Nọrọ Jehova Nso
“N’akụkụ ekpere unu, na-anọgidesinụ ike.”—NDỊ ROM 12:12.
1. Gịnị bụ uche Jehova n’ihe banyere ekpere, agbamume dịkwa aṅaa ka Pọl onyeozi nyere banyere ikpe ekpere?
JEHOVA bụ “Chineke nke olileanya” nye ndị ya nile na-ekwesị ntụkwasị obi. Dị ka “Onye na-anụ ekpere,” ọ na-ege ntị n’arịrịọ ha nile maka enyemaka iji nweta mmezu nke olileanya na-enye ọṅụ nke o debere ha n’ihu. (Ndị Rom 15:13; Abụ Ọma 65:2) Sitekwa n’Okwu ya, bụ́ Bible, ọ na-agba ndị ohu ya nile ume ịbịakwute ya mgbe ọ bụla ha chọrọ. Ọ na-anọ ya mgbe nile, na-enwe ọchịchọ ige ntị ná nchegbu ndị kasị na-emetụta ha. N’eziokwu, ọ na-agba ha ume ‘ịnọgidesi ike n’ekpere’ nakwa ‘ikpe ekpere n’esepụghị aka.’a (Ndị Rom 12:12; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:17) Ọ bụ uche Jehova ka ndị Kraịst nile na-akpọku ya mgbe nile n’ekpere, na-awụpụrụ ya obi ha dị ka mmiri, na-emekwa otú ahụ n’aha Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Jisọs Kraịst.—Jọn 14:6, 13, 14.
2, 3. (a) N’ihi gịnị ka Chineke ji gbaa anyị ume ‘ịnọgidesi ike n’ekpere’? (b) Gịnị na-emesi anyị obi ike na Chineke chọrọ ka anyị na-ekpe ekpere?
2 N’ihi gịnị ka Chineke ji nye anyị agbamume nke a? N’ihi na nrụgide na ibu ọrụ nile dị ná ndụ pụrụ ịnyịda anyị nke ukwuu nke na anyị pụrụ ichefu ikpe ekpere. Ma ọ bụ nsogbu dị iche iche pụrụ irikpu anyị, mee ka anyị kwụsị ịṅụrị ọṅụ n’olileanya ahụ, wee kwụsị ikpe ekpere. N’iburu ihe ndị a n’uche, ọ dị anyị mkpa inweta ihe ncheta ndị na-agba anyị ume ikpe ekpere na ịbịa ezi nso n’isi iyi nke enyemaka na nkasi obi, bụ́ Jehova Chineke anyị.
3 Jemes onye na-eso ụzọ dere, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jemes 4:8) Ee, Chineke abụghị onye buliri onwe ya elu gabiga ókè, ọ nọghịkwa n’ebe dị oké anya nke na ọ gaghị anụ ihe ndị anyị na-agwa ya, n’agbanyeghị ọnọdụ mmadụ na-ezughị okè anyị nọ na ya. (Ọrụ 17:27) Ọzọkwa, ọ bụghị onye na-adịghị egosi mmasị na onye na-egosi na ihe agbasaghị ya. Onye ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Anya abụọ nke Jehova dị n’ahụ ndị ezi omume, ntị ya abụọ ghekwara oghe ná mkpu ha na-etiku ya.”—Abụ Ọma 34:15; 1 Pita 3:12.
4. Olee ụzọ a pụrụ isi mee ihe atụ iji gosi na Jehova na-ege ntị n’ekpere?
4 Jehova na-akpọ òkù ka e kpekuo ya ekpere. Anyị pụrụ iji nke a tụnyere nnọkọ ebe ọtụtụ mmadụ zukọtara ma na-ekwu okwu. Ị nọ n’ebe ahụ, na-ege ntị ka ndị ọzọ na-ekwu okwu. Ọnọdụ gị bụ nke onye na-ekiri ihe na-aganụ. Ma mgbe ahụ, otu onye chigharịkwuuru gị, kpọọ aha gị, wee gwa gị okwu. Nke a na-adọrọ mmasị gị n’ụzọ pụrụ iche. N’otu aka ahụ, Chineke na-ege ndị ya ntị mgbe nile, n’ebe ọ bụla ha nọ. (2 Ihe Emere 16:9; Ilu 15:3) Ya mere, ọ na-anụ okwu anyị nile, jiri ike nchebe na mmasị na-ekiri ihe na-emenụ, dị ka a pụrụ ikwu ya. Otú ọ dị, mgbe anyị kpọrọ aha Chineke n’ekpere, a na-adọrọ mmasị ya, ọ na-elekwasịkwa anyị anya ugbu a kpọmkwem. Site n’ike ya nile, Jehova pụrụ ọbụna ịchọpụta, ghọtakwa arịrịọ mmadụ na-ekwupụtaghị ekwupụta nke dị n’ime ime obi na uche ya. Jehova na-ekwe anyị nkwa na ya ga-abịa nso ndị nile ji obi eziokwu na-akpọku aha ya, na-achọkwa ịnọ ya nso.—Abụ Ọma 145:18.
Ịzaghachi Dị Ka Nzube Chineke Si Dị
5. (a) Gịnị ka ndụmọdụ ahụ bụ ‘ịnọgidesi ike n’ekpere’ na-egosi banyere ekpere anyị? (b) Olee ụzọ Chineke na-esi aza ekpere?
5 Ndụmọdụ ahụ bụ ka anyị nọgidesie ike n’ikpe ekpere na-egosi na mgbe ụfọdụ, Jehova pụrụ ikwe ka anyị nọgide na-ekpe ekpere banyere otu ihe ruo ogologo oge ụfọdụ tupu a hụta nzaghachi ya. Ọbụna na ike pụrụ ịgwụ anyị ịrịọ Chineke maka ihu ọma ma ọ bụ ịhụnanya obi ebere nke yiri ka ọ̀ dị anyị oké mkpa ma bụrụ nke a na-enwetabeghị ruo ogologo oge. N’ihi nke a, Jehova Chineke na-agwa anyị ka anyị ghara ịdaba n’iche echiche dị otú ahụ kama ka anyị nọgide na-ekpe ekpere. Anyị kwesịrị ịnọgide na-arịọ ya arịrịọ banyere nchegbu anyị nile, na-enwe obi ike na ọ na-akwanyere ekpere anyị ùgwù, na ọ ga-emezukwa ihe ndị dị anyị mkpa n’ezie, ọ bụghị nanị ihe anyị pụrụ ichepụtawo n’echiche. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jehova na-ahazi arịrịọ ndị anyị na-arịọ ya dị ka nzube ya si dị. Dị ka ihe atụ, arịrịọ anyị pụrụ imetụta ndị ọzọ. Anyị pụrụ iji okwu ahụ tụnyere ihe banyere onye bụ nna mgbe nwa ya rịọrọ ya ka o nye ya ịnyịnya ígwè. Nna ahụ maara na ọ bụrụ na ọ zụtara nwa ya nwoke ahụ ịnyịnya ígwè, nwa ya nwoke nke ọzọ ga-achọkwa ka a zụtara ya. Ebe ọ pụrụ ịbụ na otu n’ime ụmụ ya ndị ahụ etorubeghị ogo ịgba ịnyịnya ígwè, nna ahụ pụrụ ikpebi ịghara ịzụta nke ọ bụla n’oge ahụ. N’otu aka ahụ, n’iburu nzube na oge o ji eme ihe dị iche iche n’uche, Nna anyị nke eluigwe na-ekpebi ihe kachasị mma maka anyị na ndị ọzọ.—Abụ Ọma 84:8, 11; tụlee Habakuk 2:3.
6. Ihe atụ dị aṅaa ka Jisọs mere n’ihe banyere ekpere, gịnịkwa ka ịnọgidesi ike n’ekpere na-egosi?
6 Ihe atụ ahụ Jisọs mere banyere mkpa ọ dị na ndị na-eso ụzọ ya “aghaghị ikpe ekpere mgbe nile, na ịghara ikwe ka ike gwụ ha” kwesịrị ịrịba ama. Otu nwanyị di ya nwụrụ, n’enweghị ike inweta ikpe ziri ezi, nọgidere n’arịrịọ ọ na-arịọ onye ọkà ikpe bụ mmadụ, ruo mgbe o mesịrị nweta ikpe ziri ezi. Jisọs kwukwara, sị: “Ma Chineke, ọ́ gaghị ekpepụta ndị nke ya a họpụtara?” (Luk 18:1-7) Ịnọgidesi ike n’ekpere na-egosipụta okwukwe anyị, ndabere anyị na-adabere n’ebe Jehova nọ, ịdị njikere anyị ịnọ ya nso na ịrịọ ya arịrịọ, na-ahapụrụ ya iduzi ihe ga-esi na ya pụta.—Ndị Hibru 11:6.
Ihe Nlereanya nke Ndị Nọrọ Jehova Nso
7. Olee ụzọ anyị pụrụ isi ṅomie okwukwe Ebel n’ịnọ Jehova nso?
7 Bible jupụtara n’ihe ndekọ nke ekpere ndị ohu Chineke kpere. “E dere ha izi anyị ihe, ka anyị wee were ntachi obi na nkasi obi nke ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ nwee olileanya.” (Ndị Rom 15:4) A na-ewusi okwukwe anyị ike mgbe anyị na-atụle ihe atụ ụfọdụ nke ndị nọrọ Jehova nso. Ebel chere àjà a naara nke ọma n’ihu Chineke, ọ bụkwa eziokwu na e meghị ihe ndekọ banyere ekpere ọ bụla, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ rịọrọ Jehova arịrịọ n’ekpere ka e wee nara àjà ya nke ọma. Ndị Hibru 11:4 na-asị: “Okwukwe ka Ebel ji chee àjà n’ihu Chineke nke ka àjà Ken chere mma, nke e sitere na ya gbaara ya àmà na ọ bụ onye ezi omume.” Ebel maara banyere nkwa Chineke nke dị na Jenesis 3:15, ma n’iji ya tụnyere ihe anyị maara, ọ maara ihe dị nta nke ukwuu. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, Ebel mere ihe ná ndabere nke ihe ọmụma o nwere. Ya mere taa, ụfọdụ n’ime ndị ọhụrụ na-enwe mmasị n’eziokwu nke Chineke enwebeghị ihe ọmụma di ukwuu, ma ha na-ekpe ekpere, jirikwa ihe ọmụma ha nweworo enwe eme ihe kachasị mma, dị ka Ebel mere. Ee, ha na-eme ihe n’okwukwe.
8. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Abraham nọrọ Jehova nso, oleekwa ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?
8 Ohu Chineke ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi bụ Abraham, bụ́ “nna nke ndị nile kwere [“nwere okwukwe,” NW].” (Ndị Rom 4:11) Taa, karịa otú ọ dịtụworo mgbe ọ bụla na mbụ, ọ dị anyị mkpa inwe okwukwe siri ike, ọ dịkwa anyị mkpa ikpe ekpere n’okwukwe, dị ka Abraham mere. Jenesis 12:8 na-ekwu na o ‘wuuru Jehova ebe ịchụ àjà, wee kpọkuo aha Jehova.’ Abraham maara aha Chineke, jirikwa ya mee ihe n’ekpere. Ọtụtụ ugbo o ji obi eziokwu nọgidesie ike n’ikpe ekpere, “kpọkuo aha Jehova, bụ́ Chineke ebighị ebi.” (Jenesis 13:4; 21:33) Abraham nọ na-akpọku Chineke n’okwukwe nke e mesịrị jiri mara ya. (Ndị Hibru 11:17-19) Ekpere nyeere Abraham aka ịnọgide na-aṅụrị ọṅụ dị ukwuu n’olileanya Alaeze ahụ. Ànyị na-agbaso ihe nlereanya Abraham nke ịnọgidesi ike n’ekpere?
9. (a) N’ihi gịnị ka ekpere ndị Devid kpere ji bụrụ ihe na-abara ndị Chineke uru dị ukwuu taa? (b) Gịnị pụrụ ịpụta site n’anyị ikpe ekpere dị ka Devid kpere iji nọrọ Jehova nso?
9 Devid bụ ihe nlereanya pụtara ìhè n’ịnọgidesi ike n’ekpere, abụ ọma ndị o dere mekwara ihe atụ nke ihe ekpere kwesịrị ịbụ. Dị ka ihe atụ, o kwesịrị ekwesị ka ndị ohu Chineke kpee ekpere banyere ihe ndị dị ka nzọpụta ma ọ bụ nnapụta (3:7, 8; 60:5), nduzi (25:4, 5), nchebe (17:8), mgbaghara mmehie (25:7, 11, 18), na obi dị ọcha (51:10). Mgbe Devid nọ ná mkpagbu, o kpere ekpere, sị: “Mee ka mkpụrụ obi ohu gị ṅụrịa.” (86:4) Anyị pụrụ ikpe ekpere n’otu aka ahụ maka ọṅụ nke obi, na-amara na Jehova chọrọ ka anyị na-aṅụrị ọṅụ n’olileanya anyị. Devid nọrọ Jehova nso, wee kpee ekpere, sị: “Mkpụrụ obi m na-arapara gị n’ahụ n’iso gị n’azụ: mụ ka aka nri g̣ị jideworo.” (63:8) Ànyị ga-anọ Jehova nso, dị ka Devid nọrọ ya nso? Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, ọ ga-ejidesikwa anyị ike.
10. Echiche na-ezighị ezi dị aṅaa ka onye ọbụ abụ bụ Esaf nwere n’otu oge, ma gịnị ka o mesịrị ghọta?
10 Ọ bụrụ na anyị ga-anọ Jehova nso, ọ dị mkpa ka anyị zere inwe anyaukwu n’ebe ndị na-emebi iwu nọ maka ndụ ha nke enweghị nchegbu ọ bụla na nke ịhụ ihe onwunwe n’anya. Onye ọbụ abụ ahụ bụ Esaf chere n’otu mgbe na ọ baghị uru ọ bụla ijere Jehova ozi, n’ihi na ndi na-emebi iwu “na-anọgide n’udo mgbe ebighị ebi.” N’agbanyeghị nke ahụ, ọ ghọtara na echiche ya ezighị ezi, na ndị na-emebi iwu ‘nọkwa n’ebe na-amị amị.’ Ọ ghọtara na ọ dịghị ihe dị mma karịa ịnọ Jehova nso, o kwupụtakwara uche ya gwa Chineke n’ụzọ dị otú a: “Mụ onwe m nọ n’aka gị mgbe nile: i jidewo aka nri m. N’ihi na, lee, ndị nọ gị n’ebe dị anya ga-ala n’iyi. . . . Ma mụ onwe m, ịbịaru Chineke nso dị m mma: edowo m ebe mgbaba m n’Onyenwe anyị, bụ́ Jehova, ka m wee kọọ akụkọ banyere ije ozi gị nile.” (Abụ Ọma 73:12, 13, 18, 23, 27, 28) Kama ịdị na-enwe anyaukwu maka ndụ enweghị nchegbu nke ndị na-emebi iwu, bụ́ ndị na-enweghị olileanya ọ bụla, ka anyị ṅomie Esaf n’ịnọ Jehova nso.
11. N’ihi gịnị ka Daniel ji bụrụ ezi ihe nlereanya nke ịnọ Jehova nso, oleekwa ụzọ anyị pụrụ isi ṅomie ya?
11 Daniel, ná mkpebi ya siri ike, nọgidesiri ike n’ekpere, ọbụna mgbe o chere ihe ize ndụ ihu nke ịbụ onye a tụbara n’olulu ọdụm n’ihi ilefuru anya iwu nke na-egbochi ikpe ekpere nke ndị ọchịchị nyere. Ma Jehova ‘zitere mmụọ ozi ya wee kpuchite ọnụ ọdụm ndị ahụ,’ wee napụta Daniel. (Daniel 6:7-10, 22, 27) Daniel nwetara ngọzi dị ukwuu n’ihi nnọgide ọ nọgidere n’ikpe ekpere. Ànyị na-anọgidekwa n’ikpe ekpere, karịsịa mgbe mmegide a na-emegide ọrụ nkwusa Alaeze anyị na-eche anyị ihu?
Jisọs, Ihe Nlereanya Anyị
12. (a) N’oge mmalite ije ozi ya, ihe nlereanya dị aṅaa ka Jisọs setịpụrụ n’ihe banyere ekpere, oleekwa ụzọ nke a pụrụ isi baara ndị Kraịst uru? (b) Gịnị ka ekpere ihe nlereanya Jisọs kpughere banyere ekpere?
12 Site ná mmalite nke ije ozi elu ala ya, ihe ndekọ na-egosi na Jisọs bụ onye na-ekpe ekpere. Àgwà ikpe ekpere ọ nọ na ya n’oge a na-eme ya baptism setịpụrụ ezi ihe nlereanya nye ndị ahụ a na-eme baptism ime mmiri n’oge ndị a. (Luk 3:21, 22) Mmadụ pụrụ ikpe ekpere maka enyemaka Chineke iji rụzuo ihe baptism ime mmiri nọchiri anya ya. Jisọs nyekwaara ndị ọzọ aka ịbịakwute Jehova n’ekpere. N’otu oge mgbe Jisọs nọ n’otu ebe na-ekpe ekpere, otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya gwara ya mgbe e mesịrị, sị: “Onyenwe anyị, zi anyị ikpe ekpere.” Mgbe ahụ, Jisọs kọwapụtara ihe a maara ebe nile dị ka ekpere nlereanya ahụ, nke usoro ihe ndị dị n’ime ya na-egosi na aha na nzube Chineke kwesịrị ịnọ n’ọkwá mbụ. (Luk 11:1-4) Otú a, n’ekpere anyị nile, ọ dị mkpa ka anyị lee ihe anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị na n’ụzọ a haziri nke ọma, na-aghara ilefuru ‘ihe ndị ka mkpa’ anya. (Ndị Filipaị 1:9, 10) Otú ọ dị, a na-enwe mgbe ụfọdụ e nwere mkpa pụrụ iche ma ọ bụ mgbe ndị ọ dị mkpa ilebara mkpa ụfọdụ anya kpọmkwem. Dị ka Jisọs, ndị Kraịst pụrụ ijekwuru Chineke n’ekpere ịrịọ ikike ha ga-eji rụzuo ọrụ ụfọdụ ma ọ bụ iji chee ule ma ọ bụ ihe ize ndụ ụfọdụ ihu. (Matiu 26:36-44) N’eziokwu, ekpere onwe onye pụrụ imetụta ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ nile nke ndụ.
13. Olee ụzọ Jisọs si gosipụta ịdị mkpa nke ikpe ekpere maka ndị ọzọ?
13 Site n’ezi ihe nlereanya ya, Jisọs gosiri mkpa ọ dị ikpe ekpere n’ihi ndị ọzọ. Ọ maara na a ga-akpọ ndị na-eso ụzọ ya asị, kpagbuokwa ha, ọbụna dị ka e mere ya onwe ya. (Jọn 15:18-20; 1 Pita 5:9) N’ihi ya, ọ rịọrọ Chineke arịrịọ ‘ka o debe ha ka ha pụọ n’aka ajọ onye ahụ.’ (Jọn 17:9, 11, 15, 20) N’ịmarakwa ule ahụ pụrụ iche nke na-eche Pita ihu, ọ gwara, ya, sị: “Mụ onwe m rịọrọ arịrịọ banyere gị, ka okwukwe gị ghara ịgwụ agwụ.” (Luk 22:32) Lee nnọọ ka o si bụrụ ihe bara uru ma ọ bụrụ na anyị onwe anyị anọgidesiekwa ike n’ikpe ekpere n’ihi ụmụnna anyị, na-eche echiche banyere ndị ọzọ, ọ bụghị nanị banyere ihe isi ike na ọdịmma nke onwe anyị!—Ndị Filipaị 2:4; Ndị Kọlọsi 1:9, 10.
14. Olee ụzọ anyị si mara na Jisọs nọrọ Jehova ezi nso n’oge dum nke ije ozi elu ala ya, oleekwa ụzọ anyị pụrụ isi ṅomie ya?
14 N’oge ije ozi ya dum, Jisọs nọgidesiri ike n’ekpere, na-anọ Jehova ezi nso. (Ndị Hibru 5:7-10) Pita onyeozi, n’Ọrụ Ndị Ozi 2:25-28, hotara okwu dị n’Abụ Ọma 16:8, wee kọwaa ya n’ihe banyere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, sị: “Devid na-ekwu okwu banyere ya, sị, Ana m ahụrịị Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] n’ihu m mgbe nile; n’ihi na ọ nọ n’aka nri m, ka a ghara ime ka m mee mkpatụ.” Anyị pụrụ ime ihe yiri nke ahụ. Anyị pụrụ ikpe ekpere ka Chineke nọrọ anyị nso, anyị pụkwara igosipụta obi ike anyị nwere n’ebe Jehova nọ site n’iji anya nke uche anyị na-ahụ ya mgbe nile. (Tụlee Abụ Ọma 110:5; Aịsaịa 41:10, 13.) Mgbe ahụ, anyị ga-ezere ụdị nsogbu nile, n’ihi na Jehova ga-akwado anyị, ọ dịghịkwa mgbe a ga-ewezụga anyị n’ọnọdụ anyị.
15. (a) N’ihe banyere gịnị ka anyị na-ekwesịghị ịhapụ mgbe ọ bụla ịnọgidesi ike n’ikpe ekpere? (b) Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka e nyere banyere obi ekele anyị?
15 Ka anyị ghara ịkwụsị mgbe ọ bụla inye Jehova ekele maka ịdị mma nile o jiworo mesoo anyị, ee, maka ‘amara Chineke nke karịrị nke ukwuu,’ nke gụnyere onyinye o nyere Ọkpara ya dị ka àjà mgbapụta maka mmehie anyị nile. (2 Ndị Kọrint 9:14, 15; Mak 10:45; Jọn 3:16; Ndị Rom 8:32; 1 Jọn 4:9, 10) N’eziokwu, n’aha Jisọs, “na-ekelekwa Chineke, bụ́ Nna, ekele mgbe nile n’ihi ihe nile.” (Ndị Efesọs 5:19, 20; Ndị Kọlọsị 4:2; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:18) Anyị aghaghị ilezi anya ka anyị ghara ikwe ka e mebie obi ekele anyị n’ihi ihe anyị nwere n’ihi na anyị na-echegbubiga onwe anyị nke ukwuu n’ihi ihe anyị na-enweghị ma ọ bụ ihe ndị bụ ihe isi ike nke onwe anyị.
Ịtụkwasị Jehova Ibu Anyị Nile
16. Mgbe ibu ụfọdụ na-enye anyị nsogbu, gịnị ka anyị kwesịrị ime?
16 Ịnọgidesi ike n’ekpere na-egosipụta ịdị omimi nke nrara anyị raara onwe anyị nye. Mgbe anyị kpọkuru Chineke, mmetụta ọ na-enwe n’ahụ anyị na-adị mma ọbụna tupu anyị enweta azịza site n’aka ya. Ọ bụrụ na ọ dị ibu na-enye uche anyị nsogbu, anyị pụrụ ịnọ Jehova nso site n’ịgbaso ndụmọdụ ahụ bụ: “Tụkwasị Jehova ihe o nyeworo gị dị ka ibu, ya onwe ya ga-anagidekwa gị.” (Abụ Ọma 55:22) Site n’ịtụkwasị Chineke ibu anyị nile—nchegbu, nchekasị, enwetaghị ihe a tụrụ anya ya, egwu, na ihe ndị ọzọ—na-enwe okwukwe zuru ezu n’ebe ọ nọ, anyị na-enweta ndajụ nke obi, bụ́ “udo nke Chineke, nke kachasị uche nile.”—Ndị Filipaị 4:4, 7; Abụ Ọma 68:19; Mak 11:24; 1 Pita 5:7.
17. Olee ụzọ anyị pụrụ isi nweta udo nke Chineke?
17 Udo nke a nke Chineke ọ̀ na-abịa ozugbo ahụ? Ọ bụ ezie na anyị pụrụ inweta ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ntụsara ahụ ozugbo ahụ, ihe Jisọs kwuru banyere ikpe ekpere maka mmụọ nsọ bụkwa eziokwu n’ebe a: “Rịọnụ [“na-arịọnụ,” NW], a ga-enyekwa unu, chọọnụ [“na-achọnụ,” NW], unu ga-achọtakwa; kụọnụ [“na-akụnụ aka,” NW], a ga-emeghekwara unu.” (Luk 11:9-13) Ebe mmụọ nsọ bụ ụzọ anyị na-esi ewepụ nchegbu, ọ dị mkpa ka anyị nọgidesie ike n’ịrịọ arịrịọ maka udo nke Chineke na enyemaka ya n’ihe banyere ibu anyị nile. Anyị pụrụ ijide n’aka na site n’ịnọgidesi ike n’ekpere, anyị ga-enweta ntụsara ahụ na ndajụ obi nke dị anyị mkpa.
18. Gịnị ka Jehova na-emere anyị ma ọ bụrụ na anyị amaghị kpọmkwem ihe anyị ga-ekpe ekpere maka ya n’ọnọdụ ụfọdụ?
18 Ma, gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na anyị amaghị kpọmkwem ihe anyị ga-ekpe ekpere maka ya? Ịsụ ude anyị na-asụ n’ime obi na-anọgide ọtụtụ mgbe na-abụ nke a na-ekwupụtaghị ekwupụta n’ihi na anyị aghọtazughị ọnọdụ anyị nke ọma, ma ọ bụ anyị amaghị ihe anyị ga-eche Jehova n’ihu. Ọ bụ n’ebe a ka mmụọ nsọ pụrụ inyere anyị aka. Pọl dere, sị: “N’ihi na anyị amataghị ihe anyị ga-ekpe n’ekpere dị ka anyị na-aghaghị ikpe; kama ọ bụ mmụọ nsọ onwe ya weere ịsụ ude a na-apụghị ikwu na-arịọrọ anyị arịrịọ.” (Ndị Rom 8:26) Ò si aṅaa bụrụ otú ahụ? N’ime Okwu Chineke, e nwere amụma na ekpere ndị sitere n’ike mmụọ nsọ ndị metụtara ọnọdụ anyị. Ọ na-ekwe ka ndị a rịọrọ anyị arịrịọ, dị ka a pụrụ ikwu ya. Ọ na-anakwere ndị a dị ka ihe anyị ga-ekpe n’ekpere maka ha ma a sị nnọọ na anyị maara ihe ha pụtara n’ọnọdu anyị, ọ na-emezukwa ha.
Ekpere na Olileanya Na-adịgide
19. N’ihi gịnị ka ekpere na olileanya ga-eji nọgide ruo mgbe ebighị ebi?
19 Ikpegara Nna anyị nke eluigwe ekpere ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, karịsịa n’ihe banyere inwe ekele maka ụwa ọhụrụ ahụ na ngọzi ya nile. (Aịsaịa 65:24; Mkpughe 21:5) Anyị ga-anọgidekwa na-aṅụrị ọṅụ n’olileanya, n’ihi na ụdị ụfọdụ nke olileanya ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 13:13.) Anyị apụghị ọbụna icheta n’echiche ụdị ihe ọhụrụ ndị Jehova ga-ewepụta mgbe ọ na-anọkwaghị n’okpuru ụbọchị Sabat ahụ o nyere onwe ya. (Jenesis 2:2, 3) Ruo mgbe nile ebighị ebi, ọ ga na-eji ịhụnanya na-edebere ndị ya ihe ndị dị ịtụnanya n’ọdịnihu, e nwekwara oké ihe ndị a ga-emere ha n’ọdịnihu n’ihe banyere ime uche ya.
20. Gịnị kwesịrị ịbụ mkpebi anyị siri ike, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
20 N’inwe olileanya na-akpali akpali otú a n’ihu anyị, ka anyị nile nọrọ Jehova nso site n’ịnọgidesi ike n’ekpere. Ka anyị ghara ịkwụsị mgbe ọ bụla ikele Nna anyị nke eluigwe maka ngọzi nile anyị nwetara. Mgbe oge ya ruru, anyị ga-eji ọṅụ nweta mmezu nke olileanya anyị nile, ọbụna karịa ihe anyị pụrụ icheworịị n’echiche ma ọ bụ ịtụworịị anya ya, n’ihi na Jehova pụrụ “imebiga ókè nke ukwuu hie nne karị ihe nile nke anyị na-arịọ ma ọ bụ nke anyị na-atụgharị uche.” (Ndị Efesọs 3:20) Ya mere, n’iburu nke a n’uche, ka anyị nye Jehova bụ Chineke anyị, bụ́ “Onye na-anụ ekpere,” ịja mma nile na otuto na ekele ruo mgbe nile ebighị ebi!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Dị ka akwụkwọ ọkọwa okwu bụ Webster’s New Dictionary of Synonyms si kwuo, “Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na mgbe nile, okwu ahụ bụ ịnọgidesi ike na-egosipụta àgwà dị mma; ọ na-atụ aro mmadụ ịjụ ịbụ onye a kụdara aka site n’ọdịda n’imezu ihe a chọrọ, obi abụọ, ma ọ bụ ihe isi ike dị iche iche, tinyekwara ịnọgidesi ike na-achụso otu ihe mgbaru ọsọ ma ọ bụ otu ihe omume.”
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
◻ N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị nọgidesie ike n’ekpere?
◻ Gịnị ka anyị na-amụta site n’ihe nlereanya nke ikpe ekpere tupu oge Kraịst?
◻ Gịnị ka ihe nlereanya nke Jisọs na-akụziri anyị banyere ekpere?
◻ Olee ụzọ anyị pụrụ isi tụkwasị Jehova ibu anyị nile, gịnịkwa na-esi na ya apụta?
[Foto dị na peeji nke 17]
Daniel nọgidesiri ike n’ekpere n’agbanyeghị iyi egwu nke ịbụ onye a tụbara n’olulu ọdụm