Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w08 4/1 p. 30
  • Ị̀ Maara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • N’Ụlọ Nzukọ Ndị Juu Dị na Nazaret
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Site n’Akwụkwọ Mpịakọta Gaa na Codex Otú Bible Si Dịrị n’Ụdị Akwụkwọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • N’Ụlọ Nzukọ Dị n’Obodo Jisọs
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Imeghe Anya Nye Ozi Ọma Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
w08 4/1 p. 30

Ị̀ Maara?

Olee ihe mere Jizọs ji jiri nwayọọ nwayọọ gwọọ onye ìsì?

Mak 8:22-26 kọọrọ anyị na Jizọs gwọrọ otu onye ìsì na Betseida. Ebe ahụ kwuru na Jizọs bu ụzọ gbụsa nwoke ahụ ọnụ mmiri n’anya wee jụọ ya ma ò nwere ihe ọ na-ahụ. Ihe nwoke ahụ zara gosiri na ọ ka nọ ná mgbagwoju anya. Ọ sịrị: “Ana m ahụ ndị mmadụ, n’ihi na ana m ahụ ihe yigasịrị osisi, ma ha na-ejegharị ejegharị.” Jizọs wee bitụ nwoke ahụ aka n’anya ọzọ. Lee ihe mere mgbe o mere nke ahụ: “Nwoke ahụ wee hụwa ụzọ nke ọma, e wee gwọọ ya, o wee na-ahụ ihe niile nke ọma.” O doro anya na Jizọs ji nwayọọ nwayọọ gwọọ nwoke ahụ. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?

Baịbụl azaghị ajụjụ ahụ kpọmkwem, ma anyị nwere ike ịtụle ihe mere o ji mee nke a. Nwoke ahụ ịmalite ịhụ ụzọ ná mberede kemgbe ọtụtụ afọ o kpuru ìsì, ma ọ bụ kemgbe a mụrụ ya, agaghị abụrụ ya obere ihe. Dị ka ihe atụ: O nwere mgbe a na-eji ịnyịnya arụ ọrụ n’ebe a na-egwupụta ihe n’ime ime ala. Ịnọ n’ọchịchịrị maara ha ahụ́ nke na mgbe a kpọpụtara ha n’elu ala, o were ha ihe ruru otu ụbọchị tupu ha ahụwa ụzọ n’ebe ìhè dị. Ọ ga-aka esiri onye kpuru ìsì ike ma ọ malite ịhụ ụzọ. N’oge anyị a, e nweela mgbe ndị dọkịta na-awa anya doziri nsogbu ụfọdụ ndị kpuru ìsì nwere n’anya, ha wee malite ịhụ ụzọ. Ma, ọtụtụ mgbe, ọ na-esiri ndị ahụ ha gwọrọ ike n’ihi na anya ha na-ezitere ụbụrụ ha ozi karịrị akarị. Ha na-anọ ná mgbagwoju anya, ha anaghịkwa amata ihe ndị ha maara na mbụ, n’ihi ihe dị iche iche jupụtara n’ụwa ndị anya ha na-ahụ. Ka oge na-aga, ụbụrụ ha na-amalite ịmata ihe anya ha na-ahụ.

Ọ ga-abụ ịhụnanya Jizọs nwere n’ebe nwoke ahụ nọ mere o ji jiri nwayọọ nwayọọ gwọọ ya. N’ikpeazụ, nwoke ahụ malitere ‘ịhụ ihe niile nke ọma,’ ghọtawa ihe niile ọ na-ahụ.

Gịnị mere ịgụ akwụkwọ mpịakọta ji esi ike n’oge Jizọs?

Ibé akwụkwọ a na-eji eme akwụkwọ mpịakọta na-adịkarị n’agbata sentimita iri abụọ na atọ na sentimita iri abụọ na asatọ n’ogologo, nakwa n’agbata sentimita iri na ise na sentimita iri abụọ na atọ n’obosara. A na-anyakọta ọtụtụ n’ime ha ọnụ ma ọ bụkwanụ jiri eri linin dụkọta ha. Mgbe ụfọdụ, ọ bụ ibé akwụkwọ ndị dị ogologo ka a na-eji eme ya. Akwụkwọ Mpịakọta Aịzaya nke A Hụrụ n’Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ dị ibé iri na asaa, ha niile dị ihe dị ka mita asaa n’ogologo ugbu a. Ọ ga-abụ na akwụkwọ mpịakọta Aịzaya nke Jizọs gụrụ n’ụlọ nzukọ dị na Nazaret hà ka nke a n’ogologo.—Luk 4:16, 17.

Alan Millard dere banyere nke a n’akwụkwọ ya bụ́ Discoveries From the Time of Jesus, sị: “Onye chọrọ ịgụ akwụkwọ [mpịakọta] ahụ na-eji aka abụọ buru ya, were aka ekpe ya na-afụghe ya, ebe mmalite ya na-adị n’aka nri ya, ya na-agụ ya n’ahịrị n’ahịrị, ya ana-afụchi ya. Tupu Jizọs eruo n’Aịzaya isi nke iri isii na otu, bụ́ ebe ọ gụrụ n’ụlọ nzukọ, ọ ghaghị ịbụ na ọ fọrọ obere ka ọ fughechaa akwụkwọ mpịakọta ahụ ma fụchie ebe ndị ọ fụghere.”

N’oge ahụ, akwụkwọ Aịzaya enwebeghị isi na amaokwu dị ka o nwere taa. Mgbe e bunyere Jizọs akwụkwọ mpịakọta n’ụlọ nzukọ dị na Nazaret, ọ chọtara ebe bụ́ Aịzaya 61:1, 2 na Baịbụl anyị ugbu a. O sighịrị Jizọs ike ‘ịchọta ebe’ ahụ, nke na-egosi na ọ maara Okwu Chineke nke ọma.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya