Nrubeisi Chineke n’Ezinụlọ E Kewara Ekewa n’Ụzọ Okpukpe
“ỌNA-AFỤ afụ nke ukwuu karịa otiti ihe nkịtị. . . . Ọ na-adị m ka e tijasịrị m ahụ, ma ọ dịghị onye pụrụ ịhụ ya.” “Mgbe ụfọdụ ọ na-adị m ka ọ bụ m nwụọ . . . ma ọ bụ gawara onwe m ma ghara ịlaghachi ọzọ.” “Ọ na-esi ike mgbe ụfọdụ ichezi echiche.”
Okwu ndị ahụ jupụtara ná mmetụta uche na-ekpughe mmetụta nke obi nkoropụ na owu ọmụma. Ha sitere n’ọnụ ndị e ji okwu ọnụ tie ihe—ebubo, iyi egwu, ịkpọ aha ndị na-eweda mmadụ ala, ịgba nkịtị—na ọbụna iti ihe nkịtị site n’aka onye òtù ọlụlụ ha na ndị òtù ezinụlọ. N’ihi gịnị ka e ji emeso ndị a n’ụzọ ọjọọ otú a? Nanị n’ihi ndịrịta iche nke nkwenkwe okpukpe. N’okpuru ọnọdụ ndị a, ibi n’ezinụlọ e kewara ekewa n’ụzọ okpukpe na-eme ka ofufe Jehova bụrụ nnukwu ihe ịma aka. Ma, ọtụtụ ndị Kraịst a na-emejọ n’ụzọ dị otú a na-enwe ihe ịga nke ọma n’igosipụta nrubeisi Chineke.
Ọ bụ ihe obi ụtọ na a dịghị achọta nhụsianya na nrụgide dị otú ahụ n’ezinụlọ nile e kewara ekewa n’ụzọ okpukpe. Ka o sina dị, ọ na-eme eme. Ezinụlọ gị ò kwekọrọ ná nkọwa a? Mgbe ahụ, ọ pụrụ ịdị na-esiri gị ike ịnọgide na-akwanyere onye òtù ọlụlụ gị ma ọ bụ nne na nna gị ùgwù. Ọ bụrụ na ị bụ nwunye nke nọ n’ọnọdụ ahụ ma ọ bụ ụmụ na gburugburu ebe obibi dị otú ahụ, olee otú ị pụrụ isi nwee ihe ịga nke ọma n’igosipụta nrubeisi Chineke n’ezinụlọ e kewara ekewa n’ụzọ okpukpe? Olee nkwado ndị ọzọ pụrụ inye? Oleekwa nnọọ otú Chineke si ele okwu ahụ anya?
Gịnị Mere O Ji Esi Oké Ike Irube Isi?
Ọchịchọ ọdịmma onwe nanị na enweghị ekele nke ụwa na ọchịchọ ezughị okè ndị nke gị na-ejikọ aka na-eme ka nrubeisi Chineke bụrụ ọgụ na mgba oge nile. Setan maara nke a, uche ya nile bụkwa igbu mmụọ gị. Ọ na-ejikarị ndị òtù ezinụlọ eme ihe, bụ́ ndị nwere mmasị na nkwanye ùgwù dị nta, ma ọ bụrụ na ha nwere ma ọlị, maka ụkpụrụ nile nke Chineke. Ụkpụrụ ime mmụọ na nke omume gị ndị dị elu na-adịkarị nnọọ iche pụọ ná ndị nke ezinụlọ gị na-ekweghị ekwe. Nke a pụtara echiche ndị na-emegiderịta ibe ha n’omume na ọrụ. (1 Pita 4:4) Nrụgide ime gị ka i si n’ụkpụrụ ndị Kraịst wezụga onwe gị pụrụ isi ike, ebe ọ bụ na i rubewo isi n’iwu bụ́: “Unu esola ọrụ nke ọchịchịrị nke na-amịghị mkpụrụ na-enwekọ ihe.” (Ndị Efesọs 5:11) N’anya ha ọ dịkwaghị ihe i mere dị mma. Ọ bụ okpukpe gị kpatara ihe dum. Otu nne, mgbe o nwere ibu arọ n’ihi ụmụaka nọ n’ọrịa, rịọrọ maka enyemaka di ya ma nweta azịza ime akaje bụ́, “I nwere oge maka okpukpe gị; enyemaka adịghị gị mkpa.” Okwu ndị dị otú ahụ na-etinye ihe n’ihe ịma aka nke irube isi.
E nwekwara oge mgbe unu na-agaghị ekwekọrịta n’okwu ndị na-emegideghị Akwụkwọ Nsọ kpọmkwem. Ma, ị matara na ị bụ akụkụ nke ezinụlọ, ruokwa n’ókè ahụ i nwere ibu ọrụ ụfọdụ. “M na-enwe oké mmetụta uche mgbe m na-eche banyere ụzọ nna m si emeso anyị n’ihi na m matara na ọ na-eche na ọ nọ nanị ya,” ka Connie na-ekwu. “Aghaghị m ichetara onwe m ọtụtụ mgbe ka m ghara iwe iwe n’ihi mmegide nna m. Ọ dị m mkpa ịgwa onwe m na e nwere ihe siri ike mere o ji emeghachi omume otú a ma ọ bụ na-ajụ nguzo anyị. Setan bụ onye ọchịchị nke usoro ihe nke a.” Susan, onye di ya na-ekweghị ekwe, kpughere na nzuzo, sị: “Na mbụ m na-eche na m chọrọ ikewapụ—ma ọ bụkwaghị ugbu a. M maara na Setan ji ya eme ihe iji nweta m.”
Mgbalị Setan ime ka i nwee mmetụta nke abaghị uru pụrụ iyi nke na-adịghị ebelatatụ ebelatatụ. Ọtụtụ ụbọchị pụrụ ịgabiga n’enweghị nkwurịta okwu n’etiti gị na onye òtù ọlụlụ gị. Ndụ pụrụ ịbụ nke oké owu ọmụma. Nke a na-erichapụ obi ike na ùgwù onwe onye ma na-anwale nrubeisi Chineke gị. Ụmụaka na-enwekwa mmetụta nke nrichapụ nke mmetụta uche na nke anụ ahụ. N’otu ọnọdụ, ọ bụ ezie na nne na nna ha jụrụ, ndị ntorobịa atọ na-ejere Chineke ozi ji ikwesị ntụkwasị obi na-aga nzukọ ndị Kraịst. Otu n’ime ha, bụ́ onye ozi oge nile ugbu a, kwuru, sị: “Ahụ ga-akụnwụsị anyị, ike agwụsịakwa anyị; anyị apụghị ihi ụra; o tiwara anyị obi.”
Gịnị Ka Chineke Na-atụ Anya Ya n’Aka Gị?
Mgbe nile irubere Chineke isi na-ebute ụzọ, nrubeisi a kpaara ókè nye ịbụ isi nke di aghaghị ịbụkwa mgbe nile dị ka Jehova tụziri. (Ọrụ 5:29) Nke ahụ pụrụ isi ike, ma ọ pụrụ ikwe omume. Nọgide na-elegara Chineke anya maka enyemaka. Ọ chọrọ ka ị ‘kpọọ isiala n’ime mmụọ na eziokwu,’ ṅaakwa ntị ma rube isi ná nduzi ya. (Jọn 4:24) Ihe ọmụma sitere n’Okwu Chineke, mgbe ọ na-ejupụta ụdị obi nke ziri ezi, na-akpali nrubeisi site n’ọchịchọ obi. Ọ bụ ezie na ọnọdụ nke gị pụrụ ịgbanwe, ma Jehova ma Okwu ya adịghị nke na-agbanwe. (Malakaị 3:6; Jemes 1:17) Jehova ekenyewo ịbụ isi n’aka di. Nke a na-abụ eziokwu ma ọ̀ nakweere ịbụ isi Kraịst ma ọ bụ na ọ nakwereghị ya. (1 Ndị Kọrint 11:3) Ọ bụ ezie na nke a pụrụ isi ike ịnagide ma ọ bụrụ na ị na-eche mkparị na mweda n’ala ihu mgbe nile, Jemes onye na-eso ụzọ sịrị: “Amamihe ahu nke si n’elu bịa . . . na-ekwenye okwu nke ọma.” (Jemes 3:17) Ịghọta ịbụ isi nke a n’enweghị mgbagha na ịnakwere ya chọrọ mmụọ Chineke, karịsịa mkpụrụ ya nke ịhụnanya.—Ndị Galetia 5:22, 23.
Mgbe ị hụrụ mmadụ n’anya, ọ na-aka mfe irubere ịbụ isi Chineke guzobere isi. Ndị Efesọs 5:33 na-adụ ọdụ, sị: “Onye ọ bụla ya hụ nwunye nke aka ya n’anya, dị ka ọ na-ahụ onwe ya n’anya; ka nwunye leziekwa anya ka ọ na-atụ egwu di ya.”
Chee banyere Jisọs. A kparịrị ya n’okwu ọnụ na n’iti ihe, ma ọ dịghị mgbe o kwutọrọ onye ọ bụla. Ọ nọgidere na-enwe ihe ndekọ nke na-enweghị ntụpọ. (1 Pita 2:22, 23) Ka Jisọs wee die oké mkparị ndị dị otú ahụ, obi ike dị ukwuu na ịhụnanya na-adịghị ada ada maka Nna ya, bụ́ Jehova, dị ya mkpa. Ma, ịhụnanya “na-anagide ihe nile.”—1 Ndị Kọrint 13:4-8.
Pọl chetaara onye ọrụ ibe ya bụ́ Timoti, ọ na-echetakwara anyị taa sị: “Chineke enyeghị anyị mmụọ nke ụjọ; kama ọ bụ nke ike na ịhụnanya na ime ka uche zuo okè.” (2 Timoti 1:7) Ịhụnanya miri emi maka Jehova na maka Jisọs Kraịst pụrụ ịkpali gị gaa ná nrubeisi Chineke mgbe ọnọdụ yiri nke a na-apụghị idi edi. Izu okè nke uche ga-enyere gị aka ịnọgide na-enwe echiche ziri ezi ma lekwasị anya ná mmekọrịta gị na Jehova na Jisọs Kraịst.—Tụlee Ndị Filipaị 3:8-11.
Ndị Òtù Ọlụlụ Na-enwe Ihe Ịga nke Ọma n’Igosi Nrubeisi Chineke
Mgbe ụfọdụ ị ghaghị ichere ogologo oge iji hụ ụzọ Jehova ga-esi dozie nsogbu gị. Ma, aka ya adịghị mkpụmkpụ mgbe ọ bụla. “Na-eme mgbe nile ihe Jehova nyere gị ikike na ihe ùgwù ime—ife ya ofufe ná nzukọ na mgbakọ nile, ịmụ ihe, ije ozi, na ikpe ekpere,” ka otu onye na-enwe ihe ịga nke ọma n’igosipụta nrubeisi Chineke na-enye ndụmọdụ ya. Ọ bụ mgbalị gị ka Jehova na-agọzi, ọ bụghị nanị ihe ndị ị rụzuru. Ná 2 Ndị Kọrint 4:17, Pọl onyeozi sịrị na ‘mkpagbu anyị dị na nwa oge a, ma ọ na-arụpụtara anyị ebube nke na-adịru ebighị ebi.’ Tụgharịa uche na nke a. Ọ ga-abụrụ gị ihe na-eme ka i guzo kwem. Otu nwunye na-echetaghachi, sị: “Ndụ ezinụlọ m adịghị aka mma, mgbe ụfọdụkwa adịghị m ama ma obi ọ̀ dị Jehova ụtọ banyere m. Ma otu ihe m na-ewere dị ka ngọzi ya bụ eziokwu ahụ bụ na m na-apụta n’ọnọdụ ndị a siri ike n’ọnọdụ ka mma karịa di m. Ịmara na ihe anyị na-eme na-atọ Jehova ụtọ na-eme ka mgbalị ahụ nile bụrụ ihe bara uru.”
Jehova na-ekwe nkwa na ya agaghị ekwe ka i nwee ọnọdụ ndị karịrị ihe ị pụrụ ịnagide. Tụkwasị ya obi. Ọ maara ihe karịa gị, ọ makwaara gị karịa otú ị maara onwe gị. (Ndị Rom 8:35-39; 11:33; 1 Ndị Kọrint 10:13) Ikpegara Jehova ekpere n’ọnọdụ ndị siri ike na-enye aka. Kpee ekpere ka mmụọ ya duzie gị, karịsịa mgbe ị na-amaghị ụzọ ị ga-eso ma ọ bụ ụzọ isi chee otu ọnọdụ ihu. (Ilu 3:5; 1 Pita 3:12) Na-etiku ya mgbe nile maka ndidi, njide onwe onye, na obi umeala iji rubere ịbụ isi dị ná ndụ gị isi. Ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Jehova bụ nkume m dị elu, na ebe m e wusiri ike, na onye na-eme ka m gbapụ.” (Abụ Ọma 18:2) Icheta nke a bụ ihe enyemaka na-enye ume maka ndị nọ n’ezinụlọ e kewara ekewa n’ụzọ okpukpe.
Karịsịa ihe nile, tinye mgbalị nile iji mee ka alụmdi na nwunye gị bụrụ nke obi ụtọ. Ee, Jisọs bu ụzọ hụ na ozi ọma ahụ ga-akpata nkewa. Ma, kpee ekpere ka nkewa ọ bụla ghara ịbụ n’ihi àgwà ma ọ bụ omume gị. (Matiu 10:35, 36) N’iburu nke a n’uche, imekọ ihe ọnụ na-ebelata nsogbu alụmdi na nwunye. Ọbụna mgbe ọ bụ nanị gị na-egosipụta àgwà a kwesịrị ekwesị, ọ pụrụ ime ihe dị ukwuu iji gbochie nsogbu ka ha ghara iru n’ọnọdụ esemokwu na enweghị nkwekọrịta gabigara ókè. Ndidi na ịhụnanya dị oké mkpa. ‘Na-adị nwayọọ, na-anagidekwa ihe ọjọọ.’—2 Timoti 2:24.
Pọl onyeozi ghọrọ ‘ihe nile n’ebe mmadụ nile nọ.’ (1 Ndị Kọrint 9:22) N’otu aka ahụ, n’ahapụghị ọrụ ndị Kraịst, ọ pụrụ ịdị gị mkpa mgbe ụfọdụ ịhazigharị usoro ihe omume gị iji tinyekwuo oge n’iso onye òtù ọlụlụ na ezinụlọ gị nọkọọ. Nye onye ị họọrọ iso kerịta ndụ gị oge dị ukwuu dị ka o kwere omume. Gosi nchebara echiche nke ndị Kraịst. Nke a bụ ngosipụta nke nrubeisi Chineke.
Ọ na-akara nwunye na-atụ egwu Chineke ma na-edo onwe ya n’okpuru bụ́ onye dị nro ma dị ọmịiko mfe igosipụta nrubeisi Chineke. (Ndị Efesọs 5:22, 23) Okwu dị amara, “e ji nnú mee ka ọ dị ụtọ,” na-enye aka ibelata ọtụtụ ugbo ole a pụrụ inwe esemokwu.—Ndị Kọlọsi 4:6; Ilu 15:1.
Amamihe Chineke na-enye gị okwu ịdọ aka ná ntị ka i dozie esemokwu ngwa ngwa ma weghachi udo site n’okwu ọma ndị na-ewuli elu, kama ịlakpu ụra “ná mkpasu iwe.” (Ndị Efesọs 4:26, 29, 31) Nke a na-ewe obi umeala. Daberesie ike n’ebe Jehova nọ maka ume. Otu nwunye bụ́ onye Kraịst ji obi umeala kweta, sị: “Mgbe ekpere si n’ala ala obi gasịrị, enwewo m ahụmahụ nke mmụọ Jehova iwelite aka m ịmakụ di m.” Okwu Chineke na-adụ ọdụ, sị: “Unu enyeghachila onye ọ bụla ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ . . . Were ezi ihe merie ihe ọjọọ.” (Ndị Rom 12:17-21) Nke a bụ okwu ndụmọdụ amamihe dị na ya na ụzọ nke nrubeisi Chineke.
Ụmụaka Ndị Na-egosi Nrubeisi Chineke
Ndụmọdụ Jehova nye unu bụ́ ụmụaka ndị nọ n’ezinụlọ e kewara ekewa n’ụzọ okpukpe bụ: “Na-aṅanụ ntị okwu ndị mụrụ unu n’ihe nile, n’ihi na nke a bụ ihe na-atọ ezi ụtọ n’ime Onyenwe anyị.” (Ndị Kọlọsi 3:20) Rịba ama na e webatara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst n’okwu a. N’ihi ya, irubere ndị nne na nna isi abụghị nke a na-akparaghị ókè. N’otu akụkụ ndụmọdụ dị n’Ọrụ Ndị Ozi 5:29, “ikwenyere Chineke karịa mmadụ,” dịkwaara ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst. Ọnọdụ dị iche iche ga-ebilite mgbe ị na-aghaghị ikpebi ihe ị ga-eme ná ndabere nke ihe ị maara ziri ezi dị ka Akwụkwọ Nsọ na-ekwu. Ọ pụrụ ịkpata ụdị ntaramahụhụ ụfọdụ n’ihi ịjụ itinye aka n’ihe omume nke ofufe ụgha. Ọ bụ ezie na nke a bụ atụmanya na-adịghị enye obi ụtọ, ị pụrụ inweta nkasi obi, ọbụnadị nwee ike ịṅụrị ọṅụ n’eziokwu bụ na ị na-ata ahụhụ n’ihi ime ihe ziri ezi n’anya Chineke.—1 Pita 2:19, 20.
Ebe ọ bụ na e ji ụkpụrụ Bible na-eduzi echiche gị, ị pụrụ ịgba iche n’ebe ndị mụrụ gị nọ n’okwu ụfọdụ. Nke a adịghị eme ha ndị iro gị. Ọbụna ma ọ bụrụ na ha abụghị ndị ohu Jehova raara onwe ha nye, ha ruru eru inweta nsọpụrụ kwesịrị ekwesị. (Ndị Efesọs 6:2) Solomọn sịrị: “Gee nna gị, bụ́ onye mụrụ gị, ntị, eledakwala nne gị anya.” (Ilu 23:22) Gbalịa ịghọta obi mgbu ha na-enwe n’ihi gị ịgbaso okwukwe nke ha na-amaghị ama. Soro ha kwurịta okwu, ‘meekwa ka a mara obi ọma gị.’ (Ndị Filipaị 4:5) Kwupụta mmetụta na nchegbu gị. Guzosie ike maka ụkpụrụ nile nke Chineke, ma, ‘a sị na ọ bụ ihe ga-ekwe gị, ka ihe nke dịịrị gị onwe gị hà, gị na mmadụ nile na-adị n’udo.’ (Ndị Rom 12:18) Eziokwu bụ na ị na-erubere ụkpụrụ iwu nne na nna isi ugbu a na-egosi Jehova na ị chọrọ ịnọgide na-erube isi dị ka onye Alaeze ahụ ga-achị.
Ihe Ndị Ọzọ Pụrụ Ime
Ndị Kraịst bi n’ezinụlọ e kewara ekewa n’ụzọ okpukpe nwere mkpa nke nkwado na nghọta site n’aka ndị ofufe ibe ha. Nke a na-apụta ìhè site n’okwu nke otu onye sịrị: “Ọ na-adị m ka mụ enweghị olileanya na enyemaka ma ọlị, ebe ọ bụ na ọ dịghị ihe onye ọ bụla pụrụ ime, ọ dịghịkwa ihe m pụrụ ime iji gbanwee ya. M na-atụkwasị Jehova obi ime uche ya n’ezinụlọ anyị, ihe ọ sọrọ ya bụrụ.”
Iso ụmụnna nwoke na nwanyị n’ime mmụọ na-akpakọrịta ná nzukọ ndị Kraịst bụ ebe mgbaba. Otu onye a kọwara ndụ ya dị ka “ụwa abụọ dịgasị iche. Otu nke m ga-anọrịrị n’ime ya na otu nke m ga-enwe mmasị ịnọ na ya.” Ịhụnanya nke òtù ụmụnna bụ ihe na-eme ka o kwe ndị a nọ n’ahụhụ omume ịtachi obi ma na-eje ozi n’ọnọdụ nile. Tinye ha n’ekpere gị. (Ndị Efesọs 1:16) Mgbe mgbe, n’ọnọdụ ọ bụla, na-agwa ha okwu na-agba ume, na-ewuli elu, na-akasikwa obi. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Mgbe a pụrụ ime ya, mgbe o kwesịkwara ekwesị, gụnye ha n’ihe omume gị dị iche iche nke ọchịchị Chineke na nke nnọkọ mmekọrịta mmadụ na ibe ya.
Ngọzi na Uru Nile nke Nrubeisi Chineke
Na-atụgharị uche kwa ụbọchị banyere ngọzi na uru nile nke igosipụta nrubeisi Chineke n’ezinụlọ e kewara ekewa n’ụzọ okpukpe. Na-agbalị irube isi. ‘Ike agwụla gị.’ (Ndị Galetia 6:9) Ntachi obi n’ọnọdụ ndị na-adịghị mma na ikpe na-ezighị ezi “n’ihi akọ na uche n’ebe Chineke nọ . . . bụ ihe ekele” n’ebe Chineke nọ. (1 Pita 2:19, 20) Na-erube isi ruo n’ókè a na-emebighị ụkpụrụ na iwu ezi omume Jehova. Nke a na-egosi ịnọgidesi ike n’ihe nye ndokwa Jehova. Àgwà nsọpụrụ Chineke gị pụrụ ọbụna ịzọpụta ndụ nke onye òtù ọlụlụ gị, ụmụ gị, ma ọ bụ nne na nna gị.—1 Ndị Kọrint 7:16; 1 Pita 3:1.
Ka ị na-anagide ihe nile ezinụlọ e kewara ekewa n’ụzọ okpukpe chọrọ, a na-atụkwa anya ha, cheta ịdị mkpa nke iguzosi ike n’ezi ihe nye Jehova Chineke na Jisọs Kraịst. Ị pụrụ ịhapụ ọtụtụ ihe, ma ịhapụ nguzosi ike n’ezi ihe bụ ịhapụ ihe nile, tinyere ndụ n’onwe ya. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Chineke . . . gwara anyị okwu n’ọgwụgwụ ụbọchị ndị a n’ime Ọkpara, Onye O doro onye nketa nke ihe nile, Onye O sitekwara n’aka Ya mee ụwa nile.” Ịghọta “oké nzọpụta dị otú a” ga-ewusi gị ike ịdị na-erube isi.—Ndị Hibru 1:1, 2; 2:3.
Nrubeisi na nguzosi ike gị na-adịghị ada ada maka omume na ụkpụrụ ndị ziri ezi bụ ihe nchebe na-enye ahụ ike nye gị na onye òtù ọlụlụ gị na-ekweghị ekwe. Ikwesị ntụkwasị obi na-ewusi ihe nkekọ ezinụlọ ike. Ilu 31:11 na-ekwu banyere nwunye na-ejide onwe ya nke ọma bụ́ nke na-anọgidesi ike n’ihe, sị: “Obi di ya atụkwasịwo ya obi.” Ịdị ọcha gị n’omume na nkwanye ùgwù dị omimi pụrụ imeghe anya di gị na-ekweghị ekwe. Ọ pụrụ iduje ya n’ịnakwere eziokwu Chineke.
Nrubeisi Chineke bụ n’ezie ihe dị oké ọnụ ahịa na nke na-azọpụta ndụ. Kpee ekpere maka ya ná ndụ ezinụlọ gị. Ọ ga-arụpụta udo nke uche ma wetara Jehova otuto.