Ị̀ Ga-ekwesị Ntụkwasị Obi Dị Ka Elaịja?
“Mụ onwe m na-ezitere unu Elaịja, bụ́ onye amụma, tutu oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova abịa.”—MALAKAỊ 4:5.
1. Nsogbu dị aṅaa dapụtara mgbe Israel nọworo n’Ala Nkwa ahụ ihe dị ka afọ 500?
“ALA nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.” (Ọpụpụ 3:7, 8) Nke ahụ bụ ihe Jehova Chineke nyere ndị Israel mgbe ọ tọpụsịrị ha n’agbụ Ijipt na narị afọ nke 16 T.O.A. Ma leedị! Narị afọ ise agafewo, ugbu a kwa oké ụnwụ nri ji alaeze ebo iri nke Israel aka. O siri ike ịchọta ahịhịa ndụ ọ bụla. Ụmụ anụmanụ na-anwụ, mmiri ezobeghịkwa kemgbe afọ atọ na ọkara. (1 Ndị Eze 18:5; Luk 4:25) Gịnị kpatara ọdachi nke a?
2. Gịnị kpatara nsogbu mba Israel?
2 Ndapụ n’ezi ofufe akpatawo nsogbu a. N’imebi Iwu Chineke, Eze Ehab alụwo adaeze bụ́ Jezebel bụ onye Kenean, o kwewokwa ya ka o webata ofufe Beal n’Israel. Nke ka njọ, o wuworo chi ụgha a ebe nsọ na Sameria, bụ́ isi obodo. Leenụ, a rabawo ndị Israel n’ikwenye na ofufe Beal ga-ewetara ha ụba ihe ọkụkụ! Otú ọ dị, dị ka Jehova dọworo aka ná ntị, ha nọ ugbu a n’ihe ize ndụ nke ‘isi n’ezi ala ha laa n’iyi.’—Deuterọnọmi 7:3, 4; 11:16, 17; 1 Ndị Eze 16:30-33.
Ule Dị Ịrịba Ama nke Ịbụ Chi
3. Olee otú Elaịja onye amụma si tinye uche n’ihe bụ nnọọ nsogbu Israel?
3 Mgbe ụnwụ nri ahụ malitere, onye amụma Chineke kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Elaịja gwara Eze Ehab, sị: “Jehova, bụ́ Chineke nke Israel, na-adị ndụ, Onye m guzoworo n’ihu Ya, igirigi ma ọ bụ mmiri ozuzo agaghị adị ma ọlị n’afọ ndị a, ma ọ bụ nanị dị ka okwu m si dị.” (1 Ndị Eze 17:1) Mgbe ọ hụsịrị eziokwu dị egwu nke mkpọsa a, eze ahụ tara Elaịja ụta maka iwetara Israel mmekpa ahụ. Ma Elaịja na-aza na ọ bụ ya na ụlọ ya ka a ga-ata ụta n’ihi ndapụ n’ezi ofufe ha dị ka ndị na-efe Beal. Iji dozie ihe iseokwu ahụ, onye amụma Jehova gwara Eze Ehab ka ọ chịkọta Israel nile n’Ugwu Kamel tinyere ndị amụma 450 nke Beal na ndị amụma 400 nke ogidi dị nsọ. Ehab na ndị ọ na-achị zukọrọ n’ebe ahụ, ikekwe na-atụ anya na ihe omume ahụ ga-eweta ụkọ mmiri ozuzo ahụ ná njedebe. Ma Elaịja na-etinye uche n’ihe iseokwu ka mkpa. “Ruo ole mgbe,” ka ọ na-ajụ, “ka unu ga na-arụgharị n’etiti ụzọ abụọ ndị a? ọ bụrụ na Jehova bụ Chineke, jesoonụ Ya: ọ bụrụ Beal, jesoonụ ya.” Ndị Israel amaghị ihe ha ga-ekwu.—1 Ndị Eze 18:18-21.
4. Iji dozie ihe iseokwu nke ịbụ Chi, gịnị ka Elaịja kwuru ka e mee?
4 Ruo ọtụtụ afọ ndị Israel agbalịwo ịgwakọta ofufe Jehova na ofufe Beal. Iji dozie ihe iseokwu nke ịbụ Chi, Elaịja na-ekwu ugbu a ka a maa aka. Ọ ga-akwadebe otu nwa oké ehi maka ịchụ àjà, ndị amụma Beal ga-akwadebekwa ọzọ. Mgbe ahụ Elaịja na-asị: “Unu ga-akpọkukwa aha chi unu, ma mụ onwe m ga-akpọku aha Jehova: ọ ga-erukwa, na chi ahụ nke na-ewere ọkụ za, onye ahụ bụ Chineke.” (1 Ndị Eze 18:23, 24) Cheedị echiche ọkụ isite n’eluigwe dị ka azịza ekpere!
5. Olee otú e siri kpughee abaghị uru nke ofufe Beal?
5 Elaịja ewee gwa ndị amụma Beal ka ha malite. Ha akwadebe otu oké ehi maka ịchụ àjà ma tụkwasị ya n’elu ebe ịchụ àjà. Mgbe ahụ ha na-awụgharị gburugburu ebe ịchụ àjà ahụ, na-ekpe ekpere, sị: “Beal, za anyị.” Nke a gara n’ihu “site n’ụtụtụ wee ruo etiti ehihie.” “Werenụ oké olu kpọọ,” ka Elaịja na-akwa emo. Beal aghaghị iji ihe dị ngwa n’aka, ma ọ bụ “eleghị anya ya onwe ya na-arahụ ụra, ma ọ ga-eteta.” N’oge na-adịghị anya ndị amụma Beal malitere ime ara ara. Leedị! Ha ji daga na-ebi onwe ha, ọbara sikwa n’ọnyá ha na-agbapụta. Leekwa ụzụ dịnụ ka 450 ahụ dum ji olu ha nile na-akpọ mkpu! Ma e nweghị onye na-aza.—1 Ndị Eze 18:26-29.
6. Nkwadebe dị aṅaa ka Elaịja mere maka ule ịbụ Chi ahụ?
6 Ugbu a oge nke Elaịja ewee ruo. O wughachiri ebe ịchụ àjà Jehova, gwuo obere okokoro gburugburu ya, wee doo àjà ahụ n’usoro. Mgbe ahụ o wee wụkwasị mmiri n’elu nkụ na àjà ahụ. A na-awụkwasị nnukwu ite mmiri 12 n’elu ebe ịchụ àjà ahụ ruo mgbe obere okokoro ahụ n’onwe ya juru. Chee echiche ọnọdụ amaghị ihe ga-emenụ e nwere ka Elaịja na-ekpe ekpere, sị: “Jehova, bụ́ Chineke Abraham na Aịsak na Israel, ka a mara taa na Gị onwe gị bụ Chineke n’Israel, na mụ onwe m bụkwa ohu Gị, na ọ bụkwa n’okwu Gị ka m meworo ihe nile ndị a. Za m, Jehova, za m, ka ndị nke a wee mara na Gị onwe gị, Jehova, bụ Chineke, na Gị onwe gị echigharịwokwa obi ha ịlata.”—1 Ndị Eze 18:30-37.
7, 8. (a) Olee otú Jehova siri zaa ekpere Elaịja? (b) Gịnị ka a rụzuru site n’ihe ndị mere n’Ugwu Kamel?
7 N’azịza nye ekpere Elaịja, ‘ọkụ Jehova ewee daa site n’eluigwe ma na-eripịa ihe ọ chụrụ n’àjà, nkụ ahụ, nkume ahụ, na ájá ahụ, rachapụkwa mmiri dị n’obere okokoro ahụ.’ Ndị ahụ wee daa kpuo ihu ha n’ala ma sị: “Jehova, Ya onwe ya bụ Chineke; Jehova, Ya onwe ya bụ Chineke.” (1 Ndị Eze 18:38, 39) Ugbu a Elaịja mere ihe biri okwu. O nyere iwu, sị: “Jidenụ ndị amụma Beal; ekwela ka otu nwoke n’ime ha wepụga onwe ya.” Mgbe e gbusịrị ha na ndagwurugwu Kaịshọn, igwe ojii jupụtara n’igwe. N’ikpeazụ, oké mmiri ozuzo eweta ụkọ mmiri ozuzo ahụ ná njedebe!—1 Ndị Eze 18:40-45; tụlee Deuterọnọmi 13:1-5.
8 Lee oké ụbọchị ọ bụ! Jehova nwere mmeri n’ule a dị ịrịba ama nke ịbụ Chi. Ọzọkwa, ihe omume ndị a chigharịrị obi ọtụtụ ndị Israel lata n’ebe Chineke nọ. N’ụzọ a na n’ụzọ ndị ọzọ, Elaịja kwesịrị ntụkwasị obi dị ka onye amụma, ọ rụkwara ọrụ onye amụma n’onwe ya.
“Elaịja, Bụ́ Onye Amụma” Ọ̀ Ka Ga-abịa?
9. Gịnị ka e buru n’amụma na Malakaị 4:5, 6?
9 Ka e mesịrị, site n’ọnụ Malakaị, Chineke buru amụma, sị: “Lee, Mụ onwe m na-ezitere unu Elaịja, bụ́ onye amụma, tutu oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova abịa. Ọ ga-emekwa ka obi ndị bụ nna chigharịkwute ụmụ ha, ka obi ụmụ chigharịkwutekwa ndị bụ nna ha; ka M wee ghara ịbịa were iwezụga ka e bibie ya tigbuo ụwa.” (Malakaị 4:5, 6) Elaịja dịrị ndụ ihe dị ka afọ 500 tupu e kwuo okwu ndị ahụ. Ebe nke a bụ amụma, ndị Juu nke narị afọ mbụ O.A. nọ na-atụ anya ọbịbịa Elaịja imezu ya.—Matiu 17:10.
10. Ònye bụ Elaịja ahụ e buru n’amụma, oleekwa otú anyị si mara?
10 Mgbe ahụ, ònye bụ Elaịja nke a na-abịanụ? E kpughere onye ọ bụ mgbe Jisọs Kraịst sịrị: “Site n’ụbọchị Jọn Baptist ruo ugbu a alaeze eluigwe bụ ihe mgbaru ọsọ ndị mmadụ na-achụso, ndị na-achụsokwa ya na-ejide ya. N’ihi na ndị nile, ndị Amụma na Iwu ahụ, buru amụma ruo n’oge Jọn; ọ bụrụkwa na ị chọrọ ịnakwere ya, Ya onwe ya bụ ‘Elaịja onye e bu ụzọ kwuo na ọ ga-abịa.’” Ee, Jọn Onye Na-eme Baptism bụ onye ahụ e buru n’amụma yiri Elaịja. (Matiu 11:12-14, NW; Mak 9:11-13) Otu mmụọ ozi agwawo nna Jọn, bụ́ Zakaraịas, na Jọn ga-enwe “mmụọ na ike Elaịja,” na ọ ‘ga-edoziri Onyenwe anyị otu ndị nke a kwadebewooro Ya.’ (Luk 1:17) Baptism Jọn mere bụ ngosipụta ihu ọha nke nchegharị mmadụ chegharịrị site ná mmehie o mere megide Iwu ahụ, bụ́ nke gaje iduga ndị Juu na Kraịst. (Luk 3:3-6; Ndị Galetia 3:24) Ọrụ Jọn si otú ahụ ‘doziere Jehova ndị a kwadebeworo.’
11. Na Pentikọst, gịnị ka Pita kwuru banyere ‘ụbọchị Jehova,’ oleekwa mgbe o mere?
11 Ọrụ Jọn Onye Na-eme Baptism dị ka “Elaịja” gosiri na ‘ụbọchị Jehova’ dị nso. Pita onyeozi gosikwara ịdị nso nke ụbọchị ahụ mgbe Chineke ga-eme ihe megide ndị iro ya ma chebe ndị ya. O gosipụtara na ihe omume ọrụ ebube ndị ahụ weere ọnọdụ na Pentikọst nke 33 O.A. bụ mmezu nke amụma Joel banyere mwụpụ nke mmụọ Chineke. Pita gosiri na nke a gaje ime tupu ‘ụbọchị ahụ dị ukwuu dịkwa egwu nke Jehova.’ (Ọrụ 2:16-21; Joel 2:28-32) Ọ bụ na 70 O.A. ka Jehova mezuru Okwu ya site n’ime ka ndị agha Rom mezuo ikpe Chineke n’isi mba ahụ jụrụ Ọkpara ya.—Daniel 9:24-27; Jọn 19:15.
12. (a) Gịnị ka Pọl na Pita kwuru banyere ‘ụbọchị Jehova’ na-abịanụ? (b) Gịnị mere na ihe aghaghị ime dị ka ọrụ Elaịja gosipụtara?
12 Otú ọ dị, a ka nwere ihe ọzọ ga-eme, ma 70 O.A. gasịa. Pọl onyeozi jikọtara ọbịbịa ‘ụbọchị Jehova’ na ọnụnọ nke Jisọs Kraịst. Ọzọkwa, Pita onyeozi kwuru banyere ụbọchị ahụ n’ihe metụtara “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” ka dị n’ihu. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:1, 2; 2 Pita 3:10-13) Buru n’uche na Jọn Onye Na-eme Baptism rụrụ ọrụ yiri nke Elaịja tupu ‘ụbọchị Jehova’ abịa na 70 O.A. Ihe ndị a nile gosiri na e nwere ihe ọzọ ga-ewere ọnọdụ dị ka ọrụ Elaịja rụworo gosipụtara. Gịnị ka ọ bụ?
Ha Nwere Mmụọ Elaịja
13, 14. (a) Myirịta dị aṅaa dị n’agbata ọrụ Elaịja na nke ndị Kraịst e tere mmanụ nke oge a? (b) Gịnị ka ndị Krisendọm si n’ezi ofufe dapụ meworo?
13 Ọ bụghị nanị na ọrụ Jọn Onye Na-eme Baptism yiri ọrụ Elaịja kama ọrụ ndị Kraịst e tere mmanụ n’oge a dị oké egwu nke bu ọbịbịa nke ‘ụbọchị Jehova’ ụzọ yikwara ya. (2 Timoti 3:1-5) N’inwe mmụọ na ike Elaịja, ha bụ ndị nkwado siri ike nke ezi ofufe. Leekwa ka nke a siworo dị mkpa! Mgbe ndị ozi Kraịst nwụsịrị, e nwere ndapụ n’ezi Iso Ụzọ Kraịst, ọbụna dị ka ofufe Beal juru ebe nile n’Israel nke ụbọchị Elaịja. (2 Pita 2:1) Ndị sị na ha bụ ndị Kraịst malitere ịgwakọta Iso Ụzọ Kraịst na nkwenkwe na omume okpukpe ụgha. Dị ka ihe atụ, ha nakweere ozizi ikpere arụsị na nke Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị nke bụ na mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. (Eklisiastis 9:5, 10; Ezikiel 18:4) Ndị Krisendọm si n’ezi ofufe dapụ akwụsịwo iji aha otu ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, eme ihe. Kama nke ahụ, ha na-efe Atọ n’Ime Otu. Ha anakwerewokwa omume yiri nke Beal bụ́ ịkpọ isiala nye ihe oyiyi Jisọs na nne ya, bụ́ Meri. (Ndị Rom 1:23; 1 Jọn 5:21) Ma ọ gwụbeghị.
14 Site na narị afọ nke 19 gaa n’ihu, ndị ndú chọọchị dị iche iche nke Krisendọm malitere ikwupụta obi abụọ banyere ọtụtụ akụkụ nke Bible. Dị ka ihe atụ, ha jụrụ ihe ndekọ Jenesis banyere okike ma nakwere nchepụta evolushọn, na-akpọ ya “ihe kwekọrọ na nkà sayensị.” Nke a megidere kpọmkwem nkụzi Jisọs Kraịst na ndị ozi ya. (Matiu 19:4, 5; 1 Ndị Kọrint 15:47) Otú ọ dị, dị ka Jisọs na ụmụazụ ya nke oge mbụ, ndị Kraịst e tere mmanụ taa na-akwado ihe ndekọ Bible banyere okike.—Jenesis 1:27.
15, 16. N’ụzọ dị iche na Krisendọm, olee ndị nụworo ụtọ nke nri ime mmụọ a na-enye mgbe nile, sitekwa n’ụzọ dị aṅaa?
15 Ka ụwa banyere na “mgbe ọgwụgwụ,” ụnwụ nri ime mmụọ jidere Krisendọm. (Daniel 12:4; Emọs 8:11, 12) Ma obere ìgwè nke ndị Kraịst e tere mmanụ nụrụ ụtọ ihe oriri ime mmụọ Chineke na-enye mgbe nile “na mgbe ya,” ọbụna dị ka Jehova hụrụ na e nyere Elaịja ihe oriri n’oge ụnwụ nri nke ụbọchị ya. (Matiu 24:45; 1 Ndị Eze 17:6, 13-16) Ndị a maara n’otu mgbe dị ka Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile, ndị ohu Chineke a kwesịrị ntụkwasị obi mesịrị nata aha Akwụkwọ Nsọ kwadoro bụ́ Ndịàmà Jehova.—Aịsaịa 43:10.
16 Elaịja mezuru ihe aha ya bụ, nke pụtara “Chineke M Bụ Jehova.” Dị ka magazin e ji mara ndị ohu elu ala nke Jehova, Ụlọ Nche anọgidewo na-eji aha Chineke na-eme ihe. N’ezie, mbipụta nke abụọ ya (August 1879, Bekee) kwupụtara obi ike na magazin ahụ nwere Jehova dị ka onye nkwado ya. Magazin a na mbipụta ndị ọzọ nke Watch Tower Society na-ekpughe nkụzi ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị nke Krisendọm na ihe fọrọ na Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, ebe ha na-akwado ịbụ eziokwu nke Okwu Chineke, bụ́ Bible.—2 Timoti 3:16, 17; Mkpughe 18:1-5.
O Kwesịrị Ntụkwasị Obi n’Okpuru Ule
17, 18. Olee otú Jezebel si meghachi omume n’ogbugbu nke ndị amụma Beal, ma olee otú e si nyere Elaịja aka?
17 Mmeghachi omume ndị ụkọchukwu nye mkpughe e kpughere ha yiri nke Jezebel mgbe ọ nụrụ na Elaịja egbuwo ndị amụma Beal. O zigaara onye amụma Jehova kwesịrị ntụkwasị obi ozi, na-aṅụ iyi na ya ga-egbu ya. Nke a abụghị iyi egwu na-enweghị isi, n’ihi na Jezebel egbuworị ọtụtụ n’ime ndị amụma Chineke. N’egwu, Elaịja gbagara Bia-sheba n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ. N’ịhapụ onye na-ejere ya ozi n’ebe ahụ, ọ gakwuru n’ihu, banye n’ọzara, na-ekpe ekpere ka ya nwụọ. Ma Jehova agbahapụbeghị onye amụma ya. Otu mmụọ ozi gosiri Elaịja onwe ya iji kwadebe ya maka ogologo njem ịga Ugwu Horeb. N’ihi ya o nwetara ihe oriri maka njem ụbọchị 40 nke ihe karịrị kilomita 300. Na Horeb, Chineke gwara ya okwu mgbe ngosipụta dị ebube nke ike n’oké ifufe, ala ọma jijiji, na ọkụ gasịrị. Jehova anọghị ná ngosipụta ndị a. Ha bụ ngosipụta nke mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ọrụ ya. Mgbe ahụ Jehova gwara onye amụma ya okwu. Cheedị otú ahụmahụ a si wusie Elaịja ike. (1 Ndị Eze 19:1-12) Gịnị ma ọ bụrụ, dị ka Elaịja, na ụjọ ejidetụ anyị mgbe ndị iro nke ezi ofufe yiri anyị egwu? Ahụmahụ ya kwesịrị inyere anyị aka ịghọta na Jehova adịghị agbahapụ ndị ya.—1 Samuel 12:22.
18 Chineke mere ka o doo anya na Elaịja ka nwere ọrụ ịrụ dị ka onye amụma. Ọzọkwa, ọ bụ ezie na Elaịja chere na ọ bụ nanị ya na-efe ezi Chineke ahụ n’Israel, Jehova gosiri ya na 7,000 akpọbeghị isiala nye Beal. Mgbe ahụ Chineke zighachiri Elaịja n’ọrụ ya. (1 Ndị Eze 19:13-18) Dị ka Elaịja, ndị iro nke ezi ofufe nwere ike ịdị na-achụgharị anyị. Anyị nwere ike ịghọ ndị a na-akpagbu n’ụzọ siri ike, dị ka Jisọs buru n’amụma. (Jọn 15:17-20) Mgbe ụfọdụ, ụjọ pụrụ ijide anyị. Ma, anyị pụrụ ịdị ka Elaịja, onye nwetara mmesi obi ike Chineke ma jirizie ikwesị ntụkwasị obi nọgide n’ozi Jehova.
19. Ahụmahụ dị aṅaa ka ndị Kraịst e tere mmanụ nwere n’oge Agha Ụwa Mbụ?
19 N’ihi mkpagbu siri ike e nwere n’oge Agha Ụwa Mbụ, ụfọdụ ndị Kraịst e tere mmanụ dabara n’egwu ma kwụsị ime nkwusa. Ha hiere ụzọ n’iche na ọrụ ha n’elu ala akwụsịwo. Ma Chineke ajụghị ha. Kama nke ahụ, o ji ebere kwagide ha, ọbụna dị ka o nyere Elaịja ihe oriri. Dị ka Elaịja, ndị e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi nakweere mgbazi Chineke ma site n’ọnọdụ arụghị ọrụ pụta. Ha ghọtazịrị oké ihe ùgwù nke ikwusa ozi Alaeze ahụ.
20. Taa, ihe ùgwù dị aṅaa ka e nyere ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi dị ka Elaịja?
20 N’amụma ya banyere ọnụnọ ya, Jisọs kọwapụtara ọrụ zuru ụwa nile nke a ga-arụzu tupu ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe nke a. (Matiu 24:14) Taa, ndị Kraịst e tere mmanụ na ọtụtụ nde ndị enyi ha bụ́ ndị na-atụ anya ndụ n’elu ala paradaịs na-arụ ọrụ a. Ịrụ ọrụ nkwusa Alaeze ahụ ruo mgbe a rụzuru ya bụ ihe ùgwù e nyere nanị ndị kwesịrị ntụkwasị obi dị ka Elaịja.
Kwesị Ntụkwasị Obi Dị Ka Elaịja
21, 22. (a) Ọrụ dị aṅaa ka ndị Kraịst e tere mmanụ na-ebute ụzọ na ya taa? (b) Site n’enyemaka dị aṅaa ka a na-arụzu ọrụ nkwusa ahụ, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị mkpa?
21 N’ịnụ ọkụ n’obi yiri nke Elaịja, obere ihe fọdụrụ n’ime ezi ndị Kraịst e tere mmanụ arụwo ọrụ dịịrị ha nke ịhụ maka ihe ndị Eze ahụ e meworo ka ọ nọkwasị n’ocheeze, bụ́ Jisọs Kraịst, nwere n’ụwa. (Matiu 24:47) Eri ihe dịkwa ka afọ 60 ugbu a, Chineke anọwo na-eji ndị a e tere mmanụ ebute ụzọ n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ nke ndị o nyeworo olileanya dị ebube nke ndụ ebighị ebi n’elu ala paradaịs. (Matiu 28:19, 20) Lee ekele ọtụtụ nde ndị a pụrụ inwe na ndị e tere mmanụ ole na ole ahụ fọdụrụ ji ịnụ ọkụ n’obi na ikwesị ntụkwasị obi na-ahụ maka ibu ọrụ ha!
22 A rụzuwo ọrụ nkwusa Alaeze a site n’aka ndị mmadụ na-ezughị okè, ọ bụkwa nanị site n’ume nke Jehova na-enye ndị ji ekpere na-adabere na ya. “Elaịja bụ mmadụ yiri anyị n’ahụ ya,” ka onyeozi Jemes kwuru mgbe ọ na-ezo aka n’ihe ilereanya nke onye amụma ahụ n’ikpe ekpere iji gosi ike ekpere onye ezi omume nwere. (Jemes 5:16-18) Ọ bụghị mgbe nile ka Elaịja nọ na-ebu amụma ma ọ bụ na-arụ ọrụ ebube. O nwere otu mmetụta ahụ na adịghị ike mmadụ ndị anyị nwere, ma o jeere Chineke ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. Ebe Chineke na-enyekwara anyị aka ma na-enye anyị ume, anyị pụrụ ikwesị ntụkwasị obi dị ka Elaịja.
23. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji kwesị ntụkwasị obi, nweekwa nchekwube?
23 Anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji kwesị ntụkwasị obi, nweekwa nchekwube. Cheta na Jọn Onye Na-eme Baptism rụrụ ọrụ yiri nke Elaịja tupu ‘ụbọchị Jehova’ etiwapụ na 70 O.A. N’inwe mmụọ na ike Elaịja, ndị Kraịst e tere mmanụ arụwo otu ụdị ọrụ ahụ Chineke nyere n’ụwa nile. Nke a na-egosi n’ụzọ doro anya na oké ‘ụbọchị Jehova’ dị nso.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaghachi?
◻ Olee otú e si nwapụta ịbụ Chi nke Jehova n’Ugwu Kamel?
◻ Ònye bụ ‘Elaịja ahụ gaje ịbịa,’ gịnịkwa ka o mere?
◻ Olee otú ndị Kraịst e tere mmanụ nke oge a siworo gosi na ha nwere mmụọ Elaịja?
◻ N’ihi gịnị ka o ji kwe anyị omume ikwesị ntụkwasị obi dị ka Elaịja?
[Igbe dị na peeji nke 15]
Olee Eluigwe nke Elaịja Rịgoro?
“O RUO na, mgbe [Elaịja na Elaịsha] nọ na-eje, na-eje ije na-ekwukwa okwu, lee, ụgbọala ọkụ na ịnyịnya ọkụ, nke kewara ha abụọ; Elaịja wee rịgoruo eluigwe n’oké ifufe.”—2 Ndị Eze 2:11.
Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “eluigwe” pụtara n’ebe a? Okwu ahụ na-ezo aka mgbe ụfọdụ n’ebe obibi ime mmụọ nke Chineke na ụmụ ya ndị ikom bụ́ ndị mmụọ ozi dị. (Matiu 6:9; 18:10) “Eluigwe” pụkwara ịpụta eluigwe na ala nkịtị. (Deuterọnọmi 4:19) Bible jikwa okwu a eme ihe n’izo aka na mbara ikuku ụwa a na-ahụ anya, ebe nnụnụ na ifufe na-efe.—Abụ Ọma 78:26; Matiu 6:26.
Ole nke n’eluigwe ndị a ka Elaịja onye amụma rịgoro? O doro anya na e bufere ya site na mbara ikuku ụwa ma debe ya n’akụkụ dị iche nke ụwa. Elaịja ka nọ n’ụwa ọtụtụ afọ ka e mesịrị, n’ihi na o degaara Eze Jehoram nke Juda akwụkwọ ozi. (2 Ihe Emere 21:1, 12-15) Na Elaịja arịgoghị n’ebe obibi ime mmụọ nke Jehova Chineke ka Jisọs Kraịst kwadoro, bụ́ onye kwuru, sị: “Ọ dịghịkwa onye ọ bụla rịgoworo n’eluigwe, ma ọ́ bụghị Onye siri n’eluigwe rịdata, bụ́ Nwa nke mmadụ,” ya bụ, Jisọs n’onwe ya. (Jọn 3:13) E megheere ụmụ mmadụ na-ezughị okè ụzọ eluigwe na nke mbụ ya mgbe ọnwụ, mbilite n’ọnwụ, na nrịgo Jisọs Kraịst gasịrị.—Jọn 14:2, 3; Ndị Hibru 9:24; 10:19, 20.