Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 11/1 p. 4-8
  • Eziokwu Banyere Ndị Mmụọ Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Eziokwu Banyere Ndị Mmụọ Ozi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ime Ka A Ghara Ịhụchazi Ọrụ Setan
  • Ekpere Nye Ònye?
  • Ndị Mmụọ Ozi Hà Bụ Ndị Na-enweghị Okpukpe?
  • ‘Nna Ụgha’
  • Ịgakwuru Ndị Mmụọ Ozi Ka Ọ Bụ Ndị Mmụọ Ọjọọ?
  • “Mmụọ Ozi nke Ìhè”
  • Otu ‘Mmụọ Ozi nke Na-efe n’Etiti Eluigwe’
  • Ndị Mmụọ Ozi Otú Ha Si Emetụta Ndụ Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ndị Mmụọ Ozi Bụ “Ndị Mmụọ Na-ejere Ọha Mmadụ Ozi”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Otú Ndị Mmụọ Ozi Pụrụ Isi Nyere Gị Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Olee Ndị Bụ Ndị Mmụọ Ozi?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 11/1 p. 4-8

Eziokwu Banyere Ndị Mmụọ Ozi

Ịmara mmadụ na-agụnyekarị ịmụ ihe banyere ezinụlọ onye ahụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ịmara Jehova Chineke. Ọ gụnyere ihe karịrị nanị ịmụta aha ya. Anyị aghaghịkwa ịmara ihe banyere “ezinụlọ” ya nọ n’eluigwe. (Tụlee Ndị Efesọs 3:14, 15.) Bible na-akpọ ndị mmụọ ozi “ụmụ” Chineke. (Job 1:6) N’ịtụle n’ime Bible òkè dị mkpa ha na-ekere, anyị kwesịrị ịchọ ịmakwu ihe banyere ha iji ghọta ọnọdụ ha ná nzube Chineke.

ỤKPỤRỤ omume ọhụrụ na-ebilite. Ọ bụghị nanị na ọtụtụ ndị mmadụ karị na-asị na ha kwenyere ná ndị mmụọ ozi; ọnụ ọgụgụ na-aba ụba na-azọrọ ịbụ ndị ha metụtaworo n’ụzọ ụfọdụ. Mgbe a jụrụ 500 ndị America sị, “Ì nwetụwo mmetụta nke ọnụnọ mmụọ ozi n’onwe gị ná ndụ gị?” ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ụzọ atọ n’ime ha zara ee. Ihe na-atụkwa n’anya bụ ọnụ ọgụgụ ndị ntorobịa na-asị na ha kwenyere ná ndị mmụọ ozi—dị ka otu njụta echiche e mere na United States si gosi, 76 pasent zuru ezu! N’ụzọ doro anya, ndị mmadụ nwere mmasị ná ndị mmụọ ozi. Ma olee otú echiche dị ugbu a banyere ndị mmụọ ozi si kwekọọ n’eziokwu Bible?

Ime Ka A Ghara Ịhụchazi Ọrụ Setan

Mgbe a na-ekwu okwu banyere ndị mmụọ ozi, anyị ekwesịghị ileghara ajọ ndị mmụọ ozi anya, ihe e kere eke nke eluigwe bụ́ ndị Bible na-asị na ha nupụụrụ Chineke isi. Onye mbụ n’ime ndị a bụ Setan. Otu akwụkwọ a ma ama a kpọrọ Ask Your Angels tụrụ aro na Setan bụ nanị “otu akụkụ nke Chineke” onye na-enyere ndị mmadụ aka ime ka “ike ime mmụọ” ha sie ike site n’ịnọgide na-anwa ha ọnwụnwa. N’agbanyeghị “nzube obi ịhụnanya” nke Setan, ka ndị dere ya kwuru, e jikọwo ya na ihe ọjọọ n’ụzọ hiere ụzọ ruo ọtụtụ narị afọ. Ha na-agbakwụnye na Setan na Jisọs, “ọ bụ ezie na ha adịghị akwadorịta ibe ha kpọmkwem, ọ dịkarịa ala ha nọ n’otu akụkụ ahụ, akụkụ dị mkpa nke otu onye ahụ.” Ndị a bụ okwu ndị na-atụ n’anya, ma gịnị ka Bible na-ekwu?

Bible na-eme ka o doo anya na Setan abụghị “otu akụkụ nke Chineke” kama onye iro Chineke. (Luk 10:18, 19; Ndị Rom 16:20) Ọ na-ama ịchịisi Jehova aka, nzube ya kwa n’ebe ndị mmadụ nọ abụtụghị nke “ịhụnanya.” Ọ na-eji obi ọjọọ awụkwasị ndị ohu Chineke nọ n’elu ala iwe ya. Ọ na-ebo ha ebubo n’ihu Chineke ehihie na abalị!a (Mkpughe 12:10, 12, 15-17) Nzube Setan bụ imerụ ha n’agbanyeghị ihe ọ bụla ọ ga-efu. Mkpagbu ọ kpagburu nwoke ezi omume ahụ bụ́ Job n’emeghị ebere kpughere omume obi ịta mmiri ya n’ebe nhụsianya mmadụ dị.—Job 1:13-19; 2:7, 8.

N’abụtụghị ndị ‘nọ n’otu akụkụ,’ Setan na Jisọs na-emegiderịta nnọọ onwe ha. Leenụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ Setan bụ onye kpaliri Herọd inye iwu ike igbusịsị ụmụ ọhụrụ—ha nile ná mgbalị igbu nwatakịrị ahụ bụ́ Jisọs! (Matiu 2:16-18) Ibu agha Setan n’esepụghị aka nọgidere ruo ọnwụ Jisọs. (Luk 4:1-13; Jọn 13:27) Otú a, kama ịbụ “akụkụ dị mkpa nke otu onye ahụ,” Jisọs na Setan dịrịtara nnọọ iche kpam kpam. Amụma Bible na-egosi na iro ha bụ nke a na-apụghị izere ezere. (Jenesis 3:15) N’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọ bụ Jisọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie ga-ebibi Setan n’oge a kara aka nke Chineke.—Mkpughe 1:18; 20:1, 10.

Ekpere Nye Ònye?

Ụfọdụ ndị na-akwado okwu banyere ndị mmụọ ozi na-ekwu na ntụgharị uche na usoro ndị ọzọ dị mma iji gwa ndị mmụọ ozi okwu. “Arịrịọ e ji ezi obi rịọ maka izute otu onye òtù nke ezinụlọ eluigwe agaghị abụ nke a ga-eleghara anya,” ka otu akwụkwọ na-ekwu. “Rịọ arịrịọ, a ga-azakwa gị ya.” Maịkael, Gebriel, Uriel, na Raphael so n’ime ndị mmụọ ozi akwụkwọ ahụ kwuru na ọ dị mma ịgakwuru.b

Otú ọ dị, Jisọs ziri ndị na-eso ụzọ ya ikpegara Chineke ekpere, ọ bụghị ndị mmụọ ozi. (Matiu 6:9, 10) N’otu aka ahụ, Pọl dere, sị: ‘N’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ.’ (Ndị Filipaị 4:6) Ya mere, n’ekpere ha ndị Kraịst adịghị agakwuru onye ọzọ ma e wezụga Jehova, ha na-emekwa otú ahụ n’aha Jisọs Kraịst.c—Jọn 14:6, 13, 14.

Ndị Mmụọ Ozi Hà Bụ Ndị Na-enweghị Okpukpe?

Dị ka Eileen Elias Freeman, onye isi oche òtù AngelWatch Network si kwuo, “ndị mmụọ ozi karịrị okpukpe ọ bụla, nkà ihe ọmụma ọ bụla, na okwukwe ọ bụla. N’ezie, ndị mmụọ ozi enweghị okpukpe ọ bụla dị ka anyị maara ya.”

Otú ọ dị, Bible na-eme ka o doo anya na ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi nwere okpukpe; ha na-efe ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, onye na-adịghị anakwere ịma aka site na chi ndị ọzọ. (Deuterọnọmi 5:6, 7; Mkpughe 7:11) Otú a, ụdị mmụọ ozi ahụ kọwaara Jọn onyeozi onwe ya dị ka “ohu ibe” nke ndị na-erube isi n’ihe ndị Chineke nyere n’iwu. (Mkpughe 19:10) Ọ dịghị ebe ọ bụla n’ime Bible anyị na-agụ banyere ndị mmụọ ozi na-ekwesị ntụkwasị obi ịkwado ụdị ofufe ọ bụla ọzọ. Ha na-enye Jehova ofufe a na-ekewaghị ekewa.—Ọpụpụ 20:4, 5.

‘Nna Ụgha’

Ọtụtụ n’ime ihe ndị ahụ a sịrị na ọ bụ izute ndị mmụọ ozi metụtara isoro ndị nwụrụ anwụ kwurịta okwu. “M na-eche na deede m achọtawo ụzọ isi rute m ma mee ka m mara na ya nwere obi ụtọ n’ikpeazụ,” ka otu nwanyị aha ya bụ Elise na-ekwu mgbe ọ natasịrị ihe o chere bụ ihe ịrịba ama. Terri n’otu aka ahụ na-echeta ezi enyi ya nwụrụnụ. “Otu izu mgbe e mesịrị ememe olili ozu ya,” ka o na-ekwu, “ọ bịakwutere m n’ihe m chere bụ nrọ. Ọ gwara m na m ekwesịghị iru újú ọpụpụ ya, n’ihi na o nwere obi ụtọ ma nọrọ n’udo.”

Ma Bible na-ekwu na ndị nwụrụ anwụ “adịghị ama ihe ọ bụla.” (Eklisiastis 9:5) Ọ na-asịkwa na mgbe mmadụ nwụrụ, “n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.” (Abụ Ọma 146:4, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Otú ọ dị, Setan bụ ‘nna ụgha.’ (Jọn 8:44) Ọ bụ onye malitere ụgha nke na mkpụrụ obi mmadụ na-alanarị ọnwụ. (Tụlee Ezikiel 18:4.) Ọtụtụ ndị taa na-ekwenye nke a, bụ́ nke dabara nke ọma ná nzube Setan, n’ihi na ọ na-emebi mkpa maka inwe okwukwe ná mbilite n’ọnwụ—ozizi gbara ọkpụrụkpụ nke Iso Ụzọ Kraịst. (Jọn 5:28, 29) Ya mere, ịjụ ndị nwụrụ anwụ ase ma ọ bụ ihe yiri ịnata ozi n’aka ha ka bụkwa akụkụ ọzọ nke ihe omume ndị mmụọ ozi nke Chineke na-akwadoghị.

Ịgakwuru Ndị Mmụọ Ozi Ka Ọ Bụ Ndị Mmụọ Ọjọọ?

Ihe dị ukwuu n’ihe omume ndị mmụọ ozi ugbu a na-etinye aka n’anwansi. Tụlee ahụmahụ Marcia. “Site na September ruo December 1986,” ka ọ na-ekwu, “m malitere ịnata ozi site ‘n’ike ka nke mmadụ.’ Ahụrụ m onyinyo ụgha ma rọọ nrọ dị ịtụnanya banyere ‘ndụ gaworo aga.’ M gakwuuru ndị enyi m nwụworonụ ma nwee ahụmahụ uche ndị ọzọ bụ́ ebe ndị m maara ihe banyere ndị m ka zutere. M ghọkwara onye e ji onyinye nke ide ihe m na-amaghị gọzie ma na-ezi ozi sitere n’aka ndị a na-adịghị ahụ anya. Ụfọdụ, ndị m na-ezutetụbeghị mbụ ná ndụ elu ala ha, ga-esi n’aka m zigara ndị ọzọ ozi.”

Ojiji a na-eji ịjụ ndị mmụọ ase eme ihe iji soro ndị mmụọ ozi “nwee nkwurịta okwu” bụ ihe dị ebe nile. Otu akwụkwọ na-agba ndị na-agụ ya ume hoo haa iji nkume majik, kaadị tarot, I Ching, mkpụrụ ego, ịgụ akara aka, na ịgụ kpakpando eme ihe. “Kwee ka mmadụ ime gị duga gị n’ezigbo agbara,” ka ndị dere ya dere, “ma nwee ntụkwasị obi na otu mmụọ ozi ga-ezute gị ebe ahụ.”

Otú ọ dị, dị ka Bible si kwuo, ihe ọ bụla ‘zutere gị ebe ahụ’ n’ezie abụghị otu n’ime ndị mmụọ ozi Chineke. N’ihi gịnị? N’ihi na ịjụ ndị mmụọ ase na-emegide Chineke, ndị na-efekwa ezi ofufe—n’eluigwe na n’elu ụwa—adịghị etinye aka na ya. N’Israel ịjụ ndị mmụọ ase bụ ịda iwu nke na-akpata ọnwụ! “Ihe arụ nke Jehova ka onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ,” ka Iwu ahụ kwuru.—Deuterọnọmi 13:1-5; 18:10-12.

“Mmụọ Ozi nke Ìhè”

Ọ gaghị eju anyị anya na Ekwensu pụrụ ime ka ịjụ ndị mmụọ ase yie ihe bara uru, ọbụna ihe si n’aka ndị mmụọ ozi. Bible na-ekwu na Setan “na-eme onwe ya ka o yie mmụọ ozi nke ìhè.” (2 Ndị Kọrint 11:14) Ọ pụrụ ọbụna imepụta ihe àmà ụfọdụ ma mezie ka ha mezuo, na-aghọgbu ndị na-ahụ ya iche na ihe ịrịba ama ahụ si n’aka Chineke. (Tụlee Matiu 7:21-23; 2 Ndị Tesalọnaịka 2:9-12.) Ma ọrụ nile nke Setan—n’agbanyeghị otú ha yiruru ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ—na-emezu otu n’ime nzube abụọ: ichigharị ndị mmadụ ihu megide Jehova ma ọ bụ nanị ime ka uche ha kpuo ìsì ka ‘ìhè nke ozi ọma nke ebube Kraịst wee ghara ịwakwasị ha.’ (2 Ndị Kọrint 4:3, 4) Ụzọ nghọgbu nke ikpeazụ a na-abụkarị nke kasị adị irè.

Tụlee ihe ndekọ Bible banyere otu nwa agbọghọ na narị afọ mbụ. Amụma ndị o buru wetaara ndị nwe ya uru dị ukwuu. Ruo ọtụtụ ụbọchị o soro ndị ahụ na-eso ụzọ n’azụ, na-asị: “Mmadụ ndị a bụ ndị ohu Chineke Onye kachasị ihe nile elu, ndị na-ekwusara unu ụzọ nzọpụta.” Ihe o kwuru bụ eziokwu. Ma, ihe ndekọ ahụ na-agwa anyị na ọ bụghị otu mmụọ ozi, kama “mmụọ nke a na-akpọ Paịtọn,” ji ya. N’ikpeazụ, Pọl “chigharịrị, sị mmụọ ahụ, Ana m enye gị iwu n’aha Jisọs Kraịst ka i si n’ime ya pụta. O wee pụta n’otu hour ahụ.”—Ọrụ 16:16-18.

N’ihi gịnị ka Pọl ji chụpụ mmụọ a? E kwuwerị, o wetaara ndị nwe nwa agbọghọ ahụ mmụọ ọjọọ ji ego dị ukwuu. Site n’ike ka nke mmadụ, nwa agbọghọ ahụ pụrụ ịgwaworị ndị ọrụ ugbo mgbe ha ga-agha mkpụrụ, ụmụ agbọghọ mgbe ha ga-alụ di, na ndị na-egwupụta akụ̀ ndị dị n’ala ebe ha ga-achọ ọlaedo. Leenụ, mmụọ a ọbụna kpaliri nwa agbọghọ a ikwu ụfọdụ ihe ndị bụ eziokwu, na-eto ndị ahụ na-eso ụzọ n’ihu ọha!

Ka o sina dị, ọ bụ “mmụọ nke a na-akpọ Paịtọn.” Ebe ọ dị otú ahụ, o nweghị ikike ime nkwupụta banyere Jehova na ndokwa ya maka nzọpụta. Okwu ịja mma ya, ikekwe nke e kwuru iji kwadoo amụma ndị nwa agbọghọ ahụ buru, dọpụrụ uche ndị na-ekiri ihe na-emenụ n’ebe ezi ndị na-eso ụzọ Kraịst nọ. Pọl nwere ezi ihe mere o ji dọọ ndị Kọrint aka ná ntị, sị: “Unu apụghị iketa table Onyenwe anyị na table ndị mmụọ ọjọọ.” (1 Ndị Kọrint 10:21) Ọ bụghị ihe ijuanya na ndị Kraịst nke narị afọ mbụ bibisịrị akwụkwọ ha nile metụtara ịjụ ndị mmụọ ase.—Ọrụ 19:19.

Otu ‘Mmụọ Ozi nke Na-efe n’Etiti Eluigwe’

Dị ka anyị hụworo, Bible na-ekpughe ọtụtụ ihe banyere ihe omume ndị mmụọ ozi ndị e nwere ugbu a ịbụ ihe ya na Onye Iro Chineke, bụ́ Setan Ekwensu, nwere njikọ chiri anya. Nke a ọ̀ pụtara na ndị mmụọ ozi dị nsọ adịghị etinye aka n’ihe omume ụmụ mmadụ? N’ụzọ dị iche, ha na-arụ ọrụ dị ike n’elu ụwa ugbu a. Gịnị ka ọ bụ? Iji zaa ya, anyị aghaghị ilenye anya n’akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe. A kpọtụrụ ndị mmụọ ozi aha ọtụtụ ugboro n’akwụkwọ a karịa n’akwụkwọ ọ bụla ọzọ nke Bible.

Ná Mkpughe 14:6, 7, anyị na-agụ ihe ndekọ Jọn onyeozi nke ọhụụ amụma ọ natara: “M wee hụ mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efe n’etiti eluigwe, na-enwe ozi ọma ebighị ebi izisara ndị na-anọdụ n’elu ụwa, bụ́ mba nile ọ bụla na ebo nile ọ bụla na asụsụ nile ọ bụla na ndị nile ọ bụla; ọ na-ewerekwa oké olu sị, Tụọnụ egwu Chineke, nyekwa Ya otuto; n’ihi na oge hour nke ikpe Ya abịawo: kpọọkwanụ isiala nye Ya, bụ́ Onye kere eluigwe na ala na oké osimiri na isi iyi nile nke mmiri nile.”

Akụkụ akwụkwọ nsọ a na-eme ka ọrụ kasị mkpa nke ndị mmụọ ozi pụta ìhè. Ha na-arụ ọrụ dị oké mkpa—nke ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ bụ banyere ọrụ a ka Jisọs kwere ndị na-eso ụzọ ya nkwa, sị: “Mụ onwe m nọnyeere unu ụbọchị nile, ruo ọgwụgwụ oge a.” (Matiu 28:18-20) Olee otú Jisọs na-esi anọnyere ndị na-eso ụzọ ya? Otu ụzọ bụ site n’inye ha enyemaka ndị mmụọ ozi ka e wee rụzuo nnukwute ọrụ a.

Ndịàmà Jehova na-etinye ihe karịrị otu ijeri hour kwa afọ n’ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Mgbe ha na-arụ ọrụ a, ha na-ahụ ihe àmà nke nduzi ndị mmụọ ozi. N’ozi ụlọ n’ụlọ ha, o mewo mgbe mgbe na ha zutere ndị ka nọworo na-ekpe ekpere ka mmadụ nyere ha aka ịghọta nzube nile nke Chineke. Nduzi ndị mmụọ ozi, tinyere Ndịàmà n’onwe ha ibu ụzọ mee ihe, akpatawo ọtụtụ narị puku inwe ihe ọmụma banyere Jehova kwa afọ!

Ị̀ na-ege mmụọ ozi ahụ na-efe n’etiti eluigwe ntị? Mgbe Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ gị, gịnị ma ọ bụrụ na i soro ha kwurịta ozi nke mmụọ ozi a n’ụzọ zuru ezu karị?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Okwu ndị ahụ bụ́ “Setan” na “Ekwensu” pụtara “onye nguzogide” na “onye nkwutọ.”

b Ọ bụ ezie na a kpọtụrụ Maịkael na Gebriel aha n’ime Bible, aha Raphael na Uriel pụtara n’ime akwụkwọ Apọkrịfa, ndị na-abụghị akụkụ Bible n’ezie.

c Rịba ama na a na-ekpe ekpere site na Jisọs, ọ bụghị nye ya. A na-ekpe ekpere n’aha Jisọs n’ihi na ọbara ya a wụfuru meghere ụzọ ịgakwuru Chineke.—Ndị Efesọs 2:13-19; 3:12.

[Igbe dị na peeji nke 8]

OLEE NDỊ BỤ NDỊ MMỤỌ OZI?

N’ỤZỌ dị iche n’ihe ọtụtụ ndị kwenyere, ndị mmụọ ozi abụghị mkpụrụ obi pụrụ apụ nke ndị mmadụ nwụworonụ. N’ụzọ doro anya Bible na-ekwu na ndị nwụrụ anwụ “adịghị ama ihe ọ bụla.” (Eklisiastis 9:5) Mgbe ahụ, olee ebe ndị mmụọ ozi si bịa? Bible na-egosi na Chineke kere ha n’otu n’otu tupu a tọọ ntọala ụwa. (Job 38:​4-⁠7) Otú ezinụlọ eluigwe nke Chineke hà pụrụ ịbụ ọtụtụ narị nde, ma eleghị anya ọtụtụ ijeri ma ọ bụ karịa! Ụfọdụ ndị mmụọ ozi sonyeere Ekwensu ná nnupụisi ya​—⁠Daniel 7:10: Mkpughe 5:11; 12:7-⁠9.

Ebe ọ bụ na Jehova abụghị Chineke nke aghara, ọ bụghị ihe ijuanya na ezinụlọ ya buru ibu nke ndị mmụọ ozi mejupụtara bụ nke a haziri ahazi.​—⁠1 Ndị Kọrint 14:33.

• Mmụọ ozi mbụ, ma n’ume ma n’ikike, bụ onyeisi mmụọ ozi, Jisọs Kraịst, onye a na-akpọkwa Maịkael. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:16; Jud 9) Ndị nọ n’okpuru ikike ya bụ ndị seraph, ndị cherub, na ndị mmụọ ozi.

• Ndị seraph na-eje ozi n’ocheeze Chineke. O doro anya na ọrụ ha gụnyere ikwusa ịdị nsọ Chineke na ime ka ndị ya dị ọcha.​—⁠Aịsaịa 6:​1-3, 6, 7.

• Ndị cherub ka a hụkwara n’ihu Jehova. Dị ka ndị na-ebu ma ọ bụ na-anọdebe ocheeze Chineke, ha na-akwado ịdị ebube nke Jehova.​—⁠Abụ Ọma 80:1; 99:1; Ezikiel 10:​1, 2.

• Ndị mmụọ ozi (nke pụtara “ndị na-aga ozi”) bụ ndị ozi ma ọ bụ ndị enyemaka nke Jehova. Ha na-emezu uche Chineke, ma ọ̀ gụnyere ịgbapụta ndị Chineke ma ọ bụ mkpochapụ nke ndị ajọ omume.​—⁠Jenesis 19:​1-⁠26.

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ị̀ na-ege mmụọ ozi ahụ na-efe n’etiti eluigwe ntị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya