Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 3 p. 14-p. 15 para. 2
  • A Mụọ Onye Ga-akwadebe Ụzọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Mụọ Onye Ga-akwadebe Ụzọ
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Mụwo Onye Ndozi Ụzọ ahụ
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Elizabet Mụrụ Nwa
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • E Nyeghachiri Ha Ụgwọ Ọrụ n’Ihi Ijegharị n’Ụzọ Ụta Na-adịghị Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 3 p. 14-p. 15 para. 2
Mgbe Elizabet na-egosi ndị ọzọ nwa ọhụrụ ya

ISI NKE 3

A Mụọ Onye Ga-akwadebe Ụzọ

LUK 1:57-79

  • A MỤỌ JỌN ONYE NA-EME BAPTIZIM, GỤỌKWA YA AHA

  • ZEKARAYA EKWUO IHE JỌN GA-ARỤ N’ỌDỊNIHU

Oge eruwela mgbe Elizabet ga-amụ nwa. Ya na onye ikwu ya bụ́ Meri nọ kemgbe ọnwa atọ. Ugbu a, oge eruola ka Meri laghachi n’obodo ya bụ́ Nazaret, nke dị n’ebe ugwu Judia. Ọ ga-agakwa ogologo ije ahụ ọ gara mgbe ọ na-abịa. Meri ga-amụkwa nwa nke ya n’ọnwa isii na-abịanụ.

Obere oge Meri lawara, Elizabet mụrụ nwa. Cheedị ụdị ọṅụ onye ọ bụla nwere na Elizabet mụrụ n’udo, ahụ́ esiekwa ya na nwa ya ike. Mgbe ndị agbata obi Elizabet na ndị ikwu ya hụrụ nwa ọhụrụ ya, ha so ya ṅụrịa ọṅụ.

Iwu Chineke nyere ndị Izrel kwuru na ọ bụrụ na nwa nwoke a mụrụ ọhụrụ eruo abalị asatọ, a ga-ebi ya úgwù. Ọ bụkwa mgbe ahụ ka a ga-agụ ya aha. (Levitikọs 12:2, 3) Ndị mmadụ chere na e kwesịrị ịgụ nwa a aha nna ya, bụ́ Zekaraya. Ma Elizabet sịrị: “Ee e! Kama a ga-agụ ya Jọn.” (Luk 1:60) Ì chetara na mmụọ ozi Gebriel kwuru na a ga-agụ nwa ahụ Jọn?

Ndị agbata obi na ndị ikwu ya ekweghị. Ha sịrị ya: “E nweghị onye ọ bụla n’etiti ndị ikwu gị nke a na-akpọ aha a.” (Luk 1:61) Ha ji aka jụọ Zekaraya ihe ọ chọrọ ka a gụọ nwa ya. Zekaraya gwara ha wetara ya ebe ọ ga-ede ya, ya edeere ha: “Jọn bụ aha ya.”—Luk 1:63.

Mgbe Zekaraya na-ede ihe; Zekaraya ebidoghachi ikwu okwu ma buo amụma

Ozugbo ahụ, Zekaraya malitere ikwu okwu. Ihe a bụ ọrụ ebube. Ì chetara na ọ kwụsịrị ikwu okwu mgbe ahụ ọ na-ekwetaghị ihe ahụ mmụọ ozi gwara ya, nke bụ́ na Elizabet ga-amụ nwa? Mgbe Zekaraya malitere ikwu okwu, o juru ndị agbata obi ya anya, ha jụrụ onwe ha, sị: “Gịnị n’ezie ka nwatakịrị a ga-abụ?” (Luk 1:66) Ha hụrụ na Chineke kwadoro aha ahụ a gụrụ Jọn.

E nyere Zekaraya ike mmụọ nsọ, ya ekwuo, sị: “Ka Jehova bụ́ Chineke Izrel bụrụ onye a gọziri agọzi, n’ihi na o lebaworo ndị ya anya wee napụta ha. O mewokwa ka mpi nzọpụta biliere anyị n’ụlọ Devid bụ́ ohu ya.” (Luk 1:68, 69) Onye Zekaraya kpọrọ “mpi nzọpụta” bụ Onyenwe Anyị Jizọs, onye a ka ga-amụ amụ. Zekaraya kwuru na Chineke ga-esi n’aka Jizọs “nye anyị ihe ùgwù nke ijere ya ozi dị nsọ n’atụghị egwu, mgbe a napụtasịrị anyị n’aka ndị iro, bụ́ ozi anyị ga-eje n’ihu ya ụbọchị anyị niile n’iguzosi ike n’ihe na ezi omume.”—Luk 1:74, 75.

Zekaraya bukwara amụma banyere nwa ya, sị: “Ma gị onwe gị, nwatakịrị, a ga-akpọ gị onye amụma nke Onye Kasị Elu, n’ihi na ị ga-ebute ụzọ gaa n’ihu Jehova iji kwadebe ụzọ ya, iji mee ka ndị ya mata banyere nzọpụta site ná mgbaghara nke mmehie ha, n’ihi obi ọmịiko nke Chineke anyị. N’ihi ọmịiko a, anyị ga-ahụ ìhè nke ga-esi n’eluigwe nwuo dị ka mgbe chi bọrọ, iji nye ndị nọ ọdụ n’ọchịchịrị nakwa n’onyinyo ọnwụ ìhè, iji duru ụkwụ anyị gaa n’ụzọ nke udo, gọziekwa anyị na ya.” (Luk 1:76-79) Amụma a na-agba ume n’eziokwu.

Ka ọ dị ugbu a, Meri alaruola n’obodo ya bụ́ Nazaret. O doro anya na ọ ka alụbeghị di. Olee ihe ga-eme Meri ma a chọpụta na ọ dị ime?

  • Olee ihe Jọn ji tọọ Jizọs?

  • Gịnị mere mgbe Jọn ruru ụbọchị asatọ a mụrụ ya?

  • Olee ọrụ Chineke nwere maka Jọn?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya