Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Aha Gị Ọ̀ Dị “n’Akwụkwọ nke Ndụ”?
    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2022 | Septemba
    • MBILITE N’ỌNWỤ NKE NDỤ NA MBILITE N’ỌNWỤ NKE IKPE

      13-14. (a) N’oge gara aga, olee otú anyị si ghọta ihe ahụ Jizọs kwuru na Jọn 5:29? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi gbasara ihe ahụ o kwuru?

      13 Jizọs kwukwara gbasara ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ n’ụwa. Dị ka ihe atụ, ọ sịrị: “Oge awa na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta, ndị mere ezi ihe ga-enweta mbilite n’ọnwụ nke ndụ, ndị mere ajọ omume ga-enweta mbilite n’ọnwụ nke ikpe.” (Jọn 5:28, 29, Baịbụl Nsọ​—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ) Gịnị ka ihe a Jizọs kwuru pụtara?

      14 N’oge gara aga, anyị ghọtara na ihe ahụ Jizọs kwuru bụ ihe ndị ahụ a kpọlitere n’ọnwụ ga-eme mgbe a kpọlitechara ha n’ọnwụ, ya bụ, na ụfọdụ ndị ga-ebilite n’ọnwụ mewe ihe ọma, ụfọdụ ndị ebilite n’ọnwụ mewe ihe ọjọọ. Ma, ị̀ chọpụtara na Jizọs ekwughị na ndị ahụ a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-eme ihe ọma ma ọ bụ ga-eme ihe ọjọọ? Ihe o kwuru gosiri na ọ bụ ihe ha mere n’oge gara aga. O kwuru gbasara “ndị mere ezi ihe” na “ndị mere ajọ omume.” Ihe a gosiri na ọ bụ ihe ha mere tupu ha anwụọ. Ihe a doro anya n’ihi na o nweghị onye a ga-ekwe ka ọ na-eme ihe ọjọọ n’ụwa ọhụrụ. Ọ ga-abụrịrị na ihe ọjọọ ahụ bụ ihe ha mere tupu ha anwụọ. Gịnịzi ka ihe Jizọs kwuru gbasara “mbilite n’ọnwụ nke ndụ” na “mbilite n’ọnwụ nke ikpe” pụtara?

      15. Olee ndị ga-enweta “mbilite n’ọnwụ nke ndụ,” n’ihi gịnịkwa?

      15 Ndị ezi omume, bụ́ ndị mere ihe ọma tupu ha anwụọ, ga-enweta “mbilite n’ọnwụ nke ndụ” n’ihi na e deela aha ha n’akwụkwọ nke ndụ. Ihe ọ pụtara bụ na mbilite n’ọnwụ nke “ndị mere ezi ihe” e kwuru okwu ya na Jọn 5:29 bụkwa mbilite n’ọnwụ nke “ndị ezi omume” e kwuru okwu ya n’Ọrụ Ndịozi 24:15. Ihe a a kọwara dabara n’ihe e kwuru ná Ndị Rom 6:7. Ebe ahụ sịrị: “Onye nwụrụ anwụ enwerela onwe ya ná mmehie ya.” Mgbe ndị ezi omume ahụ nwụrụ, a kagburu mmehie ha mere. Ma Jehova ka na-echeta ihe ọma niile ha mere. (Hib. 6:10) Ndị ezi omume a a kpọlitere n’ọnwụ ka kwesịrị ịna-erubere Jehova isi ma ọ bụrụ na ha achọghị ka e hichapụ aha ha n’akwụkwọ nke ndụ.

      16. Gịnị ka “mbilite n’ọnwụ nke ikpe” pụtara?

      16 Gịnị ga-emekwanụ ndị bụ́ ndị ajọ omume tupu ha anwụọ? Ọ bụ eziokwu na a kagburu mmehie ha mgbe ha nwụrụ, ha efeghị Jehova mgbe ha dị ndụ. Aha ha adịghị n’akwụkwọ nke ndụ. N’ihi ya, mbilite n’ọnwụ nke “ndị mere ajọ omume” bụkwa mbilite n’ọnwụ nke “ndị ajọ omume” e kwuru okwu ya n’Ọrụ Ndịozi 24:15. Ha ga-enweta “mbilite n’ọnwụ nke ikpe.”c Ihe ọ pụtara bụ na a ga-ele ndị ajọ omume ahụ ule. (Luk 22:30) Ka oge na-aga, Jizọs ga-ama ma hà ruru eru ka e deba aha ha n’akwụkwọ nke ndụ. Ọ bụru na ha ahapụ ihe ọjọọ ndị ahụ ma nyefee Jehova onwe ha, a ga-edenyezi aha ha n’akwụkwọ nke ndụ.

  • Aha Gị Ọ̀ Dị “n’Akwụkwọ nke Ndụ”?
    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2022 | Septemba
    • c N’oge gara aga, anyị kwuru na “ikpe” ahụ e kwuru ebe a pụtara ịma ha ikpe ọnwụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na “ikpe” nwere ike ịpụta ịma mmadụ ikpe. Ma, n’amaokwu a, ọ dị ka ihe “ikpe” Jizọs kwuru pụtara bụ ileru mmadụ anya ma ọ bụ ile mmadụ ule. Otu akwụkwọ na-akọwa okwu Grik kwukwara na ọ pụtara “ileru àgwà mmadụ anya.”

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya