Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Na-akwado Ụmụnna Nwaanyị
    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2020 | Septemba
    • Ebe Jizọs nọ ọdụ mgbe ọ na-akụzi ihe, Mata na Meri anọdụ ala n’akụkụ ụkwụ ya na-ege ya ntị. Foto ndị na-egosi: 1. Ebe otu di na nwunye gara ileta nwanna nwaanyị ahụ́ na-adịghị n’ụlọ ya. Nke nwoke na-agwa nwanna nwaanyị ahụ okwu, nwunye ya ana-edozi ihe ha zụtaara ya. 2. Ebe otu di na nwunye gara soro otu nwanna nwaanyị na nwa ya nwaanyị na-enwe ofufe ezinụlọ. 3. Ebe otu nwanna nwaanyị na-enyere ụmụnna nwaanyị abụọ aka imezi ụgbọala ha. Ọ na-agbanwere ha taya ụgbọala ha.

      Anyị nwere ike igosi ụmụnna anyị ndị nwaanyị na anyị hụrụ ha n’anya otú ahụ Jizọs mere (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6 ruo na nke 9)e

      6. Dị ka e kwuru na Luk 10:38-42, olee otú Jizọs si nyere Meri na Mata aka?

      6 Jizọs wepụtara oge ka ya na ụmụ nwaanyị na-eso ụzọ ya nọrịa. Ọ bụkwaara ha ezigbo enyi. Chee banyere otú ya na Meri na Mata si bụrụ ezigbo enyi. O nwekwara ike ịbụ na Meri na Mata alụbeghị di mgbe ahụ. (Gụọ Luk 10:38-42.) O doro anya na okwu ọnụ Jizọs na omume ya mere ka ahụ́ ruo ha ala. Obi ruru Meri ala ịnọ n’akụkụ ụkwụ Jizọs otú ahụ ndị na-eso ụzọ Jizọs na-eme.c O sighịrị Mata ike ịgwa Jizọs na obi adịghị ya mma maka na Meri achọghị inyere ya aka. Jizọs ji ohere ahụ kụziere ha ihe dị ezigbo mkpa. Ọ gakwara leta ha na nwanne ha Lazarọs n’oge ndị ọzọ. Ihe a gosiri na ọ hụrụ ha n’anya. (Jọn 12:1-3) Ọ bụ ya mere na mgbe Lazarọs dara ọrịa, Meri na Mata ma na ha nwere ike ịkpọ Jizọs ka ọ bịa nyere ha aka.—Jọn 11:3, 5.

  • Na-akwado Ụmụnna Nwaanyị
    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2020 | Septemba
    • c Otu akwụkwọ kwuru, sị: “Ndị na-eso ụzọ na-anọ n’akụkụ ụkwụ ndị nkụzi ha. Ndị na-eso ụzọ na-eme nke ọma na-emecha bụrụ ndị nkụzi. Mana, ụmụ nwaanyị anaghị abụ ndị nkụzi. . . . Ọ ga-abụ na ọ tụrụ ọtụtụ ụmụ nwoke ndị Juu n’anya mgbe Meri bịara nọrọ n’akụkụ ụkwụ Jizọs na-ege ya ntị kama ịnọ na-arụ ọrụ dịịrị ụmụ nwaanyị.”

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya