Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 37 p. 94-p. 95 para. 2
  • Jizọs Akpọlite Nwa Otu Nwaanyị Di Ya Nwụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs Akpọlite Nwa Otu Nwaanyị Di Ya Nwụrụ
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jisọs Ewepụ Iru Újú nke Nwanyị Di Ya Nwụrụ
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Onye Na-eme Ka Mmadụ Dị Ndụ Ọzọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Anyị Pụrụ Isi n’Ọnwụ Bilie!
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • “Ọ Pụghị Ịbụ Eziokwu!”
    Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 37 p. 94-p. 95 para. 2
Ebe Jizọs na ndịozi ya hụrụ ndị bu ozu nwa nwoke nke otu nwaanyị di ya nwụrụ na-aga ili

ISI NKE 37

Jizọs Akpọlite Nwa Otu Nwaanyị Di Ya Nwụrụ

LUK 7:11-17

  • JIZỌS AKPỌLITE MMADỤ N’ỌNWỤ N’OBODO NEN

Obere oge Jizọs gwọchara onye ahụ na-ejere otu onyeisi ndị agha ozi, Jizọs si na Kapaniọm gbadawa obodo Nen, nke dị kilomita iri atọ na abụọ ma e si Kapaniọm gawa ya. Ọ bụghị naanị ya gawara. Ndị na-eso ụzọ ya na ìgwè mmadụ so ya. O yiri ka ọ̀ bụ ná mgbede ka ha rutere ná mpụga obodo Nen. Mgbe ha ruru ebe ahụ, ha hụrụ ọtụtụ ndị Juu na-aga ili ozu. Ha si n’ime obodo buru ozu otu nwa okorobịa na-aga ka ha lie ya.

Onye kacha eru uju n’ime ha bụ nne nwa okorobịa ahụ. Ọ bụ nwaanyị di ya nwụrụ, ugbu a kwa, naanị otu mkpụrụ nwa o nwere anwụọla. Mgbe di ya nwụrụ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ya na nwa ya nwoke ọ hụrụ n’anya ka nọ. Chegodị otú nwa ya nwoke a si dịrị ya n’obi n’ihi na ọ bụ ya bụ olileanya o nwere. Ugbu a, nwa a anwụọkwala. Ònyezi ka ya na nwaanyị a ga na-anọ, ònyekwa ga na-enyere ya aka?

Mgbe Jizọs hụrụ nwaanyị a, oké mwute nwaanyị a nọ na ya na uju ọ na-eru wutere ya. Jizọs weturu obi ma gwa nwaanyị ahụ okwu mesiri ya obi ike. Ọ sịrị ya: “Kwụsị ịkwa ákwá.” Ọ bụghị naanị okwu ka Jizọs kwuru. Ọ garuru nso bitụ ihe e ji buru ozu nwa okorobịa ahụ aka. (Luk 7:13, 14) Otú o si mee ihe ahụ mere ka ndị ahụ bu ozu na ndị ha na ha so kwụsị ozugbo. Ọtụtụ ndị ga na-eche ihe ihe a o mere pụtara nakwa ihe ọ na-aga ime.

Mgbe Jizọs na-akpọnye nwata nwoke ahụ ọ kpọlitere n’ọnwụ nne ya, ìgwè mmadụ ana-ele ya anya

Gịnịkwanụ banyere ndị ahụ ha na Jizọs so, ndị hụrụla ka ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube, na-agwọkwa ọrịa dị iche iche? O nwere ike ịbụ na ha ahụtụbeghị Jizọs ka ọ kpọlitere mmadụ n’ọnwụ. Ọ bụ eziokwu na e nweela ndị a kpọlitere n’ọnwụ n’oge dị anya gara aga, ma Jizọs ọ̀ ga-emeli ụdị ihe ahụ? (1 Ndị Eze 17:17-23; 2 Ndị Eze 4:32-37) Jizọs kwuru n’olu dara ụda, sị: “Nwa okorobịa, ana m asị gị, Bilie!” (Luk 7:14) Ihe ahụ o kwuru mekwara. Nwoke ahụ nọọrọ ọdụ ma malite ikwu okwu. Ihe a tụrụ nne ya n’anya, obi abụrụkwa ya sọ aṅụrị. Jizọs kpọọrọ ya kpọnye nne ya. Nwaanyị ahụ anọghịzi naanị ya.

Mgbe ndị mmadụ hụrụ na nwa okorobịa ahụ adịla ndụ n’eziokwu, ụfọdụ malitere ito Jehova Onye Na-enye Ndụ, sị: “E mewo ka onye amụma dị ukwuu bilie n’etiti anyị.” Ndị ọzọ ghọtakwara ihe ọrụ ebube a Jizọs rụrụ pụtara. Ha sịrị: “Chineke echewo ihu ya n’ebe ndị ya nọ.” (Luk 7:16) Akụkọ banyere ihe a dị́ ịtụnanya merenụ gazuru obodo ndị dị gburugburu ebe ahụ ozugbo, ma n’obodo Jizọs bụ́ Nazaret, nke dị kilomita iri site n’ebe ahụ. Akụkọ a rutechadịrị Judia dị n’ebe ndịda.

Jọn Onye Na-eme Baptizim ka nọkwa n’ụlọ mkpọrọ. Ọ chọkwara ịma banyere ọrụ ndị Jizọs na-arụ. Ndị na-eso ụzọ Jọn kọọrọ ya banyere ọrụ ebube ndị a. Gịnị ka Jọn mere mgbe ọ nụrụ banyere ọrụ ebube ndị a?

  • Gịnị nọ na-eme ka Jizọs na-abịaru obodo Nen nso?

  • Olee otú ihe Jizọs hụrụ si metụ ya n’ahụ́, gịnịkwa ka o mere?

  • Gịnị ka ndị mmadụ mere mgbe ha hụrụ ihe Jizọs mere?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya