Ihe Mere Na Ọ Dị Ihe Nri Anyasị Nke Onyenwe Anyị Pụtaara gị
JISỌS KRAỊST malitere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị n’abalị ikpeazụ nke ndụ mmadụ ya. Ọ bụ anyasị Thursday, March 31, Jisọs nwụkwara n’ehihie Friday, April 1. Ebe ọ bụ na ụbọchị ndị e nwere na kalenda ndị Juu na-amalite n’uhuruchi nke otu ụbọchị ruo nke ụbọchị na-eso ya, Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị na ọnwụ Jisọs mechara na Nisan 14, 33 O.A.
N’ihi gịnị ka Jisọs ji malite nri a? Gịnị ka achịcha ahụ na mmanya ahụ o ji mee ihe bụ ihe ịrịba ama ha? Ònye kwesịrị iso rie ya? Ugbo ole ka e kwesịrị ịdị na-eme oriri a? Oleekwa otú ọ pụrụ isi nwee ihe ọ pụtaara gị?
Gịnị Mere E Ji Malite Ya?
Banyere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, Jisọs gwara ndị ozi ya, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” Dị ka nsụgharị ọzọ si dee ya, ọ sịrị: “Meenụ nke a dị ka ihe ncheta m.” (1 Ndị Kọrint 11:24; The New English Bible) N’ezie, a na-ezokarị aka n’ebe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị dị dị ka Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst.
Jisọs nwụrụ dị ka onye na-eguzosi ike n’ezi ihe nke na-akwado ọkaaka Jehova wee si otú ahụ nwapụta Setan ịbụ onye ụgha nke na-akwa emo n’ihi ịma aka na ụmụ mmadụ ziri ezi ji ihe nkwali ndị nke ọchịchọ onwe onye nanị na-ejere Chineke ozi. (Job 2:1-5) Ọnwụ ya mere ka obi Chineke ṅụrịa.—Ilu 27:11.
Site n’ọnwụ ya dị ka mmadụ zuru okè, Jisọs ‘nyekwara ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.’ (Matiu 20:28) N’imehie megide Chineke, nwoke mbụ ahụ tụfuru ndụ mmadụ zuru okè na olileanya ya nile. Ma “Chineke hụrụ ụwa [nke ihe a kpọrọ mmadụ] n’anya otú a, na o nyere ọbụna Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka onye ọ bụla nke kwere na ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ee, “ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ; ma onyinye amara nke Chineke bụ ndụ ebighị ebi n’ime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.”—Ndị Rom 6:23.
‘A Natara n’Aka Onyenwe Anyị’
Okwu ndị a nke Pọl onyeozi kọwakwuru ememe ncheta nke ọnwụ Kraịst: “Mụ onwe m natara n’aka Onyenwe anyị ihe m nyekwara unu n’aka idebe, na Onyenwe anyị Jisọs n’abalị ahụ nke a raara ya nye n’aka mmadụ, o naara ogbe achịcha, keleekwa, wee nyawaa ha, sị, Nke a bụ ahụ m, nke a na-enye n’ihi unu: na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m. Mgbe ha risịrị nri anyasị, ọ narakwa iko otú ahụ, sị, Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ n’ime ọbara m: na-emenụ nke a, mgbe ọ bụla unu ga-aṅụ ya, ka unu wee na-echeta m. N’ihi na mgbe ọ bụla unu na-eri achịcha nke a, na-aṅụkwa iko ahụ, unu na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị ruo mgbe ọ ga-abịa.”—1 Ndị Kọrint 11:23-26.
Ebe Pọl na-esoghị Jisọs na ndị ozi 11 ahụ nọrọ na Nisan 14, 33 O.A., ihe àmà na-egosi na ihe ọmụma nke a bụ nke a “natara n’aka Onyenwe anyị” site ná mkpughe sitere n’ike mmụọ nsọ. Jisọs malitere Ememe Ncheta ahụ “n’abalị ahụ nke [Judas] raara ya nye” n’aka ndị okpukpe ndị Juu bụ́ ndị iro, bụ́ ndị mere ka ndị Rom kpọgide Kraịst n’elu osisi. Ndị o ruuru ikere òkè n’achịcha na mmanya nnọchianya ndị ahụ ga-eme otú ahụ ná ncheta ya.
Na-eme Ya Ugboro Ole?
Gịnị ka okwu Pọl pụtara, nke bụ́: “Mgbe ọ bụla unu na-eri achịcha nke a, na-aṅụkwa iko ahụ, unu na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị ruo mgbe ọ ga-abịa”? Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi ga-ekere òkè n’ihe nnọchianya ndị ahụ nke Ememe Ncheta “mgbe ọ bụla” ruo mgbe ha nwụrụ, ka e wee kpọlite ha ma e mesịa gaa ná ndụ eluigwe. N’ihu Chineke na ụwa, ha ga-esi otú a na-akpọsa mgbe ọ bụla okwukwe ha ná ndokwa Jehova mere nke bụ àjà Jisọs. Ruo ogologo oge hà aṅaa? “Ruo mgbe ọ ga-abịa,” ka Pọl kwuru, nke ihe àmà na-egosi na ọ pụtara na ememe ndị a ga-aga n’ihu ruo mgbe Jisọs bịarutere ịnara ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ gaa n’eluigwe site ná mbilite n’ọnwụ n’oge “ọnụnọ” ya. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:14-17, NW) Nke a kwekọrọ n’okwu ndị Kraịst gwara ndị ozi 11 ahụ na-anọgidesi ike n’ihe: “Ọ bụrụkwa na mụ agaa idoziri unu ebe, agaje m ịbịa ọzọ, m ga-anarakwa unu nye onwe m; ka unu onwe unu wee nọọkwa ebe mụ onwe m nọ.”—Jọn 14:3.
È kwesịrị ime ememe ncheta ọnwụ Kraịst kwa ụbọchị ma ọ bụ ma eleghị anya kwa izu? Ọ dị mma, Jisọs malitere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, e gbuokwa ya n’Ememe Ngabiga, bụ́ nke na-echeta mgbapụta Israel site n’agbụ ndị Ijipt. N’ezie, a kpọrọ ya “àjà ngabiga anyị, bụ́ Kraịst” n’ihi na ọ bụ ya bụ Nwa Atụrụ a chụụrụ ndị Kraịst n’àjà. (1 Ndị Kọrint 5:7) E mere Ememe Ngabiga nanị otu ugbo n’afọ, na Nisan 14. (Ọpụpụ 12:6, 14; Leviticus 23:5) Nke a na-egosi na e kwesịrị ịdị na-eme ncheta ọnwụ Jisọs nanị mgbe ọ bụla a na-emebu Ememe Ngabiga—kwa afọ, ọ bụghị kwa ụbọchị ma ọ bụ kwa izu.
Ruo ọtụtụ narị afọ ọtụtụ ndị sị n’aha bụ ndị Kraịst mere ncheta ọnwụ Jisọs otu ugbo kwa afọ. N’ihi na ha na-eme otú ahụ na Nisan 14, a kpọrọ ha ndị Quartodeciman, nke pụtara “ndị ụbọchị nke iri na anọ.” Banyere ha, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ J. L. von Mosheim dere, sị: “Ọ maara ndị Kraịst nke Asia Minor ahụ ime ememe oriri a dị nsọ, bụ́ ncheta nke mmalite nke nri anyasị Onyenwe anyị, na ọnwụ nke Jisọs Kraịst, n’otu mgbe ahụ ndị Juu riri atụrụ Ngabiga ha, ya bụ n’uhuruchi ụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa mbụ [Nisan]. . . . Ha weere ihe ilereanya nke Kraịst dị ka iwu.”
Ihe Ihe Nnọchianya Ndị Ahụ Pụtara
Pọl sịrị na Jisọs “naara ogbe achịcha, keleekwa, wee nyawaa ha.” A ghaghị ịnyawa achịcha ahụ yiri biskit nke e ji ntụ ọka na mmiri mee n’etinyeghị ya ihe iko achịcha (ma ọ bụ yisti) ka e wee rie ya. N’okwu ihe atụ nke Bible, ihe iko achịcha na-egosipụta mmehie ma ọ bụ ịrụ arụ. Ka ọ na-agba ndị Kraịst bụ́ ndị Kọrint ume ịchụpụ nwoke na-eme omume rụrụ arụ n’ọgbakọ, Pọl sịrị: “Ùnu amataghị na ihe iko achịcha dị nta na-eko ogbe ụtụ ọka a gwọrọ agwọ dum? Sachapụnụ ihe iko achịcha ochie, ka unu wee bụrụ ogbe ụtụ ọka a gwọrọ agwọ ọhụrụ, dị ka unu bụ achịcha ekoghị eko. N’ihi na a chụkwara àjà ngabiga anyị, bụ́ Kraịst: ya mere, ka anyị na-eme ememe ahụ, ọ bụghị n’ihe iko achịcha ochie, ọ bụghịkwa n’ihe iko achịcha nke bụ obi ọjọọ na ajọ ọrụ, kama n’achịcha ekoghị eko nke bụ ịdị ọcha na eziokwu.” (1 Ndị Kọrint 5:6-8) Dị ka ntakịrị ihe iko achịcha na-eko ogbe, ma ọ bụ ngwakọta dum nke achịcha, otú ahụ ka ọgbakọ ahụ ga-abụ nke na-adịghị ọcha n’anya Chineke ma ọ bụrụ na e wepụghị mmetụta na-emerụ emeru nke nwoke mmehie ahụ. Ọ dị ha mkpa iwepụ “ihe iko achịcha” ahụ n’etiti ha, dị nnọọ ka ndị Israel pụrụ isi ghara inwe ihe iko achịcha n’ụlọ ha nile n’oge Ememe Achịcha Ekoghị Eko nke sochiri Ememe Ngabiga.
Banyere achịcha ekoghị eko nke Ememe Ncheta ahụ, Jisọs sịrị: “Nke a bụ ahụ m, nke a na-enye n’ihi unu.” (1 Ndị Kọrint 11:24) Achịcha ahụ na-anọchite anya anụ ahụ zuru okè nke Jisọs, bụ́ nke Pọl dere banyere ya, sị: “Mgbe [Jisọs] na-abịa n’ụwa, ọ sị, Àjà na ihe e chere n’ihu gị, ị chọghị ha, ma ahụ ka ị kwadebere nye m; Àjà nsụresị ọkụ na àjà a chụrụ banyere mmehie, ha abụghị ihe dị gị ezi mma: mgbe ahụ ka m sịrị, Lee, abịawo m (n’akwụkwọ mpịakọta ka e deworo ihe banyere m) ime ihe ị na-achọ, Chineke. . . . Ọ bụkwa n’ọchịchọ a ka e doworo anyị nsọ site n’iche ahụ Jisọs Kraịst n’ihu Chineke dị ka àjà nanị otu mgbe.” (Ndị Hibru 10:5-10) Anụ ahụ Jisọs nke zuru okè enweghị mmehie, o jekwara ozi dị ka àjà mgbapụta maka ihe bụ mmadụ.—Ndị Hibru 7:26.
Ka o kpesịrị ekpere maka iko nke mmanya ahụ na-acha ọbara ọbara nke a na-agwaghị ihe, Jisọs sịrị: “Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ n’ime ọbara m.” (1 Ndị Kọrint 11:25) Nsụgharị ọzọ sịrị: “Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke e ji ọbara m mee ka o guzo.” (Moffatt) Dị ka ọbara nke oké ehi na ewu ndị a chụrụ n’àjà mere ka ọgbụgba ndụ Iwu ahụ n’etiti Chineke na mba Israel dị irè, otú a ka ọbara Jisọs a wụpụrụ n’ọnwụ mere ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ dị irè. Nhota e hotara ọgbụgba ndụ ahụ na-enyere anyị aka ịmata ndị iwu kwadoro iso rie ihe nnọchianya ndị ahụ nke Ememe Ncheta.
Ònye Kwesịrị Iso Rie?
Ụmụ azụ Jisọs e tere mmanụ ndị nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ziri ezi iso rie ihe nnọchianya ndị ahụ nke Ememe Ncheta. A gbara ọgbụgba ndụ nke a n’etiti Chineke na Israel ime mmụọ. (Jeremaịa 31:31-34; Ndị Galetia 6:16) Ma ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ga-emesịa wetara ihe nile a kpọrọ mmadụ na-erube isi ngọzi, ị pụkwara iso ná ndị ga-anata ngọzi ndị ahụ.
Ndị so eri ihe nnọchianya ndị ahụ nke Ememe Ncheta aghaghị ịnọ n’onwe ha n’ọgbụgba ndụ maka Alaeze nke Jisọs gbara. Mgbe ọ na-amalite nri a, Jisọs gwara ndị ozi ya na-anọgidesi ike n’ihe, sị: “Mụ onwe m na-agbakwa ndụ inye unu alaeze, dị ka Nna m gbara ndụ inye m.” (Luk 22:29) Ọgbụgba ndụ Alaeze nke Chineke so Eze Devid gbaa tụrụ aka n’oge dị n’ihu n’ọbịbịa nke Jisọs, bụ́ onye ga-achị isi ruo mgbe ebighị ebi n’Alaeze eluigwe ahụ. E sere onyinyo Israel ime mmụọ ahụ dị 144,000 bụ́ ndị ga-eso ya kere òkè n’ịchị isi dị ka ha na-eguzo n’Ugwu Zaịọn nke eluigwe ha na Nwa Atụrụ ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst. Mgbe a kpọlitere ha n’ọnwụ, ha ga-eso Kraịst chịa dị ka ndị so bụrụ eze na ndị nchụàjà. (2 Samuel 7:11-16; Mkpughe 7:4; 14:1-4; 20:6) Nanị ndị nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na n’ọgbụgba ndụ onwe onye nke ha na Jisọs ziri ezi iso rie ihe nnọchianya ndị ahụ nke Nri Anyasị Onyenwe Anyị.
Mmụọ Chineke na-eso mmụọ nke ndị ahụ e tere mmanụ na-agba àmà na ha bụ ụmụ Ya na ndị ha na Kraịst na-ekekọ ihe. Pọl dere, sị: “Mmụọ nsọ onwe ya sooro mmụọ anyị na-agba àmà, na anyị bụ ụmụ Chineke: ma ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, anyị bụkwa ndị nketa; ndị nketa nke Chineke, na ndị ha na Kraịst na-ekekọ; ma ọ bụrụ na ọ bụ ezie na anyị na ya na-ahụkọ ahụhụ, ka e wee nyekọọkwa anyị na ya otuto.” (Ndị Rom 8:16, 17) Mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ọrụ, Chineke na-akpata n’ime ndị e tere mmanụ obi ike na a họpụtawo ha maka ndụ eluigwe. Ha na-ele ihe nile Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ndụ eluigwe anya dị ka a na-agwa ha, dịkwa njikere ịhapụ ihe nile nke ụwa, gụnyere ndụ mmadụ. Ọ bụ ezie na ndụ n’ime ụwa Paradaịs ga-adị ebube, ha enweghị olileanya ahụ. (Luk 23:43) Olileanya e ji n’aka nke na-adịghị agbanwe agbanwe, nke na-adabereghị n’echiche dị iche iche nke okpukpe ụgha, na-enye ha ikike iso rie ihe nnọchianya ndị ahụ nke Ememe Ncheta.
Ọ ga-ewute Jehova ma mmadụ na-asị na ya bụ onye a kpọrọ ịbụ eze na onye nchụàjà n’eluigwe mgbe ọ na-enweghị ọkpụkpọ dị otú ahụ. (Ndị Rom 9:16; Mkpughe 22:5) Chineke gburu Kora n’ihi iji mpako chọọ ọkwá onye nchụàjà. (Ọpụpụ 28:1; Ọnụ Ọgụgụ 16:4-11, 31-35) Ya mere, gịnị ma ọ bụrụ na oké mkpali mmetụta uche ma ọ bụ echiche okpukpe ndị e nwere na mbụ mere ka mmadụ rie ihe nnọchianya ndị ahụ nke Ememe Ncheta n’ụzọ na-ezighị ezi? Mgbe ahụ o kwesịrị ịkwụsị iri ya ma kpee ekpere n’obi umeala maka mgbaghara Chineke.—Abụ Ọma 19:13.
Otú O Si Metụta Gị
A chọghị n’aka mmadụ iri ihe nnọchianya ndị ahụ nke Ememe Ncheta ka àjà mgbapụta Jisọs wee kpuchie ya, o wee nata ndụ ebighị ebi n’elu ụwa. Dị ka ihe atụ, Bible enyeghị ihe ọ bụla na-egosi na ndị na-atụ egwu Chineke dị ka Abraham, Sera, Aịsak, Rebeka, Boaz, Rut, na Devid ga-enwe mgbe ha ga-eri ihe nnọchianya ndị a. Ma ha na ndị ọzọ nile na-achọ ndụ agwụghị agwụ ná mbara ala a ga-egosipụta okwukwe na Chineke na Kraịst na ná ndokwa Jehova nke bụ́ àjà mgbapụta Jisọs. (Jọn 3:36; 14:1) Ncheta kwa afọ nke ọnwụ Kraịst na-eje ozi dị ka ihe ncheta nke oké àjà ahụ.
Ịdị mkpa nke àjà Jisọs bụ nke e gosipụtara mgbe Jọn onyeozi sịrị: “Ihe ndị a ka m na-edegara unu n’akwụkwọ, ka unu wee ghara imehie. Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla emehie, anyị nwere otu onye na-ekwu ọnụ anyị n’ebe Nna anyị nọ, ya bụ Jisọs Kraịst, bụ́ onye ezi omume: ya onwe ya bụkwa ihe ịjụrụ Chineke obi banyere mmehie nile anyị; ma ọ bụghị ihe ịjụrụ ya obi banyere nanị mmehie nke anyị onwe anyị, kama ọ bụkwa ihe ịjụrụ ya obi banyere mmehie nke ụwa dum.” (1 John 2:1, 2) Ndị Kraịst e tere mmadụ pụrụ ịsị na Jisọs bụ “ihe ịjụrụ Chineke obi banyere mmehie [ha].” Otú ọ dị, ọ bụkwa àjà maka mmehie nke ụwa dum, na-eme ka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi nwee ike inweta ndụ na-adịghị agwụ agwụ n’ụwa Paradaịs ahụ dị oké nso!
Site n’ịnọ n’oge ime ncheta ọnwụ Kraịst, ị ga-erite uru site n’okwu Bible na-akpali iche echiche. A ga-echetara gị otú Jehova Chineke na Jisọs Kraịst siworo meere anyị ihe dị ukwuu. Ọ ga-enyeghachi ụgwọ ọrụ n’ụzọ ime mmụọ iso ndị nwere nkwanye ùgwù dị omimi maka Chineke na Kraịst na maka àjà mgbapụta Jisọs zukọọ. Ememe ahụ pụrụ nnọọ imesi ọchịchọ gị ike maka ịbụ onye ga-anata amara Chineke, nke ga-eduga ná ndụ agwụ agwụ. Anyị ji obi anyị na-akpọ gị òkù iso Ndịàmà Jehova zukọ mgbe anyanwụ dasịrị n’April 6, 1993, ime ncheta nke ọnwụ Jisọs Kraịst n’ihi na Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị pụrụ inwe ihe dị ukwuu ọ pụtara nye gị.