Isi 6
Gịnị Ka Chineke Nọworo Na-eme?
1. Gịnị ka ọtụtụ ndị taa kwere banyere Chineke, ma nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu?
ỌTỤTỤ mmadụ taa kwere na Chineke enweghị oké mmasị n’ụwa ma ọ bụ na o nweghị ihe ọ na-eme banyere ihe ndị na-enye ụmụ mmadụ nsogbu. Ma ihe bụ eziokwu bụ na Chineke na-echegbu onwe ya nke ukwuu. N’ezie, ọ pụrụ ịbụ na o mebeghị ihe ndị mmadụ tụrụ anya ka o mee. Ma nke a apụtaghị na o mebeghị ihe ọ bụla. N’ezie, ọ nọwo na-eme ihe maka ụmụ mmadụ site na mgbe mmadụ malitere dịwa rute n’oge a.
2. Olee ụzọ ịdị mkpụmkpụ nke ndụ ha pụrụ isi metụta echiche ndị mmadụ n’okwu a?
2 Otu ihe mere ndị mmadụ jiri kwubie na Chineke enweghị ihe ọ na-eme bụ afọ ndụ ha nke dị mkpirikpi. Nke a mere na ha adịghị enwe ndidi ịhụ na e mere ihe ná mkpirikpi oge nke ndụ ha kwere. Ya mere ọchịchọ nke ịhụ mgbanwe n’oge ha dị ndụ na-achịkwa echiche ha. N’ihi ya, ihe ha na-achọkarị ime bụ iji ihe ndabere nke ahụmahụ mmadụ a kpaara ókè nke ukwuu kpee Chineke ikpe.
3. Ịdị ogologo nke ndụ Jehova ò si aṅaa emetụta ike o nwere iche ọnọdụ dị iche iche ihu n’oge kasị mma?
3 N’aka nke ọzọ, Jehova na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 90:2, 4; Aịsaịa 44:6) Site n’ụzọ o si ele ihe anya, ọ pụrụ ịhụta nke ọma oge mgbe ọrụ ya ga-emezu ihe kachasị mma maka onye ọ bụla o metụtara, meekwa ka nzube ya gaa n’ihu n’ụzọ kasị dị irè. (Aịsaịa 40:22; 2 Pita 3:8, 9) Nke ahụ kpọmkwem bụ nnọọ ihe Chineke nọworo na-eme.
Ụzọ Chineke Siworo Kpughee Onwe Ya
4. Gịnị ka Jehova kwupụtaworo ịbụ nzube ya, ya mere ihe ọmụma dị aṅaa ka o nyeworo ụmụ mmadụ?
4 Nzube Jehova bụ iweta ọchịchị ezi omume maka ihe nile e kere eke, nke ga-ewekọta ihe a kpọrọ mmadụ n’udo na ịdị n’otu, na-enwe ịnọ ná ntụkwasị obi zuru ezu. (Ndị Efesọs 1:9, 10; Ilu 1:33) Otú ọ dị, Chineke adịghị arụgide onye ọ bụla ịnọ n’okpuru ọchịchị ya. Nanị ndị ahụ na-ejere ya ozi, ndị hụkwara ụzọ o si achị achị n’anya, ka ọ na-anabata. Iburu n’uche idokwa ụwa ebe mmadụ jupụtara ndị ga-adị ndụ n’ụkpụrụ ezi omume nile nke ọchịchị ya, Chineke ewepụtaworo ụmụ mmadụ ihe ọmụma nke ụkpụrụ ndị ahụ na ụzọ ọchịchị ya si arụ ọrụ. N’otu mgbe ahụ Chineke anọwo na-eme ka o kwe ụmụ mmadụ omume inweta ihe ọmụma dị mkpa banyere ya onwe ya na àgwà ya nile.—Jọn 17:3.
5. Ànyị ga-amụta ihe dị aṅaa banyere Chineke site n’ọrụ okike?
5 Ebe ọ bụ mmụọ, n’ezie mmadụ apụghị ịhụ Jehova anya. Ya mere, ọ̀ ga-esi aṅaa mee ka ụmụ mmadụ ndị bụ anụ ahụ na ọbara ghọta ihe ndị a? Otu ihe bụ na a pụrụ ịmụta ọtụtụ ihe banyere àgwà nile nke Onye Okike ahụ site n’aka ọrụ ya. (Ndị Rom 1:20) Mmekọrịta magburu onwe ya nke dị n’etiti ihe nile dị ndụ na iwu okike nke na-achị ihe nile na-agba àmà nye amamihe ya. Ike dị ukwuu a na-ahụ n’oké osimiri, n’ọnọdụ ihu igwe, na n’ike nke kpakpando nile na-enye ihe àmà nke ọkaaka ya. (Job 38:8-11, 22-33; 40:2) Ụdị ihe oriri dị iche iche na-atọ ụtọ, ịma mma nke okooko osisi, nnụnụ, anwụ ọwụwa na anwụ ọdịda, egwuregwu nile na-atọ ọchị nke ụmụ anụmanụ—ha nile na-akọ banyere ịhụnanya nke Onye Okike ahụ n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ na ọchịchọ ya ime ka ndụ anyị bụrụ ihe ọṅụ. Ma mkpughe Chineke kpughere onwe ya akwụsịghị n’ihe ndị a.
6. (a) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Chineke kpugheworo uche ya kpọmkwem? (b) Olee ụzọ ọzọ Chineke siworo kpughee ụkpụrụ na ọdịdị ya nye mmadụ?
6 N’oge dị iche iche, o kwuwo okwu site n’eluigwe. N’ọnọdụ ụfọdụ, o mere nke a n’onwe ya. N’oge ndị ọzọ o kwuru okwu site n’ọnụ ndị mmụọ ozi, dị ka n’ugwu Saịnaị na n’ala nke mmiri gbara gburugburu nke Arabia, ebe o nyere ọtụtụ nde ndị Israel iwu ya. (Ọpụpụ 20:22; Ndị Hibru 2:2) Mgbe e mesịrị, site n’ọnụ ndị amụma ya o zigaara ndị mmadụ ozi ruo ọtụtụ narị afọ, meekwa ka e detuo mkpughe nile nke nzube ya. (2 Pita 1:21) Otú a, Jehova ejiriwo nwayọọ nwayọọ mee ka mmadụ mara ụkpụrụ ezi omume Ya na uche Ya nile. Akụkụ dị mkpa na nke a bụ ụzọ o siworo kpughee ụkpụrụ na àgwà ya nile site n’ụzọ ya na ụmụ mmadụ si nwee mmekọrịta. Nke a etinyewo oké mkpali mmụọ nke ahụmahụ mmadụ n’Okwu ya e dere ede. Lee ka o si bụrụ ihe na-ezi ihe karị na nke na-emesi mmadụ obi ike ọ bụghị nanị ịnụ na ịgụ banyere nkwupụta nile nke nzube Chineke, kamakwa inwe n’ihe ndekọ Bible, ihe nlereanya nke ndị dịworo ndụ ndị na-enyere anyị aka ịghọta uche ya karị! (1 Ndị Kọrint 10:11) Ma gịnị ka ihe ndekọ nke a na-ekpughe?
7. (a) Chineke ò siwo aṅaa gosipụta na ya adịghị anagide mmebi iwu ruo mgbe ebighị ebi? (b) Mgbe anyị mụtara ụzọ Chineke si ele ụdị àgwà ahụ anya, gịnị ka anyị kwesịrị ime?
7 Ọ na-enye ihe àmà na Chineke anaghị anagide mmebi iwu ruo mgbe ebighị ebi. N’eziokwu, o kwere ka ụmụ Adam na Iv gaa n’ụzọ nke ha, na-ewulite ihe ndekọ a na-apụghị ịgbanarị agbanarị nke na mmadụ apụghị inwe ihe ịga nke ọma n’ịchịkwa onwe ya. Ma Chineke ahapụghị ụmụ mmadụ n’enweghị ngosipụta nke ikpe ọmụma ya megide ụzọ ọjọọ ha nile. N’ihi ya o wetara iju mmiri n’oge Noa n’ihi na ‘ụwa jupụtara n’ihe ike.’ (Jenesis 6:11-13) O bibiri obodo Sọdọm na Gọmọra retọrọ eretọ n’omume. (Jenesis 19:24, 25; Jud 7) O kwere ka mba Israel, ndị na-asị na ha na-efe ya, gaa ná ndọta n’agha n’ihi na ha kpere okpukpe ụgha. (Jeremaịa 13:19, 25) N’ịmụta ụzọ Chineke si ele ụdị omume ahụ anya, anyị nwere ohere ime mgbanwe ná ndụ anyị iji gosi ịhụnanya anyị maka ihe ziri ezi. Ànyị ga-eme ya?
8. Mgbe Chineke wetara mbibi, à ga-enwe ndị nlanarị? Nye ihe atụ.
8 Ihe ndekọ Bible na-ekpughekwa na Chineke na-akpa ókè n’etiti ndị ziri ezi na ndị na-emebi iwu. N’Iju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ, Chineke ebibighị Noa, bụ́ “onye na-ekwusa ezi omume,” kama o chebere ya na mmadụ asaa ndị ọzọ. (2 Pita 2:5) Ọzọ, tupu ọkụ na brimstone ezokwasị Sọdọm, e mebere ohere mgbapụ nye onye ezi omume bụ Lọt na ezinụlọ ya.—Jenesis 19:15-17; 2 Pita 2:7.
9. Gịnị ka anyị na-amụta site n’ụzọ Jehova si mesoo ndị Israel oge ochie?
9 Mgbe ụmụ Israel, ndị ṅụworo iyi ife Chineke, gosiri ekwesịghị ntụkwasị obi, ọ chụpụghị ha ozugbo ahụ. Dị ka ọ gwara ha, sị: “M na-ezitara unu ndị ohu m nile, bụ́ ndị amụma, na-ebili n’isi ụtụtụ na-ezite ha kwa ụbọchị.” Ma ha egeghị ntị. (Jeremaịa 7:25, 26) Ọbụna mgbe oge mbibi Jerusalem bịaruru nso, Jehova sịrị: “Ọ̀ na-atọ m ụtọ ma ọlị, bụ́ ọnwụ nke onye na-emebi iwu? . . . Ọ́ dịghị atọ m ụtọ mgbe o si n’ụzọ ya chigharịa wee dị ndụ? . . . Ya mere chigharịanụ, wee dị ndụ.”—Ezikiel 18:23, 32.
10. E wezuga inwe ndidi ya, olee ihe ọzọ ihe ndekọ Bible ndị a na-akụziri anyị banyere Chineke?
10 Mgbe ahụ, olee ihe anyị na-ahụ? Na n’ụzọ na-emetụ obi ndị na-achọ ịgbaso ezi omume n’ụzọ dị ukwuu, Jehova emewo ka o doo anya oké ndidi ya n’ebe ụmụ mmadụ nọ. N’otu mgbe ahụ, mmeso ya nile na-eme ka ịhụnanya ya maka ezi omume na mkpa ọ dị ikwekọ n’ihe ọ chọrọ bamie anyị n’obi.
11. (a) Okwu nzube dị aṅaa ka Jehova kwupụtara n’Iden? (b) Gịnị ka Chineke nọworo na-eme eri mgbe ahụ?
11 Ihe ọzọkwa dị nnọọ mkpa guzopụtara iche. Site ná mmalite o dowo anya na Chineke nwere nzube pụtara ìhè n’ihe ọ bụla o meworo. Ọ hapụbeghị ime ihe mgbe mmezu nke nzube ya chọrọ ka o mee ihe. E kwupụtara nzube a bụ isi n’Iden. Mgbe ọ na-ama Setan ikpe, Jehova kwuru na Setan ga-enwe ohere ịzụlite otu “mkpụrụ,” ndị ahụ ga-egosipụta àgwà ya nile ma kwado ya. O bukwara amụma iwepụta ụdị “mkpụrụ” ọzọ, onye mgbapụta ezi omume. Onye a ga-emerụ agwọ ochie ahụ, “onye a na-akpọ Ekwensu na Setan,” oké mmerụ ahụ na-akpata ọnwụ, si otú a napụta ụmụ mmadụ pụọ n’ọchịchị ya na-emebi ihe. (Jenesis 3:15; Mkpughe 12:9) Mgbe o kwupụtasịrị okwu nzube nke a, Jehova gara n’ihu ime ndokwa pụtara ìhè maka ịchịkwa ihe omume nile nke ụwa ma e mesịa n’okpuru “mkpụrụ” ahụ e kwere ná nkwa. Ọrụ njikere nke a ga-ewe oge, dị ka anyị ga-ahụ.
Ihe Mere O Ji Mesoo Israel Oge Ochie Ihe Kpọmkwem
12, 13. (a) Olee ihe mere Chineke jiri họpụta ndị Israel ma nyekwa nanị otu mba ahụ iwu ya? (b) N’ihi ya, gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’akụkọ ihe mere eme nke Israel na nke mba ndị ọzọ?
12 Ogologo oge tupu mba ndị dị taa amalite ịdị, Chineke họọrọ otu mba nke o ji mee ihe ọtụtụ narị afọ dị ka ndị nke ya. N’ihi gịnị? Iji wepụta ihe ngosi a na-ahụ anya nke ọrụ ụkpụrụ ezi omume ya nile na-arụ. Mba ahụ, bụ́ Israel oge ochie, bụ nke ụmụ Abraham, bụ́ nwoke nke gosipụtaworo okwukwe dị ukwuu n’Onye Okike ahụ, mejupụtara. Jehova gwara ha, sị: “Ọ bụghị na unu bara ụba karịa ndị nile ka Jehova hụrụ unu n’anya sie ike, wee họpụta unu: n’ihi na unu onwe unu dị ole na ole karịa ndị ọzọ: kama ọ bụ n’ihi na Jehova hụrụ unu n’anya, na n’ihi na o debere iyi ọ ṅụụrụ nna unu ha.”—Deuterọnọmi 7:7, 8; 2 Ndị Eze 13:23.
13 Mgbe ọ napụtasịrị ha pụọ n’ịbụ ohu n’Ijipt, Jehova kwere ịnabata ha ná mmekọrịta pụrụ iche, ha wee zaghachi, sị: “Ihe nile Jehova kwuru, anyị ga-eme ya.” (Ọpụpụ 19:8) Mgbe ahụ Jehova nyere ha ụkpụrụ ya nile, wee si otú a dopụ ha iche n’ebe ndị mba ọzọ dị ma nyekwa ha ihe ọmụma zuru ezu banyere ụkpụrụ ezi omume ya nile. (Deuterọnọmi 4:5-8) Ya mere, akụkọ Israel oge ochie na-enye ihe ndekọ nke ihe na-eme mgbe e rubere isi n’iwu ezi omume Chineke ma ọ bụ mgbe e nupụụrụ ya isi. Ka ọ dị mgbe ahụ, akụkọ nke mba ndị ọzọ na-ekpughe ihe ọ na-apụtara ndị na-ebi ndụ n’enweghị iwu Chineke.
14. (a) Chineke ò mejọrọ mba ndị na-abụghị ndị Israel site n’etinyeghị aka n’ihe omume ha? (b) Ma, olee otú ha siri rite uru n’amara Chineke?
14 Gịnị banyere mba ndị ọzọ ahụ? Ha gara n’ụzọ nke aka ha, na-ahọrọ ụdị ọchịchị nke onwe ha. Ndị ha adịghi njọ n’ụzọ nile ná ndụ ha. Ha ka nwekwara ike nke akọ na uche, nke a mgbe ụfọdụ kwa na-akpali ha ime ihe n’ụzọ na-egosi nchegbu ọmịiko maka mmadụ ibe ha. (Ndị Rom 2:14; Ọrụ 28:1, 2) Ma mmehie ha ketara eketa na ọjụjụ ha jụrụ nduzi Chineke mere ha ịgbaso ọchịchọ onwe onye nke dubara n’agha ndị dị ilu na omume rụrụ arụ dị iche iche. (Ndị Efesọs 4:17-19) Agaghị ata Chineke ụta ma ọlị maka ahụhụ nke ụzọ ndụ ha họọrọ n’onwe ha wetara. Mgbe Chineke na-etinye aka bụ nanị mgbe ihe omume mmadụ na mmezu nke nzube Chineke sukọrọ isi. Ka oge na-aga, Chineke n’obi ọma kwere ka ha soro nweta ụtọ ndụ, ụtọ ịma mma nke ihe nile e kere eke na nke mkpụrụ nke ala.—Ọrụ 14:16, 17.
15. Ndokwa dị aṅaa maka ngọzi nke ndị mmadụ nke mba ndị a ga-emesịa nweta ka Chineke nọ na-ahazi?
15 Jehova agụpụghịkwa ndị mmadụ nke mba ndị a inweta uru nile e kwere ná nkwa site na “mkpụrụ” Abraham ma e mesịa. Jehova kwuru banyere “mkpụrụ” nke a ga-abịa site n’eriri ezinụlọ Abraham, sị: “Ọ bụkwa ná mkpụrụ gị ka mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha; n’ihi na i gewo ntị n’olu m.” (Jenesis 22:18) Ya mere, ọ bụ ezie na Chineke jiri ụmụ Israel mee ihe kpọmkwem, ọ nọkwa n’akpaghị ókè na-arụpụta nzube ya ịgọzi mba ndị ọzọ n’ikpeazụ, ọ bụ ezie na ha amataghị nke a.—Ọrụ 10:34, 35.
16. (a) N’oge a nile, gịnị ka Chineke nọ na-eme banyere Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa? (b) Ònye ka Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa ghọrọ?
16 N’oge mgbe Jehova ji Israel oge ochie na-eme ihe, o buru ọtụtụ amụma ndị mejuru mkpa ndị bụ isi nke ụmụ mmadụ ndị nwere okwukwe—ụzọ a ga-esi mata Mkpụrụ Abraham ahụ e kwere ná nkwa mgbe o mesịrị bịa. Ọbụna usoro ezinụlọ ya site n’agbụrụ Juda na ụlọ Devid ka a kpọrọ aha kpọmkwem. (Jenesis 49:10; Abụ Ọma 89:35, 36) A kpọrọ Betlehem aha dị ka ebe a ga-amụ ya. (Maịka 5:2) N’ọtụtụ narị afọ tupu oge ya, e kwupụtara kpọmkwem afọ mgbe a ga-ete ya mmanụ dị ka Mesaịa. (Daniel 9:24-27) E sere onyinyo ije ozi ya dị ka onye nchụàjà n’ihi ụmụ mmadụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa ọchụchụ ọ chụrụ onwe ya n’àjà nke meghere ụzọ maka ndụ ebighị ebi nye ụmụ mmadụ nke mba nile. (Ndị Hibru 9:23-28) Ya mere, mgbe oge a kara aka ruru, ihe nile n’ụzọ a na-apụghị ịrụ ụka gosipụtara Jisọs Kraịst dị ka Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa onye ọ bụ site na ya ka ngọzi dị iche iche ga-esi bịara agbụrụ mmadụ.—Ndị Galetia 3:16, 24; 2 Ndị Kọrint 1:19, 20.
Ịkwadebe Ndị Ọchịchị maka Ụmụ Mmadụ
17. Site na Jisọs, olee ihe Chineke gaje iweta, è sikwa aṅaa mesie nke a ike n’oge ọmụmụ ya?
17 Tupu ọmụmụ Jisọs a gwawo nne ya bụ Meri site n’aka mmụọ ozi na a ga-enye nwa ya nwoke alaeze ebighị ebi. E mere ka ndị ọzụzụ atụrụ nọ nso Betlehem mara banyere ọmụmụ ya, ha wee nụkwa ka ọtụtụ ìgwè ndị agha nke eluigwe na-eto Chineke, na-asị: “Otuto dịrị Chineke n’ebe kachasị ihe nile elu, udo dịkwa n’elu ụwa n’etiti mmadụ ndị ihe ha dị ya ezi mma.”—Luk 1:31-33; 2:10-14.
18. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka ahụmahụ ya nile n’elu ụwa siri kwadebe ya maka ọrụ nke onyeeze na onye nchụàjà? (b) Mmetụta dị aṅaa ka ọnwụ ya nwere n’iweta udo?
18 Tụlee uru nile dị n’ihi onye a ga-abụ eze nke eluigwe n’ọdịnihu ịbụ onye biworo n’ụwa. Dị ka mmadụ, ọ bịara mata ma ghọtakwa nsogbu nile nke ụmụ mmadụ. O binyeere ha sorokwa ha rụkọọ ọrụ, na-ekekọ ihe mgbu ha, taakwa ahụhụ ihe isi ike n’onwe ya. N’ule sikarịrị ike o gosipụtara ma ikwesị ntụkwasị obi ya nye Jehova na ịhụnanya nke ezi omume. N’ụzọ dị otú a, Chineke na-akwadebe Jisọs ịghọ Eze na-aghọta ihe nakwa Onyeisi Nchụàjà inye ụmụ mmadụ uru ndị na-enye ndụ. (Ndị Hibru 1:9; 4:15; 5:8-10) Ọzọkwa, site n’iji ndụ onwe ya chụọ àjà, Jisọs Kraịst meghere ụzọ ka ụmụ mmadụ nwetaghachi mmekọrịta udo ha na Chineke.—1 Pita 3:18.
19. (a) Ànyị si aṅaa mata na Jisọs siri n’ọnwụ bilie ma rịgookwa n’eluigwe? (b) Banyere ọbụbụeze ya, gịnị ka o mere mgbe ọ laghachisịrị n’eluigwe?
19 Mgbe ọnwụ Jisọs gasịrị, Chineke weghachiri ya ná ndụ ọzọ, ihe karịkwara 500 ndị mmadụ hụrụ ya, bụ́ ndị nwere ike inye ihe àmà na mbilite n’ọnwụ ahụ emewo n’ezie. (1 Ndị Kọrint 15:3-8) Mgbe iri ụbọchị anọ nke mbilite n’ọnwụ Jisọs gasịrị, ọ rịgoro n’eluigwe wee pụọ n’anya ndị na-eso ụzọ ya na-ele ya. (Ọrụ 1:9) Site n’eluigwe ọ gara n’ihu ịchị ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi, uru nke ọchịchị ya mekwara ka ha guzopụ iche n’ebe ụmụ mmadụ ndị ọzọ nọ. Ma ugbu a ọ̀ bụ oge nye ya ịmalite ịchị mba nile? Ee e, n’ihi na okwu ndị ọzọ n’usoro oké ihe omume Chineke chọrọ nlebara anya.—Ndị Hibru 10:12, 13.
20. Ọrụ dị ọhụrụ dị aṅaa ka Jisọs meghewooro ndị na-eso ụzọ ya n’elu ala?
20 Oké ọrụ fọdụrụ nke a ga-arụ gburugburu ụwa. Tupu ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Jisọs, ọ dịghị onye Israel ọ bụla pụworo dị ka onye nkwusa ozi ọma ịtọghata ndị mmadụ nke mba ndị ọzọ. Otú ọ dị, onye ọ bụla nwere ọchịchọ nke ife Chineke pụrụ isonyere ndị Israel mgbe ọ bụla ma nweta uru ya nile. (1 Ndị Eze 8:41-43) Otú ọ dị, mmalite nke Iso Ụzọ Kraịst meghere ụzọ maka ihe omume dị ukwuu dị ọhụrụ. Jisọs Kraịst n’onwe ya guzobere ihe nlereanya ma hapụkwa ya dị ka ihe e nyere n’iwu nye ndị na-eso ụzọ ya, na-agwa ha tupu ọ rịgoo n’eluigwe, sị: “Unu ga-abụkwa ndịàmà m n’ime Jerusalem, na n’ime Judia na Sameria nile, ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.”—Ọrụ 1:8.
21. Kama ịbụ ntọghata nke ụwa nile, Chineke na-emezu gịnị site n’ọrụ ịgba àmà ahụ?
21 Ịtọghata ụwa nile ọ̀ bụ ihe o bu n’uche? Ee e. Kama nke ahụ, Jisọs gosiri na a ga-enwe nchịkọbata bụ isi nke “ụmụ alaeze ahụ” na mgbe “ọgwụgwụ oge a.” Ee, a ga-ahọpụtakwa ndị ọzọ ndị so n’òtù ọchịchị Alaeze ahụ na-abịanụ. (Matiu 13:24-30, 36-43) Onye ọ bụla na-agụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ Grik nke ndị Kraịst ga-ahụta ngwa ngwa na malite na Pentikọst 33 O.A., a kpọrọ ndị ọzọ òkù iso Jisọs Kraịst keta ịchịisi Alaeze eluigwe ya.—2 Timoti 2:12; Ndị Hibru 3:1; 1 Pita 1:3, 4.
22. (a) Iru eru dị aṅaa ka Chineke na-achọ n’aka ndị a na-ele anya iketa Alaeze eluigwe ahụ? (b) Ya mere, è mere nhọrọ ahụ n’ọkụ n’ọkụ?
22 Ịhọpụta ndị ga-eso chịa achị n’ọdịnihu, bụ́ ndị bụ mmadụ ga-ewe oge. N’ihi gịnị? Otu ihe bụ na ohere nke ahụ ga-agbatịru ruo ndị nke mba nile. Ọ bụ ezie na ọtụtụ na-ekwupụta na ha so na ya, ole na ole gosipụtara onwe ha ịbụ n’ezie ndị na-eso ụzọ na-ekwesị ntụkwasị obi nke Ọkpara Chineke. (Matiu 22:14) A ga-eru ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ndị dị elu. Ọ bụ ezie na ndị Kraịst adịghị ebi ndụ dị ka otu mba dịpụrụ iche dị ka Israel oge ochie mere, e lewo ha anya dị ka ndị ọbịa, ndị na-ekwupụta ụzọ ndụ dị iche. (1 Pita 2:11, 12) Ha aghaghị ịdị ọcha pụọ n’omume rụrụ arụ na àgwà rere ure nke ụwa dị ha gburugburu. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Iji ghọọ ezi “ụmụ Chineke,” ha ga-egosipụta onwe ha dị ka ndị na-adị “n’udo,” na-ekereghị òkè n’agha nke mba dị iche iche ma ghara ịdị na-emegwara mgbe a na-akpagbu ha n’ihi okwukwe ha. (Matiu 5:9; 26:52; Ndị Rom 12:18, 19) Ha aghaghị igosipụta ikwesị ntụkwasị obi nye ịchịisi Chineke site n’ịjụ ịkpọsa ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nke e sere onyinyo ya n’ime Bible dị ka ‘anụ ọhịa.’ (Mkpughe 20:4, 6) N’ihi ihe ndị a nile na n’ihi na ha ebuliwo aha Jisọs Kraịst elu n’ọrụ ya dị ka Eze nke Chineke tere mmanụ, ‘mba nile akpọwo ha asị.’ (Matiu 24:9) Ya mere, ndị nile ga-abụ ndị ọchịchị eluigwe nke ihe a kpọrọ mmadụ tinyere Kraịst abụghị ndị a họọrọ n’ọkụ n’ọkụ.
23. (a) Mmadụ ole ga-emejupụta òtù ndị ọchịchị ahụ nke eluigwe ha na Kraịst? (b) Site n’ole ndị ka e si họrọ ha, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
23 Ọ bụghị n’ihi na ọnụ ọgụgụ ndị a họọrọ ga-adị ukwuu nke na nhọrọ ga-ewe oge. Dị ka Akwụkwọ nsọ kwuru, Chineke kabiri ọnụ ọgụgụ ndị òtù ọchịchị nke a a họrọ ahọ ndị nọ n’okpuru Jisọs Kraịst akara ịbụ nanị 144,000 mmadụ. (Mkpughe 14:1-3) Ma Chineke eleziwo anya họrọ ha. E nwetara ha site “n’ebo nile ọ bụla, na asụsụ nile ọ bụla, na ndị nile ọ bụla, na mba nile ọ bụla.” (Mkpughe 5:9, 10) N’etiti ha bụ ndị si n’ụzọ nile nke ndụ, ndị nwoke na ndị nwanyị, ndị kerewooro òkè ná nsogbu nile dị iche iche nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ka ha na-eyikwasị ọdịdị mmadụ ọhụrụ nke onye Kraịst, e nweghị ụdị nsogbu ọ bụla nke ụfọdụ n’ime ha na-echebeghị ihu ma meriekwa ya. (Ndị Efesọs 4:22-24; 1 Ndị Kọrint 10:13) Lee oké ọṅụ anyị pụrụ inwe maka nke a! N’ihi gịnị? N’ihi na ọ na-enye anyị nchekwube na ha ga-abụ ndị eze na ndị nchụàjà nwere ọmịiko na ebere, ndị nwere ike inyere ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị ndị dị iche iche aka irite uru site ná ndokwa nile nke Chineke maka ndụ ebighị ebi.
24. Gịnị banyere ọtụtụ nde ụmụ mmadụ ndị ọzọ ndị biworo ma nwụọkwa n’oge nke a, nke ọtụtụ n’ime ha na-amataghịkwa ihe Bible na-akọ?
24 Oleekwanụ banyere ụmụ mmadụ na-anọghị ná ndokwa nke a? N’oge a nile, Chineke etinyeghị aka n’ụdị ọchịchị dị iche iche. O kwere ka ụmụ mmadụ gaa n’ụzọ nke ha họọrọ. N’ezie, ọtụtụ nde ndị mmadụ adịwo ndụ ma nwụọkwa, ọtụtụ n’ime ha anụtụghị banyere Bible ma ọ bụ Alaeze Chineke. Ma, Chineke echezọbeghịkwa ha. Ọ na-edokwa maka oge nke Pọl onyeozi kwuru banyere ya, sị: “N’ihi na enwere m olileanya n’ebe Chineke nọ . . . na mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.” (Ọrụ 24:15) Mgbe ahụ, n’okpuru ọnọdụ ndị dị mma nke Usoro Ihe Ọhụrụ Chineke, a ga-enye ha ohere zuru ezu ịmụta ụzọ Jehova. N’ịdabere na nke a, ha pụrụ iwere nguzo nke onwe ha n’ihe iseokwu banyere ọkaaka nke eluigwe na ala. Ndị hụrụ ezi omume n’anya ga-enweta ohere ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
Ka “Mgbe Ọgwụgwụ” Na-abịaru Nso
25, 26. (a) Mgbe oge ya ruru, ike ọzọ dị aṅaa ka a ga-enyekwu Kraịst, megidekwa onye ka ọ ga-eme ihe? (b) Nke a ọ̀ ga-esi aṅaa metụta ọnọdụ ndị dị n’ụwa?
25 Tupu ọbịbịa nke Usoro Ihe Ọhụrụ ahụ, ihe ndị na-eju anya aghaghị ime. Bible buru amụma oké mgbanwe n’ihe omume nile nke ụwa. A ga-echi Jisọs Kraịst echichi dị ka Eze mgbe ahụ ọ bụghị nanị ịdị na-achị ndị na-eso ụzọ ya kama ọ ga-enwe ike ime ihe n’ebe ụwa nile dị. Mkpu a ga-ada n’eluigwe, sị: “Alaeze nke ụwa aghọwo alaeze nke Onyenwe anyị, na nke Kraịst ya, ọ ga-abụkwa eze ruo mgbe nile ebighị ebi.” (Mkpughe 11:15) Ihe mbụ Eze ahụ ga-eme ga-abụ megide “onyeisi nke ụwa nke a” n’onwe ya, bụ́ Setan Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya. (Jọn 14:30) A ga-atụda ndị ike ọjọọ ndị a site n’eluigwe ma chụda ha na gburugburu ụwa. Gịnị ga-esi na ya pụta?
26 Ihe nkọwa amụma ahụ dekọrọ otu olu sitere n’eluigwe nke na-asị: “N’ihi nke a, ka obi na-atọ unu ụtọ, unu eluigwe nile, na unu ndị bi n’ime ha. Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na Ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.” (Mkpughe 12:12) A ga-enwe ọgba aghara ọ na-adịbeghị ihe dị ka ya na mbụ n’etiti mba nile, ma ọgwụgwụ agaghị abịa ozugbo ahụ.
27. Ka “ọgwụgwụ” na-abịaru nso, ọrụ nkewapụta dị ukwuu dị aṅaa ga-ewere ọnọdụ, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa? (b) Ruo ókè hà aṅaa ka mbibi ụwa e buru amụma ya ga-adị ukwuu?
27 Nke a ga-abụ oge maka oké ọrụ nke ime nkewapụta. N’okpuru nduzi nke Jisọs Kraịst e chiworo eze, ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi ga-amụba nkwusa “ozi ọma nke a nke alaeze” n’ebe nile mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile. A ga-enye onye ọ bụla n’ebe nile ohere igosipụta omume ha n’ebe ịchịisi Chineke dị. (Matiu 24:14; 25:31-33) Mgbe e mezuru nke a, dị ka Jisọs kọwara, “mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” Ọ ga-abụ “mkpagbu ukwu . . . nke ihe dị ka ya a kadịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị.” (Matiu 24:21) O nwekwaghị mgbe mmadụ ga-ajụ ọzọ, sị Gịnị ka Chineke nọworo na-eme? Nanị ndị ga-alanarị ga-abụ ndị ọ masịworo ịmata ihe ọ na-eme, meekwa ka ndụ ha kwekọọ n’ihe ọ chọrọ tupu mbibi ụwa ahụ abịaruo nso.
28. (a) Olee mgbe ichi Kraịst eze na ikewapụta ndị mmadụ nke mba nile na-ewere ọnọdụ? (b) Ya mere, gịnị dị mkpa ka i mee ngwa ngwa banyere ya n’onwe gị?
28 Ma olee mgbe ihe ndị a ga-ewere ọnọdụ? Olee mgbe e nyere Kraịst ike ịchị dị ka Eze na ịga n’ihu ikewapụta ndị mmadụ nke mba nile? Ihe ndị mere eme na-egosi na Chineke anọwo na-eme nke a n’oge narị afọ nke iri abụọ nke a. Kraịst anọkwasịworị n’ocheeze ya n’eluigwe, ọrụ nkewapụta nke a na-erukwa ngwụsị ya. Oge i nwere ịkwụnyere akụkụ Jehova n’ihe iseokwu ọkaaka eluigwe na ala dị mkpirikpi nke ukwuu. “Mkpagbu ukwu” ahụ dị oké nso! Inyocha amụma Bible n’ìhè nke akụkọ ihe ndị mere n’oge na-adịbeghị anya na-akwado eziokwu nke a. Anyị na-agba gị ume iji nlezianya nyochaa nke a.
[Foto dị na peeji nke 62]
Site n’ibinyere ụmụ mmadụ, onye ọchịchị ọhụrụ nke ụwa matara ihe a kpọrọ mmadụ nke ọma karị