Nkà Mmụta Ọdịdị Ụwa nke Bible Ò Ziri Ezi?
ANYANWỤ ka dasịrị na Palestine. Afọ ahụ bụ 1799. Mgbe ụbọchị na-ekpo ọkụ nke ịzọ ije gasịrị, Ndị Agha France amawo ụlọikwuu ha, Napoléon, bụ́ ọchịagha bụ isi, na-ezu ike n’ụlọntụ ya. Site ná ntakịrị nnwupụta ìhè nke ọkụ kandụl, otu onye n’ime ndị ohu ya na-agụpụta ihe site na Bible dị n’asụsụ French n’ụzọ na-ada ụda.
O doro anya na nke a mere ọtụtụ mgbe n’oge obubu agha Napoléon na Palestine. “Mgbe a na-ama ụlọikwuu ná mkpọmkpọ ebe nke obodo ochie ndị ahụ,” ka o mesịrị cheta n’ihe ndekọ nke akụkọ ndụ ya, “ha na-agụ Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ dara ụda n’uhuruchi ọ bụla . . . myirita na eziokwu nke nkọwa ya nile na-akpali mmasị: ha ka kwekọrọ ná mba a mgbe ọtụtụ narị afọ na mgbanwe dị iche iche gasịrị.”
N’ezie, ndị na-eme njem n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa na-ahụ ya dị ka ihe dị mfe ijikọ ihe omume dị iche iche nke Bible na ókèala ndị e nwere n’oge a. Tupu Ndị Agha France emerie Ijipt, ndị mba ọzọ maara ihe dị ntakịrị banyere ala ochie ahụ. Mgbe ahụ ndị ọkà mmụta sayensị na ndị mmụta Napoléon kpọtaworo n’Ijipt malitere ikpughere ụwa akụkụ dị iche iche nke ebube mbụ nke Ijipt. Nke a emewo ka ọ dị mfe karị iji anya nke uche hụ ‘ohu siri ike’ nke ndị Israel nọ n’okpuru ya.—Ọpụpụ 1:13, 14.
N’abali nke mgbapụta site n’aka Ijipt, ndị Israel zukọrọ na Rameses wee bulie ije gaa “ná nsọtụ ọzara.” (Ọpụpụ 12:37; 13:20) N’ebe a, Chineke nyere ha iwu ka ha “chigharịa” ma ‘maa ụlọikwu n’akụkụ oké osimiri.’ E lere omume a dị ịtụnanya anya dị ka ‘ịtụhị ha n’ala,’ eze Ijipt zọliri njem ya na ndị agha ya na 600 ụgbọ ala iji jideghachi ndị ohu ya mbụ.—Ọpụpụ 14:1-9.
Ọpụpụ Ahụ
Dị ka Josephus, bụ́ onye ọkọ akụkọ ihe mere eme nke narị afọ mbụ O.A. si kwuo, ndị agha Ijipt chụbara ndị Israel “ebe dị warawara” ma gechibido ha “n’etiti akụkụ ndagwurugwu kpọdara n’ike bụ́ ndị siri ike iru na ha na osimiri ahụ.” Taa, a maghị n’ezie kpọmkwem ebe ndị Israel si gafere Osimiri Uhie ahụ. Otú ọ dị, ọ dị mfe iji anya nke uche hụ ihe omume ahụ site n’ọnụ ọnụ nke ugwu na-elepụ anya ná ngwụsị ebe ugwu nke Osimiri Uhie ahụ. Ọ bụ ihe obi ụtọ na a kpọrọ ugwu ahụ Jebel ʽAtaqah, nke pụtara “Ugwu nke Mgbapụta.” N’etiti ugwu a na Osimiri Uhie ahụ e nwere ntakịrị mbara ala nke ruru n’ebe obere ugwu fọrọ nke nta ka ọ banye n’ime osimiri. N’akụkụ nke Osimiri Uhie ahụ chere ya ihu e nwere ọdọ mmiri nke nwere ọtụtụ isi iyi, bụ́ nke a kpọrọ ʽAyun Musa, nke pụtara “olulu mmiri Mosis.” Ala mmiri dị n’agbata ebe abụọ ahụ gbadara nwayọọ nwayọọ, ma n’ebe ndị ọzọ ọ kpọdara dị ka olulu nke omimi ya dị n’agbata 30 na 60 amaụkwụ.
Ndị ọkà mmụta okpukpe nke Krisendọm n’enweghị okwukwe anwawo ịkatọ ọrụ ebube ahụ Chineke mere mgbe o kewara mmiri nke Osimiri Uhie ahụ ụzọ abụọ wee mee ka ndị Israel lanarị site n’ala akọrọ. Ha welara ihe omume ahụ n’akụkụ ọzọ n’ebe ala dị mmiri mmiri na-adịghị omimi ma ọ bụ ebe ugwu nke Osimiri Uhie ahụ. Ma nke ahụ ekwekọghị na ndekọ nke Bible, bụ́ nke kwuru ọtụtụ mgbe na ngafe ahụ weere ọnọdụ n’Osimiri Uhie ahụ n’ebe e nwere mmiri ga-ezu iri Fero na ndị agha ya nile, ee, ilokọrọ ha.—Ọpụpụ 14:26-31; Abụ Ọma 136:13-15; Ndị Hibru 11:29.
Ọzara Saịnaị
E gosipụtara ọnọdụ siri oké ike nke a hụtara n’Ala Saịnaị Mmiri Gbara Gburugburu n’ụzọ pụtara ìhè n’ihe ndekọ Bible nke mwagharị ndị Israel. (Deuterọnọmi 8:15) Ya mere, otu mba dum hà pụrụ izukọ n’ala ala Ugwu Saịnaị iji nata Iwu Chineke ma mesịa si ebe ahụ pụọ iji guzoro “n’ebe dị anya”? (Ọpụpụ 19:1, 2: 20:18) È nwere ebe dị obosara n’ụzọ zuru ezu iji nye ohere maka ụdị ngagharị nke ìgwè mmadụ ndị e mere atụmatụ iru nde atọ n’ọnụ ọgụgụ?
Onye na-eme njem na narị afọ nke 19 na ọkà mmụta Bible, bụ́ Arthur Stanley, jere leta akụkụ Ugwu Saịnịa ma kọwaa ihe ndị òtù ya hụrụ mgbe ha rịgooro Ras Safsafa: “Mmetụta o nwere n’ebe anyị nọ, dịkwa ka ọ dị n’ebe onye ọ bụla nke hụrụ ma kọwaa ya, bịara n’egbughị oge. . . . N’ebe a bụ mbara ala miri emi ma dị obosara nke na-acha edo edo, na-agbada n’ala ala nke obere ugwu . . . Ọ bụrụ na a tụlee ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ enweghị ụdị ihe ndị jikọrọ mbara ala na ugwu n’ógbè a, ọ bụ nnọọ n’ezie ihe àmà dị mkpa n’eziokwu nke akụkọ ahụ, na a pụrụ ịhụ otu ụdị njikọ ahụ, na nke ahụ bụkwa gburugburu ebe Saịnaị a ma ama.”
Ala Nkwa Ahụ
N’afọ nke 40 nke mwagharị ndị Israel wagharịrị n’ọzara, Mosis nyere nkọwa a nke ihe e ji mara ala ahụ ha na-ejike ịbanye: “Jehova, bụ́ Chineke gị, na-eme ka ị baa n’ezi ala, bụ́ ala iyi mmiri, na nke isi iyi na ogbu mmiri, na-apụta ná ndagwurugwu na n’ugwu.”—Deuterọnọmi 8:7.
A hụrụ izi ezi nke nkwa nke a n’oge na-adịghị anya mgbe mba ahụ nile zukọtara ọnụ—ndị ikom, ndị inyom, ụmụaka, na ndị ọbịa—ná ndagwurugwu mmiri jupụtara nke Shekem n’agbata Ugwu Ebal na Ugwu Geraịzim. Ebo isii guzo n’ala ala nke Ugwu Geraịzim. Ebo isii ndị ọzọ zukọrọ n’akụkụ ndagwurugwu nke ọzọ chere ya ihu n’ala ala nke Ugwu Ebal ịnụ ngọzi Chineke nile nke mba ahụ ga-enweta ma ọ bụrụ na ha erube isi n’Iwu Jehova na ọbụbụ ọnụ ndị ga-abịanụ ma ọ bụrụ na ha edebeghị Iwu Chineke. (Joshua 8:33-35) Ma è nwere oghere zuru ezu maka mba nke a ịbanye n’ime ndagwurugwu nke a dị warawara? Oleekwa otú ha nile si nụ ihe a na-ekwu n’enweghị ígwè ọgbara ọhụrụ ndị na-eme ka ụda olu dịwanye ukwuu?
Jehova Chineke pụrụ imeworị ka ụda olu ndị Livaị daa ụda karị n’ụzọ ọrụ ebube. Otú ọ dị, ụdị ọrụ ebube dị otú ahụ eyighị ka ọ dị mkpa. Ọnọdụ nke ime ka ụda pụta nke ọma ná ndagwurugwu a dị mma nke ukwuu. “Ndị nile na-eme njem,” ka onye ọkà mmụta Bible na narị afọ nke 19 bụ́ Alfred Edersheim dere, “kwenyere n’ihe abụọ: 1. Na a pụghị inwe ihe isi ike ọ bụla n’ịnụ n’ụzọ pụtara ìhè ihe ọ bụla nke e kwuru ma site n’Ebal ma site na Geraịzim na ndagwurugwu ahụ. 2. Na ugwu abụọ ndị a nyere ebe zuru ezu a ga-eguzo ọtọ maka ndị Isael nile.”
Onye ọkà mmụta ọzọ nke Bible na narị afọ 19, bụ́ William Thomsom, kọwara ahụmahụ ya na ndagwurugwu ahụ n’akwụkwọ ya bụ́ The Land and the Book, sị: “Etiwo m mkpu ka m nụ ndaghachi nke ụda olu m, ma mgbe ahụ chee n’echiche otú ọ na-aghaghị ịdịworị mgbe ndị Livaị nwere ụda olu dị elu kwupụtara . . . ‘Onye a na-abụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ nke na-eme arụsị a pịrị apị, bụ́ ihe arụ nke Jehova.’ Nakwa mgbe a zara AMEN! dị ukwuu nke dara ụda okpukpu iri, site ná mkpọkọta ahụ dị ukwuu, na-ebili, na-agbasa, na-adaghachikwa ọzọ site n’Ebal ruo Geraịzim, nakwa site na Geraịzim ruo Ebal.”—Tụlee Deuterọnọmi 27:11-15.
Ndagwurugwu Jezreel
N’ebe ugwu nke Shekem ka e nwekwara ndagwurugwu ọzọ na-eme nri, nke na-agbago site n’ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị ala nke elu osimiri ma saghepụ na mbara ala buru ibu. A na-akpọ ógbè a nile Ndagwurugwu Jezreel, nke a gụrụ aha n’ihi obodo Jezreel. N’ebe ugwu nke Ndagwurugwu ahụ e nwere obere ugwu ndị nke Galili, bụ́ ebe Nazaret, bụ́ obodo a mụrụ Jisọs dị. “Nazaret,” ka George Smith kọwara n’akwụkwọ ya bụ The Historical Geography of the holy Land, “dị na ndagwurugwu buru ibu nke dị n’etiti obere ugwu ndị ahụ; ma ngwa ngwa ị rịgooro n’ọnụ ọnụ nke ndagwurugwu nke a, . . . lee ụdị ihe ndị ị ga-ahụ! [Ndagwurugwu Jezreel] na-eche gị ihu, ya na ọ́gbọ̀ agha ya . . . Ọ bụ map nke akụkọ ihe mere eme nke Agba Ochie.”
N’ala ndagwurugwu a, ndị ọkà n’ihe mgbe ochie ndị e gwupụtara n’ala egwupụtawo mkpọmkpọ ebe nke obodo alaeze dị iche iche nke Israel meriri n’agha n’oge Joshua, ndị dị ka, Teanak, Megido, Jọkneam, nakwa ma eleghị anya Kedesh. (Joshua 12:7, 21, 22) N’otu ógbè nke a kwa, n’oge Onyeikpe Barak na Onyeikpe Gideon, Jehova gbapụtara ndị ya site n’aka mba ndị iro karịrị ha ike n’ụzọ ọrụ ebube.—Ndị Ikpe 5:1, 19-21; 6:33; 7:22.
Ọtụtụ narị afọ mgbe nke a gasịrị, Eze Jihu gbaara ịnyịnya ya gafere ndagwurugwu ahụ gaa n’obodo Jezreel iji mezuo ihe Jehova kpere n’ikpe banyere Jezebel na ndị ụlọ Ehab dapụrụ n’ezi ofufe. Site n’ụlọ nche nke Jezreel, ọ pụrụ ịdịworị mfe ịhụ n’akụkụ ọwụwa anyanwụ, mbịarute nke ndị agha Jihu site n’ebe dị anya ruo kilomita 19. Ya mere, a gaara enweworị nnukwu oge maka Eze Jehoram iji zipụ onye ozi mbụ na nke abụọ n’azụ ịnyịnya na, n’ikpeazụ, ka Eze Jehoram nke Israel na Ahazaịa nke Juda kwadebe ụgbọ ala ha ma zute Jihu tupu ya erute obodo Jezreel. Jihu gburu Jehoram na-egbughị oge. Ahazaịa gbapụrụ ma mesịa merụọ ahụ, ọ nwụkwara na Megido. (2 Ndị Eze 9:16-27) Banyere ebe ọ́gbọ̀ agha ahụ dị ka nke dị n’elu, George Smith dere, sị: “Ọ na-akpali mmasị na e nweghị n’ime akụkọ nile ahụ . . . ihe na-agaghị ekwe omume ná nkà mmụta ọdịdị ụwa.”
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jisọs ledara anya na Ndagwurugwu Jezreel mgbe mgbe ma chemie echiche ná mmeri ndị na-akpali akpali nke werewooro ọnọdụ n’ebe ahụ, na-amara na a kara ya, bụ́ Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa, aka imezu ọrụ nke Joshua Ka Ukwuu, Barak Ka Ukwuu, Gideon Ka Ukwuu, na Jihu Ka Ukwuu n’iwepụ ọkaaka Jehova n’ụta. N’ezie, Bible ji Megido, bụ obodo kasị dịrị n’etiti n’ala ndagwurugwu ahụ mee ihe dị ka ihe iriba ama nke ebe a ga-alụ agha Chineke nke Ha–Magedọn (nke pụtara “Ugwu Megido”). Nke ahụ ga-abụ agha zuru ụwa nile ọnụ nke Jisọs Kraịst, dị ka Eze nke ndị bụ eze, ga-ebibi ndị nile bụ ndị iro Chineke na ọgbakọ ndị Kraịst, ezi ndị Chineke.—Mkpughe 16:16; 17:14.
Bible na-akọ na ndị Juu nke Nazaret iwe dị n’obi nwara n’otu mgbe ịkwada Jisọs ka ọ nwụọ site “na mpempe ugwu nke e wuru obodo ha n’elu ya.” (Luk 4:29) Ọ bụ ihe obi ụtọ na, ná ndịda ọdịda anyanwụ nke obodo oge ugbu a bụ́ Nazaret e nwere mpempe ugwu dị mita 12 ebe ihe omume a pụworo ime. Jisọs lanarịrị site n’aka ndị iro ya, Bible kwukwara, “o wee rịdata na Kapanaum.” (Luk 4:30, 31) N’ezie, Kapanaum, bụ́ nke dị n’Osimiri Galili, dị ala nke ukwuu karị.
Ihe ndị a na nkọwa ndị ọzọ miri emi emewo ka ndị ọzọ e wezụga Napoléon kwupụta ihe ijuanya n’izi ezi nke nkà mmụta ọdịdị ụwa nke Bible. “Nhota [Bible] hotara ọdịdị elu ala dị ọtụtụ, ma na-ejukwa afọ n’ozuzu ya,” ka Thomson dere n’akwụkwọ bụ́ The Land and the Book. “Ọ bụ ihe na-agaghị ekwe omume ịbụ onye na-agaghị enwe mmetụta site ná nkwekọ a nọgidere na-enwe n’etiti akụkọ ihe mere eme e dekọrọ na nkà mmụta ọdịdị ụwa nke okike ma n’Agba Ochie ma n’Agba Ọhụrụ,” ka Stanley kwuru n’akwụkwọ bụ́ Sinai and Palestine.
Izi ezi dị ịtụnanya nke Bible banyere okwu ndị metụtara nkà mmụta ọdịdị ụwa bụ nanị otu ihe àmà na ọ bụghị akwụkwọ nkịtị mmadụ chepụtara. Mbipụta atọ bu ụzọ nke Ụlọ Nche nwere isiokwu ndị yiri nke a banyere Bible. Anyị na-akpọ gị okù inweta na irite uru n’akụkụ atọ ndị ọzọ ahụ nke usoro isiokwu ndị a.
[Map dị na peeji 7]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
NDAGWURUGWU JEZREEL
Jezreel
Nazaret
Teanak
Megido
Jọkneam
Kedesh
N
OSIMIRI GALILI
OKÉ OSIMIRI
maịlụ
kilomita
5
10
10
20
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ọ dabeere na map e setara na Pictorial Archive (Near Eastern History) Est., na ụlọ ọrụ Survey of Israel
[Foto dị na peeji nke 5]
Israel natara Iwu ahụ n’Ugwu Saịnaị
[Ebe E Si Nweta Foto]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.