị gbaghaara ha. Ọ dị nnọọ ka ime gị dị ka ị bụ onye nzuzu.”

Mgbe ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na ịzụlite àgwà nke ịgbaghara mmadụ siri ike na mgbe ikpeazụ ndị a. Ma, Bible na-agba anyị ume iji obi ọma na-agbaghara. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 2:7.) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji na-agbaghara?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a A gbanwewo aha ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya