Inye Ihe Ochie Ndị Dị Nsọ Ofufe Ọ̀ Na-amasị Chineke?
ỌBARA nke “San Gennaro,” nke a sịrị na ọ na-adịghachi mmiri mmiri ihe dị ka ugbo atọ kwa afọ, bụ otu n’ime ọtụtụ ihe nsọ ochie nke okpukpe e nwere. Otú ahụ kwa ka ọ dị n’ihe banyere Ákwà Mfụchi nke Turin, bụ́ nke a sịrị na ọ bụ n’ime ya ka a fụchiri anụ ahụ Jisọs Kraịst. Ụfọdụ n’ime ihe nsọ ochie ndị e jikọrọ ha na Jisọs bụ ihe ahụ a sị na ọ bụ àkwà o dinara na ya mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ (nke dị n’otu nnukwu ụlọ basilika dị na Rom), akwụkwọ o ji mụọ otú e si asụpe okwu, na ihe karịrị otu puku ntú ndị a sịrị na e jiri mee ihe n’ogbugbu ya! Ihe nsọ ochie nke okpukpe gụnyekwara ọtụtụ isi Jọn Onye Na-eme Baptism na n’ebe dị iche iche na Europe, ozu anọ ndị e kwuru na ha bụ “Santa Lucia.”
Otu n’ime obodo ndị a ma nnọọ ama banyere ihe nsọ ochie bụ Trier, Germany, ebe e chekwara otu n’ime ọtụtụ “uwe mwụda nsọ”—uwe ime ahụ na-enweghị ebe a dụkọtara ya adụkọta nke Jisọs Kraịst yiri. Na Vatican City n’onwe ya, e nwere ihe karịrị otu puku ihe nsọ ochie ndị dị n’otu ụlọ nkwakọba ihe ochie pụrụ iche. E debere ọtụtụ puku ihe nsọ ochie nke okpukpe na chọọchị nke “Senti Ursula” nke dị na Cologne, Germany. E nwere ọtụtụ ebe ndị ọzọkwa. Ee, n’Itali nanị, e nwere 2,468 ebe dị iche iche a kpọrọ ebe nsọ ebe ndị e debere ihe nsọ ochie nke okpukpe!
A na-eche na a malitere inye ihe nsọ ochie nke okpukpe oké nsọpụrụ kemgbe narị afọ nke anọ nke Oge Anyị, dịkwa ka ọ dị ofufe a na-enye “ndị senti.” N’ihi ihe metụtara okpukpe, akụ na ụba, na ọbụna ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọnụ ọgụgụ ihe nsọ ochie ejiwo nke nta nke nta mụbaa n’ime ọtụtụ narị afọ gafeworonụ, e nwekwara ọtụtụ puku taa. Nzukọ Kansụl Vatican nke Abụọ mesighachiri ya ike na “dị ka omenala ya si dị, Chọọchị ahụ na-enye ndị senti ofufe, na-asọpụrụkwa ihe nsọ ochie dị iche iche ndị ziri ezi na ihe oyiyi ha.” (Constitution “Sacrosanctum Concilium” sulla sacra Liturgia, nke dị na I Documenti del Concilio Vaticano II, 1980, Edizioni Paoline E hotara “ihe nsọ ndị ahụ dị ebube, tinyekwara ndị ahụ ọha mmadụ na-enye nsọpụrụ,” n’ime Codex Iuris Canonici (Ndepụta nke Iwu Chọọchị) nke John Paul nke Abụọ mebere na 1983. (Canon 1190). Ndị Anglican na ndị nọ na chọọchị Orthodox dị iche iche na-asọpụrụkwa ihe nsọ ochie.
Ebe e nwere ọtụtụ ntú otú a ndị e ji kpọgbuo Kraịst, na ọtụtụ isi nke Jọn Onye Na-eme Baptism dị adị, ọ bụ ihe doro anya na ihe nsọ ochie nke okpukpe na-abụkarị wayo. Dị ka ihe atụ, iji usoro radiocarbon na-achọpụta mgbe ihe dịrị gosiri na ákwà mfụchi nke Turin ahụ bụ nke wayo. Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịhụ na n’oge e nwere oké nrụrịta ụka banyere ya na 1988, onye ahụ a ma ama nke na-akọ banyere ihe na-eme na Vatican, bụ́ Marco Tosatti jụrụ, sị: “Ọ bụrụ na e jiri usoro nnyocha nkà mmụta sayensị ndị e jiri mee ihe banyere Ákwà Mfụchi ahụ mee ihe banyere ihe ndị ọzọ ọha mmadụ na-efe ofufe, gịnị ka a ga-achọpụta?”
