ISI NKE 29
Gịnị Na-eme Anyị ma Anyị Nwụọ?
È nwetụla onye ị hụrụ n’anya nwụrụ? O nwere ike ịbụ na obi gbawara gị n’oge ahụ, gị ana-eche, sị: ‘Gịnị na-eme anyị ma anyị nwụọ? È nwere mgbe anyị ga-ahụ ndị nke anyị nwụrụ anwụ ọzọ?’ Chọpụta otú na-akasi obi Baịbụl si zaa ajụjụ ndị a n’isiokwu a na nke na-eso ya.
1. Gịnị na-eme anyị ma anyị nwụọ?
Jizọs ji ọnwụ tụnyere oké ụra. Onye nọ n’oké ụra anaghị ama ihe na-eme gburugburu ya. Olee otú ọnwụ si yie ụra? Mmadụ nwụọ, ọ naghịzi ama ihe bụ́ ahụ́ ụfụ. Owu anaghịkwa ama ya n’agbanyeghị otú o si hụ ndị enyi ya na ndị ikwu ya n’anya. Baịbụl sịrị na “ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla.”—Gụọ Ekliziastis 9:5.
2. Olee uru ịma nke bụ́ eziokwu gbasara ndị nwụrụ nwụrụ ga-abara anyị?
Ọtụtụ ndị na-atụ ọnwụ ụjọ. Ha na-atụdị ndị nwụrụ anwụ ụjọ. Ma, ihe Baịbụl kwuru gbasara ọnwụ nwere ike ịkasi gị obi. Jizọs sịrị: “Eziokwu ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.” (Jọn 8:32) Ụfọdụ okpukpe na-akụzi na mmadụ nwụọ, mkpụrụ obi ya adịrị ndụ na-aga, ma ọ bụghị ihe Baịbụl kwuru. N’ihi ya, e nweghị onye na-atawa ahụhụ ma ọ nwụọ. Ebe ọ bụkwa na e nweghị ihe ndị nwụrụ anwụ ma, ha agaghị emeli anyị ihe ọ bụla. Ọ bụ ya mere na ime ka obi jụrụ ndị nwụrụ anwụ abaghị uru. Ife ha ofufe ma ọ bụkwanụ ikpere ha ekpere abaghịkwa uru.
Ụfọdụ na-asị na ha na ndị nwụrụ anwụ na-ekwurịta okwu. Ma, ọ gaghị ekwe omume. Dị ka anyị mụtarala, ndị nwụrụ anwụ “amaghị ihe ọ bụla.” Ndị mmụọ ọjọọ na-eme ka ọ dị ka hà bụ ndị nwụrụ anwụ. Ọ ga-abụ ha na-agwa ndị na-eche na ha na ndị ha nwụrụ anwụ na-akpa nkata okwu, ha echee na ha na ndị ha nwụrụ anwụ na-ekwurịta. N’ihi ya, ịmata ihe bụ́ eziokwu banyere ọnwụ ga-eme ka ndị mmụọ ọjọọ ghara inweta anyị. Jehova dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara ịchọ otú anyị na ndị nwụrụ anwụ ga-esi kwurịta okwu maka na ọ ma na anyị na ndị mmụọ ọjọọ ikwurịta okwu ga-akpatara anyị nsogbu.—Gụọ Diuterọnọmi 18:10-12.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụtakwuo ihe Baịbụl kwuru gbasara ọnwụ, meekwa ka okwukwe gị sie ike n’ebe Chineke nọ. Ọ hụrụ anyị n’anya, ọ naghịkwa ata ndị nwụrụ anwụ ahụhụ.
3. Chọpụta ihe na-eme mmadụ n’eziokwu ma ọ nwụọ
N’ebe dị iche iche n’ụwa, e nwegasịrị ihe ndị mmadụ kweere gbasara ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ. O doro anya na ha niile agaghị abụcha eziokwu.
N’ebe i bi, olee ihe ọtụtụ ndị kweere gbasara ndị nwụrụ anwụ?
Unu chọọ ịmata ihe Baịbụl kwuru, kpọnyenụ VIDIO a.
Gụọnụ Ekliziastis 3:20. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Gịnị ka amaokwu a kwuru na-eme mmadụ ma ọ nwụọ?
Ebe a ọ̀ sịrị na ọ na-abụ mmadụ nwụọ, mkpụrụ obi ya ma ọ bụ mmụọ ya adịrị ndụ na-aga?
Baịbụl gwara anyị ihe mere mgbe Lazarọs, bụ́ ezigbo enyi Jizọs, nwụrụ. Ka unu na-agụ Jọn 11:11-14, chọpụtanụ ihe Jizọs kwuru mere Lazarọs mgbe ọ nwụrụ. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Gịnị ka Jizọs ji tụnyere ọnwụ?
Gịnị ka ihe a Jizọs ji tụnyere ọnwụ na-akụziri anyị gbasara ihe na-eme ndị nwụrụ anwụ?
Ì chere na ihe a Baịbụl kwuru gbasara ọnwụ bụ eziokwu?
4. Ịmata eziokwu gbasara ọnwụ baara anyị uru
Anyị mata eziokwu gbasara ọnwụ, anyị agaghị na-atụ ndị nwụrụ anwụ ụjọ. Gụọnụ Ekliziastis 9:10. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Ò nwere ihe ndị nwụrụ anwụ ga-emeli anyị?
Eziokwu dị na Baịbụl ga-eme ka anyị ghara ikweta na e kwesịrị ime ka obi jụrụ ndị nwụrụ anwụ ma ọ bụkwanụ na e kwesịrị ife ha ofufe. Gụọnụ Aịzaya 8:19 na Mkpughe 4:11. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú i chere obi na-adị Jehova ma mmadụ na-efe onye nwụrụ anwụ ma ọ bụ na-achọ ka onye nwụrụ anwụ nyere ya aka?
Ịmara eziokwu gbasara ọnwụ na-eme ka anyị ghara ịna-etinye aka n’omenala ndị na-adịghị Jehova mma
5. Ịmata eziokwu gbasara ọnwụ na-akasi anyị obi
A na-akụziri ọtụtụ ndị na ọ bụrụ na ha nwụọ, a ga-ata ha ahụhụ maka ihe ndị ha mere n’oge ha dị ndụ. Ma anyị amatala na e nweghị onye a na-ata ahụhụ ma ọ nwụọ, ya sọkwa ya ya bụrụ onye mere mmehie dị ezigbo njọ. Ihe a na-akasi anyị obi. Gụọnụ Ndị Rom 6:7. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Ebe ọ bụ na Baịbụl sịrị na onye nwụrụ anwụ enwerela onwe ya ná mmehie ya, ì chere na e nwere onye nwụrụ anwụ na-ata ahụhụ n’ihi mmehie o mere n’oge gara aga?
Ka anyị na-amụtakwu gbasara Jehova, ọ ga-edokwu anyị anya na o mekataghị taa ndị nwụrụ anwụ ahụhụ. Gụọnụ Diuterọnọmi 32:4 na 1 Jọn 4:8. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Ọ̀ ga na-atọ Chineke ụtọ ịta ndị nwụrụ anwụ ahụhụ ebe ọ bụkwanụ na ọ na-akpa àgwà ndị anyị gụtara n’amaokwu ndị a?
Eziokwu ndị a dị na Baịbụl gbasara ọnwụ hà na-akasi gị obi? Maka gịnị?
ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ụjọ na-atụ ha maka ihe ndị nwụrụ anwụ nwere ike ime ha.
Olee amaokwu Baịbụl i nwere ike ịgụrụ onye kwuru ụdị ihe a ga-eme ka obi ruo ya ala?
NCHỊKỌTA
Onye nwụrụ anwụ enweghịzi ihe ọ ma. Ndị nwụrụ anwụ anaghị ata ahụhụ, e nweghịkwanụ ihe ha nwere ike ime ndị dị ndụ.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Gịnị na-eme anyị ma anyị nwụọ?
Olee uru ịmata eziokwu gbasara ọnwụ baara anyị?
Olee otú ịmata eziokwu gbasara ọnwụ si akasi anyị obi?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Chọpụta ihe Baịbụl kwuru na “mkpụrụ obi” bụ.
Chọpụta ma Chineke ọ̀ na-ata ndị ajọ omume ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ.
Ọ̀ Bụ Eziokwu na Chineke Na-ata Ndị Ajọ Omume Ahụhụ n’Ọkụ Ala Mmụọ? (3:07)
Ànyị kwesịrị ịna-atụ ndị nwụrụ anwụ ụjọ?
Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ —Hà Pụrụ Inyere Gị Aka Ka Ọ̀ Bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie? (broshọ)
Chọpụta otú otu nwoke si mụta nke bụ́ eziokwu gbasara ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ nakwa otú ihe a ọ mụtara si kasie ya obi.
“Otú Baịbụl Si Zaa M Ajụjụ M Niile Ha Edoo M Anya Tọrọ M Ezigbo Ụtọ” (Ụlọ Nche, Febụwarị 1, 2015)