Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 4/15 p. 3-4
  • À Na-ebu Ụzọ Edetu Ọdịnihu Anyị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • À Na-ebu Ụzọ Edetu Ọdịnihu Anyị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chineke Ò Guzobeworị Akara Aka Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ịchọ Ọdịnihu A Kara Aka nke Mmadụ
    Teta!—1999
  • Ikwere n’Akara Aka Ọ̀ Na-achị Ndu Gi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ọ̀ Bụ Akara Aka Ka Ọ Bụ Nanị Ihe Ndabara?
    Teta!—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 4/15 p. 3-4

À Na-ebu Ụzọ Edetu Ọdịnihu Anyị?

ONYE Kraịst, onye Alakụba, onye Juu, onye Hindu, ma ọ bụ onye na-ekpe okpukpe ọzọ—ndị okpukpe nile na-enweta ọdachi ma na-eru újú maka ihe dị otú ahụ.

Dị ka ihe atụ, na December 6, 1997, otu ọdachi dị egwu mere n’obodo Irkutsk nke Siberia. Otu akatamkpo ụgbọelu AN-124 nke na-ebu ndị njem ka felisịrị nnọọ mgbe injin ya abụọ kwụsịrị ịrụ ọrụ. Ụgbọelu ahụ, bụ́ nke a gbajuru mmanụ ụgbọelu, sụkpunyere n’otu ụlọ e bi ebi. Ọkụ repịara ọtụtụ ụlọ, na-ewetara ọtụtụ ndị bi na ha na-enweghị enyemaka, tinyere ụmụaka na-enweghị ihe ha mere, ọnwụ na mmerụ ahụ.

N’ógbè ahụ na Siberia bụ́ ebe ihe ọghọm ahụ mere, o yiri ka e nwere ndị nwere echiche okpukpe dị iche iche. Ụfọdụ nwere ike ikwupụta nkwenkwe n’Iso Ụzọ Kraịst, ma ha ka pụrụ iche na ihe ọdachi ahụ bụ n’ihi akara aka ha. Ha na ndị ọzọ pụrụ iche, sị, ‘Ọ bụ uche Chineke, ọ bụrụkwa na ndị ahụ nwụrụnụ anwụghị n’ụzọ a, ha gaara anwụ n’ụzọ ọzọ—ọ bụ akara aka ha.’

Echiche dị otú ahụ, ma e kwuru ya ekwu ma ọ bụ na e kwughị ya, na-egosi otu echiche e nwere n’ọtụtụ okpukpe gburugburu ụwa—akara aka. Ọtụtụ ndị kwere na n’ụzọ ụfọdụ e buwo ụzọ detuo ọdịnihu anyị, site n’ụbọchị ọmụmụ anyị ruo n’ụbọchị ọnwụ anyị.

Nkwenkwe n’akara aka na-adị n’ụdị dị iche iche, na-eme ka nkọwa zuru ezu sie ike. N’ụzọ bụ isi akara aka na-enye echiche nke na ihe nile na-emenụ, ọrụ nile, ihe omume nile—ma ọ dị mma ma ọ dị njọ—bụ ihe a na-apụghị izere ezere; a kawo ya akara na ọ ga-eme n’ihi na ikike ka elu bụ́ nke karịrị nchịkwa mmadụ ebuwo ụzọ kpebie ya. A pụrụ ịhụ echiche dị otú ahụ n’ịgụ kpakpando, na karma nke okpukpe Hindu na nke okpukpe Buddha, nakwa n’ozizi ọdịnihu a kara aka nke Krisendọm. Laa azụ na Babylonia oge ochie, ụmụ mmadụ kwere na ndị bụ́ chi na-eji ihe e dere ede na-achịkwa akara aka na ọdịnihu. Dị ka e chere, chi ọ bụla nke na-achịkwa “mbadamba nkume nke akara aka” ndị a pụrụ ikpebi akara aka ndị mmadụ, nke alaeze dị iche iche, na ọbụna nke ndị bụ́ chi n’onwe ha.

Ọtụtụ ndị okpukpe kweere na site n’iwu Chineke, tupu a mụọ ụmụ mmadụ, Chineke na-ekpebi ihe ga-eme ndị mmadụ, tinyere ogologo ndụ ha, ma ha ga-abụ nwoke ma ọ bụ nwanyị, ọgaranya ma ọ bụ ogbenye, ma ha ga-ahụsi anya ma ọ bụ nwee obi ụtọ. A sịrị na ihe ndị a nile dị n’uche Chineke ma ọ bụ na a ga-ede ha n’otu akwụkwọ tupu o mee. Ya mere mgbe ọdachi mere, ọ bụ ihe a na-ahụkarị bụ́ onye kwere ekwe ịsị, “mektoub,”—e dere ya ede!

A na-eche na ebe ọ bụ na Chineke na-ebu ụzọ amara ihe nile, ọ ghaghịkwa ikpebi onye ga-erubere ya isi na onye ga-enupụrụ ya isi. N’ihi ya ọtụtụ ndị kwenyere na ya na-ekwere na ọbụna tupu a mụọ mmadụ, Chineke ekpebiworị ma ọ ga-enweta obi ụtọ ebighị ebi na Paradaịs ka ọ ga-enweta mbibi ebighị ebi.

Ị pụrụ iche na nke a na-ada nnọọ ka ozizi ọdịnihu a kara aka a na-akụzi na chọọchị ụfọdụ nke Krisendọm. Onye Protestant bụ́ onye nkwado bụ isi nke ọdịnihu a kara aka bụ onye France Na-eme Mgbanwe nke narị afọ nke 16 bụ́ John Calvin. Ọ kọwara ọdịnihu a kara aka dị ka “iwu ebighị ebi nke Chineke, nke o ji kpebie ihe ọ chọrọ iji mmadụ nke ọ bụla eme. E keghị mmadụ nile n’otu ọnọdụ ahụ, kama e burula ụzọ kpebie ndụ agwụghị agwụ maka ụfọdụ ma nye ndị ọzọ mbibi agwụghị agwụ.” Calvin kwukwara, sị: “Ọ bụghị nanị na Chineke hụrụ ọdịda nwoke mbụ ahụ tupu o mee, hụkwa n’ime ya mbibi nke ụmụ ya; kamakwa ọ haziri ya n’ọchịchọ nke aka ya.”

Ma, ọ bụghị ndị nile na-ekpe okpukpe ndị na-akụzi ọdịnihu a kara aka ma ọ bụ nkwenkwe akara aka kwere na ya n’onwe ha. Ụfọdụ n’izi ezi na-ekwu na ihe odide okpukpe ahụ kwuru banyere nnwere onwe mmadụ ime nhọrọ. N’ezie, e nwewo arụmụka dị ukwuu banyere omume ụmụ mmadụ, ma hà bụ ihe si ná nnwere onwe mmadụ ime nhọrọ pụta ka hà bụ nke Chineke bu ụzọ kpebie. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ arụwo ụka na mmadụ aghaghị inwere onwe ya ime nhọrọ na ime ihe, ebe ọ bụ na Chineke, bụ́ onye ziri ezi, na-ajụ mmadụ ajụjụ maka omume ya. Ndị ọzọ ekwuwo na Chineke na-eke omume mmadụ kama na mmadụ “na-enweta” ha n’ụzọ ụfọdụ ma na-aghọ ndị ga-aza ajụjụ maka ha. Otú ọ dị, n’ozuzu, ọtụtụ na-ekwere na Chineke ekpebiwo ihe omume ọ bụla, nke ukwu na nke nta, ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị.

Gịnị ka i kwere? Chineke ò kpebiworịị ihe ọdịnihu gị ga-abụ? Ndị mmadụ hà nweere onwe ha n’ezie ime nhọrọ, ikike ime ezigbo nhọrọ banyere ọdịnihu ha? Ruo ókè hà aṅaa ka ọdịnihu anyị na-adabere n’omume anyị? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

SEL/Sipa Press

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya