Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Okwu ahụ bụ “onye nwere onyinye mmụọ nsọ,” nke a na-achọta ná 1 Ndị Kọrint 14:37, ọ̀ pụtara na mmadụ anatawo mmụọ nsọ n’echiche ịbụ onye e tere mmanụ, ka ọ̀ pụtara na o nwere onyinye ọrụ ebube sitere ná mmụọ nsọ?
Na New World Translation of the Holy Scriptures, amaokwu nke a na-agụ, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-eche na ya bụ onye amụma ma ọ bụ onye nwere onyinye mmụọ nsọ, ya nakwere ihe ndị m na-edegara unu, n’ihi na ha bụ ihe Onyenwe anyị nyere n’iwu.”—1 Ndị Kọrint 14:37.
Onye na-agụ nke a pụrụ iwere ahịrị okwu ahụ bụ́ “onye nwere onyinye mmụọ nsọ” dị ka izo aka gaa n’eziokwu ahụ bụ na ndị Kraịst narị afọ mbụ bụ ndị e ji mmụọ nsọ mụta ma ghọọ ụmụ ime mmụọ nke Chineke. Ma ọ bụ a pụrụ ịghọta ahịrị okwu ahụ dị ka nke na-emetụta onye nataworo onyinye pụrụ iche nke mmụọ nsọ. Nghọta nke abụọ a yikarịrị nke ọ bụ, dị ka ihe a na-atụle n’ebe ahụ nyere aka igosi.
N’ebe a Pọl onyeozi jiri okwu Grik bụ́ pneu·ma·ti·kosʹ mee ihe, bụ́ nke nwere echiche bụ isi nke “ihe banyere mmụọ nsọ, ime mmụọ.” E ji ụdị ya dị iche iche mee ihe ná nkọwa ndị dị ka “ahụ nke mmụọ na-achị,” ‘ngọzi mmụọ nsọ,’ “nghọta nile nke mmụọ nsọ,” “ụlọ nke mmụọ nsọ.”—1 Ndị Kọrint 15:44; Ndị Efesọs 1:3; Ndị Kọlọsi 1:9; 1 Pita 2:5.
N’ọnọdụ ndị ahụ, Bible kwupụtara isiokwu ha (ahụ, ngọzi, nghọta, ụlọ) nke “mmụọ nsọ” na-akọwa. Ma n’ọnọdụ ndị ahụ, echiche na nghọta kwesịrị ekwesị nke “mmụọ nsọ” aghaghị ịbụ nke e kpebiri site n’ihe gbara ya gburugburu. Dị ka ihe atụ, 1 Ndị Kọrint 2:14, 15 na-egosi ọdịiche dị n’àgwà nke onye anụ ahụ na-achị nakwa nke onye ho pneu·ma·ti·kosʹ, nke pụtara n’ụzọ ezi uche dị na ya “onye mmụọ nsọ na-achị.”
Ndị Kọrint nke Mbụ, isi nke 12 ruo 14 na-elekwasị anya n’onyinye ọrụ ebube nke mmụọ nsọ. Chineke nyere onyinye ndị a n’aka ụfọdụ ndị Kraịst oge mbụ iji gosipụta na ya adịkwaghị eji Israel anụ ahụ eme ihe kama ugbu a ọ na-agọzi “Israel nke Chineke” bụ́ ndị Kraịst. (Ndị Galetia 6:16) Banyere onyinye ndị a, Pọl dere, sị: “Ugbu a e nwere ụdị dị iche iche nke onyinye, ma e nwere otu mmụọ nsọ ahụ.” (1 Ndị Kọrint 12:4, NW) Amamihe pụrụ iche, ihe ọmụma, na okwukwe so n’onyinye nke mmụọ nsọ, dịkwa ka ibu amụma, ikwu okwu n’ọtụtụ asụsụ, na nkọwa nke ọtụtụ asụsụ.—1 Ndị Kọrint 12:8-11.
Ndị Kraịst nọ na Kọrint bụ́ ndị Pọl degaara akwụkwọ bụ ndị e ji mmụọ nsọ Chineke tee mmanụ. Pọl sịrị: “Ma unu sachara onwe unu, ma e doro unu nsọ, ma a gụrụ unu ná ndị ezi omume n’aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ya na n’ime mmụọ nke Chineke anyị.” (1 Ndị Kọrint 6:11; 12:13) Ee, mmadụ nile anatawo ‘mmụọ nsọ, bụ́ ihe e ji mara na a ga-emezu ya.’ (2 Ndị Kọrint 5:5) Otú ọ dị, ọ bụghị ha nile natara onyinye pụrụ iche site ná mmụọ nsọ. O yikwara ka ọtụtụ hà nwere oké mmasị n’ikwu okwu n’ọtụtụ asụsụ, na-atụkwasị ịdị mkpa na-ekwesịghị ekwesị n’onyinye nke a. Pọl dere akwụkwọ iji gbazie echiche ha wee rụtụ aka na ikwu okwu n’ọtụtụ asụsụ ga-abara ọtụtụ ndị uru dịkwa ka onyinye nke ibu amụma ga-eme. Ná ngwụsị nke isi nke 12, Pọl dụrụ ndị Kọrint ọdụ, sị: “Werenụ obi na-anụ ọkụ chọọ onyinye amara ndị a nke ka ukwuu.”—1 Ndị Kọrint 12:28-31.
Mgbe ahụ, ná mmalite nke isi nke 14, ọ gbara ume, sị: “Na-agbasonụ ịhụnanya; otú ọ dị werenụ obi na-anụ ọkụ chọọ [ta pneu·ma·ti·kaʹ], ma na-achọkarịnụ ka unu buo amụma.” Na-achọ gịnị? Ọ dịghị mkpa ndị Kraịst ịchọwa mmụọ nke otite mmanụ, n’ihi na ha enweworị nke ahụ. N’ụzọ ezi uche dị na ya, Pọl bu n’uche “onyinye” nke mmụọ nsọ, nke ya onwe ya, ná ngwụsị nke isi nke 12, gbara ha ume ịchọ. Ya mere, New World Translation of the Holy Scriptures sụgharịrị 1 Ndị Kọrint 14:1 ịbụ: “Jirinụ ịnụ ọkụ n’obi nọgide na-achọ onyinye ime mmụọ.” Nsụgharị Bible ndị ọzọ n’ebe a sụgharịrị ta pneu·ma·ti·kaʹ ịbụ “onyinye ime mmụọ” ma ọ bụ “onyinye nke Mmụọ ahụ.”
Site n’ihe ahụ a na-atụle, anyị rịbara ama na n’isi ngwụsị nke isi nke 14, Pọl jikọtara ibu amụma na pneu·ma·ti·kosʹ. Dị ka ọ dị n’amaokwu nke 1, ihe gbara okwu ahụ gburugburu na-egosi na o bu n’uche ịbụ onye nwere onyinye nke mmụọ nsọ. Akwụkwọ The New Testament in Modern Speech, nke R. F. Weymouth dere, ji nsụgharị nke a mee ihe: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-akpọ onwe ya onye amụma ma ọ bụ onye nwere onyinye ime mmụọ, ya nakwere dị ka ihe Onyenwe anyị nyere n’iwu ihe m na-edegara unu ugbu a.”
Ee, ndị Kraịst nile, ma hà nwere onyinye nke ibu amụma ma ọ bụ onyinye ọ bụla ọzọ nke mmụọ nsọ, kwesịrị ịnakwere ma na-agbaso ndụmọdụ ahụ nke Pọl dere banyere ụzọ ihe nile kwesịrị isi were ọnọdụ n’ọgbakọ.