ISI NKE 17
Ụzọ Isi Nwee Obi Ụtọ
N’ihi gịnị ka Jehova ji bụrụ “Chineke onye obi ụtọ”?
ANYỊ nile na-enwe mmasị inwe obi ụtọ, ọ́ bụghị ya?— Ma, ndị nwere obi ụtọ n’ezie adịghị ọtụtụ. Ị̀ ma ihe kpatara ya?— Ọ bụ n’ihi na ọtụtụ ndị amụtabeghị ụzọ isi nweta obi ụtọ. Ha chere na inwe ọtụtụ ihe bụ ụzọ e si enweta obi ụtọ. Ma mgbe ha nwetara ihe ndị a, obi ụtọ ha anaghị adịte aka.
Ka anyị hụ isi ihe dị mkpa nke na-eme ka e nwee obi ụtọ. Onye Ozizi Ukwu ahụ kwuru, sị: “A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Ya mere, gịnị bụ ụzọ isi nwee obi ụtọ?— Ee, ọ bụ site n’inye ndị ọzọ ihe na site n’imere ha ihe. Ị̀ ma?—
Ka anyị chebakwuoro nke a echiche. Jizọs ọ̀ sịrị na onye e nyere onyinye agaghị enwe obi ụtọ?— Ee e, o kwughị otú ahụ. Ị na-enwe mmasị inweta onyinye, ọ̀ bụ na ị dịghị enwe?— Ọ na-amasị onye ọ bụla. Obi na-atọ anyị ụtọ mgbe anyị nwetara ihe ndị dị mma.
Ma, Jizọs kwuru na anyị ga-enweta ọbụna obi ụtọ ka ukwuu mgbe anyị nyere ihe. N’uche gị, ònye ka ị ga-asị na ọ bụ ya nyeworo ndị mmadụ ihe karịa onye ọ bụla ọzọ?— Ee, ọ bụ Jehova Chineke.
Bible na-ekwu na Chineke “na-enye mmadụ nile ndụ na ume na ihe nile.” Ọ na-enye anyị mmiri ozuzo site n’eluigwe nakwa anwụ, ka ihe ọkụkụ wee na-eto, ka anyị nweekwa nri anyị ga-eri. (Ọrụ 14:17; 17:25) Ka a sịkwa ihe mere Bible ji kpọọ Jehova “Chineke onye obi ụtọ”! (1 Timoti 1:11) Inye ndị ọzọ ihe bụ otu n’ime ihe ndị na-enye Chineke obi ụtọ. Mgbe anyị nyekwara ndị ọzọ ihe, ọ pụkwara ime ka anyị nwee obi ụtọ.
Gịnị pụrụ inye gị obi ụtọ karịa nanị gị iricha nri nile unu siri?
Ma, olee ihe ndị anyị pụrụ inye ndị ọzọ? Olee ihe i chere?— Mgbe ụfọdụ, onyinye na-efu ego. Ọ bụrụ na ọ bụ onyinye ị zụtara n’ụlọ ahịa, ị ga-akwụ ụgwọ ya. Ya mere, ọ bụrụ na ị chọrọ inye mmadụ ụdị onyinye ahụ, ọ pụrụ ịdị mkpa na ị ga na-edokọ ego ruo mgbe i nwetara ego ga-ezuru gị iji zụta onyinye ahụ.
Ma, ọ bụghị onyinye nile ka a na-azụta azụta. Dị ka ihe atụ, n’ụbọchị anwụ na-achasi ike, otu iko mmiri jụrụ oyi na-eme n’ezie ka ahụ́ jụọ mmadụ oyi. Ya mere, mgbe i nyere onye akpịrị na-akpọ nkụ onyinye dị otú ahụ, ị pụrụ inweta obi ụtọ ahụ nke na-abịa site n’inye ihe.
Otu ụbọchị ma eleghị anya, gị na nne gị nwere ike isi ezigbo nri. Nke ahụ ga-abụ ihe na-enye obi ụtọ. Ma, olee ihe i nwere ike iji ụfọdụ n’ime nri ahụ mee bụ́ nke ga-eme ka i nwee obi ụtọ ọbụna karịa nanị gị iricha nri ahụ nile?— Ee, ị pụrụ inyetụ otu n’ime ndị enyi gị ụfọdụ n’ime nri ahụ. Ị̀ ga-eme ya otu ụbọchị?—
Onye Ozizi Ukwu ahụ na ndịozi ya ma obi ụtọ a na-enweta site n’inye ihe. Ị̀ ma ihe ha nyere ndị ọzọ?— Ọ bụ ihe kasị mma n’ụwa! Ha ma eziokwu banyere Chineke, ha jikwa obi ụtọ soro ndị ọzọ kerịta ozi ọma a. Ha mere nke a n’ekweghị ka onye ọ bụla nye ha ego maka ihe ha nyere ha.
Otu ụbọchị, Pọl onyeozi na ezigbo enyi ya, bụ́ Luk onye na-eso ụzọ, zutere otu nwanyị nke chọkwara inweta obi ụtọ nke na-abịa site n’inye ihe. Ha zutere ya na ndịda otu osimiri. Pọl na Luk gara ebe ahụ n’ihi na ha nụrụ na ọ bụ ebe a na-ekpe ekpere. N’eziokwu kwa, mgbe ha ruru, ha hụrụ ụfọdụ ndị inyom ka ha na-ekpe ekpere.
Pọl malitere izi ụmụ nwanyị ndị a ozi ọma banyere Jehova Chineke na Alaeze ya. Aha otu n’ime ha bụ Lidia, o gekwara ntị nke ọma. Mgbe e mesịrị, Lidia chọrọ ime ihe iji gosi na oziọma ahụ ọ nụrụ masịrị ya. Ya mere, ọ rụgidere Pọl na Luk, sị: “Ọ bụrụ na unu ewerewo m dị ka onye na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova, batanụ n’ime ụlọ m nọrọ.” O mekwara ka ha bịa n’ụlọ ya.—Ọrụ 16:13-15.
Gịnị ka Lidia na-agwa Pọl na Luk?
Lidia nwere obi ụtọ na ndị ohu Chineke ndị a bịara n’ụlọ ya. O nwere ịhụnanya n’ebe ha nọ n’ihi na ha nyeere ya aka ịmụta banyere Jehova na Jizọs nakwa otú ndị mmadụ pụrụ isi dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. O nwere obi ụtọ na ya nyere Pọl na Luk ihe oriri ka ha rie, nyekwa ha ebe ha ga-anọ zuo ike. Ya mere, Lidia nwetara obi ụtọ site n’ihe o nyere n’ihi na ọ chọrọ n’ezie inye ihe. Nke ahụ bụ ihe anyị kwesịrị ịdị na-echeta. Mmadụ pụrụ ịgwa anyị na anyị aghaghị inye onyinye. Ma, ọ bụrụ na anyị achọghị ime ya n’ezie, inye ihe ahụ agaghị eme ka anyị nwee obi ụtọ.
Gịnị mere Lidia ji nwee obi ụtọ inye Pọl na Luk ihe?
Dị ka ihe atụ, ọ bụrụkwanụ na i nwere swiiti ụfọdụ ị chọrọ ịracha? Ọ bụrụ na m gwa gị ka i nyetụ nwatakịrị ọzọ ụfọdụ n’ime ha, ị̀ ga-enwe obi ụtọ inyetụ ya?— Ma, ọ bụrụkwanụ na i ji swiiti ụfọdụ mgbe i zutere enyi gị ị hụrụ n’anya nke ukwuu? Ọ bụrụ na i kpebie n’onwe gị inyetụ enyi gị, nke ahụ ọ́ gaghị eme ka i nwee obi ụtọ?—
Mgbe ụfọdụ, anyị na-ahụ mmadụ n’anya nke ukwuu nke na anyị na-achọ inye ya ihe nile n’edebeghị ụfọdụ maka onwe anyị. Ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ na-ebukwu ibu, otú ahụ ka o kwesịrị ịdị na-adị anyị n’ebe Ọ nọ.
N’ihi gịnị ka nwanyị a dara ogbenye ji nwee obi ụtọ inyecha ihe nile o nwere?
Onye Ozizi Ukwu ahụ ma otu nwanyị dara ogbenye, onye ọ dị otú ahụ. Ọ hụrụ nwanyị ahụ n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Nwanyị ahụ nwere nanị ntakịrị mkpụrụ ego abụọ; ọ gwụla ihe o nwere. Ma nwanyị ahụ tụnyere ha abụọ n’ime igbe dị ka onyinye maka ụlọ nsọ ahụ. Ọ dịghị onye manyere ya ime ya. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị nọ n’ebe ahụ amadịghị ihe o mere. O mere ya n’ihi na ọ chọrọ ime ya nakwa n’ihi na ọ hụrụ Jehova n’anya n’ezie. O nyere ya obi ụtọ dị ukwuu na o nwere ike inye ihe.—Luk 21:1-4.
E nwere ọtụtụ ụzọ anyị pụrụ isi nye ihe. Ị̀ pụrụ icheta ụfọdụ n’ime ha?— Ọ bụrụ na anyị na-enye ihe n’ihi na anyị chọrọ n’ezie inye ihe, anyị ga-enwe obi ụtọ. Ọ bụ ya mere Onye Ozizi Ukwu ahụ ji na-agwa anyị, sị: “Na-enyenụ ihe.” (Luk 6:38) Ọ bụrụ na anyị na-enye ihe, anyị ga na-eme ka obi na-atọ ndị ọzọ ụtọ. Anyị ga-abụkwa ndị nwere obi ụtọ karịsịa!
Ka anyị gụkwuo banyere otú inye ihe na-esi eweta obi ụtọ, na Matiu 6:1-4; Luk 14:12-14; nakwa ná 2 Ndị Kọrint 9:7.