O doro anya na ọ dịghị onye ọ bụla maara ihe nke ga-achọ ife ihe nsọ ochie nke ụgha ofufe. Ma nke ahụ ọ̀ bụ nanị ihe a ga-atụle?
Gịnị Ka Bible Na-ekwu?
Bible ekwughị na ndị nwere ihu ọma Chineke, bụ́ ụmụ Israel oge ochie, fere ihe nsọ ochie okpukpe ofufe n’oge ha nọ n’agbụ n’Ijipt. N’eziokwu, nna ochie ahụ bụ Jekọb nwụrụ n’Ijipt, e burukwara ozu ya gaa n’ala Kenean maka olili “n’ọ́gbà nke dị n’ọhịa Makpila.” Nwa ya nwoke bụ Josef nwụkwara n’Ijipt, e mesịkwara chịrị ọkpụkpụ ya gaa Kenean maka olili. (Jenesis 49:29-33; 50:1-14, 22-26; Ọpụpụ 13:19) Otú ọ dị, Akwụkwọ nsọ adịghị ekwu ihe ọ bụla gosiri na ọ dị mgbe ọ bụla ụmụ Israel fere ozu Jekọb ma ọ bụ nke Josef ofufe dị ka ihe nsọ ochie nke okpuke.
Tụleekwa ihe mere n’okwu banyere Mosis onye amụma. N’okpuru nduzi Chineke, o duziri ụmụ Israel ruo 40 afọ. Mgbe ahụ, mgbe ọ gbara 120 afọ, ọ rịgoro Ugwu Nebo, wee kirie Ala Nkwa ahụ, wee nwụọ. Maịkael onye isi ndị mmụọ ozi sooro Ekwensu rụrịta ụka banyere ozu Mosis, e mebikwara mgbalị ọ bụla Setan pụrụ imeworị iji ya rara ụmụ Israel banye n’ife ihe nsọ ochie ofufe. (Jud 9) Ọ bụ ezie na o kwere nghọta na ha ruru újú n’oge ọnwụ Mosis, ọ dịghị mgbe ọ bụla ha fere ozu ya ofufe. N’eziokwu, Chineke mere ka ihe dị otú ahụ ghara ikwe omume site n’ili Mosis n’ili a na-akaghị akara n’otu ebe ụmụ mmadụ na-amaghị ama.—Deuterọnọmi 34:1-8.
Ụfọdụ ndị na-akwado ife ihe nsọ ochie ofufe na-akpọtụ uche ná 2 Ndị Eze 13:21, nke na-agụ, sị: “O ruo, mgbe ha na-eli otu nwoke, lee, ha hụrụ usuu ndị na-apụnara mmadụ ihe; ha wee tụba nwoke ahụ n’ili [onye amụma bụ] Elaịsha: nwoke ahụ wee daa, metụ ọkpụkpụ Elaịsha ahụ, wee dị ndụ, bilie guzoo n’ụkwụ ya abụọ.” Nke a bụ ọrụ ebube nke metụtara ọkpụkpụ na-adịghị ndụ nke otu n’ime ndị amụma Chineke. Ma Elaịsha anwụwo, ‘ọ maghịkwa ihe ọ bụla’ n’oge ọrụ ebube ahụ. (Eklisiastis 9:5, 10) Ya mere, ihe kpatara mbilite n’ọnwụ nke a aghaghị ịbụ ike na-arụ ọrụ ebube nke Jehova Chineke, onye ji mmụọ nsọ ya, ma ọ bụ ike ọrụ ya, rụzuo ya. Ọ bụkwa ihe kwesịrị ịrịba ama na Akwụkwọ nsọ adịghị ekwu na ọ dị mgbe ọ bụla e fere ọkpụkpụ Elaịsha ofufe.
Ụfọdụ ndị nọ na Krisendọm na-akwado inye ihe nsọ ochie ofufe n’ihi ihe e kwuru n’Ọrụ Ndị Ozi 19:11, 12, ebe anyị na-agụ, sị: “Chineke na-arụkwa ọrụ dị ike site n’aka Pọl [onyeozi] dị ka a na-ahụghị mgbe ọ bụla: ya mere a na-esi n’ahụ ya wetara ndị ahụ ha na-adịghị ike ịchafọ ma ọ bụ ákwà apron, ọrịa ha wee laa n’ahụ ha, ajọ mmụọ nile apụtakwa.” Biko rịba ama na ọ bụ Chineke rụrụ ọrụ ndị a dị ebube site n’aka Pọl. Onyeozi ahụ n’onwe ya arụghị ọrụ ndị ahụ n’adabereghị n’onye ọ bụla ọzọ, ọ dịghịkwa mgbe ọ naara ofufe site n’aka mmadụ ọ bụla.—Ọrụ 14:8-18.
Ihe Megidere Ozizi Bible
N’eziokwu, ife ihe nsọ ochie nke okpukpe ofufe megidere ozizi dị iche iche nke Bible. Dị ka ihe atụ, otu isi ihe a na-apụghị ilefuru anya n’ofufe dị otú ahụ bụ nkwenye e kwenyere n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi mmadụ. Ọtụtụ nde ndị na-ejesi chọọchị ike kwenyere na mkpụrụ obi nke ndị nile e meworo ka ha bụrụ ndị nsọ, ndị a na-enyekwa ofufe dị ka “ndị senti” dị ndụ n’eluigwe. Ndị a, bụ́ ndị nwere obi eziokwu, na-ekpegara “ndị senti” dị otú a ekpere, na-achọ nchebe ha, na-arịọkwa ka ha kwuchitere ndị ahụ na-arịọ arịrịọ ọnụ ha n’ebe Chineke nọ. N’ezie, dị ka otu akwụkwọ okpukpe si kwuo, ndị Katọlik na-ekwu na ihe nsọ ochie nwere “ikike nkwuchite ọnụ nke Onye Senti ahụ n’ebe Chineke nọ.”
Otú ọ dị, dị ka Bible si kwuo, mkpụrụ obi mmadụ abụghị ihe na-adịghị anwụ anwụ. Ụmụ mmadụ enweghị mkpụrụ obi n’ime onwe ha, bụ́ nke na-adịghị anwụ anwụ, nke nwekwara ike ịdị adị mgbe e kewara ya na anụ ahụ mgbe a nwụsịrị. Kama nke ahụ, Akwụkwọ nsọ na-asị: “Jehova, bụ́ Chineke, wee were ájá sitere n’ala kpụọ mmadụ, o wee kuo ume ndụ nye n’oghere imi ya abụọ; mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.” (Jenesis 2:7) Kama ịkụzi na ụmụ mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ, Bible na-asị: “Mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ.” (Ezikiel 18:4) Nke a metụtara ụmụ mmadụ dum—gụnyere ndị ahụ e mesịrị doo nsọ dị ka “ndị senti”—n’ihi na anyị nile eketawo mmehie na ọnwụ site ná mmadụ mbụ ahụ, bụ́ Adam.—Ndị Rom 5:12.
Ife “ndị senti” ofufe kwesịrị ka e zere ya n’ihi na ọ dịghị mgbe ọ bụla e nyere ha ikike ikwuchitere onye ọ bụla ọnụ ya n’ebe Chineke nọ. Jehova Chineke enyewo iwu na ọ bụ nanị Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, pụrụ ime nke a. Pọl onyeozi kwuru na Jisọs “abụghị nanị na ọ nwụrụ n’ihi anyị—o bilitere site n’ọnwụ, n’ebe ahụkwa n’aka nri Chineke ọ na-eguzo, na-arịọrọ anyị arịrịọ.”—Ndị Rom 8:34, The Jerusalem Bible; tụlee Jọn 14:6, 14.
Ihe ọzọ mere a ga-eji zere ife “ndị senti” na ihe nsọ ochie nke okpukpe ofufe, bụ́ ndị e jikọrọ ha na ha, dabeere n’ihe Bible kwuru banyere ikpere arụsị. Otu n’ime Iwu Iri ahụ e nyere ụmụ Israel kwuru, sị: “Gị emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, ma ọ bụ oyiyi nke ụdị ọ bụla nke dị n’eluigwe n’elu, ma ọ bụ nke dị n’ụwa n’okpuru ya, ma ọ bụ nke dị ná mmiri n’okpuru ụwa: gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe: n’ihi na mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, bụ Chineke ekworo [“nke na-achọ ka a rara ofufe nye nanị ya,” NW].” (Ọpụpụ 20:4, 5) Mgbe ọtụtụ narị afọ gasịrị, Pọl onyeozi gwara ndị Kraịst ibe ya, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, gbanarịnụ ikpere arụsị.” (1 Ndị Kọrint 10:14) N’otu aka ahụ, Jọn onyeozi dere, sị: “Ụmụntakịrị m, cheenụ onwe unu nche ka unu ghara ikpere arụsị.”—1 Jọn 5:21.
Ya mere, inye “ndị senti” e doro nsọ na ihe nsọ ochie nke okpukpe oké nsọpụrụ enweghị nkwado ọ bụla n’ime Bible. Otú ọ dị, ụfọdụ ndị na-achọ inwe ihe a na-ele anya dị ka ihe dị nsọ nke a pụrụ ịhụ anya, bitụkwa aka, nke e chekwara na o nwere ike nzọpụta. N’eziokwu, ọtụtụ ndị na-ele ihe nsọ ochie nke okpukpe anya dị ka ihe njikọ a na-ahụ anya ná nkekọ ahụ dị n’etiti eluigwe na ala. Biko tụgharịa uche ruo nwa mgbe n’isi ihe nke a.
Ọ bụghị site n’ịhụ ihe nsọ ochie okpukpe anya na ibitụ ha aka ka mmadụ na-eme ihe kwekọrọ n’okwu Jisọs banyere ofufe nke Chineke na-achọ. Jisọs sịrị: “Oge hour na-abịa, ugbu a ka ọ dịkwa, mgbe ndị na-akpọ isiala n’ezie ga-akpọ isiala nye Nna m n’ime mmụọ na eziokwu: n’ihi na ndị dị otú ahụ ka Nna m na-achọkwa ka ha bụrụ ndị na-akpọ isiala nye ya. Chineke bụ mmụọ: ndị na-akpọkwa isiala nye ya aghaghị ịkpọ isiala n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:23, 24) Jehova Chineke bụ “mmụọ,” nke anya ụmụ mmadụ na-apụghị ịhụ. Ife ya ofufe “n’ime mmụọ” pụtara na ozi dị nsọ anyị na-ejere Chineke bụ nke obi nke jupụtara n’ịhụnanya na okwukwe kpaliri. (Matiu 22:37-40; Ndị Galetia 2:16) Anyị apụghị ife Chineke ‘n’eziokwu’ site n’ife ihe nsọ ochie ofufe, kama ọ bụ nanị site n’ịjụ okwu ụgha nile nke okpukpe, na-amụta ihe bụ uche ya dị ka e kpughere ya n’ime Bible, na-emekwa ya.
N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya na onye ọkà mmụta bụ Jemes Bentley kwenyere na ‘ndị Hibru oge ochie emeghị omume nke ife ihe nsọ ochie ofufe.’ O kwukwara na n’ime narị afọ anọ malite n’ọnwụ Stifen ruo mgbe Lucian gwupụtaghachiri ozu ya, àgwà ndị Kraist n’ebe ihe nsọ ochie dị gbanwere kpam kpam. Otú ọ dị, ka ọ na-erule narị afọ nke ise O.A., Krisendọm nke siworo n’ezi ofufe dapụ akwụsịworị ịrapagide n’ozizi Bible ndị doro anya banyere ikpere arụsị, ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, na ọnọdụ Jisọs Kraịst dị ka onye ‘na-arịọrọ anyị arịrịọ.’—Ndị Rom 8:34; Eklisiastis 9:5; Jọn 11:11-14.
Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ofufe anyị bụrụ ihe na-amasị Chineke, anyị aghaghị ijide n’aka na e jikọtaghị ya na ụdị ọ bụla nke ikpere arụsị. Iji bụrụ nke a na-anara nke ọma, ofufe anyị aghaghị ịgara Onye Okike ahụ, bụ́ Jehova Chineke, ọ bụghị ihe nsọ ochie ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke. (Ndị Rom 1:24, 25; Mkpughe 19:10) Anyị aghaghịkwa inweta ezi ihe ọmụma nke Bible, wulitekwa okwukwe siri ike. (Ndị Rom 10:17; Ndị Hibru 11:6) Ọ bụrụkwa na anyị na-eje ije n’ụzọ nke ezi ofufe, anyị ga-eme omume n’ụzọ kwekọrọ n’ihe àmà hiri nne nke Akwụkwọ nsọ nke na-egosi na inye ihe nsọ ochie ofufe adịghị amasị Chineke.
[Foto dị na peeji nke 5]
Ọ dịghị mgbe e fere ọkpụkpụ Elaịsha ofufe, ọ bụ ezie na ha keere òkè n’otu mbilite n’ọnwụ