Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ruo ókè hà aṅaa ka ndị Kraịst kwesịrị ichegbu onwe ha n’ihi na a pụrụ itinyeworị ihe ndị mejupụtara ọbara, dị ka “plasma” e chekpọrọ echekpọ, ná nri ndị e mepụtara emepụta?
Ọ bụrụ na e nwere ezi ihe mere a ga-eji kwere na e ji ọbara anụmanụ (ma ọ bụ otu n’ihe ndị mejupụtara ya) eme ihe n’ógbè unu n’imepụta nri, ndị Kraịst kwesịrị iji ezi nlezianya mee ihe. Ma, ọ ga-abụ ihe amamihe na-adịghị na ya inwe obi erughị ala ma ọ bụ ịnọ ná nchegbu nanị n’ihe a na-ejighị n’aka.
Ná mmalite nke akụkọ ihe mere eme mmadụ, Onye Okike anyị nyere iwu na ụmụ mmadụ ekwesịghị iri ọbara. (Jenesis 9:3, 4) O kwuru na ọbara nọchiri anya ndụ, nke bụ onyinye sitere n’aka ya. A pụrụ iji ọbara e wepụtara n’ihe e kere eke mee ihe nanị maka ịchụ àjà, dị ka n’elu ebe ịchụàjà. Ma ọ bụghị otú ahụ, a ga-awụfu ọbara e wepụtara site n’ihe e kere eke n’ala, na-enyeghachi ya Chineke dị ka a pụrụ isi lee ya anya. Ndị ya ga-ezere ichebe ndụ site n’ịnara ọbara. O nyere iwu, sị: “Unu erila ọbara anụ ahụ ọ bụla: n’ihi na ndụ nke anụ ahụ ọ bụla, ọbara ya ka ọ bụ: onye ọ bụla nke na-eri ya, a ga-ebipụ ya.” (Levitikọs 17:11-14) A gwaghachiri ndị Kraịst banyere mmachibido Chineke machibidoro iri ọbara. (Ọrụ 15:28, 29) Ya mere ọ dị ndị Kraịst oge gboo mkpa izere nri ọbara dị na ya, dị ka anụ sitere n’anụmanụ a nyagburu anyagbu ma ọ bụ ngwọngwọ ọbara.
Otú ọ dị, n’itinye ya n’ọrụ, olee otú ndị Kraịst ndị ahụ ga-esi mee ihe ná mkpebi ha siri ike nke ‘ichebe onwe ha pụọ n’imetụ ọbara aka’? (Ọrụ 21:25) Ihe ha ga-eme ọ̀ bụ nanị itinye okwu ndị ahụ nke Pọl n’ọrụ, sị: “Ihe nile ọ bụla a na-ere n’ahịa anụ, rienụ ya, ghara ịjụ ajụjụ n’ihi akọ na uche”?
Ee e. Okwu ndị ahụ dị ná 1 Ndị Kọrint 10:25 na-ezo aka n’anụ nke pụrụ isite n’anụmanụ a chụrụ n’àjà n’ụlọ arụsị. Laa azụ na mgbe ahụ, a na-ewepụ anụ fọdụrụ n’ụlọ nsọ site n’iresi ya ndị ahịa, bụ́ ndị pụrụ itinyekọ ya n’anụ ndị ha na-ere n’ụlọ ahịa ha. Ihe Pọl na-ekwu bụ na anụ sitere n’ụlọ nsọ enweghị ihe ọjọọ ma ọ bụ ihe na-egbu egbu o bu n’ime ya. N’ụzọ ihe àmà dị na ya ọ bụ ihe a na-emekarị bụ́ ịgbapụsị ọbara nile dị n’anụ ndị e ji chụọ àjà n’ebe ahụ nakwa iji ya mee ihe n’elu ebe ịchụàjà nke ndị na-ekpere arụsị. Ya mere ọ bụrụ na e rere ụfọdụ n’ime anụ ahụ nke gabigara ihe a chọrọ n’ahịa, n’enweghị ihe ọ bụla doro anya jikọrọ ya na ụlọ nsọ ma ọ bụ nghọta ndị na-ezighị ezi nke ndị ọgọ mmụọ, ndị Kraịst pụrụ ịzụrụ ya dị ka anụ a na-ere n’ahịa bụ́ nke dị ọcha nakwa nke a gbapụsịrị ọbara dị na ya nke ọma.
Otú ọ dị, ọ ga-adị iche ma ọ bụrụ na ndị Kraịst ahụ maara na anụ sitere n’anụ a nyagburu anyagbu (ma ọ bụ ngwọngwọ ọbara) so n’ihe ndị dị n’ụlọ ahịa dị n’ógbè ha. Ọ ga-adị ha mkpa iji nlezianya mee ihe n’ịhọrọ anụ ha ga-azụrụ. Ha pụrụ ịmata ihe ndị e ji anụ mee bụ́ ndị ọbara dị na ha ma ọ bụrụ na ndị ahụ nwere ụcha pụrụ iche (ọbụna dị ka a pụrụ ịmata ngwọngwọ ọbara n’ala ebe ndị a na-ahụkebe ya). Ma ọ bụ ndị Kraịst pụrụ ịjụ ase onye ogbu anụ ma ọ bụ onye na-ere anụ a maara nke ọma. Ọ bụrụ na ha e nweghị ihe mere ha ga-eji kwere na anụ ụfọdụ nwere ọbara na ha, ha pụrụ ịzụrụ ma rie.
Pọl dekwara, sị: “Meenụ ka mmadụ nile mara obi ọma unu.” (Ndị Filipaị 4:5) A pụrụ itinye nke ahụ n’ọrụ n’ihe metụtara ịzụrụ anụ. Ma Iwu ndị Israel ma iwu nke òtù na-achị isi nke ndị Kraịst na narị afọ mbụ nyere adịghị nke gosiri na ndị Chineke tinyerịrị mgbalị gabigara ókè iji mee njụpụta banyere anụ, ọbụna ghọọ ndị na-adịghị ata anụ ma ọ bụrụ na e nwee obere obi abụọ ọ bụla banyere ọbara ịdị n’anụ nke e nwere.
Onye Israel na-achụ nta nke gburu anụ ga-agbapụsị ọbara ya. (Tụlee Deuterọnọmi 12:15, 16.) Ọ bụrụ na ezinụlọ ya apụghị iricha anụ ahụ, ọ pụrụ ire ụfọdụ. Ọbụna n’anụ e gbupụrụ ọbara nke ọma, ntakịrị ọbara ka ga-afọdụ n’anụ ahụ, ma ọ dịghị ihe ọ bụla na Bible nke na-egosi na ọ dị onye Juu na-azụ anụ mkpa ịgabiga ihe a chọrọ nke ịmata ihe ndị dị ka minit ole gaferenụ mgbe e gbusịrị anụ tupu e gbupụ ya ọbara, akwara nke e gbubiri iji mee ka ọbara gbapụ, na otú e si kobe anụ ahụ n’elu ruokwa ogologo oge hà aṅaa. Gaakwa n’ihu, òtù na-achị isi edeghị na ọ dị ndị Kraịst mkpa iji mkpachara anya pụrụ iche mee ihe n’akụkụ nke a, dị ka a ga-asị na ha chọrọ inweta azịza nile zuru ezu tupu ha erie anụ ọ bụla.
N’ọtụtụ ala taa, iwu, omenala, ma ọ bụ ihe omume okpukpe bụ nke na-achọ na ihe ndị e si n’anụ mepụta (ma e wezụga ihe ndị pụrụ iche dị ka ngwọngwọ ọbara) na-esite n’anụ ndị a na-aghaghị ịgbapụsị ọbara dị na ha mgbe e gburu ha. Otú a, ọ gaghị adịkebe ndị Kraịst bi n’ebe ndị ahụ mkpa ichegbubiga onwe ha ókè banyere usoro e ji gbuo ma ọ bụ mepụta ya. N’echiche gbasapụrụ agbasapụ, ha pụrụ ịdị ‘na-eri anụ a na-ere n’ahịa, n’ajụghị ajụjụ,’ ha pụkwara inwe akọ na uche ziri ezi na ha na-ezere ọbara.
Otú ọ dị, n’oge ụfọdụ e nwewo akụkọ ozi, banyere iji ọbara mee ihe n’azụmahịa bụ́ nke nyeworo ụfọdụ ndị Kraịst nsogbu. Ụfọdụ ndị na-ere anụ na-eche sị na a pụrụ iwekọta ọbara dị ukwuu sitere n’anụ e gburu egbu maka iji ya mee ihe ma rite uru, dị ka ná ntụ́ fertilizer ma ọ bụ nri ụmụ anụ. Ndị na-eme nchọpụta amụwo ihe ọmụmụ iji mara ma à pụrụ iji ọbara dị otú ahụ (ma ọ bụ ihe ndị mejupụtara ya) mee ihe n’anụ ndị a gwakọrịtara ha na ihe ndị ọzọ. Ọbụna na ụlọ ọrụ ole na ole na-emepụta ihe ahịa emepụtawo ọ̀tụ̀tụ̀ na-ehikebeghị nne nke plasma dị mmiri mmiri, nke oyi mere ka ọ kpụkọọ akpụkọ, ma ọ bụ nke e gwere egwe (ma ọ bụ mkpụrụ ndụ ọbara uhie na-enwekwaghị ụcha ya) nke a pụrụ iji dochie anya ọ̀tụ̀tụ̀ anụ dị nta n’ihe ndị dị ka ngwọngwọ a kpụrụ akpụ ma ọ bụ anụ a kwọrọ akwọ. Ihe ọmụmụ ndị ọzọ elekwasịwo anya n’iji ihe ndị e si n’ọbara e mere ka ọ dị ntụ́ ntụ́ mepụta dị ka ihe ndị a na-etinye ná nri ma ọ bụ ndị e ji ejidekọta mmiri na abụba n’anụ e gwere egwe, n’ihe ndị e ghere eghe, ma ọ bụ n’ihe oriri na ihe ọṅụṅụ ndị ọzọ iji tinye ya protein ma ọ bụ iron.
Otú ọ dị, ọ dị mma ịrịba ama na a nọwo na-eme ụdị nchọpụta dị otú ahụ kemgbe ọtụtụ iri afọ. Ma, o yiri ka ojiji e ji ihe ndị dị otú ahụ eme ihe ọ̀ bụrụwo nke a kpaara ókè nke ukwuu ma ọ bụ ọbụna nke na-adịghị adị ma ọlị n’ihe ka n’ọtụtụ ala. Ụfọdụ akụkọ ozi e nwere na-enye aka igosi ihe kpatara ya:
“Ọbara bụ ebe e si enweta protein nke na-edozi ahụ na nke na-arụ ọrụ. Otú ọ dị, e jiriwo ọbara ehi mee ihe n’ọ̀tụ̀tụ̀ a kpaara ókè ná nri ụmụ mmadụ na-eri kpọmkwem n’ihi ụcha ya nke pụtakarịrị ìhè na otú o si atọ.”—Journal of Food Science, Mpịakọta nke 55, Nọmba nke 2, 1990.
“Protein ndị e nwere n’ime plasma nke dị n’ọbara, nwere ihe ndị bara uru dị na ya, dị ka ịbụ nke na-agbari ngwa ngwa, ịrụ ọrụ nke ịgbari àbụ̀bà, bụrụkwa nke ya na mmiri na-adịghị agwakọrịta . . . ijikwa ha mee ihe n’imepụta nri na-enye abamuru dị ukwuu. Otú ọ dị, e mewo ka ọ pụta ìhè na Japan na e nweghị usoro ọ bụla dị irè nke e ji eme ka plasma dị ọcha, karịsịa mgbe a mịpụsịrị mmiri dị na ya.”—Journal of Food Science, Mpịakọta nke 56, Nọmba nke 1, 1991.
Ụfọdụ ndị Kraịst mgbe ụfọdụ, agụwo akwụkwọ ndị a na-amapawa n’ahụ nri ndị a gbara ná mkpọ, ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị ọchịchị na-achọ ka e depụta ihe ndị e ji mee ya. Ha pụkwara ịhọrọ ime otú ahụ mgbe nile banyere ihe ọ bụla nke ha nwere ihe mere ha ga-eji kwere na ọbara dị na ya. N’ezie, ọ ga-abụ ihe ziri ezi, izere ihe ndị e depụtara ihe ndị dị ka ọbara, plasma nke ọbara, plasma, protein nke globin (ma ọ bụ globulin), ma ọ bụ hemoglobin (ma ọ bụ globin) iron. Ihe ọmụma e ji ere ahịa nke sitere n’otu ụlọ ọrụ dị na Europe nke na-arụ ụdị ọrụ a na-ekweta, sị: “A ghaghị idepụta ihe ọmụma nke na-egosi na e tinyere globin ná nri ná mkpọ e ji tinye nri ahụ n’ụzọ nke na onye ahụ na-azụ ya agaghị abụ onye e duhiere n’ihe banyere ihe ndị mejupụtara nri ahụ ma ọ bụ uru nke dị na ya.”
Otú ọ dị, ọbụna n’ihe banyere inyocha akwụkwọ ndị a na-amapawa n’ihe na ịjụ ase ndị na-egbu anụ, ọ dị mkpa iji ezi uche mee ihe. Ihe a na-ekwu abụghị na ndị Kraịst n’ụwa nile aghaghị ịtụle akwụkwọ ndị a na-amapawa n’ihe nakwa ihe ndị e ji mepụta nri nile a gbara ná mkpọ ma ọ bụ na ha kwesịrị ịgba ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ oriri na ọṅụṅụ ma ọ bụ ebe ndị a na-ere nri ajụjụ. Onye Kraịst pụrụ ibu ụzọ jụọ onwe ya, sị, ‘Ọ̀ dị ihe àmà ọ bụla a chọpụtaworo nke na-egosi na e ji ọbara ma ọ bụ ihe e nwetara n’ọbara eme ihe n’imepụta nri n’ógbè ma ọ bụ obodo a?’ N’ihe ka ọtụtụ n’ebe dị iche iche, azịza ya bụ ee e. N’ihi ya, ọtụtụ ndị Kraịst ekpebiwo na ha onwe ha agaghị etinye oge dị ukwuu na uche ha n’ịga nyochawa ihe na-eyikebeghị ka ọ na-eme eme. Onye na-echeghị otú a, kwesịrị ime dị ka akọ na uche ya si dị, n’ekpeghị ndị ọzọ ikpe, bụ́ ndị pụrụ ikpebi okwu ahụ n’ụzọ dị iche ma nweekwa ezi akọ na uche n’ihu Chineke.—Ndị Rom 14:2-4, 12.
Ọbụna a sị na a pụrụ imepụta nri ndị ọbara dị na ha, ọ pụrụ ịbụ na nke a abụghị ihe a na-eme n’ebe nile n’ihi ego, iwu obodo, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, magazin bụ́ Food Processing (September 1991) kwuru, sị: “Maka ndị ahụ na-agba nri ná mkpọ, bụ́ ndị nwere nsogbu ọ bụla banyere ihe dị ala karịa 1% (n’achịcha e ji anụ mee) nke plasma anụ ehi a gwakọtara ya na mmiri, ịgwakọta ya n’ụzọ ọzọ na-eme ka e nwee protein nke kpụkọrọ ọnụ n’ọnọdụ ya, a pụkwara ịnabata ya dị ka Kosher [nri iwu ndị Juu kwadoro].”
O kwesịrị ka e mesie ya ike na iwu, omenala, ma ọ bụ ihe na-amasị ndị mmadụ n’ọtụtụ ala bụ ụdị nke na a na-emekarị ka ọbara gbapụsịa site n’anụ e gburu egbu, na a dịghịkwa eji ọbara dị otú ahụ eme ihe n’imepụta nri ndị ọzọ. Ọ bụrụ na e nweghị ihe e ji n’aka mere a ga-eji chee na ọnọdụ ahụ dị iche n’ógbè ebe i bi ma ọ bụ na e nwewo mgbanwe dị ịrịba ama n’oge na-adịbeghị anya, ndị Kraịst kwesịrị ịnọ ná nche megide ichegbu onwe ha n’ihi nanị ihe e lere anya na ọ pụrụ ime ma ọ bụ n’ihi asị̀rị̀. Otú ọ dị, mgbe o doro anya ma ọ bụ yikarịa ka à na-eji ọbara eme ihe n’ụzọ sara mbara—ma ọ̀ bụ ná nri ma ọ bụ́ n’iji gwọọ ọrịa—anyị kwesịrị ikpebisi ike irube isi n’iwu Chineke ịzere ọbara.