À Pụrụ Ime Ka Akara Aka na Ịhụnanya Chineke Kwekọọ?
“ANYỊ na-akọwa akara aka dị ka nhazi ebighị ebi nke Chineke, ebe ọ nọ kpebie ihe ọ chọrọ iji nwoke ọ bụla mee. N’ihi na o keghị ha nile n’otu ọnọdụ, kama buru ụzọ kaa ụfọdụ akara maka ndụ ebighị ebi na ndị ọzọ maka amamikpe ebighị ebi.”
Ọ bụ otú ahụ ka Onye Ndozigharị Protestant bụ́ John Calvin si kọwaa nchepụta ya nke akara aka n’akwụkwọ bụ́ Institutes of the Christian Religion. Nchepụta nke a dabeere n’echiche nke na Chineke mazuru ihe nile nakwa na ihe ihe ndị o kere eke na-eme apụghị ịgbagha nzube ya dị iche iche ma ọ bụ mee ya ka o mee mgbanwe.
Ma nke a ọ̀ bụ ihe Bible na-achọ ime ka a ghọta banyere Chineke? Nke ka mkpa, nkọwa dị otú ahụ ò kwekọrọ n’àgwà dị iche iche nke Chineke, karịsịa àgwà ya bụ́ isi—ịhụnanya?
Chineke nke Nwere Ike Ịkọ Ọdịnihu
Chineke nwere ike ịkọ ọdịnihu. Ọ na-akọwa onwe ya dị ka onye “na-egosi ikpeazụ site na mbụ, na-egosikwa ihe nke a na-emeghị eme site na mgbe ochie; na-asị, Ndụmọdụ m ga-eguzosi ike, ọ bụkwa ihe nile nke na-atọ m ụtọ ka M ga-eme.” (Aịsaịa 46:10) N’akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ, Chineke emewo ka e detuo amụma ya dị iche iche iji gosi na ya pụrụ iji ike ịhụ ọdịnihu ya mee ihe ma kọọ ihe omume dị iche iche tupu ha ewere ọnọdụ.
Otú a, n’ụbọchị Belteshaza, eze Babilọn, mgbe Daniel onye amụma rọrọ nrọ banyere anụ ọhịa abụọ, otu na-anọchi ibe ya, Jehova nyere ya nkọwa ya: “Ebulu ahụ nke ị hụrụ, nke nwere mpi abụọ, ha bụ eze nke Midia na Peasia. Mkpi ahụ nke nwere ajị hie nne bụ eze Jevan [Gris].” (Daniel 8:20, 21) O doro anya na Chineke ji ike ịhụ ọdịnihu ya kpughee usoro ndị ọchịchị ụwa. Alaeze Ukwu Babilọn na-achị mgbe ahụ ka Medo-Peasia ga-anọchi, e mesịakwa Gris.
Amụma pụkwara imetụta otu mmadụ. Dị ka ihe atụ, Maịka onye amụma kwupụtara na a ga-amụ Mesaịa ahụ na Betlehem. (Maịka 5:2) Ọzọ, n’ọnọdụ nke a Chineke ji ike ịhụ ọdịnihu ya mee ihe. Otú ọ dị, e bu otu nzube kpọmkwem n’uche maa ọkwa nke a—ịmata onye Mesaịa ahụ bụ. Ihe atụ nke a adịghị akwado iji ozizi akara aka nke gụnyere onye ọ bụla mee ihe n’ihe nile.
N’ụzọ megidere nke ahụ, Akwụkwọ Nsọ na-ekpughe na e nwere ọnọdụ ndị Chineke na-ahọrọ ịhapụ ịma ihe ga-adapụta. Kpọmkwem tupu mbibi nke Sọdọm na Gọmọra, o kwupụtara: “Ka M rịdakwa, hụ ma ọ bụ dị ka iti mkpu ya si dị, nke ruru m ntị, ka ha mezuworo; ọ bụrụkwa na ọ dịghị otú a, ka M mara.” (Jenesis 18:21) Akụkụ ihe odide nke a na-egosi n’ụzọ doro anya na Chineke ebughị ụzọ mara ókè nke ịrụ arụ dị n’obodo ndị ahụ tupu o nyochaa okwu ahụ.
N’eziokwu, Chineke pụrụ ibu ụzọ hụ ihe omume ụfọdụ, ma n’ọtụtụ ọnọdụ, ọ họrọwo ịhapụ iji ike ya nke ịhụ ọdịnihu mee ihe. N’ihi na Chineke bụ onye pụrụ ime ihe nile, o nweere onwe ya iji ikike ya nile mee ihe otú dị ya mma, ọ bụghị dị ka ọ dị ụmụ mmadụ na-ezughị okè mma.
Chineke nke Pụrụ Idozi Okwu
Dị ka Calvin kwuru, ụfọdụ na-asị na Chineke eguzobewo akara aka nke ọdịda mmadụ tupu okike ya nakwa na o nyewo ndị ‘a họtara ahọta’ akara aka tupu ọdịda ahụ. Ma ọ bụrụ na nke a bụ eziokwu, ọ̀ bụ na ọ gaghị abụ ihu abụọ Chineke inye Adam na Iv olileanya ndụ ebighị ebi, na-amara nke ọma na ha agaghị enwe ike inweta ya? Ọzọkwa, ọ dịghị ebe ọ bụla Akwụkwọ Nsọ gọpụrụ na e nyeghị mmadụ abụọ mbụ ahụ nhọrọ: ịgbaso ntụzi Chineke ma dịrị ndụ ebighị ebi ma ọ bụ ịjụ ha ma nwụọ.—Jenesis, isi nke 2.
Ma mmehie Adam na Iv ọ̀ gbagọrọ n’ezie nzube Chineke? Ee e, n’ihi na ozugbo ha mehiere, Chineke mara ọkwa na ya ga-ewelite otu “mkpụrụ” ibibi Setan na ndị ọrụ ya nile nakwa na ya ga-edozikwa okwu ọzọ n’elu ụwa. Dị nnọọ ka ahụhụ ole na ole na-apụghị ịkwụsị onye ọrụ ubi ịrụpụta mkpụrụ bara ụba, otú ahụ ka nnupụisi Adam na Iv na-agaghị egbochi Chineke ime ka ụwa ghọọ paradaịs.—Jenesis, isi nke 3.
Chineke mesịrị kpughee na a ga-enwe gọọmenti eluigwe nke e tinyere n’aka nwa Eze Devid nakwa na ndị ọzọ ga-esonye n’Alaeze a. A kpọrọ ndị ọzọ ndị a “ndị nsọ nke Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu.”—Daniel 7:18; 2 Samuel 7:12; 1 Ihe Emere 17:11.a
Ibu Ụzọ Kwuo Abụghị Inye Akara Aka
Eziokwu ahụ bụ na Chineke ahọrọghị ịmara ụzọ nke ihe a kpọrọ mmadụ ga-agbaso egbochighị ya ibu amụma nke ihe ndị ga-esite n’ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ mmadụ mere. A pụghị ịta onye mekanik nke dọrọ ọkwọ ụgbọ ala aka ná ntị banyere ọnọdụ ọjọọ nke ụgbọ ala ya ụta ma ọ bụrụ na e nwee ihe ọghọm ma ọ bụ bo ya ebubo iguzobe akara aka ya. N’otu aka ahụ, a pụghị ibo Chineke ebubo iguzobe akara aka nke ihe mwute ihe omume dị iche iche nke ụmụ mmadụ na-arụpụta.
Otu ihe ahụ bụ eziokwu banyere ụmụ nke mmadụ abụọ mbụ ahụ. Tupu Ken egbuo nwanne ya, Jehova tinyere nhọrọ n’ihu Ken. Ọ̀ ga-achịkwa mmehie, ka mmehie ọ̀ ga-achịkwa ya? Ọ dịghị ihe ọ bụla n’akụkọ ahụ nke na-egosi na Jehova guzobere akara aka nke na Ken ga-eme nhọrọ nke na-ezighị ezi ma gbuo nwanne ya.—Jenesis 4:3-7.
E mesịa, Iwu Mosis dọrọ ndị Israel aka ná ntị ihe ga-eme ma ọ bụrụ na ha esi n’ebe Jehova nọ wezụga onwe ha, dị ka ihe atụ, site n’ịlụrụ nwanyị n’etiti mba ndị ọgọ mmụọ. Ihe e buru amụma ya mere. A pụrụ ịhụ nke a n’ihe atụ nke Eze Solomọn, onye ndị nwunye ya si ala ọzọ kwanyere n’ikpere arụsị mgbe ọ na-eme agadi. (1 Ndị Eze 11:7, 8) Ee, Chineke dọrọ ndị ya aka ná ntị, ma o guzobeghị akara aka ihe ga-abụ omume ha n’otu n’otu.
A na-agba ndị Kraịst a họọrọ, ma ọ bụ ndị a họtara ahọta, ume ịnọgidesi ike ma ọ bụrụ na ha achọghị ka a napụ ha ụgwọ ọrụ ahụ e kwere ná nkwa nke iso Kraịst chịa achị n’eluigwe. (2 Pita 1:10; Mkpughe 2:5, 10, 16; 3:11) Dị ka ụfọdụ ndị ọkà mmụta okpukpe n’oge gara aga jụrụ, N’ihi gịnị ka e ji nye ihe ncheta ndị dị otú ahụ ma ọ bụrụ na ọkpụkpọ nke ndị ahụ a họtara ahọta enweghị mgbanwe?
Akara Aka na Ịhụnanya Chineke
E nyere mmadụ nnwere onwe ime nhọrọ, ebe e kere ha “n’onyinyo Chineke.” (Jenesis 1:27) Nnwere onwe ime nhọrọ dị oké mkpa ma ọ bụrụ na ụmụ mmadụ ga-asọpụrụ ma fee Chineke site n’ịhụnanya, ọ bụghị dị ka ígwè ọrụ robot nke e bu ụzọ kpebie mmegharị ahụ ya nile. Ịhụnanya nke ihe e kere eke nwere ọgụgụ isi, ndị nweere onwe ha gosiri ga-eme ka Chineke nwee ike ịgbagha ebubo ndị na-ezighị ezi. Ọ na-asị: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.”—Ilu 27:11.
Ọ bụrụ na e guzobeere ndị ohu Chineke akara aka—ma ọ bụ haziere ha usoro, dị ka a pụrụ isi kwuo ya—ọ̀ bụ na a pụghị ịgbagha izi ezi nke ịhụnanya ha maka Onye Okike ha? Ọzọkwa, ọ̀ bụ na ọ gaghị emegide akpaghị ókè nke Chineke ya ime nhọrọ nke e bu ụzọ kpebie nke ndị a kara aka inweta ebube na obi ụtọ n’echebaraghị ihe ha ruru eru maka ha echiche? Karịa nke ahụ, ọ bụrụ na e menyere ụfọdụ otú ahụ, ebe a kara ndị ọzọ akara maka ntaramahụhụ ebighị ebi, ọ ga-esi ike nke a ịkpalite mmetụta nke ekele ndị si n’ezi obi n’ime ndị “a họọrọ,” ma ọ bụ “ndị a họtara ahọta.”—Jenesis 1:27; Job 1:8; Ọrụ 10:34, 35.
N’ikpeazụ, Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha kwusaa ozi ọma nye ihe nile a kpọrọ mmadụ. Ọ bụrụ na Chineke ahọrọworị ndị a ga-azọpụta, ọ̀ bụ na nke a agaghị eme ka ịnụ ọkụ n’obi ndị Kraịst na-egosi ná nkwusa ozi ọma jụọ oyi? Ọ̀ bụ na ọ gaghị eme ka ọrụ nkwusa ahụ ghara inwe nnọọ isi?
Ịhụnanya na-adịghị akpa ókè site n’aka Chineke bụ ikike kasị ike nke pụrụ ịkwali ndị mmadụ ịhụkwa ya n’anya. Ngosipụta kasị ukwuu nke ịhụnanya Chineke bụ ịchụ Ọkpara ya n’àjà n’ihi ihe a kpọrọ mmadụ na-ezughị okè, na-emehie emehie. Ike ịhụ ọdịnihu nke Chineke banyere Ọkpara ya bụ ihe atụ pụrụ iche, ma ọ na-emesi anyị obi ike na nkwa nile nke mweghachi nke dabeere na Jisọs ga-emezu n’ezie. Ya mere ka anyị nwee okwukwe n’Ọkpara ahụ ma gaa Chineke nso. Ka anyị gosi ekele anyị site n’ịnakwere òkù Chineke ịbata ná mmekọrịta dị mma anyị na Onye Okike anyị. Taa, Chineke na-esetịpụrụ mmadụ nile chọrọ iji nnwere onwe ime nhọrọ ha mee ihe ma gosi ịhụnanya ha maka ya òkù nke a.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Mgbe Jisọs na-ekwu banyere Alaeze nke a kwadebere “site ná ntọala nke ụwa” (Matiu 25:34), ọ ghaghị ịdị na-ezo aka n’oge ụfọdụ mgbe mmehie mbụ ahụ gasịrị. Luk 11:50, 51 na-ejikọta “ntọala ụwa,” ma ọ bụ ntọala nke ihe a kpọrọ mmadụ a pụrụ ịnapụta anapụta site n’ihe mgbapụta, na oge Ebel.
[Igbe dị na peeji nke 7]
NDỊ E NYERE AKARA AKA DỊ KA OTU ÌGWÈ
“Ndị Chineke bu ụzọ mata ka o nyekwara akara aka ime ka ha kwekọọ n’oyiyi Ọkpara ya, ka o wee bụrụ nwa mbụ n’etiti ọtụtụ ụmụnne ndị ikom. Ndị o nyekwara akara aka, ọ kpọkwara ha; ndị ọ kpọrọ, ọ nwapụtakwara ha; ndị ọ nwapụtara, o nyekwara ha ebube.” (Ndị Rom 8:29, 30, New International Version) Olee otú anyị kwesịrị isi ghọta okwu ahụ bụ ‘nyere akara aka’ nke Pọl jiri mee ihe n’amaokwu ndị a?
Echiche Pọl n’ebe a abụghị arụmụka na-enweghị mgbagha nke na-akwado akara aka mmadụ. Ná mmalite narị afọ anyị, akwụkwọ Dictionnaire de théologie catholique kọwara arụmụka Pọl (Ndị Rom, isi nke 9-11) n’ụzọ dị otú a: “N’ụzọ na-arị elu, echiche na-ewu ewu n’etiti ndị mmụta Katọlik bụ na e setịpụbeghị nchepụta bụ ezie banyere akara aka ịga ná ndụ agwụghị agwụ.” Otu akwụkwọ ntụaka ahụ hotaziri M. Lagrange dị ka onye kwuru, sị: “Ajụjụ ahụ bụ́ isi Pọl welitere abụghị ma ọlị nke akara aka na amamikpe kama nanị nke ọkpụkpọ ndị Jentaịl gaa n’amara nke Iso Ụzọ Kraịst, ọdịiche e nwere maka ya bụrụ ekweghị ekwe nke ndị Juu. . . . O metụtara ìgwè dị iche iche, ndị Jentaịl, ndị Juu, ọ bụghịkwa kpọmkwem ụmụ mmadụ n’otu n’otu.”—Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.
N’isi nso a karị, The Jerusalem Bible nyere otu nkwubi okwu ahụ banyere isiakwụkwọ ndị a (9-11), na-asị: “Ya mere, isiokwu nke isiakwụkwọ ndị a abụghị nsogbu nke akara aka mmadụ maka ebube, ma ọ bụ ọbụna maka okwukwe, kama nke òkè Israel na-ekere n’akụkọ ihe mere eme nke nzọpụta, nsogbu ọ bụ nanị ya ka okwu ndị dị n’A[gba] O[chie] welitere.”
Amaokwu ndị ikpeazụ nke Ndị Rom isi nke 8 metụtara otu okwu ahụ. Ya mere, amaokwu ndị a n’izi ezi pụrụ ichetara anyị na Chineke bu ụzọ hụ ọdịdị nke otu ìgwè, ma ọ bụ òtù, site n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ nke a ga-akpọ iso Kraịst chịa, nakwa iru eru ndị a ga-achọ ka ha mezuo—nke a bụkwa n’ebughị ụzọ kpebie tupu oge ya kpọmkwem ndị mmadụ n’otu n’otu ndị a ga-ahọrọ, n’ihi na nke ahụ ga-emegide ịhụnanya na ikpe ziri ezi ya.