Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 1/15 p. 10-15
  • Na-ezi Ihe n’Ihu Ọha na Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-ezi Ihe n’Ihu Ọha na Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụzọ Ndị Ozi Si Mee Ihe
  • Ọ Dịghị Ihe E Ji Edochi Anya Ya
  • Ndị Okenye Ga Na-ebute Ụzọ
  • Onye Ọ Bụla Bụ Onyeàmà
  • Ịgba Àmà Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ
    Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Gịnị Mere Ozi Ụlọ n’Ụlọ Ji Dị Mkpa n’Oge A?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Kpebisie Ike Ịgbasi Àmà Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • “Rụọ Ọrụ Onye Na-ezisa Ozi Ọma”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 1/15 p. 10-15

Na-ezi Ihe n’Ihu Ọha na Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ

“Egwu emeghị m ka m laa azụ . . . izi unu ihe n’ihu ọha na site n’ụlọ ruo n’ụlọ.”—ỌRỤ 20:20, “Byington.”

1. Olee ụzọ otu onye ụkọchukwu Katọlik si kwuo okwu n’ịdị irè nke ije ozi site n’ụlọ ruo n’ụlọ nke Ndịàmà Jehova?

“NDỊ Katọlik Ejiri Oziọma ahụ Na-aga Site n’Ụlọ ruo n’Ụlọ.” Otú ahụ ka e dere n’otu isiakụkọ dị n’akwụkwọ akụkọ The Providence Sunday Journal nke October 4, 1987. Akwụkwọ akụkọ ahụ kọrọ na otu nzube bụ isi nke ọrụ nke a bụ iji “kpọọ ụfọdụ n’ime ndị òtù ha na-adịghị abịachikwa chọọchị anya ka ha maliteghachi ịbịachi anya.” E hotara ihe onye ụkọchukwu bụ John Allard, bụ́ onye isi nke ụlọ ọrụ Office for Evangelization in the Diocese of Providence kwuru, sị: “N’ezie, a gaje inwe ịrụ ụka dị ukwuu. Ụmụ mmadụ gaje ịsị, ‘Lekwa ka ha na-aga, dị nnọọ ka Ndịàmà Jehova.’ Ma Ndịàmà Jehova dị irè, ọ́ bụghị otú ahụ? Ana m agwasi gị ike na ị pụrụ ịbanye n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze nke ọ bụla dị na steti [nke Rhode Island, U.S.A.,] ma hụ ọgbakọ nke jupụtara ná ndị bụbu ndị Katọlik.”

2. Ajụjụ dị aṅaa ka a na-ewelite n’ụzọ kwesịrị ekwesị?

2 Ee, a maara Ndịàmà Jehova nke ọma maka ije ozi dị irè ha na-eje site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ma ọ̀ bụ n’ihi gịnị ka ha na-eji eje site n’ụlọ ruo n’ụlọ?

Ụzọ Ndị Ozi Si Mee Ihe

3. (a) Ọrụ dị aṅaa ka Jisọs Kraịst nyere ndị na-eso ụzọ ya? (b) Olee ụzọ bụ isi ndị na-eso ụzọ Kraịst n’oge gboo si rụzuo ọrụ ha?

3 Jisọs Kraịst nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ nke a bara uru, sị: “Ya mere, gaanụ mee [“ndị nke,” NW] mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke mmụọ nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke m nyere unu n’iwu: ma lee, mụ onwe m nọnyeere unu ụbọchị nile, ruo ọgwụgwụ oge a.” (Matiu 28:19, 20) Ụzọ bụ isi a ga-esi rụọ ọrụ ahụ pụtara ìhè ozugbo ụbọchị Pentikọst nke 33 O.A. gasịrị. “Kwa ụbọchị n’ụlọ nsọ ahụ, sitekwa n’ụlọ ruo n’ụlọ ha nọgidere n’alaghị azụ na-ezi ihe, na-ekwusakwa ozi ọma ahụ banyere Kraịst, Jisọs.” (Ọrụ 5:42, NW) Mgbe ihe dị ka 20 afọ gasịrị, Pọl onyeozi na-ekere òkè n’ije ozi site n’ụlọ ruo n’ụlọ, n’ihi na o chetaara ndị okenye bụ ndị Kraịst, ndị si obodo Efesọs, sị: “Alaghị m azụ n’ịgwa unu nke ọ bụla n’ihe ndị ga-abara unu uru ma ọ bụkwanụ site n’izi unu ihe n’ihu ọha nakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ.”—Ọrụ 20:20, NW.

4. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na Ọrụ Ndị Ozi 5:42 na Ọrụ Ndị Ozi 20:20 pụtara na e kesara nkwusa nke ndị na-eso ụzọ Jisọs site n’ụlọ ruo n’ụlọ?

4 N’Ọrụ Ndị Ozi 5:42, a sụgharịtara okwu ahụ bụ “site n’ụlọ ruo n’ụlọ” site n’okwu ahụ bụ́ kat’ oiʹkon. N’ebe a, e jiri okwu ahụ bụ́ ka·taʹ mee ihe n’echiche nke na-egosi “nkesa.” Ya mere, e kesara nkwusa nke ndị ahụ na-eso ụzọ site n’otu ụlọ ruo n’ụlọ ọzọ. N’ikwu okwu banyere Ọrụ Ndị Ozi 20:20, Randolph O. Yeager dere na Pọl kụziri ihe “ma ná nzukọ ihu ọha [de·mo·siʹa] nakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ (n’echiche nke ikesa ihe [ka·taʹ] nakwa nke na-egosi ihe e mere ihe banyere ya kpọmkwem). Pọl anọwo afọ atọ n’Efesọs. O jere n’ụlọ nke ọ bụla, ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ, o kwusaara ndị nile ozi ọma (amaokwu 26). N’ebe a ka e nwere nkwado akwụkwọ nsọ maka mgbasa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ tinyekwara nke ahụ a na-eme ná nzukọ ihu ọha dị iche iche.”

5. N’Ọrụ Ndị Ozi 20:20, n’ihi gịnị ka o ji bụrụ na Pọl adịghị ezo aka nanị ná nleta efu o jere n’ụlọ ndị okenye ma ọ bụ ná nleta ọzụzụ atụrụ?

5 A na-ahụ ụzọ yiri nke ahụ e si jiri ka·taʹ mee ihe na Luk 8:1 [NW], bụ́ nke na-ekwu okwu banyere nkwusa Jisọs kwusara “site n’obodo ruo n’obodo, sitekwa n’obodo nta ruo n’obodo nta ọzọ.” Pọl jiri ụdị okwu kat’ oiʹkous nke na-egosi ọtụtụ ihe mee ihe n’Ọrụ Ndị Ozi 20:20. N’ebe a, ụfọdụ nsụgharị Bible na-agụ “n’ebe obibi unu dị iche iche.” Ma ihe onyeozi ahụ na-ezo aka na ya n’ebe a abụghị nanị ije nleta nkịtị n’ụlọ ndị okenye ma ọ bụ nleta ọzụzụ atụrụ n’ụlọ ndị kwere ekwe ibe ya. Okwu ndị ọzọ o kwuru na-egosi na ihe ọ na-ekwu okwu banyere ya bụ ije ozi site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’etiti ndị na-ekweghị ekwe, n’ihi na ọ sịrị: “Ma agbasiiri m ma ndị Juu ma ndị Grik àmà ike banyere nchegharị n’ebe Chineke nọ nakwa inwe okwukwe n’Onyenwe anyị Jisọs.” (Ọrụ 20:21, NW) Ndị kwere ekwe ibe ya echegharịworị, na-etinyekwa okwukwe na Jisọs. Ya mere, ma Ọrụ Ndị Ozi 5:42 ma Ọrụ Ndị Ozi 20:20 na-ekwu okwu banyere ikwusara ndị na-ekweghị ekwe ozi ọma “site n’ụlọ ruo n’ụlọ” ma ọ bụ site n’otu ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ ọzọ.

Ọ Dịghị Ihe E Ji Edochi Anya Ya

6. Gịnị ka e kwuworo banyere ọdịdị nke ọrụ nkwusa Pọl rụrụ n’Efesọs?

6 N’ikwu okwu banyere okwu ndị ahụ Pọl kwuru n’Ọrụ Ndị Ozi 20:20, na 1844, Abiel Abbot Livermore dere, sị: “Ọ naghị ezuru ya nanị ikwu okwu ihu ọha ná mgbakọ ọha, wee hapụ ụzọ ndị ọzọ a pụrụ isi mee ihe, kama o jiri ịnụ ọkụ n’obi na-arụ oké ọrụ ahụ n’otu n’otu, n’ụlọ n’ụlọ, na-eburu eziokwu nke eluigwe ahụ n’ụzọ nkịtị baa n’ụlọ na n’obi ndị Efesọs.” N’oge na-adịchabeghị anya, e kwuwo, sị: “Ịgbasa oziọma ahụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ bụ ihe e ji mara ndị Kraịst nke narị afọ mbụ site ná mmalite (tụlee Ọrụ 2:46; 5:42). . . . [Pọl] arụzuwo ọrụ ya nke ọma n’ebe ma ndị Juu ma ndị Jentaịl bi n’Efesọs nọ, ha enweghịkwa ihe ngọpụ ọ bụla ma ọ bụrụ na ha alaa n’iyi ná mmehie ha.”—The Wesleyan Bible Commentary, Mpịakọta 4, peji 642, 643.

7. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Chineke na-akwado ije ozi ụlọ n’ụlọ nke Ndịàmà Jehova?

7 Ọ bụ ezie na ikwu okwu ihu ọha nwere ọnọdụ nke ya n’ikwusa ozi ọma ahụ, ọ bụghị ihe a ga-eji dochie anya ijekwuru ndị mmadụ n’ụlọ nke aka ha. N’ihe banyere nke a, onye ọkà mmụta bụ Joseph Addison Alexander kwuru, sị: “Chọọchị emepụtabeghị ihe ọ bụla nke ga-anọchi anya ma ọ bụ megide mmetụta ahụ nke ime nkwusa n’ụlọ chọọchị na n’ebe obibi na-enwe.” Dị ka onye mmụta bụ O. A. Hills si kwuo: “Nkụzi ihu ọha na nke a na-eme site n’ụlọ ruo n’ụlọ aghaghị ịgakọ ụkwụ na ụkwụ.” Ndịàmà Jehova na-enye ọzụzụ n’okwu ihu ọha ndị a na-ekwu ná Nzukọ Ihu Ọha ha na-enwe kwa izu. Ha nwekwara ihe àmà pụtara ìhè na ụzọ ahụ ndị ozi si mee ihe nke ịgbasa eziokwu Bible site n’ụlọ ruo n’ụlọ na-adị irè. O dokwara anya na Jehova na-akwado ya, n’ihi na site n’ije ozi dị otú ahụ, ọ na-eme ka ọtụtụ puku mmadụ na-enubata n’ofufe ya nke e buliri elu kwa afọ.—Aịsaịa 2:1-4; 60:8, 22.

8. (a) Gịnị ka e kwuworo banyere ihe mere nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ ji adị irè? (b) Olee ụzọ a pụrụ isi jiri Ndịàmà Jehova tụnyere Pọl n’ikwusa n’ụlọ ndị mmadụ nakwa n’ịgba àmà n’ụzọ ndị ọzọ?

8 Otu onye ọzọ ọnụ na-eru n’okwu ekwuwo, sị: “Ọ na-adịrị ndị mmadụ mfe karị icheta ihe a kụziiri ha n’ụlọ nke aka ha karịa nke a kụziri na chọọchị.” Ee, Pọl jere n’ụlọ dị iche iche ọtụtụ mgbe, na-esetịpụ ezi ihe nlereanya dị ka onyeozi. Onye ọkà mmụta Bible bụ́ Edwin W. Rice dere, sị, “O jughị ya afọ nanị izi ihe na ikwu okwu ihu ọha n’ụlọ nzukọ ndị Juu na n’ọma ahịa. Ọ nọ mgbe nile jiri ịnụ ọkụ n’obi ‘na-ezi ihe’ ‘site n’ụlọ ruo n’ụlọ.’ Ọ bụ agha a na-ebu site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ịgba mgba aka na aka, ihu na ihu, megide ajọ ihe, ijikwa nwetara Kraịst ndị mmadụ, ka o buru n’Efesọs.” Ndịàmà Jehova ghọtara na nkwurịta okwu mmadụ na mmadụ n’ụlọ ndị mmadụ na-adị irè. Karịsịa, ha na-eme nletaghachi, ọ na-atọkwa ha ụtọ iso ọbụna ndị na-emegide ha kwurịta okwu ma ọ bụrụ na ndị a ga-ekwe ka e nwee mkparịta ụka ezi uche dị na ya. Lee nnọọ ka nke a si yie ihe Pọl mere! N’ihe banyere ya, F. N. Peloubet dere, sị: “Ọrụ Pọl abụghị nanị ná nzukọ dị iche iche. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na o jere leta ọtụtụ ndị n’otu n’otu n’ụlọ nke aka ha n’ebe ọ bụla ọ nụrụ banyere onye nke na-ajụ ajụjụ iji mata ihe, ma ọ bụ onye nwere mmasị ma ọ bụ ọbụna onye na-emegide emegide ruo n’ókè na ọ dị njikere inwe mkparịta ụka n’ihe banyere okpukpe.”

Ndị Okenye Ga Na-ebute Ụzọ

9. Ihe nlereanya dị aṅaa ka Pọl setịpụụrụ ndị okenye ibe ya?

9 Ihe nlereanya dị aṅaa ka Pọl setịpụụrụ ndị okenye ibe ya? O gosiri na ha kwesịrị inwe anya ike, bụrụkwa ndị ike na-adịghị agwụ n’ikwusa ozi ọma ahụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Na 1879, J. Glentworth Butler dere, sị: “[Ndị okenye nọ n’Efesọs] maara na n’ọrụ nkwusa [Pọl], ọ bụwo onye echiche nke ihe ize ndụ onwe onye ma ọ bụ ịbụ onye a ma ama na-emetụtaghị ma ọlị; na o jichighị ihe ọ bụla n’eziokwu ndị dị mkpa; na o jighị ile mmadụ anya n’ihu lekwasịkarịa anya n’akụkụ eziokwu ndị metụtara nanị otu ndị ma ọ bụ ndị dị ọhụrụ, kama na o kwuru okwu banyere nanị na ihe nile ndị bara uru ‘iji wusie ike n’ime mmụọ,’ ma ọ bụ wulite mmadụ elu: ndụmọdụ dum nke Chineke n’ịdị ọcha na izu ezu ya! ‘Ngosi’ nke a e ji ikwesị ntụkwasị obi mee, ‘ozizi’ nke a e ji ịnụ ọkụ n’obi na-ezi eziokwu banyere Kraịst abụwo omume ya, ọ bụghị nanị n’ụlọ akwụkwọ ahụ dị na Taịranọs na n’ebe ndị ọzọ ndị na-eso ụzọ na-ezukọ, kamakwa n’ụlọ ọ bụla ọ pụrụ ịbanye. Site n’ụlọ ruo n’ụlọ, sitekwa ná mkpụrụ obi ruo ná mkpụrụ obi, kwa ụbọchị, o jiwo ozi obi ụtọ ahụ na-aga, na-enwe ọchịchọ na agụụ yiri nke Kraịst. Nye ụmụ mmadụ ndị nọ n’ọnọdụ nile nakwa ndị agbụrụ nile, nye ndị Juu ahụ na-anaraghị ya nke ọma na ndị Grik ahụ na-akwa emo, otu isiokwu ya—nke, ọ bụrụ na a kọwaa ya n’ụzọ zuru ezu, gụnyere eziokwu nile ọzọ na-azọpụta azọpụta—bụ nchegharị n’ebe Chineke nọ, na okwukwe n’ebe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọ.”

10, 11. (a) N’ihe banyere ije ozi ndị Kraịst, gịnị ka Pọl tụrụ anya ya n’aka ndị okenye nọ n’Efesọs? (b) Dị ka Pọl, n’ụdị ọrụ nkwusa dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova, gụnyere ndị okenye, na-ekere òkè na ya?

10 Ya mere, n’ụzọ bụ isi, gịnị ka Pọl tụrụ anya ya n’aka ndị okenye ahụ bụ ndị Efesọs? Onye ọkà mmụta bụ E. S. Young depụtara isi ihe dị n’okwu Pọl n’ụzọ dị otú a: “Ekwughị m okwu nanị n’ihu ọha, kama adọgburu m onwe m n’ọrụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ, n’ebe ndị nọ n’ọnọdụ nile nke ndụ dị, ma ndị Juu ma ndị Jentaịl. Isiokwu nke ije ozi m nye mmadụ nile bụ ‘nchegharị n’ebe Chineke nọ na okwukwe n’ebe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọ.’” N’ide okwu Pọl ahụ n’ụzọ ọzọ, W. B. Riley dere, sị: “Isi ihe pụtara ìhè nke dị na ya bụ: ‘Ana m atụ anya ka unu gaa n’ihu n’ihe ahụ m malitere, ka unu na-eme, na-ezikwa ihe, ana m atụkwa anya ka unu guzogide ihe dị ka mụ onwe m guzogidere; ka unu na-ezi ihe ma nye ndị mmadụ n’otu n’otu ma n’ihu ọha dị ka m mere n’okporo ámá nile nakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, iji gbaara ma ndị Juu ma ndị Grik àmà banyere nchegharị n’ebe Chineke nọ na okwukwe n’ebe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọ, n’ihi na ihe ndị a bụ isi ihe ndị dị mkpa!’”

11 N’ụzọ doro anya, n’Ọrụ Ndị Ozi isi 20, Pọl na-egosi ndị okenye ibe ya na a tụrụ anya n’aka ha ịbụ ndị na-agbara Jehova àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ. N’ihe banyere nke a, ndị okenye nke narị afọ mbụ ahụ ga na-ebute ụzọ, na-esetịpụrụ ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ezi ihe nlereanya. (Tụlee Ndị Hibru 13:17.) Ya mere, dị ka Pọl, Ndịàmà Jehova na-ekwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na-agwa ndị nke mba nile banyere Alaeze Chineke, nchegharị n’ebe Ọ nọ, na okwukwe n’ime Jisọs Kraịst. (Mak 13:10; Luk 24:45-48) N’ọrụ ụlọ n’ụlọ dị otú a, a na-atụkwa anya ka ndị okenye a họpụtara ahọpụta n’etiti Ndịàmà nke oge a na-ebute ụzọ.—Ọrụ 20:28.

12. Gịnị ka ụfọdụ ndị bụbu ndị okenye jụrụ ime, ma ọ̀ bụ na gịnị ka ndị okenye na-ebute ụzọ taa?

12 Na 1879, Charles Taze Russell malitere ibipụta akwụkwọ Zion’s Watch Tower and Herald of Christ’s Presence, nke a na-akpọzi Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova ugbu a. Russell na Ndị Mmụta Bible ndị ọzọ kwusara ozi Alaeze ahụ n’ụzọ ahụ ndị ozi si mee ya. Otú ọ dị, n’afọ ndị sochirinụ, ụfọdụ ndị okenye ọgbakọ emeghị ihe kwekọrọ n’ibu ọrụ ha nke ịgba àmà. Dị ka ihe atụ, otu Onyeàmà dere, sị: “Ihe nile gara nnọọ nke ọma ruo mgbe a mara ọkwa ahụ nke mmadụ nile ikere òkè n’ịgba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na-eji akwụkwọ dị iche iche e ji amụ ihe, karịsịakwa ọrụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ ahụ a na-arụ na Sunday—nke a bụ na 1927. Ndị okenye anyị ndị ahụ e ji ntụliaka họpụta megidere nke a, gbalịakwa ịkụda òtù ahụ dum aka ịnara ma ọ bụ ikere òkè n’akụkụ ọ bụla nke ọrụ dị otú ahụ.” Mgbe oge na-aga, ndị ikom ndị na-adịghị ekere òkè n’ọrụ nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ enwekwaghị ihe ùgwù nke ije ozi dị ka ndị okenye. Taakwa, ndị ahụ na-eje ozi dị ka ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi bụkwa ndị a tụrụ anya na ha ga na-edu ndú n’ịgba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ nakwa n’ụdị ndị ọzọ nke ije ozi ndị Kraịst.

Onye Ọ Bụla Bụ Onyeàmà

13. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ọbụna ma a sị na ndị mmadụ adịghị ege ntị n’ozi Alaeze ahụ? (b) Olee ụzọ e siworo jiri Pọl tụnyere Ezikiel?

13 Site n’enyemaka Jehova, ndị Kraịst kwesịrị ịkpọsa ozi Alaeze ahụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ọbụna ma a sị na a naraghị ya nke ọma. Dị ka onye nche nke Chineke, Ezikiel gaje ịdọ ndị mmadụ aka ná ntị ma hà gere ntị ma ọ bụ na ha egeghị. (Ezikiel 2:5-7; 3:11, 27; 33:1-6) N’iwepụta myirịta dị n’etiti Ezikiel na Pọl, E. M. Blaiklock dere, sị: “Site [n’okwu Pọl n’Ọrụ Ndị Ozi isi 20] a na-ahụ ihe onyinyo pụtara ìhè nke ije ozi ahụ n’Efesọs. Rịba ama ihe ndị a sonụ: Nke mbụ, oké ikwesị ntụkwasị obi nke Pọl. Ọ bụghị onye na-achụso ịbụ onye a ma ama ma ọ bụ nkwado nke ọha mmadụ. N’ịbụ onye tụkwasịrị uche ya, dị ka Ezikiel, n’ọrụ nke onye nche, o ji ezi ịnụ ọkụ n’obi jezuo ozi ya, nweekwa àgwà ọma iji kwadoo ihe ọ na-ekwu. Nke abụọ, ọmịiko ịhụnanya nke o nwere. Ọ bụghị onye na-ekwu okwu banyere mbibi n’enweghị mmetụta ọ bụla. Nke atọ, ịgbasa ozi ọma ya n’enweghị ike ọgwụgwụ. N’ihu ọha na site n’ụlọ ruo n’ụlọ, n’obodo ukwu na n’ime ógbè ahụ nile, o kwusawo ozi ọma ahụ.”

14. N’ihi gịnị ka ịgba àmà ji bụrụ ibu ọrụ dịkwasịrị onye ọ bụla nke raara onwe ya nye Jehova n’ekpere site na Jisọs Kraịst?

14 Ngọzi Chineke na-agọzi ndị ohu ya nke oge a n’ụba na-eme ka a ghara inwe ihe ịrụ ụka ọ bụla na ọ na-amasị ya ịhụ ka a kpọkwasịrị ha aha ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova. (Aịsaịa 43:10-12) Ọzọkwa, ha bụkwa ndịàmà nke Kraịst, n’ihi na Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu ga-anata ike, mgbe mmụọ nsọ ga-abịakwasịworị unu: unu ga-abụkwa ndịàmà m n’ime Jerusalem, na n’ime Judia na Sameria nile, ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.” (Ọrụ 1:8) Ya mere, ịgba àmà bụ ibu ọrụ dịkwasịrị onye ọ bụla nke raaraworo onwe ya n’ekpere nye Jehova Chineke site na Jisọs Kraịst.

15. Gịnị ka e kwuworo banyere ọrụ ịgba àmà nke ndị Kraịst oge gboo?

15 E kwuwo banyere ịgba àmà, sị: “O metụtara chọọchị ahụ dum. Ọrụ ije ozi ala ọzọ nke chọọchị oge gboo ahụ abụghị ibu ọrụ dịịrị òtù Women’s Missionary Society ma ọ bụ nke Foreign Mission Board. A hapụghịkwa ọrụ ịgba àmà nye nanị ndị bụ ndị ọkà dị ka ndị okenye, ndị dikin, ma ọ bụ ọbụna ndị ozi. . . . N’oge mbụ chọọchị ahụ bụ ije ozi. Usoro ihe omume ije ozi ala ọzọ nke chọọchị oge gboo ahụ dabeere n’echiche abụọ: (1) Ọrụ bụ isi chọọchị ahụ nwere bụ ịgbasa ozi ọma n’ụwa nile. (2) Ibu ọrụ nke ịrụzu ọrụ nke a dịkwasịrị òtù ndị Kraịst dum.”—J. Herbert Kane.

16. Ọbụna ndị edemede nọ na Krisendọm na-anakwere gịnị banyere ndị Kraịst na ịgba àmà?

16 Ọ bụ ezie na ndị edemede nke oge a nke Krisendọm ekwenyeghị n’ozi Alaeze ahụ, ụfọdụ n’ime ha na-anakwere na ndị Kraịst nwere ibu ọrụ nke ịgba àmà. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ bụ́ Everyone a Minister, Oscar E. Feucht kwuru, sị: “Ọ dịghị onye pastọ ọ bụla nke pụrụ ijezu ozi ahụ nke Chineke nyere onye ọ bụla nke kwere ekwe. Ọ dị mwute ịhụ na ọtụtụ narị afọ nke echiche na-ezighị ezi n’ime chọọchị emewo ka ọrụ dịịrị 500 ndị na-aga chọọchị bụrụ ọrụ nke otu onye pastọ. Ọ dịghị otú ahụ na chọọchị oge gboo. Ndị nile kwere ekwe na-ejegharị ebe nile na-ekwusa Okwu ahụ.”

17. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ọnọdụ ịgba àmà nwere ná ndụ ndị Kraịst oge gboo?

17 Ịgba àmà bụ ihe dị oké mkpa ná ndụ nke ndị Kraịst oge gboo, ọbụna dị ka ọ dị n’etiti ndị Jehova taa. Edward Caldwell Moore nke Harvard University dere, sị, “N’ikwu ya n’ụzọ sara mbara, ihe e ji mara narị afọ atọ ndị mbụ nke òtù ndị Kraịst bụ oké ịnụ ọkụ n’obi maka mgbasa nke okwukwe ahụ. Ihe na-agụsi ndị Kraịst ike bụ ikwusa ozi ọma, izisa ozi nzọpụta ahụ. . . . Otú ọ dị, mgbasa nke mmetụta Jisọs na ozizi ya nile n’oge mbụ ahụ dabeere nanị n’ụzọ dị nta n’aka ndị ikom ndị anyị pụrụ ịkpọ ndị ozi ala ọzọ. Ọ bụ ihe ndị na-arụ ụdị ọrụ ọ bụla na ndị nọ n’ọnọdụ ọ bụla n’etiti ọha mmadụ tinyechara aka wee mezuo. [Ha] buuru ihe nzuzo ahụ nke ndụ dị n’ime, àgwà ọhụrụ ahụ ha nwere n’ebe ụwa dị, bụ́ nke pụtara nzọpụta nye ha dị ka ahụmahụ ha nwere si dị, garuo n’ebe nile alaeze ukwu [Rom] ahụ sọtụrụ. . . . O doro [Iso Ụzọ Kraịst nke oge gboo] anya n’ụzọ dị omimi banyere ọgwụgwụ na-abịanụ nke usoro ihe ụwa dị adị n’oge ahụ. O kwenyere na a ga-eji ụzọ ọrụ ebube guzobe usoro ihe ọhụru nke ụwa na mberede.”

18. Olileanya dị aṅaa dị ebube dị nnọọ ukwuu karịa ọchịchọ nile nke ndị ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị?

18 N’ịgba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ nakwa n’ụdị ndị ọzọ nke ije ozi ha, Ndịàmà Jehova na-eji ọṅụ duru ndị na-ege ha ntị gaa n’ụwa ọhụrụ ahụ nke Chineke kweworo ná nkwa. Ngọzi ya ndị e buworo n’amụma nke ndụ ebighị ebi karịrị ọchịchọ nile kasị na-agụ ndị na-achọ iwulite usoro ihe ụwa ọhụrụ nke oge a agụụ. (2 Pita 3:13; Mkpughe 21:1-4) Ọ bụ ezie na o yiri ka ọ̀ ga-amasị onye ọ bụla ịdị ndụ n’ime ụwa ọhụrụ dị ebube nke Chineke, ọ gaghị adị otú ahụ. Otú ọ dị, ka anyị gaa n’ihu ịtụle ụzọ ụfọdụ dị irè ndị ohu Jehova pụrụ isi zie ndị ahụ na-achọ ịdị ndụ ebighị ebi ihe.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaghachi?

◻ N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na Ọrụ Ndị Ozi 5:42 na Ọrụ Ndị Ozi 20:20 pụtara na ndị na-eso ụzọ Jisọs kwesịrị ikwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ?

◻ Ànyị si aṅaa mara na Chineke na-akwado ozi Ndịàmà Jehova na-eje site n’ụlọ ruo n’ụlọ?

◻ N’ihe banyere ije ozi ahụ, gịnị ka a tụrụ anya ya n’aka ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi?

◻ Ọnọdụ dị aṅaa ka ịgba àmà kwesịrị inwe ná ndụ onye Kraịst?

[Foto dị na peeji nke 11]

Na 33 O.A, ndị na-eso ụzọ Jisọs gbara àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’alaghị azụ

[Foto dị na peeji nke 13]

Pọl ziri ihe “site n’ụlọ ruo n’ụlọ.” Ndịàmà Jehova na-eje ụdị ozi nke a taa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya