Ndịàmà Jehova Hà Bụ Òtù Nzuzo?
EBORO Jisọs Kraịst ebubo ịbụ onye aṅụrụma, ori nke ukwu, onye na-emebi Ụbọchị Izu Ike, onye àmà ụgha, onye na-ekwulu Chineke, na onye na-ejere Setan ozi. E bokwara ya ebubo ịbụ onye na-akwatu ọchịchị.—Matiu 9:34; 11:19; 12:24; 26:65; Jọn 8:13; 9:16; 19:12.
Mgbe ọnwụ Jisọs na mbilite n’ọnwụ ya gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya bụkwa n’otu aka ahụ ndị e boro ebubo ndị siri ike. Ndị na-eti mkpu sị, ‘ndị ikom ndị a ekpuwo elu ụwa dum mmadụ bi ihu’ kpụgara òtu ìgwè nke ndị Kraịst na narị afọ mbụ n’ihu ndị na-achị obodo. (Ọrụ 17:6) N’oge ọzọ, a kpụjere Pọl onyeozi na onye ibe ya bụ́ Saịlas na nke ndị isi ma boo ha ebubo na ha na-akpata ọgba aghara dị ukwuu n’obodo Filipaị.—Ọrụ 16:20.
E mesịrị boo Pọl ebubo ịbụ “onye na-eme ka ihe ọjọọ baa ụba, onye na-akpalikwa mmadụ n’etiti ndị Juu nile n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ha bilie megide ndị isi” nakwa ịgbalị “imerụ ụlọ ukwu Chineke.” (Ọrụ 24:5, 6) Ndị isi ndị Juu na Rom kọwaziri ọnọdụ nke ndị na-eso ụzọ Jisọs mgbe ha kwupụtara, sị: “Ihe banyere ịrọ òtù a, anyị mazuru na a na-ekwugide ya ebe nile.”—Ọrụ 28:22.
Ihe àmà na-egosi na òtù ọhụrụ nke a Jisọs Kraịst hiwere bụ nke ụfọdụ lere anya dị ka òtù okpukpe nwere echiche na omume ndị dịwagara iche bụ́ ndị megidere ihe a na-anakwere n’oge ndị ahụ dị ka akparamagwa ziri ezi nke ọha mmadụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọtụtụ taa gaara ewerewo ndị Kraịst dị ka òtù nzuzo na-eweta mbibi. Ndị na-ebo ha ebubo na-abụkarị ndị a ma ama a na-akwanyere ùgwù n’ógbè, nke a yikwara ka ọ na-eme ka ebubo ndị ahụ yie eziokwu. Ọtụtụ kwenyere n’ebubo ndị e boro Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya. Ma, dị ka ọ pụrụ ịbụ na ị maara, nke ọ bụla n’ime ebubo ndị a bụ ụgha! Eziokwu bụ na ndị mmadụ kwuru ihe ndị a emeghị ka ha bụrụ eziokwu.
Gịnị banyere taa? Ọ̀ ga-ezi ezi izo aka n’ebe Ndịàmà Jehova nọ dị ka òtù okpukpe nwere echiche na omume ndị dịwagara iche bụ́ ndị na-emegide ihe a nakweere dị ka akparamagwa ziri ezi nke ọha mmadụ? Ndịàmà Jehova hà bụ òtù nzuzo?
Ihe Ihe Àmà Na-egosi
Otu onye ọrụ gọọmenti nke obodo St. Petersburg, Russia, kọwara, sị: “E gosiri anyị Ndịàmà Jehova dị ka otu ịrọ òtù nzuzo nọ n’ọchịchịrị ma na-egbusịsị ụmụaka na onwe ha.” Otú ọ dị, n’isi nso a ndị Russia matara nke ọma karị ọdịdị bụ eziokwu nke Ndịàmà. Mgbe o sosịrị Ndịàmà Jehova rụkọọ ọrụ n’ihe banyere otu mgbakọ mba dị iche iche, otu onye ọrụ ahụ kwupụtara, sị: “Ugbu a ana m ahụ ndị dị ka ndị ọzọ, ndị nwere ihu ọchị, ọbụna karịa ọtụtụ ndị m maara. Ha dị udo dịkwa jụụ, ha hụkwara ibe ha n’anya nke ukwuu.” O kwukwasịrị: “Amaghị m nnọọ ihe mere ndị mmadụ ji agha ụgha ndị dị otú ahụ banyere ha.”
Ndịàmà Jehova adịghị enwe nzukọ ime ememe okpukpe, e jighịkwa ihe nzuzo kpuchie ofufe ha. Onye na-ede akwụkwọ nke na-abụghị Onyeàmà bụ́ Julia Mitchell Corbett rịbara ama, sị: “Mgbe ha zukọrọ, nke na-abụkarị karịa otu ugbo n’izu, n’Ụlọ Nzukọ Alaeze (a dịghị akpọ ebe ha na-ezukọ chọọchị), a na-etinye ihe kanụ n’oge ha n’ọmụmụ ihe na ntụle nke Bible.” E ji ihe ịrịba ama kaa ebe ha na-enwe nzukọ akara n’ụzọ pụtara ìhè. Nzukọ dịịrị onye ọ bụla, a na-akpọkwa ọha mmadụ òkù ịbịa. A na-anabata ndị ọbịa a na-akpọghị akpọ nke ọma.
“Ndịàmà enwewo aha nke ịkwụwa aka ọtọ, ịkpa ezi àgwà, na ịrụsi ọrụ ike,” ka Corbett kwukwasịrị n’akwụkwọ ya bụ́ Religion in America. Ọtụtụ ndị na-abụghị Ndịàmà na-ekweta ngwa ngwa na ọ dịghị ihe dị njọ ma ọ bụ ihe pụrụ iche banyere Ndịàmà Jehova. Omume ha adịghị emegide ihe a na-anakwere dị ka akparamagwa ziri ezi nke ọha mmadụ. Akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica kwuziri ekwuzi na Ndịàmà “na-esi ọnwụ n’ụkpụrụ omume dị elu nke akparamagwa onwe onye.”
Onye ntụzi nke akụkọ na ihe omume ndị pụrụ iche n’otu ụlọ ọrụ telivishọn na United States degaara Ndịàmà Jehova akwụkwọ ná nzaghachi nye otu akụkọ a gwagburu agwagbu banyere Ndịàmà n’ihe ngosi akụkọ TV bụ́ 60 Minutes. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na ọtụtụ mmadụ karị ebie ndụ ka ndị òtù unu si ebi, mba a agaghị anọ n’ọnọdụ ọ nọ na ya. Abụ m otu onye nta akụkọ maara na e hiwere nzukọ unu n’ịhụnanya na okwukwe siri ike n’Onye Okike ahụ. M chọrọ ka unu mara na ọ bụghị ndị Akụkọ nile nwere echiche a gwagburu agwagbu dị ka nke ahụ.”
Okpukpe A Maara nke Ọma
Ọ̀ dị mma ịsị na Ndịàmà Jehova bụ òtù okpukpe dị nta? N’otu ụzọ, Ndịàmà Jehova dị ole na ole n’ọnụ ọgụgụ ma e jiri ha tụnyere okpukpe ụfọdụ. Otú ọ dị, cheta ihe Jisọs kwuru: “Mkpagide ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba ná ndụ, ole na ole ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-achọta ya.”—Matiu 7:13, 14.
Ka o sina dị, Ndịàmà abụtụghị òtù nzuzo dị nta. N’udu mmiri nke 1993, ihe karịrị nde mmadụ 11 gara Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst nke Ndịàmà. Ma ihe dị mkpa karịa ọnụ ọgụgụ ha bụ mjimara omume ha na akparamagwa ha kwesịrị nṅomi, nke wetawooro ha ịja mma gburugburu ụwa. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a abụwo ihe nyere aka ná mba ebe ndị a nabataworo ha n’usoro iwu dị ka okpukpe a ma ama, nke bụ ezigbo ya.
Ihe dị ịrịba ama bụ mkpebi ikpe òtù European Commission of Human Rights kpebiri n’oge na-adịbeghị anya. O kwupụtara na Ndịàmà kwesịrị inwe nnwere onwe nke echiche, akọ na uche, na okpukpe nakwa na ha nwere iru eru nke ikwu okwu banyere okwukwe ha na ịkụziri ya ndị ọzọ. Ọ gaara esi ike ihe ịdị otú a a sị na Ndịàmà Jehova bụ ndị a maara na ha na-eji ụzọ aghụghọ ndị na-ekwekọghị n’echiche ọha mmadụ enweta ndị òtù ma ọ bụ a sị na ha ji ụzọ aghụghọ dị iche iche achịkwa uche ndị na-eso ha.
Ọtụtụ ìgwè mmadụ gburugburu ụwa maara Ndịàmà Jehova nke ọma. Anyị na-ajụ ọtụtụ nde ndị na-abụghị Ndịàmà bụ́ ndị so Ndịàmà na-amụ Bible ma ọ bụ ndị sowooro ha mụọ ihe n’otu oge, È mere mgbalị ọ bụla iji tigharịa gị anya? Ndịàmà hà tinyere ụzọ ọ bụla e ji achịkwa echiche mmadụ n’ọrụ n’ebe ị nọ? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-aza n’eziokwu “ee e.” N’ezie, ọ bụrụ na e jiri ụzọ ndị a mee ihe, a ga-enwe ọnụ ọgụgụ dị nnọọ ukwuu nke ndị e jidere n’ụzọ megidere arụmụka ọ bụla ga-akwado Ndịàmà Jehova.
“Ndị Tinyere Nnọọ Uche n’Ebe Ụmụ Mmadụ Nọ”
Ndị nọ n’òtù nzuzo na-ewepụkarị onwe ha n’ebe ndị ezinụlọ, ndị enyi, na ọbụna n’ebe ọha mmadụ n’ozuzu ya nọ. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị n’ebe Ndịàmà Jehova nọ? “Esoghị m ná Ndịàmà Jehova,” ka otu onye nta akụkọ ná Mba Czechoslovakia dere. Ma o kwukwasịrị: “O doro anya na ha [Ndịàmà Jehova] nwere ume dị egwu nke omume. . . . Ha na-ekwenyere ndị isi gọọmenti ma ha kwenyere na ọ bụ nanị Alaeze Chineke nwere ike ịgwọta nsogbu nile nke ụmụ mmadụ. Ma ka o doo gị anya—ha abụghị ndị na-anụbiga ọkụ n’obi ókè. Ha bụ ndị tinyere nnọọ uche n’ebe ụmụ mmadụ nọ.”
Ha adịghịkwa ebi n’ógbè nta dị iche iche, na-ewepụ onwe ha n’ebe ndị ikwu na ndị ọzọ nọ. Ndịàmà Jehova matara na ọ bụ ibu ọrụ ha sitere n’Akwụkwọ Nsọ ịhụ ezinụlọ ha n’anya na ilekọta ha. Ha na ndị nke agbụrụ na okpukpe nile na-ebiko ma na-arụkọ ọrụ. Mgbe e nwere ọdachi, ha na-adị ngwa iweta ihe inyeaka na enyemaka ndị ọzọ nke obi ebere.
Nke ka mkpa, ha nọ n’ọrụ nke usoro ihe omume nkụzi nke na-enweghị atụ. Okpukpe ole nwere usoro a haziri ahazi iji mee nleta onwe onye n’ebe onye ọ bụla nọ n’òtù ha nọ? Ndịàmà Jehova na-eme nke a n’ihe karịrị 200 ala na n’ihe karịrị 200 asụsụ! N’ụzọ doro anya, Ndịàmà Jehova “tinyere nnọọ uche n’ebe ụmụ mmadụ nọ.”
Ịrapagidesi Ike na Bible
N’eziokwu, nkụzi nke Ndịàmà Jehova dị iche na nke ndị chọọchị dị iche iche na-akụzi. Ndịàmà Jehova kwere na Jehova bụ Chineke nke kasị elu nakwa na Jisọs bụ Ọkpara ya, ọ bụghị akụkụ nke chi dị atọ n’ime otu. E kegidesịrị okwukwe ha ike ná nkwenye na Alaeze Chineke nanị pụrụ iwetara ihe a kpọrọ mmadụ na-ahụsianya ahụ efe. Ha na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere mbibi na-eru nso nke usoro ihe a rụrụ arụ. Ha na-ekwusa banyere nkwa Chineke maka ụwa paradaịs nye ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi. Ha adịghị efe obé ofufe. Ha adịghị agba Krismas. Ha kwenyere na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ nakwa na e nweghị ọkụ ala mmụọ. Ha agaghị eri ọbara, ha agaghịkwa anara mmịnye ọbara. Ha na-ezere itinye aka ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ikere òkè n’ibu agha. Ọ̀ dịwo mgbe ị jụrụ onwe gị ihe mere nkụzi dị iche iche nke Ndịàmà Jehova ji dị nnọọ iche?
Otu akwụkwọ akụkọ Massachusetts, bụ́ Daily Hampshire Gazette, na-akọwa na “nkọwa siri ike” Ndịàmà Jehova “na-enye Bible na-amachibido ọtụtụ ihe omume ndị ọzọ na-ejighị kpọrọ mkpa . . . , ha dum ná mgbalị iji gbasoo ihe nlereanya nke ndị Kraịst narị afọ mbụ na okwu nke Bible.” The Encyclopedia of Religion kwenyere na “ihe nile ha kwere dabeere na Bible. Ha ‘na-ehota nkwado’ (ya bụ, nye ntụaka Bible iji kwadoo) ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okwu ọ bụla nke okwukwe, na-anakwere n’ajụghị ajụjụ ikike nke Bible, nke karịrị omenala kpam kpam.” Akwụkwọ bụ́ Religion in America na-asị: “Ọ dịbeghị mgbe ìgwè ahụ kpapụtụrụ n’anya o lekwasịrị ọmụmụ Bible, nkụzi ya nile bụkwa nke a na-akwado site n’usoro ntụaka sara mbara n’akwụkwọ nsọ.”
Ònye Bụ Onye Ndú Ha?
Ọ bụ kpọmkwem n’ihi nrapagidesi ike nke a ná nkụzi Bible ka a na-agaghị eji hụ n’etiti Ndịàmà Jehova ofufe nke ndị ndú bụ́ mmadụ ma ọ bụ iji ha mere arụsị bụ́ nke e ji nnọọ mara òtù nzuzo dị iche iche taa. Ha na-ajụ echiche nke nkewa n’etiti ndị ụkọchukwu na ndị aghasa chọọchị. Akwụkwọ The Encyclopedia of Religion na-ekwu n’ụzọ ziri ezi banyere Ndịàmà Jehova, sị: “A machibidoro òtù nke ndị ụkọchukwu na ùtú aha ndị e ji amata ha iwu.”
Ha na-eso Jisọs Kraịst dị ka Onyendú ha na Isi nke ọgbakọ ndị Kraịst. Ọ bụ Jisọs bụ onye kwuru, sị: “Ka a ghara ịkpọ unu onwe unu, Rabaị: n’ihi na otu Onye bụ Onye ozizi unu, ma unu onwe unu nile bụ ụmụnna. Unu akpọkwala onye ọ bụla nna unu n’elu ụwa: n’ihi na otu Onye bụ Nna unu, Ya bụ Onye nke eluigwe. Ka a gharakwa ịkpọ unu ndị ndú, n’ihi na otu Onye bụ Onyendú unu, Ya bụ Kraịst ahụ.”—Matiu 23:8-12.
O doro anya na Ndịàmà Jehova abụghị òtù nzuzo ma ọlị dị ka Jisọs na-abụghị ori nke ukwu na onye aṅụrụma. Anyị kwere na ọ bụghị mmadụ nile akụkọ ụgha dị iche iche banyere Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya kpara ike n’ahụ ha dabara n’ọnyà nke ikwutọ ya. Ọ pụrụ ịbụ nanị na e nyewo ụfọdụ ihe ọmụma a gwagburu agwagbu. Ọ bụrụ na i nwere ajụjụ ụfọdụ banyere Ndịàmà Jehova na ihe ndị ha kwere na ha, gịnị ma ị matakwuo ha nke ọma karị? Ọnụ ụzọ nile nke Ụlọ Nzukọ Alaeze ha ghere oghe nye mmadụ nile na-achọ eziokwu.
Ị pụkwara irite uru site n’ọchịchọ ha ji nlezianya na-achọ ezi ihe ọmụmụ nke Bible, mụtakwa otú e si efe Chineke n’ụzọ kwekọrọ n’okwu Jisọs: “Oge hour na-abịa, ugbu a ka ọ dịkwa, mgbe ndị na-akpọ isiala n’ezie ga-akpọ isiala nye Nna m n’ime mmụọ na eziokwu: n’ihi na ndị dị otú ahụ ka Nna m na-achọkwa ka ha bụrụ ndị na-akpọ isiala nye Ya.”—Jọn 4:23.