Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ‘Ịgba Àmà nke Ọma’
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
    • “Ọ Na-ekwusara Ha Gbasara Alaeze Chineke” (Ọrụ 28:30, 31)

      19. Olee otú Pọl si jiri oge ahụ e ji ya eji n’ụlọ ya mee ihe bara uru?

      19 Luk ji okwu na-eme obi ụtọ ma na-agba ume pịachie akụkọ ya. Ọ sịrị: “[Pọl] nọgidere n’ụlọ ọ na-akwụ ụgwọ ya ruo afọ abụọ zuru ezu. Ọ na-anabatakwa ndị niile bịara ịhụ ya. Ọ na-ekwusara ha gbasara Alaeze Chineke, na-akụzikwara ha banyere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst n’atụghị ụjọ. O nweghịkwa onye ọ bụla na-egbochi ya.” (Ọrụ 28:30, 31) N’eziokwu, Pọl bụ onye e ji ama atụ n’ile ndị mmadụ ọbịa, n’inwe okwukwe, nakwa n’ịnụ ọkụ n’obi.

      20, 21. Olee ụfọdụ ndị ozi ọma Pọl kwusara na Rom baara uru?

      20 Otu n’ime ndị Pọl nabatara nke ọma bụ nwoke aha ya bụ Onesịmọs. Nwoke a bụ ohu nke si Kọlọsi gbapụ. Pọl nyeere ya aka ịghọ Onye Kraịst. Onesịmọs bịaziri bụrụ “nwanna Pọl, onye a tụkwasịrị obi, onye [Pọl] hụrụ n’anya.” Pọl kpọdịrị ya “onye m ji mere nwa.” (Kọl. 4:9; Faị. 10-12) O doro anya na Onesịmọs gbara Pọl ezigbo ume.a

      21 Àgwà ọma Pọl bakwaara ndị ọzọ uru. O degaara Ndị Filipaị akwụkwọ, sị ha: “Ihe mere m emeela ka e kwusakwuo ozi ọma, nke mere na ndị niile bụ́ Ndị Nche Eze Rom nakwa ndị ọzọ niile amarala na a tụrụ m mkpọrọ n’ihi Kraịst. Mkpọrọ a tụrụ m emeela ka ọtụtụ ụmụnna ndị na-ejere Onyenwe anyị ozi nwee obi ike. Obi na-esikwu ha ike ikwu okwu Chineke n’atụghị egwu.”​—Fil. 1:12-14.

  • ‘Ịgba Àmà nke Ọma’
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
    • 25, 26. Olee amụma pụrụ iche Pọl hụrụ ka o mezuru n’ihe na-erughị afọ iri atọ e buru ya, oleekwa otú o si na-emezu n’oge anyị a?

      25 Akụkọ e ji pịachie akwụkwọ Ọrụ Ndịozi magburu onwe ya, na-emetụkwa n’obi, ya bụ, na onyeozi Kraịst e ji eji n’ụlọ ya nọ ebe ahụ ‘na-ekwusara ndị niile bịara ịhụ ya gbasara Alaeze Chineke.’ N’isi nke mbụ, anyị gụrụ banyere ọrụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya mgbe ọ sịrị ha: “Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu. Unu ga-abụkwa ndị àmà m ma na Jeruselem ma na Judia na Sameria, ruokwa n’ebe kacha anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Mgbe ọ na-eruchabeghị afọ iri atọ Jizọs kwuru ihe a, ‘e kwusaala ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe niile n’ụwa.’d (Kọl. 1:23) Ihe a gosiri na mmụọ nsọ Chineke na-akpa ezigbo ike.​—Zek. 4:6.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya