N’ihi Gịnị Ka Ị Ga-eji Hụ Onye Agbata Obi Gị N’anya?
NDỤ ebighị ebi na-adabere n’ịhụnanya anyị maka Chineke na onye agbata obi. E wepụtara isi ihe ahụ n’otu nkwurịta okwu weere ọnọdụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 2,000 afọ gara aga.
Otu nwoke onye Juu maara Iwu Mosis nke ọma jụrụ Jisọs Kraịst, sị: “Ọ̀ bụ gịnị ka m ga-eme ka m wee keta ndụ ebighị ebi?” Jisọs zara, sị: “Gịnị ka e deworo n’akwụkwọ iwu? Ì si aṅaa agụ ya?” N’ihota Iwu ahụ, nwoke ahụ sịrị: “Hụ Onyenwe anyị Chineke gị n’anya site n’obi gị dum, werekwa mkpụrụ obi gị dum, na ike gị dum, na uche gị dum; hụkwa onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” “Ị zara nke ọma,” ka Jisọs kwuru. “Mee nke a, ị ga-adịkwa ndụ.”—Luk 10:25-28.
Mgbe ahụ, onye ahụ na-ajụ Jisọs ajụjụ jụrụ, sị: “Ònye bụkwa onye agbata obi m?” Kama ịza kpọmkwem, Jisọs kọrọ otu akụkọ nke ịma atụ banyere otu nwoke onye Juu nke e zuru ohi, tie ihe, ma hapụ ya ọ dị ndụ ọnwụ ka mma. Ndị Juu abụọ gafetara—nke mbụ onye nchụàjà, e mesịa onye Livaị. Ha abụọ hụrụ ọnọdụ onye Juu ibe ha ma ghara ime ihe ọ bụla iji nyere ya aka. Onye Sameria bịaziri. N’ịbụ onye ọmịiko kwaliri, o kechiri ọnyá nke onye Juu ahụ e merụrụ ahụ, kpọga ya n’otu ụlọ oriri, ma mee ndokwa maka ilekọtakwu ya.
Jisọs jụrụ onye ahụ na-ajụ ya ajụjụ: “Ọ̀ bụ onye n’ime mmadụ atọ a, ka i chere, gosiri onwe ya ka onye agbata obi nke onye ahụ dabara n’etiti ndị ahụ na-apụnara mmadụ ihe?” O doro anya na ọ bụ onye Sameria ahụ dị ebere. Jisọs si otú a gosi na ezi ịhụnanya maka onye agbata obi na-agabiga ihe mgbochi nke agbụrụ.—Luk 10:29-37.
Ụkọ nke Ịhụnanya Agbata Obi
Taa ịkpọasị na-arị elu n’etiti ndị nke agbụrụ dị iche iche. Dị ka ihe atụ, ndị na-akpa àgwà ka ndị Nazi na Germany n’oge na-adịbeghị anya gara aga, tụrụ otu nwoke n’ala wee jiri akpụkpọ ụkwụ ha dị arọ zọtọọ ya, fọ nke nta ka ha gbajisịa ọgịrịga ya nile. Ha wụrụ ya ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya nke ukwuu wee mụnye ya ọkụ. A wakporo nwoke ahụ a hapụrụ ka ọ nwụọ n’ihi na e chere na ọ bụ onye Juu. N’ihe ọzọ mere nke a na-ejikọghị na nke a, a tụrụ ọkụ n’ụlọ dị nso na Hamburg, na-agbagbu mmadụ atọ si Turkey n’ọkụ—otu n’ime ha bụ nwa agbọghọ dị afọ iri.
Na Balkan na n’akụkụ ụwa dịkwu n’ebe ime ime ọwụwa anyanwụ, agha agbụrụ dị iche iche na-egbusisị ọtụtụ puku mmadụ. Ndị ọzọ nwụrụ n’ọgụ dị n’etiti ndị nwere nzụlite dịgasị iche na Bangladesh, India, na Pakistan. N’Africa kwa, esemokwu agbụrụ na ebo dị iche iche gbukwara ọtụtụ ndị ọzọ.
Ime ihe ike dị otú ahụ na-awụ ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ akpata oyi, ha agaghịkwa eme ihe ọ bụla iji merụọ onye agbata obi ha ahụ. N’ezie, ìgwè ngagharị iwe ndị buru ibu na Germany akatọwo ime ihe ike agbụrụ n’ebe ahụ. Ma, akwụkwọ The New Encyclopædia Britannica na-asị: “Ndị si n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọdịnala nile nke ụwa na-ewere ụzọ ndụ nke ha dị ka nke karịrị ọbụna nke ndị agbata obi kasị dịrị ha nso.” Echiche ndị dị otú ahụ na-egbochi ịhụnanya agbata obi. À pụrụ ime ihe ọ bụla banyere nke a, karịsịa ebe Jisọs sịrị na ndụ dabeere n’ịhụnanya maka Chineke na agbata obi?
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 2]
Ihu peji: Jules Pelcog/Die Heilige Schrift
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
Ezi Onye Sameria Ahụ/The Doré Bible Illustrations/Dover Publications, Inc.