Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 99
  • Chineke Ọ̀ Ga-agbaghara M?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Ọ̀ Ga-agbaghara M?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Chineke nke “Dị Njikere Ịgbaghara Mmehie”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Jehova, Chineke nke “Na-agbaghara Mmehie”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Jehova Bụ Onye Kacha Agbaghara Mmehie
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 99
Ebe otu nwa okorobịa sekpu ala, jiri obi ya niile na-ekpe ekpere

Chineke Ọ̀ Ga-agbaghara M?

Ihe Baịbụl kwuru

Ee, Chineke ga-agbaghara gị ma i mee ihe ndị i kwesịrị ime. Baịbụl kwuru na Chineke ‘dị njikere ịgbaghara mmehie’ nakwa na ọ ‘ga-agbaghara anyị mmehie n’ụzọ dị ukwuu.’ (Nehemaya 9:17; Abụ Ọma 86:5; Aịzaya 55:7) Ọ na-agbaghara mmehie anyị kpamkpam. Ọ na-ehichapụ mmehie anyị. (Ọrụ Ndịozi 3:​19) Chineke agaghịkwa echeta mmehie anyị n’ihi na o kwuru, sị: “Agakwaghị m echeta mmehie ha.” (Jeremaya 31:34) Ọ gbaghara anyị, ọ naghịzi echeta mmehie anyị mere n’oge gara aga ka o nwee ike ịta anyị ahụhụ ugboro ugboro ma ọ bụ kwuo na anyị bụ ndị ọjọọ.

Ma, ihe mere Chineke ji agbaghara anyị abụghị maka na Chineke adịghị ike ma ọ bụ na ọ na-ele anyị anya n’ihu. Ọ naghị agbanwe iwu ya. Ọ bụ ya mere na ọ naghị agbaghara ụfọdụ ihe ndị mmadụ na-emejọ.​—Jọshụa 24:19, 20.

Ihe ị ga-eme ka Chineke gbaghara gị

  1. Kweta na i mehiere megide Chineke. N’agbanyeghị na e nwere ike inwe ndị ihe i mere na-ewute, i kwesịrị ibu ụzọ ghọta na onye ọ bụla mehiere bụ Chineke ka o mejọrọ.​—Abụ Ọma 51:1, 4; Ọrụ Ndịozi 24:16.

  2. Kwupụtara Chineke mmehie gị n’ekpere.​—Abụ Ọma 32:5; 1 Jọn 1:9.

  3. Ihe i mere kwesịrị iwute gị nke ukwuu. Ọ bụrụ na mmadụ enwee “mwute dị ka uche Chineke si dị,” ọ ga-eme ka onye ahụ chegharịa. (2 Ndị Kọrịnt 7:​10) Ọ pụtakwara ịkwa ụta banyere ihe mere i ji mee mmehie ahụ.​—Matiu 5:​27, 28.

  4. ‘Chigharịa,’ ya bụ, gbanwee otú i si akpa àgwà. (Ọrụ Ndịozi 3:​19) O nwere ike ịpụta ịkwụsị ihe ọjọọ ahụ ị na-eme ma ọ bụkwanụ ịgbanwe otú i si eche echiche na otú i si akpa àgwà.​—Ndị Efesọs 4:​23, 24.

  5. Gbaa mbọ mezie ihe ị na-emetaghị. (Matiu 5:23, 24; 2 Ndị Kọrịnt 7:​11) Rịọ ndị i mejọrọ ma ọ bụ ndị ihe i mere wutere mgbaghara, gbalịakwa mezie ihe ndị i nwere ike imezi.​—Luk 19:​7-​10.

  6. Rịọ Chineke ka ọ gbaghara gị n’ihi àjà Jizọs chụrụ. (Ndị Efesọs 1:7) Ị chọọ ka Chineke za ekpere gị, i kwesịrị ịgbaghara ndị mejọrọ gị.​—Matiu 6:​14, 15.

  7. Ọ bụrụ na i mere mmehie dị́ oké njọ, gwa ya onye ruru eru ga-eji Baịbụl nyere gị aka, onye rukwara eru ikpere gị ekpere.​—Jems 5:​14-​16.

Ihe na-abụghị eziokwu ụfọdụ na-eche banyere otú Chineke si agbaghara mmehie

“Mmehie m karịrị akarị, Chineke agaghị agbaghara m.”

Ebe Eze Devid na-egosi na mmehie ya wutere ya mgbe Chineke gbaghaara ya iko ọ kwara na ọchụ o gburu

Chineke gbaghaara Devid mgbe ọ kwara iko, gbuokwa ọchụ

Ọ bụrụhaala na anyị emee ihe Baịbụl kwuru ka anyị mee ma anyị mehie, Chineke ga-agbaghara anyị n’ihi na e nweghị mmehie ọ na-agaghị agbagharali. Ọ ga-agbagharali mmehie ndị dị oké njọ nakwa ndị e mere ugboro ugboro.​—Aịzaya 1:​18.

Dị ka ihe atụ, Chineke gbaghaara Eze Devid mgbe ọ kwara iko, gbuokwa ọchụ. (2 Samuel 12:​7-​13) Pọl onyeozi chere na ọ bụ ya kacha bụrụ onye mmehie, ma a gbaghaara ya. (1 Timoti 1:​15, 16) Chineke tara ndị Juu ụta na ọ bụ ha gburu Jizọs, bụ́ Mesaya. Ma, Baịbụl kwuru na ọ bụrụ na ha chegharịa, a ga-agbaghara ha.​—Ọrụ Ndịozi 3:​15, 19.

“Ọ bụrụ na m kwupụtara ụkọchukwu ma ọ bụ onye ozi Chineke mmehie m, a kagbuola mmehie m.”

E nweghị mmadụ ọ bụla nwere ike ịgbaghara mmadụ ibe ya mmehie o mere megide Chineke. N’agbanyeghị na ịgwa onye ọzọ ihe anyị mejọrọ nwere ike inyere anyị aka mgbe anyị mehiere, ọ bụ naanị Chineke na-agbaghara mmehie.​—Ndị Efesọs 4:32; 1 Jọn 1:​7, 9.

Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ka Jizọs bu n’obi mgbe ọ gwara ndịozi ya, sị: “Ọ bụrụ na unu agbaghara ndị ọ bụla mmehie ha, a gbagharawo ha mmehie ndị ahụ; ọ bụrụ na unu agbagharaghị mmehie nke ndị ọ bụla, a gbagharaghị ha”? (Jọn 20:23) Ihe Jizọs na-ekwu banyere ya bụ ike ọ ga-enye ndịozi ya mgbe ọ ga-enye ha mmụọ nsọ.​—Jọn 20:22.

Dị ka o kwere ha ná nkwa, o nyere ndịozi ya onyinye a mgbe a wụkwasịrị ha mmụọ nsọ n’afọ 33 Oge Ndị Kraịst. (Ọrụ Ndịozi 2:1-4) Ọ bụ ya mere Pita onyeozi ji nwee ike ikpe Ananayas na Safaịra ikpe. Chineke mere ka Pita mata na ihe ha kwuru abụghị eziokwu, ikpe ọ mara ha gosikwara na a gaghị agbaghara ha mmehie ha.​—Ọrụ Ndịozi 5:​1-​11.

Onyinye ahụ nakwa onyinye ndị ọzọ e si n’ike mmụọ nsọ nye ha, dị ka, ịgwọ ọrịa na ịsụ asụsụ ọzọ, kwụsịrị mgbe ndịozi Jizọs nwụchara. (1 Ndị Kọrịnt 13:​8-​10) N’ihi ya, e nweghị mmadụ ọ bụla nwere ike ịkagbu mmehie mmadụ ibe ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya