Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ndị Kraịst Oge Mbụ Na Iwu Mozis
    Ụlọ Nche—2003 | Mach 15
    • Gịnị Banyere Ndị Juu Bụ́ Ndị Kraịst?

      12. Olee ajụjụ a na-azabeghị?

      12 Òtù ahụ na-achị isi egosiwo n’ụzọ doro anya na ọ dịghị mkpa ka e bie ndị Jentaịl bụ́ Ndị Kraịst úgwù. Ma gịnị banyere ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst? Mkpebi ahụ òtù na-achị isi mere edozighị kpọmkwem akụkụ a nke nsogbu ahụ.

      13. Gịnị mere na o zighị ezi ikwu na idebe Iwu Mozis dị mkpa maka nzọpụta?

      13 Ụfọdụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst, bụ́ ndị ‘na-anụrụ Iwu ahụ ọkụ n’obi,’ nọgidere na-ebi ụmụ ha úgwù ma na-edebe akụkụ ụfọdụ nke Iwu ahụ. (Ọrụ 21:20) Ndị ọzọ mere ihe karịrị nke ahụ, ọbụna na-esi ọnwụ na ọ dị mkpa ka ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst debe Iwu ahụ iji bụrụ ndị a ga-azọpụta. Ha hiere nnọọ ụzọ na nke a. Dị ka ihe atụ, olee otú onye ọ bụla bụ́ Onye Kraịst pụrụ isi na-achụ àjà ụmụ anụmanụ maka mgbaghara mmehie? Àjà Kraịst emewo ka àjà ndị dị otú ahụ bụrụ ihe mgbe ochie. Gịnị banyere ihe Iwu ahụ chọrọ bụ́ ka ndị Juu zere iso ndị Jentaịl na-akpakọrịta? Ọ gaara esiworo Ndị Kraịst na-ezisa ozi ọma bụ́ ndị na-anụ ọkụ n’obi ike irube isi n’ihe mgbochi ndị dị otú ahụ ma na-arụzukwa ọrụ e nyere ha bụ́ ịkụziri ndị Jentaịl ihe nile Jizọs kụziri. (Matiu 28:19, 20; Ọrụ 1:8; 10:28)a E nweghị ihe àmà ọ bụla gosiri na e doziri okwu a ná nzukọ nke òtù na-achị isi. N’agbanyeghị nke ahụ, a hapụghị ọgbakọ ahụ n’enyereghị ha aka.

  • Ndị Kraịst Oge Mbụ Na Iwu Mozis
    Ụlọ Nche—2003 | Mach 15
    • [Igbe/Foto dị na peeji nke 24]

      Pọl Ejiri Obi Umeala Merie Ule

      Mgbe Pọl mesịrị njem ozi ala ọzọ gara nke ọma, ọ gara Jeruselem na 56 O.A. Ule nọ na-echere ya n’ebe ahụ. Akụkọ na ọ nọwo na-akụzi na e wezụgawo Iwu ahụ n’akụkụ eruwo n’ọgbakọ dị n’ebe ahụ. Ụjọ ji ndị okenye na nkwuwa okwu Pọl n’ihe banyere Iwu ahụ ga-eme ka ndị Juu ghọrọ Ndị Kraịst ọhụrụ sụọ ngọngọ nakwa na ha pụrụ ikwubi na Ndị Kraịst adịghị akwanyere ndokwa Jehova ùgwù. N’ọgbakọ ahụ, e nwere ndị Juu anọ bụ́ Ndị Kraịst bụ́ ndị kwere Chineke nkwa, ikekwe ha kwere nkwa ijere ya ozi dị ka ndị Nazịraịt. Ha aghaghị ịga n’ụlọ nsọ iji mezuo nkwa ha.

      Ndị okenye ahụ gwara Pọl ka o duga mmadụ anọ ahụ n’ụlọ nsọ ma hụ maka mmefu ha. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, Pọl edewo akwụkwọ ozi abụọ sitere n’ike mmụọ nsọ bụ́ ebe o kwuru na idebe Iwu ahụ adịghị mkpa maka nzọpụta. Otú ọ dị, o chebaara akọ na uche ndị ọzọ echiche. O dewo na mbụ, sị: “N’ebe ndị nọ n’okpuru iwu nọ, adịrị m ka onye nọ n’okpuru iwu . . . ka m wee rite ndị nọ n’okpuru iwu n’uru.” (1 Ndị Kọrint 9:20-23) Ọ bụ ezie na Pọl adịtụghị ekwenye n’ihe megidere ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị oké mkpa, o chere na ya pụrụ ime ihe ndị okenye tụrụ n’aro. (Ọrụ 21:15-26) Ọ dịghị njọ ya ime otú ahụ. Ọ dịghị ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru megide ndokwa e mere maka ikwe Chineke nkwa, e jibuwokwa ụlọ nsọ ahụ mee ihe maka ezi ofufe, ọ bụghị maka ikpere arụsị. Ya mere, iji ghara ime ihe ga-akpata ịsụ ngọngọ, Pọl mere ihe a gwara ya. (1 Ndị Kọrint 8:13) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a chọrọ oké obi umeala n’aka Pọl, nke bụ́ ihe mere anyị ji kwesị ịkwanyekwuru ya ùgwù.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya