-
Lidia—Onye Na-atụ Egwu Chineke Nke Na-ele ỌbịaỤlọ Nche—1996 | Septemba 15
-
-
Ime Nkwusa nke Pọl na Filipaị
Ihe dị ka n’afọ 50 O.A., Pọl zọrọ ụkwụ mbụ na Europe wee malite ime nkwusa na Filipaị.a Mgbe ọ bịarutere n’obodo ọhụrụ, ọ bụ omenala Pọl ije n’ụlọ nzukọ iji buru ụzọ meere ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu zukọrọ n’ebe ahụ nkwusa. (Tụlee Ọrụ 13:4, 5, 13, 14; 14:1.) Otú ọ dị, dị ka ụfọdụ ndị si kwuo, iwu ndị Rom machibidoro ndị Juu ikpe okpukpe ha “gburugburu ebe dị nsọ” nke Filipaị. Ya mere, mgbe ọ nọsịrị “ụbọchị ụfọdụ” n’ebe ahụ, n’Ụbọchị Izu Ike, ndị ozi ala ọzọ ahụ hụrụ otu ebe dị n’ụsọ otu osimiri n’èzí obodo ukwu ahụ ebe ‘ha chere na ebe ekpere dị.’ (Ọrụ 16:12, 13) O doro anya na nke a bụ Osimiri Gangites. N’ebe ahụ ndị ozi ala ọzọ ahụ hụrụ nanị ndị inyom, nke otu onye n’ime ha bụ Lidia.
-