Ọ̀ Dị Mgbe Ndị Nọ ná Mkpagbu Ga-enwe Udo?
Ị̀GA-ACHỌ ịhụ ọgwụgwụ nke ahụhụ, ọ bụghị nanị maka gị onwe gị kama maka ihe nile a kpọrọ mmadụ? Tụlee ihe atụ ndị a:
Sonia enwewo ihe karịrị òkè nke ya ná mkpagbu.a Nke mbụ, ọ chọpụtara na di ya anọwo na-akwa iko kemgbe afọ iri. Mgbe ahụ nwa ya nwoke nke ikpeazụ butere nje HIV ma nwụọ n’ọrịa AIDS. Afọ abụọ ka e mesịrị nwa ya nwoke nke ọzọ dara ọrịa, n’oge na-adịghị anya ọ nwụkwara n’ọrịa AIDS. “Akụkụ ikpeazụ nke ọrịa ya dịruru ogologo oge,” ka Sonia na-echeta. “O nwere oké ịda mbà n’obi, agịrị isi ya dapụsịrị, ọ pụghịkwa ịhụ ụzọ nke ọma. Ọ dị oké mwute.”
Fabiana, bụ́ nwa akwụkwọ n’otu mahadum dị na Brazil, nwere nchegbu banyere ikpe na-ezighị ezi nke ọha mmadụ ndị dị n’ụwa. Mgbe ahụ ọdachi dakwasịrị ndụ nke ya. Nwanne ya nwoke, bụ́ onye nọ na-enwe ịda mbà n’obi, gburu onwe ya. Mgbe Fabiana na-enwekwaghị ọrụ, otu enyi ya tụrụ aro ka ọ gakwuru otu pai-de-santo (dibịa amoosu), na-ekwu na ka Fabiana wee nwee ihe ndabara ọjọọ dị otú ahụ, ọ ghaghị ịbụ na mmadụ kọrọ ya ọgwụ! Ma pai-de-santo ewetaghị ahụ efe ọ bụla. Kama nke ahụ, ọ dị Fabiana ka a na-emekpa ya ahụ, o nweghị ike ihi ụra n’ihi ahụhụ ya.
Mkpagbu Ana malitere n’oge ná ndụ karị. “Mgbe m dị otu afọ,” ka ọ na-akọ, “nne m gbahapụrụ m, ya mere nne nne m kpọọrọ m.” E mesịa, mgbe Ana dị nanị afọ atọ, nne nne ya nwụrụ. E zigara Ana n’ebe a na-elekọta ụmụ na-enweghị nne ma ọ bụ nna dị na Rio de Janeiro, ebe ọ nọ ruo mgbe ọ dị afọ 13. “E mesoro anyị omume n’ụzọ jọrọ oké njọ n’ebe ahụ, aghọkwara m onye nnupụisi,” ka ọ na-ekwu. “Ka m na-etolite, alụsoro m ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile ọgụ.”
O yiri ka mkpagbu ọ̀ na-emetụta mmadụ ọ bụla n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ. N’ezie, anyị na-anụ akụkọ banyere ọdachi na-adakwasị ụmụ mmadụ kwa ụbọchị—mgbe ọ bụla anyị kiriri, gụrụ, ma ọ bụ gere ntị n’akụkọ. “Ọ bụ nanị . . . n’oge anyị nke ihe ọmụmụ mgbasa ozi ka ọ ghọrọ ihe fọrọ nke nta ka ọ ghara ikwe omume ịgbanahụ mwakwasị na-aga n’ihu nke akụkọ ọjọọ,” ka Dr. May Sykes Wylie na-ede. “Agha, ọdachi ndị na-emere onwe ha, ọdachi ụlọ ọrụ mmepụta ihe, oké mgbupịa okporo ụzọ, mpụ, iyi ọha egwu, mmetọ n’ụzọ mmekọahụ, ndina n’ike, ime ihe ike n’ebe obibi—ha nile na-eme ka mkpasasị uche bụrụ isiokwu jọgburu onwe ya na-apụtaghachi kwa ụbọchị nke narị afọ nke 20.” Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi chịkọtara ahụmahụ ụmụ mmadụ n’ụzọ ziri ezi, sị: “Ihe e kere eke nile na-asụkọ ude, ime na-emekọkwa ha, ruo ugbu a.”—Ndị Rom 8:22.
Gịnị banyere gị? Ị̀ na-enwe mkpagbu? Ahụ efe dị aṅaa ka ị pụrụ ịtụ anya ya? Ọ̀ dị mgbe ị ga-enweta ezi udo? Sonia, Fabiana, na Ana chọtara ezi nkasi obi na ọ̀tụ̀tụ̀ bụ ezie nke udo! Ị pụrụ ịgụ banyere ya n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A gbanwewo aha ndị dị n’isiokwu a.