“Atụla Egwu, Ìgwè Atụrụ Nta”
“Atụla egwu, ìgwè atụrụ nta; n’ihi na ọ dị Nna unu ezi mma inye unu alaeze Ya.”—LUK 12:32.
1. Gịnị bụ ihe ndabere nke okwu Jisọs: “Atụla egwu, ìgwè atụrụ nta”?
“CHỌỌNỤ alaeze [Chineke].” (Luk 12:31) Mgbe Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu ndị a, o kwupụtara otu ụkpụrụ nke duziworo echiche nke ndị Kraịst site n’oge ya ruo na nke anyị. Alaeze Chineke aghaghị iwere ọnọdụ mbụ kpọmkwem ná ndụ anyị. (Matiu 6:33) Otú ọ dị, n’ihe ndekọ Luk, Jisọs gara n’ihu ikwu okwu ndị na-egosi ịhụnanya, na-emesikwa obi ike nye ìgwè pụrụ iche nke ndị Kraịst. O kwuru, sị: “Atụla egwu, ìgwè atụrụ nta; n’ihi na ọ dị Nna unu ezi mma inye unu alaeze Ya.” (Luk 12:32) Dị ka Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ, Jisọs maara na e nwere oge dị oké ize ndụ nye ndị na-eso ụzọ ya ya na ha kpachiri anya n’ihu. Ma e nweghị ihe ọ bụla mere ha ga-eji na-atụ egwu ma ọ bụrụ na ha anọgide na-achọ Alaeze Chineke. Ya mere, agbamume Jisọs abụghị iwu na-agbakasị ahụ. Kama nke ahụ, ọ bụ nkwa na-egosi ịhụnanya nke rụrụ ọrụ iji kpalie nchekwube na obi ike.
2. Olè ndị mejupụtara ìgwè atụrụ nta ahụ, n’ihi gịnịkwa ka ha ji nwee ihe ùgwù pụrụ iche?
2 Jisọs na-agwa ndị na-eso ụzọ ya okwu, ọ kpọkwara ha “ìgwè atụrụ nta.” Ọ na-agwakwa ndị ahụ bụ́ ndị Jehova ‘ga-enye Alaeze ahụ’ okwu. E jiri ha tụnyere ìgwè mmadụ dị ukwuu ndị ga-anabata Jisọs n’oge ndị dị n’ihu, ìgwè nke a n’ezie dị ole na ole n’ọnụ ọgụgụ. A gụkwara ha ná ndị dị oké ọnụ ahịa n’ihi na a họpụtara ha maka ọdịnihu pụrụ iche, ka e jiri ha mee ihe n’ije ozi eze. Nna ha, Onye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu ahụ, bụ́ Jehova, kpọrọ ìgwè atụrụ nta ahụ n’olileanya nke ha ịnata ihe nketa nke eluigwe n’ime Alaeze Mesaịa nke Kraịst.
Ìgwè Atụrụ Nta Ahụ
3. Ọhụụ dị aṅaa dị ebube nke ìgwè atụrụ nta ahụ ka Jọn hụrụ?
3 Mgbe ahụ, olè ndị mejupụtara ìgwè atụrụ nta nke a nwere ihe ùgwù dị ebube dị otú ahụ? Ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst bụ́ ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. (Ọrụ 2:1-4) N’ịhụ ha dị ka ndị abụ nke eluigwe jicha ụbọ akwara n’aka ha, Jọn onyeozi dere, sị: “M wee hụ, ma lee, Nwa atụrụ ahụ ka Ọ na-eguzo n’ugwu Zaịọn, Ya na [puku narị na iri anọ na anọ], bụ́ ndị e deworo aha Ya na aha Nna Ya n’egedege ihu ha. Ndị a bụ ndị na-emerụghị onwe ha n’ahụ ndị inyom; n’ihi na ha dị ọcha ka ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Ndị a bụ ndị na-eso Nwa atụrụ ahụ ebe ọ bụla Ọ na-eje. Ndị a ka a gbatara n’etiti mmadụ, ịbụrụ Chineke na Nwa atụrụ ahụ mkpụrụ mbụ. Ọ dịghịkwa ụgha ọ bụla a hụrụ n’ọnụ ha: ha bụ ndị a na-ataghị ụta.”—Mkpughe 14:1, 4, 5.
4. Ọnọdụ dị aṅaa ka ìgwè atụrụ nta ahụ nwere n’elu ụwa taa?
4 Kemgbe Pentikọst 33 O.A., ndị a e tere mmanụ bụ́ ndị e ji mmụọ nsọ mụọ ejewo ozi dị ka ndị nnọchiteanya Kraịst n’elu ala. (2 Ndị Kọrint 5:20) Taa, nanị ole na ole n’ime ha fọdụrụ, na-ejekọ ozi ọnụ dị ka ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche. (Matiu 24:45; Mkpughe 12:17) Kemgbe afọ 1935 karịsịa, “atụrụ ọzọ” esonyeworo ha, bụ́ ndị Kraịst nwere olileanya elu ala, ndị ọnụ ọgụgụ ha dị ọtụtụ nde ugbu a. Ndị a na-enye aka n’ikwusa ozi ọma ahụ n’ụwa nile.—Jọn 10:16.
5. Gịnị bụ àgwà nke ndị fọdụrụ n’ìgwè atụrụ nta ahụ, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị mkpa na ha atụghị egwu?
5 Gịnị bụ omume nke ihe fọdụrụnụ nke ìgwè atụrụ nta nke a ndị ka nọ n’elu ụwa? Ịmara na ha gaje ịnata “alaeze nke a na-apụghị ime ka o mee mkpatụ,” ha na-eje ozi ha dị nsọ site n’egwu Chineke na ụjọ. (Ndị Hibru 12:28) Ha ghọtara n’obi umeala na nke ha bụ ihe ùgwù a na-apụghị ịtụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke na-arụpụta ọṅụ bara ụba. Ha achọtawo “otu pearl dị oké ọnụ ahịa” nke Jisọs zoro aka mgbe ọ na-ekwu okwu banyere Alaeze ahụ. (Matiu 13:46) Ka mkpagbu ukwu ahụ na-abịa, ndị Chineke e tere mmanụ na-eguzo n’atụghị egwu. N’agbanyeghị ihe na-achọ ịbịakwasị ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ ‘n’ụbọchị Onyenwe anyị, bụ́ oké ụbọchị ahụ nke na-apụta ìhè,’ ha enweghị ụjọ na-akụnwụ ahụ maka ọdịnihu. (Ọrụ 2:19-21) Gịnị mere ha ga-eji nwee ya?
Ọnụ Ọgụgụ Na-adalata
6, 7. (a) N’ihi gịnị ka ọnụ ọgụgụ nke ìgwè atụrụ nta ahụ ka nọ n’ụwa ji dị nnọọ nta? (b) Olee otú onye ọ bụla kwesịrị isi lee olileanya o nwere anya?
6 N’afọ ndị a ọnụ ọgụgụ nke ìgwè atụrụ nta ahụ ka nọ n’elu ụwa adịwo nnọọ nta. Nke a pụtara ìhè site n’akụkọ Ememe Ncheta 1994. N’ihe dị ka 75,000 ọgbakọ nke ndị Jehova n’ụwa nile, nanị 8,617 gosipụtara na ha kwere na ha so ná ndị ahụ fọdụrụ site n’ikere òkè n’ihe nnọchitenya ndị ahụ. (Matiu 26:26-30) N’ụzọ dị iche, ngụkọta ndị bịaranụ bụ 12,288,917. Ndị Kraịst e tere mmanụ maara na a ga-atụ anya nke a. Jehova eguzobewo ọnụ ọgụgụ a kpaara ókè, 144,000, imejupụta ìgwè atụrụ nta ahụ, ọ nọwokwa na-achịkọta ya kemgbe Pentikọst 33 O.A. N’ụzọ ezi uche dị na ya, ọkpụkpọ nke ìgwè atụrụ nta ahụ ga-eru ná njedebe mgbe ọnụ ọgụgụ ya na-eru nso ozuzu ya, ihe àmà na-egosikwa na nchịkọta nke ndị a a gọziri agọzi n’ụzọ pụrụ iche gwụsịrị na 1935. Otú ọ dị, e buru amụma na atụrụ ọzọ ahụ n’oge ọgwụgwụ ga-eto ịbụ “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta.” Kemgbe 1935 nchịkọta Jehova na-achịkọta n’ozuzu ya abụwo nke ndị oké ìgwè mmadụ nke a, ndị olileanya ha bụ ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala.—Mkpughe 7:9; 14:15, 16; Abụ Ọma 37:29.
7 Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ìgwè atụrụ nta ahụ ka nọ n’elu ala nọ ugbu a n’afọ ndụ ha ndị nke 70, 80, na 90. Ole na ole agafewo 100 afọ ndụ ha. Ndị a nile, n’agbanyeghị afọ ndụ ha, maara na site ná mbilite n’ọnwụ nke eluigwe, a ga-emesịa jikọta ha na Jisọs Kraịst wee soro ya chịa n’ime Alaeze ya dị ebube. Ndị nke oké ìgwè mmadụ ahụ ga-abụ ndị Kraịst ahụ bụ́ Eze ga-achị n’elu ala. Ka onye nke ọ bụla ṅụrịa n’ihe Jehova kwadebewooro ndị hụrụ ya n’anya. Ọ bụghị ihe dịịrị anyị ịhọrọ olileanya a ga-enwe. Nke ahụ dịịrị Jehova ikpebi. Òtù abụọ ahụ pụrụ ịṅụrị ọṅụ n’olileanya ha maka ọdịnihu nke obi ụtọ, ma ọ̀ bụ n’Alaeze eluigwe ma ọ bụ na paradaịs elu ala n’okpuru Alaeze ahụ.—Jọn 6:44, 65; Ndị Efesọs 1:17, 18.
8. Ruo n’ókè dị aṅaa ka ịka 144,000 akara gamiworo, gịnịkwa ga-eme mgbe a kazuru ya?
8 Ìgwè atụrụ nta ahụ nke 144,000 mejupụtara bụ “Israel nke Chineke,” bụ́ nke nọchiworo Israel anụ ahụ ná nzube Chineke. (Ndị Galetia 6:16) Ya mere, ihe ahụ fọdụrụ mejupụtara ndị fọrọ n’Israel ime mmụọ nke Chineke ndị ka nọ n’elu ala. Ndị dị otú ahụ ka fọdụrụ bụ ndị a na-aka akara maka nnwapụta ikpeazụ nke Jehova. N’ọhụụ, Jọn onyeozi hụrụ ka nke a na-eme, ọ kọkwara, sị: “M wee hụ mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-esi n’ọwụwa anyanwụ rịgoo, na-enwe akara nke Chineke dị ndụ: o wee were oké olu tiere ndị mmụọ ozi anọ ahụ mkpu, bụ́ ndị e nyere ha ike imejọ ụwa na oké osimiri, sị, Emejọla ụwa, ma ọ bụ oké osimiri, ma ọ bụ osisi ruo mgbe anyị ga-akasịwo ndị ohu Chineke anyị akara n’egedege ihu ha. M wee nụ ọnụ ọgụgụ ndị a kararịị, [puku narị na iri anọ na anọ], ndị a kararịị akara site n’ebo nile ọ bụla nke ụmụ Israel [ime mmụọ].” (Mkpughe 7:2-4) Ebe o doro anya na ọrụ a nke ịka Israel ime mmụọ akara agamiwo, e gosiri ihe ndị na-akpali akpali na-aga ime n’isi nso. Otu ihe bụ na “oké mkpagbu ahụ,” mgbe a ga-ahapụ ifufe anọ ahụ nke mbibi n’elu ụwa, aghaghị ịdị nnọọ nso.—Mkpughe 7:14.
9. Olee otú ìgwè atụrụ nta ahụ si ele ọnụ ọgụgụ na-amụba amụba nke oké ìgwè mmadụ ahụ anya?
9 Ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ bụ́ ndị a chịkọtawororịị ugbu a dị ọtụtụ nde n’ọnụ ọgụgụ. Lee ka nke a si eme ihe ahụ fọdụrụ obi ụtọ! Ọ bụ ezie na ndị nke ìgwè atụrụ nta ahụ ka nọ n’ụwa nọgidere na-agbada n’ọnụ ọgụgụ, ha azụwo ma kwadebe ndị ikom ruru eru nke oké ìgwè mmadụ ahụ iwere ibu ọrụ dị iche iche n’ihe metụtara nzukọ Chineke nke elu ala nke na-abawanye ụba. (Aịsaịa 61:5) Dị ka Jisọs gosiri, a ga-enwe ndị ga-alanarị mkpagbu ukwu ahụ.—Matiu 24:22.
“Atụla Egwu”
10. (a) Mbuso agha dị aṅaa ka a na-aga ibuso ndị Chineke, na gịnịkwa ka ọ ga-eduje? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka a na-ajụ banyere onye ọ bụla n’ime anyị?
10 A chụdawo Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ná mbara ụwa. A na-achịkwa ya na usuu ndị agha ya ibuso ndị Jehova agha. A kọwara mbuso agha nke a, nke e buru amụma ya na Bible, dị ka mbuso agha nke Gọg nke Megọg. N’ebe olè ndị nọ karịsịa ka Ekwensu chere mwakwasị ya ihu? Ọ́ bụghị n’ebe ndị ikpeazụ so n’ìgwè atụrụ nta ahụ nọ, bụ́ Israel ime mmụọ nke Chineke, ndị na-ebi n’udo “n’elu ala nke ụwa”? (Ezikiel 38:1-12) Ee, ma ihe ahụ fọdụrụ nke òtù ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi nke e tere mmanụ, na ndị ji ịnọgidesi ike n’ihe na-esonyere ha, bụ́ atụrụ ọzọ ahụ, ga-ahụ otú mbuso agha Setan ga-esi duba ná mmeghachi omume pụtara ìhè n’akụkụ nke Jehova Chineke. Ọ ga-etinye aka ya n’ihe na-emenụ iji chebe ndị ya, nke a gakwa akpasu ntiwapụ nke “oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova.” (Joel 2:31) Taa, ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche, na-arụzu ọrụ dị oké mkpa, nke na-azọ ndụ, na-adọ aka ná ntị banyere ntinye aka nke a nke Jehova na-abịanụ. (Malakaị 4:5; 1 Timoti 4:16) Ị̀ na-akwadosi ọrụ ahụ ike, na-ekere òkè n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze Jehova? Ị̀ ga-anọgide na-eme otú ahụ dị ka onye nkwusa Alaeze na-adịghị atụ egwu?
11. N’ihi gịnị ka àgwà obi ike ji dị oké mkpa taa?
11 N’iburu ọnọdụ ụwa dị ugbu a n’uche, lee ka o si bụrụ oge kwesịrị ekwesị nye ìgwè atụrụ nta ahụ ịṅa ntị n’okwu Jisọs gwara ha: “Atụla egwu, ìgwè atụrụ nta”! Ụdị àgwà obi ike ahụ dị mkpa n’ihi ihe nile na-ewere ọnọdụ ugbu a dị ka nzube Jehova si dị. N’otu n’otu, onye nke ọ bụla n’ime ìgwè atụrụ nta ahụ na-aghọta mkpa ọ dị ịtachi obi kpọmkwem ruo ọgwụgwụ. (Luk 21:19) Dị ka Jisọs Kraịst, Onyenwe ìgwè atụrụ nta ahụ, tachiri obi ma kwesị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ nke ndụ elu ala ya, otú ahụ, onye nke ọ bụla n’ihe ahụ fọdụrụ aghaghị ịtachi obi ma kwesị ntụkwasị obi.—Ndị Hibru 12:1, 2.
12. Olee otú Pọl, dị ka Jisọs, si gbaa ndị Kraịst e tere mmanụ ume ịghara ịtụ egwu?
12 Ndị nile e tere mmanụ aghaghị inwe ụdị echiche nke Pọl onyeozi nwere. Rịba ama otú okwu ya dị ka onye mkpọsa ihu ọha e tere mmanụ nke mbilite n’ọnwụ si kwekọọ n’agbamume Jisọs ịghara ịtụ egwu. Pọl dere, sị: “Na-echeta Jisọs Kraịst, dị ka Onye e meworo ka O si ná ndị nwụrụ anwụ bilie, Onye si ná mkpụrụ Devid pụta, dị ka ozi ọma m si dị: nke m na-ahụju anya n’ime ya ruo agbụ, dị ka onye na-arụ ọrụ ọjọọ; ma e keghị okwu Chineke agbụ. N’ihi nke a ka m nwere ntachi obi n’ihe nile n’ihi ndị a họpụtara, ka ha onwe ha wee ruokwa nzọpụta nke dị n’ime Kraịst Jisọs, ya na ebube ebighị ebi. Okwu a kwesịrị ntụkwasị obi: N’ihi na a sị na anyị sooro Ya nwụkọọ ọnwụ, anyị ga-esokwa Ya dịkọọ ndụ: a sị na anyị na-enwe ntachi obi, anyị ga-esokwa Ya bụkọọ eze: a sị na anyị ga-agọnarị Ya, Ya onwe ya ga-agọnarịkwa anyị: a sị na anyị ekweghị ekwe, Ya onwe ya na-anọgide n’ikwesị ntụkwasị obi; n’ihi na Ọ pụghị ịgọnarị Onwe ya.”—2 Timoti 2:8-13.
13. Nkweta dị omimi dị aṅaa ka ndị so n’ìgwè atụrụ nta ahụ na-ejigide, gịnịkwa ka nke a na-akpali ha ime?
13 Dị ka Pọl onyeozi, ndị fọdụrụ n’ìgwè atụrụ nta ahụ e tere mmanụ dị njikere ịtachiri ahụhụ obi ka ha na-akpọsa ozi ahụ dị ike e setịpụrụ n’Okwu Chineke. Nkweta ha gbamiri mkpọrọgwụ ka ha na-ejidesi ike nkwa nile nke Chineke nke nzọpụta na nke ha ịbụ ndị e nyere “okpueze ahụ, bụ́ ndụ” ma ọ bụrụ na ha ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ. (Mkpughe 2:10) Site n’inwe mbilite n’ọnwụ na mgbanwe ozugbo, a ga-ejikọ ha na Kraịst, isoro ya chịa dị ka ndị eze. Lee nnọọ mmeri ọ bụ maka ụzọ iguzosi ike n’ezi ihe obi ha gbasoro dị ka ndị na-emeri ụwa!—1 Jọn 5:3, 4.
Olileanya Pụrụ Iche
14, 15. Olee otú mbilite n’ọnwụ nke ìgwè atụrụ nta ahụ si pụọ iche?
14 Olileanya mbilite n’ọnwụ nke ìgwè atụrụ nta ahụ nwere pụrụ iche. N’ụzọ ndị dị aṅaa? Otu ihe bụ na ọ na-ebute mbilite n’ọnwụ nke “ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume” n’ozuzu ha ụzọ. (Ọrụ 24:15) N’ezie, mbilite n’ọnwụ nke ndị e tere mmanụ dabara n’otu usoro nke ịdị mkpa, dị ka e gosipụtara n’ụzọ pụtara ìhè n’okwu ndị a a na-achọta ná 1 Ndị Kọrint 15:20, 23: “E mewo ka Kraịst si ná ndị nwụrụ anwụ bilie, mkpụrụ mbụ nke ndị daworo n’ụra ọnwụ. Ma mmadụ nile n’otu n’otu n’usoro nke aka ha: Kraịst, dị ka mkpụrụ mbụ; e mesịa ndị nke Kraịst, [n’ọnụnọ, NW] Ya.” Site n’inwe ụdị ntachi obi na okwukwe nke Jisọs gosipụtara, ìgwè atụrụ nta ahụ maara ihe na-echere ha ka ha na-ejesị ozi elu ala ha, karịsịa kemgbe ezi Onyenwe anyị ahụ bịara n’ụlọ nsọ ya maka ikpe na 1918.—Malakaị 3:1.
15 Pọl na-enye anyị ihe ọzọ mere a ga-eji lee mbilite n’onwụ a anya dị ka ihe pụrụ iche. Dị ka e dekọrọ ná 1 Ndị Kọrint 15:51-53, o dere, sị: “Lee, agwa m unu ihe omimi: Ọ bụghị anyị nile ga-ada n’ụra ọnwụ, ma a ga-enwo anyị nile, n’oge dịkarịsịrị nta, n’otu ntabi anya, mgbe a ga-afụ opi ikpeazụ. . . . N’ihi na ahụ a nke pụrụ ire ure aghaghị iyikwasị ereghị ure, ahụ a nke pụrụ ịnwụ anwụ aghaghị iyikwasị anwụghị anwụ.” Okwu ndị a metụtara ndị nke ìgwè atụrụ nta ahụ ndị nwụrụ n’oge ọnụnọ Kraịst. N’enweghị ihe mere ha ga-eji nọrọ n’ụra ọnwụ ruo oge dị ogologo, a na-eyikwasị ha anwụghị anwụ, “n’oge dịkarịsịrị nta, n’otu ntabi anya.”
16, 17. Banyere olileanya ha nke mbilite n’ọnwụ, olee otú ndị Kraịst e tere mmanụ si bụrụ ndị a gọziri agọzi karịsịa?
16 Site n’ihe ọmụma nke a, anyị pụrụ ịghọta echiche nke okwu Jọn onyeozi ndị a hụrụ ná Mkpughe 14:12, 13. O dere, sị: “N’ebe a ka ntachi obi ndị nsọ dị, bụ́ ndị na-edebe ihe Chineke nyere n’iwu, na okwukwe Jisọs. M wee nụ olu ka ọ na-esi n’eluigwe daa, sị, Dee akwụkwọ, Ngọzi na-adịrị ndị nwụrụ anwụ, bụ́ ndị ga-anwụ n’ime Onyenwe anyị site n’ugbu a: ee, ka Mmụọ Nsọ na-ekwu, ka ha wee si ná ndọgbu nile ha dọgburu onwe ha n’ọrụ zuru ike; n’ihi na ọrụ nile ha na-eso ha gaa.”
17 Lee nnọọ ụgwọ ọrụ pụrụ iche na-echere ihe ahụ fọdụrụ n’ìgwè atụrụ nta! Mbilite n’ọnwụ ha ga-abịa ngwa ngwa, kpọmkwem ozugbo ha dasịrị n’ụra ọnwụ. Lee nnọọ mgbanwe dị ịrịba ama ihe ahụ fọdụrụ ga-esi otú a nwee ka ha na-amalite ọrụ ha n’ógbè ndị bụ mmụọ! Ka ime ka ndị òtù ìgwè atụrụ nta ahụ dị ebube na-aga n’ihu na ka mmezu nke amụma ndị bụ́ isi nke Bible gamiworo, n’ezie ọ dị ndị ikpeazụ fọdụrụ n’ìgwè atụrụ nta ahụ mkpa ‘ịghara ịtụ egwu.’ Atụghị egwu ha na-arụkwa ọrụ iji gbaa oké ìgwè mmadụ ahụ ume, bụ́ ndị kwesịrị ịzụlite ụdị àgwà dị otú ahụ nke atụghị egwu ka ha na-atụ anya mgbapụta n’oge nsogbu kasị ukwuu nke ụwa na-amabeghị mbụ.
18, 19. (a) N’ihi gịnị ka oge anyị bi n’ime ya ji chọọ ime ihe ngwa ngwa? (b) Gịnị mere ma ndị e tere mmanụ ma atụrụ ọzọ ahụ kwesịrị iji ghara ịtụ egwu?
18 Ịkọghachi ọrụ dị iche iche nke ìgwè atụrụ nta ahụ na-eme ka ha na oké ìgwè mmadụ ahụ nọgide na-atụ egwu ezi Chineke ahụ. Oge hour nke ikpe ya abịawo, oge kwesịrị ekwesị fọdụrụnụ dịkwa oké ọnụ ahịa. Oge fọdụrụ maka ndị ọzọ ime ihe dị mkpirikpi n’ezie. Otú ọ dị, anyị adịghị atụ egwu na nzube Chineke agaghị emezu. Ọ ghaghị ịga nke ọma!
19 Ka ọ dị ugbu a, a nụwo oké olu ndị nke eluigwe ka ha na-asị: “Alaeze nke ụwa aghọwo alaeze nke Onyenwe anyị, na nke Kraịst Ya: ọ ga-abụkwa eze ruo mgbe nile ebighị ebi.” (Mkpughe 11:15) N’ezie, Onye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu ahụ, Jehova, na-eduzi atụrụ ya nile “n’ụzọ nile nke ezi omume n’ihi aha Ya.” (Abụ Ọma 23:3) A na-eduru ìgwè atụrụ nta ahụ n’ehieghị ụzọ gaa n’ụgwọ ọrụ ha nke eluigwe. A ga-azọpụtakwa atụrụ ọzọ ahụ gabiga oké mkpagbu ahụ ịma ụtọ ndụ ebighị ebi n’ógbè elu ala nke Alaeze Chineke dị ebube n’okpuru ọchịchị nke Kraịst Jisọs. Ya mere, ọ bụ ezie na okwu Jisọs bụ nye ìgwè atụrụ nta ahụ, n’ezie ndị ohu Chineke nile n’ụwa nwere ihe mere ha ga-eji gee ntị n’okwu ya: “Atụla egwu.”
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji na-atụ anya na ọnụ ọgụgụ nke ihe fọdụrụ n’ìgwè atụrụ nta ahụ ga na-atalata?
◻ Gịnị bụ ọnọdụ nke ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ taa?
◻ N’ihi gịnị ka ndị Kraịst kwesịrị iji ghara ịtụ egwu, n’agbanyeghị mbuso agha nke Gọg nke Megọg na-abịanụ?
◻ N’ihi gịnị ka olileanya mbilite n’ọnwụ nke 144,000 ji pụọ iche, karịsịa taa?