Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 7/15 p. 31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gebriel Gara Hụ Meri
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • A Kwanyeere Jizọs Ùgwù Tupu A Mụọ Ya
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • A Sọpụụrụ Ya Tupu A Mụọ Ya
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Otu Mmụọ Ozi Eleta Meri
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 7/15 p. 31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Meri bụ́ onye ghọrọ nne Jisọs, ọ̀ dịrịlarị ime mgbe ọ gara leta ikwu ya bụ́ Elizabet?

Ee, ihe àmà na-egosi na ọ dịrịlarị ime.

Na Luk isi 1, anyị na-agụ nke mbụ ya banyere ntụrụ ime nke Elizabet, nwunye Zakaraịas onye nchụàjà, bụ́ onye mụrụ Jọn (Onye Na-eme Baptism). Mgbe Elizabet nọ “n’ọnwa nke isii . . . mmụọ ozi ahụ, bụ́ Gebriel” gara leta Meri ịgwa ya na ọ ga-atụrụ ime ma mụọ “Ọkpara nke Onye kachasị ihe nile elu.” (Luk 1:26, 30-33) Ma olee mgbe Meri tụụrụ ime?

Ihe ndekọ Luk gara n’ihu ịkọ na Meri ozugbo ahụ jere Juda ileta ikwu ya dị ime bụ́ Elizabet. Mgbe ụmụ nwanyị abụọ ahụ zutere, nwa ọhụrụ nọ n’afọ Elizabet (Jọn) wụliri elu. Elizabet zoro aka ‘ná mkpụrụ nke afọ Meri,’ ma kpọọ Meri “nne Onyenwe m.” (Luk 1:39-44) Ya mere nkwubi okwu ezi uche dị na ya bụ na Meri atụrụlarị ime, na ọ dị ime mgbe ọ gara ịhụ Elizabet.

Luk 1:56 na-agụ, sị: “Meri wee nọnyere ya ihe dị ka ọnwa atọ, wee laghachi n’ụlọ ya.” Amaokwu nke a adịghị enye ọgụgụ oge a kapịara ọnụ gaa n’akara ụbọchị kalenda ya kpọmkwem. Ọ na-asị “ihe dị ka ọnwa atọ,” bụ́ nke ga-apụta na Elizabet adịla ime ọnwa itoolu.

Mgbe o nyesịịrị Elizabet aka n’akụkụ ikpeazụ nke ime ya, Meri lawara n’ebe obibi ya na Nazaret. Ikekwe Meri ghọtara na ozugbo Elizabet mụrụ (Jọn), e nwere ike inwe ọtụtụ ndị ọbịa, ụfọdụ n’ime ha ọbụna ga-abụ ndị ikwu. Nke ahụ pụrụ ịbụ ihe ahụ erughị ala ma ọ bụ ọnọdụ ihere nye nwa agbọghọ na-alụbeghị di, bụ́ n’onwe ya onye dị ime. Ogologo oge hà aṅaa ka Meri dịrịla ime mgbe ọ lawara Nazaret? Ebe ọ bụ na ya na Elizabet nọrọ “ihe dị ka ọnwa atọ,” eleghị anya Meri ga-anọ n’akụkụ ikpeazụ nke ọnwa atọ ma ọ bụ mmalite nke ọnwa anọ nke ime ya mgbe ọ laghachiri Nazaret.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya