Debe Chineke n’Ọkwá Mbụ ná Ndụ Ezinụlọ Gị!
BOB NA JEAN—bụ́ di na nwunye ahụ e kwuru banyere ha n’isiokwu bu ụzọ—agbaghị alụkwaghịm. Kama nke ahụ, ha sooro onye na-eje ozi bụ onye Kraịst kwurịta nsogbu ha. N’oge na-adịghị anya ọ chọpụtara na nsogbu ha n’ụzọ bụ isi sitere ná nzụlite dịgasị iche ha nwere.
Dị ka ihe atụ, ebe Bob sitere n’ezinụlọ nke ndị na-arụ ọrụ aka na ndị na-arụ ọrụ ike ma na-arụkwa ọrụ ike n’onwe ya, ọ na-achọ nri ụtụtụ buru ibu kwa ụtụtụ. Jean, bụ́ onye sitere n’ezinụlọ nke ndị ọrụ bekee, na-enye ya nanị kọfị na achịcha. Otú a ka o si bụrụ na esemokwu n’ihe metụtara nri ụtụtụ kpaliri ibu agha!
Ọ dị Bob na Jean mkpa imeziwanye ọnọdụ nke nkwurịta okwu ha. Otú ọ dị, ihe kpatara nsogbu ha n’ezie karịrị nke ahụ ukwuu. Onye ahụ na-eje ozi jụrụ ha sị, “Ùnu na-ele ibe unu anya n’ụzọ kwekọrọ ná 1 Ndị Kọrint 13:4?” Akụkụ Akwụkwọ nsọ ahụ na-agụ, sị: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi, o nwekwara obi ọma; ịhụnanya adịghị ekwo ekworo; ịhụnanya adịghị anya isi.” Amaokwu nke na-eso na-ekwu na ịhụnanya ‘adịghị eme ihe na-adịghị mma n’anya, ọ dịghị achọ ihe nke aka ya, oké iwe adịghị ewe ya, ọ dịghị agụ ihe ọjọọ e mere ya.’ Ma Jean ma Bob dị njikere itinye okwu ndị a n’ọrụ ná mmekọrịta ha.
Nsogbu nke di na nwunye nke a chọrọ ihe ngwọta ime mmụọ n’ụzọ bụ isi. Ebe Bob na Jean nwere ọchịchọ ịnọgide na-enwe ezi mmekọrịta n’ebe Chineke nọ, karịsịa ihe nile, ọ dị ha mkpa itinye ụkpụrụ nile nke Bible n’ọrụ ma mata na “ọ bụrụ na Jehova ewughị ụlọ, n’efu ka ha dọgbụworo onwe ha n’ọrụ n’ime ya, bụ́ ndị na-ewu ya.” (Abụ Ọma 127:1) Amaokwu nke 3 ruo 5 metụtara mwulite nke ezinụlọ. Ihe ịga nke ọma kachasị n’ịkwalite obi ụtọ ezinụlọ na-abịa site n’idebe Chineke n’ọkwá mbụ ná ndụ ezinụlọ.—Ndị Efesọs 3:14, 15.
Ihe Idebe Chineke n’Ọkwá Mbụ Gụnyere
Idebe Chineke n’ọkwá mbụ ná ndụ ezinụlọ gị karịrị nanị ịsị, “Ezinụlọ nke na-ekpekọ ekpere n’otu na-adịkọ n’otu.” Dị ka akwụkwọ bụ Family Relations si na-ekwu, ọtụtụ ndị kwere na “okpukpe na-akwalite ezi mmekọrịta ezinụlọ ma na-emeziwanye inweta afọ ojuju ná ndụ nke ndị òtù ya.” Ma nanị ịdị na-ekpe okpukpe apụtaghị idebe Chineke n’ọkwá mbụ. Ọtụtụ na-arapara n’okpukpe n’aha nanị n’ihi ụkpụrụ omume, omenala ezinụlọ, ma ọ bụ ọnọdụ ka mma ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Chineke na-enwe mmetụta dị nta ná ndụ ha na-ebi kwa ụbọchị. N’ụzọ ka mkpa, ọ bụghị okpukpe nile bụ “okpukpe Chineke nke dị ọcha nke a na-emerụghịkwa emerụ n’ihu Chineke.”—Jemes 1:27.
Iji tinye Chineke n’ọnọdụ mbụ ná ndụ ezinụlọ anyị, anyị na ndị anyị hụrụ n’anya aghaghị ife Jehova, bụ́ “Onye Kachasị Ihe Nile Elu n’elu ụwa nile,” dị ka ihe ndị ọ chọrọ si dị. (Abụ Ọma 83:18) Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst kwuru, sị: “Ma oge hour na-abịa, ugbu a ka ọ dịkwa, mgbe ndị na-akpọ isiala n’ezie ga-akpọ isiala nye Nna m n’ime mmụọ na eziokwu: n’ihi na ndị dị otú ahụ ka Nna m na-achọkwa ka ha bụrụ ndị na-akpọ isiala nye ya. Chineke bụ mmụọ: ndị na-akpọkwa isiala nye ya aghaghị ịkpọ isiala n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:23, 24) Iji fee Jehova Chineke “n’ime mmụọ,” ozi dị nsọ anyị na-ejere ya aghaghị isite n’obi nke jupụtara n’ịhụnanya na okwukwe. (Mak 12:28-31; Ndị Galetia 2:16) Ife Chineke “n’eziokwu” chọrọ ka anyị jụ ụgha dị iche iche nke okpukpe ma kwekọọ kpam kpam n’uche ya dị ka e kpughere ha na Bible. Anyị apụghị idebe Jehova Chineke n’ọkwá mbụ ọ gwụla ma okpukpe anyị o ruru ọ̀tụ̀tụ̀ nke ụkpụrụ ya.a Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ndị a? Oleekwa ụzọ itinye ha n’ọrụ pụrụ isi baara ezinụlọ gị uru?
Idebe Chineke n’Ọkwá Mbụ dị ka Onye Bụ Di
Na 1 Ndị Kọrint 11:3, Bible na-asị: “Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla; nwoke bụkwa isi nke nwanyị; Chineke bụkwa isi nke Kraịst.” Ọ bụrụ na ị bụ di, i nwere ibu ọrụ Chineke nyere gị ịbụ onye na-eme mkpebi bụ isi n’ime ezinụlọ gị. Ma nke a adịghị enye onye ọ bụla bụ di ike ịchị ọchịchị nchịgbu ma ọ bụ ọchịchị aka ike.
Bible na-agba ndị bụ di ume ka ha tụlee mmetụta nke ndị bụ nwunye ha mgbe ha na-eme mkpebi metụtara ha. (Tụlee Jenesis 21:9-14.) N’ezie, Akwụkwọ nsọ na-agba anyị nile ume ‘ịghara ile ihe nke aka anyị anya, kama ka anyị nile n’otu n’otu leekwa ihe nke mmadụ ibe anyị anya.’ (Ndị Filipaị 2:2-4) Ebe ọ na-emetụtaghị ụkpụrụ Bible, onye Kraịst bụ di ga-ekwenyekarị n’ihe ka nwunye ya mma. N’ihi inwe mmasị onwe onye n’ebe ọ nọ, onye bụ di ga-ejidekwa n’aka na o jighị ibu arọ dị iche iche bogbuo nwunye ya. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ inyere ya aka n’ọrụ ndị dị n’ụlọ, karịsịa ọ bụrụ na nwanyị ahụ na-arụ ọrụ ego.
Pọl onyeozi dere, sị: “Ndị bụ di jikwa ụgwọ ịhụ nwunye nke aka ha n’anya dị ka ha hụrụ ahụ nke onwe ha n’anya. Onye na-ahụ nwunye nke aka ya n’anya na-ahụ onwe ya n’anya: n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla kpọrọ ahụ onwe ya asị mgbe ọ bụla; kama ọ na-azụ ya na-elezikwa ya anya nke ọma, dị ka Kraịst na-emekwa nzukọ ya.” (Ndị Efesọs 5:28, 29) Jisọs Kraịst na-emeso ndị nọ n’ọgbakọ n’ụzọ ịhụnanya.
Ihe ọzọ kwesịkwara ịrịba ama bụ ndụmọdụ Pita onyeozi nyere, sị: “Ndị bụ di, otú ahụ, soonụ nwunye unu bikọọ n’ụzọ ihe ọmụma, na-ekenye ihe bụ nwanyị nsọpụrụ, dị ka onye na-adịghị ike karị, dị ka unu na ha bụkwa ndị na-eketakọ amara nke bụ ndụ; ka e wee ghara igbochi ekpere unu.” (1 Pita 3:7) Ọ́ bụghị ihe na-akpali iche echiche ịmata na imeso nwunye mmadụ n’ụzọ na-adịghị egosi ịhụnanya pụrụ igbochi ekpere nke onye bụ di? Ee, onye bụ nwoke aghaghị imeso nwunye ya n’ụzọ ịhụnanya ma ọ bụrụ na Chineke ga-anụ ma zaa ekpere ya.
Idebe Chineke n’ọkwá mbụ metụtakwara mmekọrịta nke onye bụ nna na ụmụ ya. O kwesịrị inwe nchegbu dị omimi banyere ọdịmma ime mmụọ ha. Ma, n’otu nnyocha bụ isi e mere na U.S., nanị ọkara nke ndị ikom sịrị na “ikere òkè n’ọmụmụ Akwụkwọ nsọ ma ọ bụ òtù ndị na-enwe mkparịta ụka nke Akwụkwọ nsọ” bụ ‘ihe kasị mkpa ná nzụlite ime mmụọ nke ezinụlọ ha.’ Ndị fọdụrụ zoro aka n’ihe ndị dị ka “ikiri na ịge ntị n’okwuchukwu TV na redio” ma ọ bụ ‘icheba echiche n’ihe ndụ pụtara.’
Otụ́ ọ dị, Bible na-agwa ndị bụ nna, sị: “Akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị [“Jehova,” NW].” (Ndị Efesọs 6:4) N’etiti Ndịàmà Jehova, a na-ele anya n’aka ndị bụ nna ibute ụzọ n’ofufe nke ezinụlọ. Site n’iduzi ọmụmụ Bible ezinụlọ mgbe nile, ịbịazu nzụkọ ndị Kraịst, na ikwekọ n’ihe ndị ọzọ Akwụkwọ nsọ chọrọ, ndị ikom dị otú ahụ na-edebe Chineke n’ọkwá mbụ ná ndụ ezinụlọ.
Idebe Chineke n’Ọkwá Mbụ dị ka Onye Bụ Nwunye
Ọ bụrụ na ị bụ nwunye, ị pụrụ itinye Chineke n’ọnọdụ mbụ site n’ịkwado di gị n’ọkwá ọrụ ya dị ka onye isi ezinụlọ. Bible na-asị: “Ndị bụ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di unu, dị ka ọ na-ekwesị unu n’ime Onyenwe anyị.” (Ndị Kọlọsi 3:18) Nke a pụrụ nnọọ isi ike ma ọ bụrụ na onye bụ nwoke adịghị enwe nkwurịta okwu ma ọ bụ dị ọ̀bọ̀ banyere ibute ụzọ n’ofufe nke ezinụlọ. Otú o sina dị, ịdị na-egosipụta ịda mba ya mgbe nile, ma ọ bụ nke ka njọ, ilelị ya anya ga-eme nanị ka nsogbu ezinụlọ hiwanye nne.
Ilu 14:1 na-asị: “Nwanyị ọ bụla nke maara ihe ewuwo ụlọ ya: ma nwanyị nke gbagọrọ agbagọ n’uche ya ji aka ya abụọ akwada ya.” Otu ụzọ nke nwanyị lụrụ di, bụ́ onye nwere amamihe n’ezie, pụrụ isi debe Chineke n’ọkwá mbụ ma ‘wulite ụlọ ya’ bụ site n’ido onwe ya n’okpuru di ya. (1 Ndị Kọrint 11:3) Site ‘n’iwu nke ebere ịdịkwasị n’ọnụ ya,’ ọ na-ezere ịkatọ di ya n’enweghị oké ihe kpatara ya. (Ilu 31:26) Ọ na-agbalịsikwa ike ịhụ na mkpebi ndị di ya mere gara nke ọma.
Ụzọ ọzọ nwanyị lụrụ di ga-esi tinye Chineke n’ọnọdụ mbụ bụ site n’ịdị uchu. N’ezie, ọ bụrụ na ọ ghaghị ịrụ ọrụ ego, ọ pụrụ ịbụ na ọ gaghị enwe oge ma ọ bụ ikike nke a chọrọ iji lekọta ụlọ ya dị ka o si chọọ. Ọ ka pụkwara ịgbalisi ike ịdị ka “nwanyị nke na-ejide onwe ya nke ọma” onye Bible na-ekwu banyere ya, sị: “Ọ na-eche ojije nile nke ezinụlọ ya nche nke ọma, ọ bụghịkwa nri umengwụ ka ọ na-eri.”—Ilu 31:10, 27.
Karịsịa, ọ dị onye bụ nwunye mkpa itinye ofufe Chineke n’ọnọdụ mbụ ná ndụ ya. Ọtụtụ ndị bịaworo n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova na nke mbụ ya na-ekwu okwu banyere ezi ejiji nke ụmụntakịrị. Ọrụ onye bụ nwunye n’akụkụ nke a bara uru nke ukwuu. Ma ọ ghaghịkwa ịrụ ọrụ iji jigide ọnọdụ ime mmụọ ya site n’ekpere, ọmụmụ ihe, na ijere Chineke ozi.
Idebe Chineke n’Ọkwá Mbụ Dị Ka Ndị Ntorobịa
Otu isiokwu dị n’akwụkwọ bụ Adolescent Counselor na-ekwu, sị: “Ụmụntakịrị yiri ka ha azụlitewo àgwà na nkà amamihe nke nyeworo ha ohere iduzi ndị mụrụ ha. . . . N’ịbụ ndị e kpughere nye usoro ọha mmadụ nke na-emesi ike ma na-eto mmadụ imeju agụụ nke onwe ya ozugbo na inweta ihe onwunwe, ndị ka nọ n’oge uto na-azụlite àgwà nke ‘achọrọ m ya ugbu a.’” Ọ bụrụ na ị bụ onye ntorobịa, nke ahụ ọ̀ bụ omume gị?
Ndị Kọlọsi 3:20 na-asị: “Ụmụ, na-aṅanụ ntị okwu ndị mụrụ unu n’ihe nile, n’ihi na nke a bụ ihe na-atọ ezi ụtọ n’ime Onyenwe anyị.” Onye na-eto eto nke na-ele nrube isi dị otú a anya dị ka ihe Chineke chọrọ n’aka ya ga-akwado ndị mụrụ ya. Dị ka ihe atụ, ọ gaghị elelị ha anya na nzuzo site n’isoro ụmụ akwụkwọ ibe ya bụ́ ndị ha na-akwadoghị na-akpakọrịta; ọ gaghịkwa eji aghụghọ nwaa ime ka otu n’ime ndị mụrụ ya kwekọọ n’ụzọ nke ya. (Ilu 3:32) Kama nke ahụ, onye ọ bụla na-eto eto nke na-edebe Chineke n’ọkwá mbụ ná ndụ ya ga-ekwekọ ná nduzi ịhụnanya nke nne na nna.
Debe Chineke n’Ọkwá Mbụ!
N’agbanyeghị ihe bụ ọnọdụ anyị n’ime ezinụlọ, ọ dị anyị mkpa idebe Chineke n’ọkwá mbụ ná ndụ ma zụlite mmekọrịta chiri anya n’ebe ọ nọ. Gị na ezinụlọ gị ùnu na-eme nke ahụ?
Na “mgbe ikpeazụ” ndị a, anyị nile na-eche “oge dị oké egwu” ihu. (2 Timoti 3:1-5) Otú o sina dị, o kwere mee ịga n’ihu n’ụzọ ime mmụọ ma lanahụ ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a. (Matiu 24:3-14) Site n’ime ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ezi ihe ọmụma Bible, gị na ezinụlọ gị pụrụ inwe olileanya nke ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala. (Luk 23:43; Jọn 17:3; Mkpughe 21:3, 4) Ee, ọ pụrụ ịdị otú ahụ ma ọ bụrụ na i debe Chineke n’ọkwá mbụ ná ndụ ezinụlọ gị.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee isi 22 nke akwụkwọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 5]
A na-enwe mmasị dị omimi na nwanyị nke na-ejide onwe ya
[Foto dị na peeji nke 7]
Bible na-agba ndị bụ di ume ka ha bute ụzọ n’ofufe nke ezinụlọ