Nke A Agaghị Ekwe Omume!
“ỌDỊKARỊRỊ camel mfe ịgabiga n’anya àgị̀gá, karịa ọgaranya ịba n’alaeze Chineke.” (Matiu 19:24) Jisọs Kraịst kwuru nke a iji kụziere ndị na-eso ụzọ ya ihe. Nwa okoro bụ onye ọchịchị nke bara ọgaranya na-achị eze ajụwo ịnara ọkpụkpọ oku ịbịa bụrụ onye na-eso ụzọ Jisọs wee soro keta ọtụtụ ohere ime mmụọ ndị magburu onwe ha. Nwoke ahụ họọrọ ijigidesi ọtụtụ ihe onwunwe ya aka ike kama isoro Mesaịa ahụ.
Jisọs adịghị ekwu na ọ bụ ihe na-agaghị ekwe omume ma ọlị onye ọgaranya inweta ndụ ebighị ebi ná ndokwa Alaeze ahụ, n’ihi na ụfọdụ ndị bara ọgaranya ghọrọ ndị na-eso ụzọ ya. (Matiu 27:57; Luk 19:2, 9) Otú ọ dị, inweta ndụ ebighị ebi bụ ihe na-agaghị ekwe omume nye onye ọgaranya ọ bụla na-enwe ịhụnanya ka ukwuu n’ebe ihe onwunwe ya dị karịa n’ihe ime mmụọ. Ọ bụ nanị site n’ịmata mkpa ime mmụọ ya na ịchọ enyemaka Chineke ka ụdị onye ahụ pụrụ isi nweta nzọpụta nke Chineke na-enye.—Matiu 5:3; 19:16-26.
Ihe atụ nke camel na anya àgị̀gá abụghị nke a ga-ele anya n’ụzọ nkịtị. Jisọs ji ikwubiga okwu ókè mee ihe n’imesi okwu ike banyere ihe isi ike nke na-eche ndị bara ọgaranya ihu, bụ́ ndị na-agbalị ime ihe na-atọ Chineke ụtọ ma n’otu mgbe ahụ na-anọgide na-ebi ndụ nke ịhụ ihe onwunwe n’anya na nke ịba ọgaranya.—1 Timoti 6:17-19.
Ụfọdụ na-asị na anya àgị̀gá ahụ bụ otu ọnụ ụzọ ntakịrị dị ná mgbidi obodo ukwu ebe ọ pụrụ isiri camel ike isi gafee ma ọ bụrụ na a napụ ya ibu ya. Ma okwu Grik bụ́ rha·phisʹ, nke a sụgharịrị ịbụ “àgị̀gá” na Matiu 19:24 na Mak 10:25, sitere ná ngwaa nke pụtara “ịdụ ihe.” Na Luk 18:25 okwu ahụ bụ́ be·loʹne pụtara àgị̀gá e ji adụ ihe, n’ebe ahụkwa New World Translation na-agụ, sị: “N’ezie, ọ dị mfe karị, ka camel si na anya àgị̀gá e ji adụ ihe gafee karịa onye bara ọgaranya ịbanye n’ime alaeze Chineke.” Ndị dị iche iche a na-asọpụrụ akwadowo nsụgharị a. W. E. Vine kwuru, sị: “Echiche nke iji ‘anya àgị̀gá’ tụnyere ọnụ ụzọ nta yiri nke ọgbara ọhụrụ; e nweghị ihe àmà nke na o sitere n’oge ochie.”—An Expository Dictionary of New Testament Words.
Camel buru ibu nke na-agbalị ịfabanye n’anya dị oké nta nke àgị̀gá e ji adụ ihe “dị nnọọ ka ikwubiga okwu ókè nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ,” ka otu ihe odide kwuru. Banyekwara ụfọdụ ndị maara ihe nke ukwuu nke na ha na-eme ihe yiri ihe na-agaghị ekwe omume, akwụkwọ bụ́ The Babylonian Talmud kwuru, sị: “Ha na-esi n’anya àgị̀gá sefee enyi.” Jisọs jiri okwu e kwubigara ókè nke a ma ama na ihe ndị doro anya na ha megiderịtara ibe ha mesie ihe na-agaghị ekwe omume ike. Ọ bụ ihe na-agaghị ekwe omume ka camel, ma ọ bụ enyi, site n’anya àgị̀gá e ji adụ ihe gafee. Otú ọ dị, site n’enyemaka Chineke, onye bara ọgaranya pụrụ ịhapụ echiche ịhụ ihe onwunwe n’anya ma chọọ ndụ ebighị ebi n’ezie. Otú a kwa ka ndị nile nwere ọchịchọ sitere n’ala ala obi ịmụ na ime uche nke Chineke Kasị Ihe Nile Elu, bụ́ Jehova pụkwara ime.