Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 51 p. 126-p. 127 para. 9
  • E Gburu Mmadụ n’Otu Ememme Ncheta Ọmụmụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • E Gburu Mmadụ n’Otu Ememme Ncheta Ọmụmụ
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Igbu Mmadụ n’Oge Ememe Ncheta Ọmụmụ
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ọ̀ Bụ Nnọkọ Oriri na Ọṅụṅụ Nile Na-amasị Chineke?
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • “N’oge Herọd Bụ́ Eze”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 51 p. 126-p. 127 para. 9
1. Ebe Salomi na-agba egwú n’oge Herọd na-eme ememme ncheta ọmụmụ ya; 2. Mgbe Salomi bu isi Jọn Onye Na-eme Baptizim na-ebugara Herodias

ISI NKE 51

E Gburu Mmadụ n’Otu Ememme Ncheta Ọmụmụ

MATIU 14:1-12 MAK 6:14-29 LUK 9:7-9

  • HERỌD ENYE IWU KA E GBUPỤ JỌN ONYE NA-EME BAPTIZIM ISI

Ndịozi Jizọs nọ na Galili na-ekwusa ozi ọma. Ma, onye bu ụzọ gwa ndị mmadụ banyere Jizọs enwereghị onwe ya ikwusa ozi ọma otú ahụ ha na-ekwusa. Onye ahụ bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim. Ọ ka nọ n’ụlọ mkpọrọ kemgbe ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ abụọ ugbu a.

Jọn kwuru n’ezoghị ọnụ na ọ dị njọ Eze Herọd Antipas ịkpọrọ nwunye nwanne ya nwoke bụ́ Filip lụwa. Herọd gbara nwunye mbụ ya alụkwaghịm, lụwazie Herodias. N’Iwu Mozis, bụ́ nke Herọd sịrị na ya na-eso, ndị si otú a lụọ na-akwa iko, iwu akwadoghịkwa ya. N’ihi ihe a Jọn kwuru, Herọd nyere iwu ka a tụba ya n’ụlọ mkpọrọ. Ikekwe, ọ bụ Herodias gwara ya ka ọ tụọ Jọn mkpọrọ.

Herọd amaghị ihe ọ ga-eme Jọn n’ihi na ndị mmadụ ‘weere Jọn dị ka onye amụma.’ (Matiu 14:5) Ma, Herodias anaghị eche ihe a ga-eme ya eche. O “buuru Jọn iwe n’obi.” Ọ nọdị na-achọ ihe ya ga-eme ka e gbuo ya. (Mak 6:19) N’ikpeazụ, o nwetara ohere ọ na-achọ achọ kemgbe.

Obere oge tupu e mee Ememme Ngabiga nke afọ 32, Herọd mere nnukwu ememme iji cheta ụbọchị ọmụmụ ya. Ndị niile ọkwá ha dị elu n’ọchịchị Herọd, ndị isi agha, nakwa ụmụ amaala a ma ama na Galili bịachara ememme ahụ. Mgbe a na-eme ememme ahụ, a kpọpụtara Salomi, nwa Herodias mụtaara di mbụ ya bụ́ Filip, ka ọ bịa gbaa egwú. Egwú ọ gbara tọgburu ndị bịara ememme ahụ atọgbu.

Mgbe Herọd na-egosi na obi dị ya ụtọ n’ihi otú Salomi si gbaa egwú n’oge ememme ncheta ọmụmụ ya

Egwú ahụ nwa ahụ a mụtaara Filip gbara tọrọ Herọd ezigbo ụtọ nke na ọ sịrị ya: “Rịọ m ihe ọ bụla ị chọrọ, m ga-enyekwa gị ya.” Ọ ṅụdịrị iyi, sị: “Ihe ọ bụla ị rịọrọ m, m ga-enye gị ya, ruo ọkara nke alaeze m.” Ma, tupu Salomi ekwuo ihe ọ bụla, ọ pụrụ gaa jụọ nne ya, sị: “Gịnị ka m ga-arịọ?”—Mak 6:22-24.

Ụdị ohere a ka Herodias nọ na-achọ kemgbe. Ọ zara nwa ya ozugbo, sị: “Isi Jọn onye na-eme baptizim.” Salomi egbughị oge bịaghachi gwa Herọd ihe ọ chọrọ ka o meere ya. Ọ sịrị ya: “Achọrọ m ka i bunye m isi Jọn Onye Na-eme Baptizim ozugbo n’efere dị mbadamba.”—Mak 6:24, 25.

Ihe a ọ rịọrọ wutere Herọd nke ukwuu. Mana, ndị bịara ememme ahụ nụrụ nkwa ahụ o kwere Salomi. Ọ ga-eme ya ihere ma ọ bụrụ na o mezughị nkwa ahụ o kwere n’agbanyeghị na ọ ga-eme ka o gbuo onye aka ya dị ọcha. N’ihi ya, Herọd zipụrụ ndị nche ya ka ha gaa n’ụlọ mkpọrọ gbute isi Jọn. O teghị aka ndị nche ahụ eburu isi Jọn n’efere lọghachi. Herọd bunyere ya Salomi, Salomi ebunye ya nne ya.

Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn nụrụ ihe merenụ, ha bịara buru ozu Jọn gaa lie, gazie kọọrọ Jizọs ihe merenụ.

Ka e mechara, mgbe Herọd nụrụ banyere Jizọs, na ọ na-agwọ ndị mmadụ ọrịa, na-achụpụkwa ha ndị mmụọ ọjọọ, egwu tụwara ya. Ọ nọ na-eche ma Jizọs a na-eme ihe ndị a ọ̀ bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim ‘e si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite.’ (Luk 9:7) N’ihi ya, Herọd Antipas nọ na-achọsi ike otú ọ ga-esi hụ Jizọs. Ma, ihe o kwo na-achọ ịhụ ya abụghị ka o gee ntị n’ozi ọma ya. Kama, ọ chọrọ ịhụ ya iji mara ma ihe a ya na-eche ọ̀ bụ eziokwu ka ọ bụ na ọ bụghị.

  • Gịnị mere e ji tụọ Jọn Onye Na-eme Baptizim mkpọrọ?

  • Olee otú Herodias si mechaa hụ na e gburu Jọn?

  • Mgbe Jọn nwụchara, gịnị mere Herọd Antipas ji chọwa ịhụ Jizọs?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya