Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ịmara “Uche nke Kraịst”
    Ụlọ Nche—2000 | Febụwarị 15
    • Ịmara “Uche nke Kraịst”

      “Ònye maara uche Onyenwe anyị, ka o zie Ya ihe? Ma anyị onwe anyị nwere uche nke Kraịst.”—1 NDỊ KỌRINT 2:16.

      1, 2. N’Okwu ya, gịnị ka Jehova hụrụ dị ka ihe kwesịrị ekwesị ikpughe banyere Jisọs?

      GỊNỊ ka Jisọs dị ka ya? Gịnị bụ ụcha agịrị isi ya? akpụkpọ ahụ ya? anya ya? Olee otú o toruru n’ogologo? Olee otú ọ dịruru n’arọ? N’afọ ndị gafeworonụ, e nwewo ihe osise dịgasị iche banyere Jisọs, site ná ndị bụtụ eziokwu ruo ná ndị na-abụtụghị eziokwu banyere ya. Ụfọdụ esewo ya dị ka onye siri ike ma dị gara gara, ebe ndị ọzọ sere ya dị ka onye na-esighị ike nke na-adịghị gara gara.

      2 Otú ọ dị, Bible elekwasịghị anya n’ọdịdị Jisọs. Kama nke ahụ, Jehova hụrụ ya dị ka ihe kwesịrị ekwesị ikpughe ihe dị nnọọ ịrịba ama karị: ụdị onye Jisọs bụ. Ihe ndekọ nke Oziọma ndị ahụ akọghị nanị ihe Jisọs kwuru ma mee kamakwa ha na-ekpughe otú mmetụta na ụzọ iche echiche ndị mere o ji kwuo ihe ndị o kwuru ma mee ihe ndị o mere, haruru. Ihe ndekọ anọ ndị a e dere n’ike mmụọ nsọ na-eme ka anyị nwee ike inyoba anya n’ihe Pọl onyeozi zoro aka na ya dị ka “uche nke Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 2:16) Ọ dị mkpa ka anyị mara echiche, mmetụta, na àgwà Jisọs. N’ihi gịnị? N’ihi ihe abụọ ma ọ dịkarịa ala.

      3. Nghọta dị aṅaa ka anyị pụrụ inweta site n’ịmara uche nke Kraịst?

      3 Nke mbụ, uche nke Kraịst na-eme ka anyị hụperetụ uche nke Jehova Chineke. Jisọs maara nnọọ Nna ya nke ọma nke na ọ pụrụ ikwu, sị: “Ọ dịghịkwa onye ọ bụla maara Onye Ọkpara ahụ bụ, ma ọ bụghị Nna Ya; na Onye Nna ahụ bụ, ma ọ bụghị Ọkpara Ya, na onye ọ bụla Ọkpara na-ezube ikpughe Ya nye ya.” (Luk 10:22) Ọ dị ka a ga-asị na Jisọs na-ekwu, sị, ‘Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ihe Jehova dị ka ya, bịakwute m.’ (Jọn 14:9) N’ihi ya, mgbe anyị na-amụ ihe Oziọma ndị ahụ na-ekpughe banyere ụzọ Jisọs si chee echiche ma nwee mmetụta, anyị na-amụ otú Jehova si eche echiche ma na-enwe mmetụta, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Ihe ọmụma dị otú ahụ na-eme ka anyị nwee ike ịbịarukwu Chineke anyị nso.—Jemes 4:8.

      4. Ọ bụrụ na anyị ga-eme n’ezie dị ka Kraịst, gịnị ka anyị na-aghaghị ibu ụzọ mụta, n’ihi gịnịkwa?

      4 Nke abụọ, anyị ịmara uche nke Kraịst ga-enyere anyị aka “[iso] ijeụkwụ Ya nile.” (1 Pita 2:21) Iso Jisọs abụghị nanị ihe banyere ikwughachi ihe ndị o kwuru na iṅomi ihe ndị o mere. Ebe ọ bụ na echiche na mmetụta na-akpali okwu ọnụ na ime ihe, iso Kraịst chọrọ ka anyị zụlite otu “uche” ahụ o nwere. (Ndị Filipaị 2:5) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ bụrụ na anyị ga-eme dị ka Kraịst n’ezie, anyị aghaghị ibu ụzọ mụta iche echiche na inwe mmetụta dị ka ya, ya bụ, ruo n’ókè anyị nwere ike dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè. Site n’enyemaka ndị dere Oziọma ndị ahụ, ka anyị nyobazie anya n’uche nke Kraịst. Nke mbụ, anyị ga-atụle isi ihe ndị kpaliri Jisọs iche echiche na inwe mmetụta dị ka o si mee.

      Ịdị Adị Ya Tupu Ọ Ghọọ Mmadụ

      5, 6. (a) Mmetụta dị aṅaa ka ndị anyị na ha na-akpakọrịta pụrụ inwe n’ebe anyị nọ? (b) Olee onye ya na Ọkpara Chineke bu ụzọ mụọ kpakọrịtara n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa, mmetụta dịkwa aṅaa ka nke a nwere n’ebe ọ nọ?

      5 Ndị anyị na ha na-akpachi anya pụrụ inwe mmetụta n’ebe anyị nọ, na-emetụta echiche, mmetụta, na omume anyị n’ụzọ dị mma ma ọ bụ n’ụzọ dị njọ.a (Ilu 13:20) Tụlee onye ya na Jisọs kpakọrịtara n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa. Oziọma Jọn na-adọrọ uche gaa n’ịdị adị Jisọs dị ka “Okwu ahụ,” ma ọ bụ Ọnụ Na-ekwuru Chineke, tupu ọ ghọọ mmadụ. Jọn na-ekwu, sị: “Na mbụ ka Okwu ahụ dịrị, Okwu ahụ na Chineke dịkwara, Okwu ahụ bụrụkwa [chi, NW]. Onye ahụ na Chineke dịrị na mbụ.” (Jọn 1:1, 2) Ebe ọ bụ na Jehova enweghị mmalite, Okwu ahụ na Chineke ịnọ site “na mbụ” aghaghị ịdị na-ezo aka ná mmalite nke ọrụ okike Chineke. (Abụ Ọma 90:2) Jisọs bụ “onye e buru ụzọ mụọ n’ihe nile e kere eke.” N’ihi ya, ọ dị adị tupu e kee ihe ndị ọzọ bụ́ mmụọ nakwa eluigwe na ala nkịtị.—Ndị Kọlọsi 1:15; Mkpughe 3:14.

      6 Dị ka ụfọdụ atụmatụ ndị sayensị mere si dị, eluigwe na ala nkịtị adịruwo ma ọ dịkarịa ala ijeri afọ 12. Ọ bụrụ na atụmatụ ndị ahụ nwere otú ha si zitụ ezi, Ọkpara Chineke bu ụzọ mụọ so Nna ya nwee mkpakọrịta chiri anya ruo afọ a na-apụghị ịgụta ọnụ tupu e kee Adam. (Tụlee Maịka 5:2.) Ha abụọ si otú a nwee njikọ ịhụnanya na nke miri emi. Dị ka amamihe a kọwara ka ọ bụ mmadụ, a kọwara Ọkpara a e bu ụzọ mụọ n’ịdị adị ya tupu ọ ghọọ mmadụ dị ka onye kwuru, sị: “Anọkwa m n’akụkụ Ya, dị ka onye ọkà: M wee bụrụ ihe na-atọ [Jehovah] ụtọ kwa ụbọchị, na-egwuri egwú n’ihu Ya mgbe nile.” (Ilu 8:30) N’ezie, isoro Isi Iyi nke ịhụnanya na-akpachi anya ruo afọ a na-apụghị ịgụta ọnụ nwere mmetụta dị ukwuu n’ebe Ọkpara Chineke nọ! (1 Jọn 4:8) Ọkpara a bịara mara ma na-egosipụta echiche, mmetụta, na ụzọ nke Nna ya ruo n’ókè nke ọ na-adịghị onye ọ bụla ọzọ pụrụ ime ya.—Matiu 11:27.

      Ndụ na Mmetụta Elu Ala

      7. Olee otu n’ime ihe ndị mere o ji dị mkpa ka Ọkpara Chineke bu ụzọ mụọ bịa n’ụwa?

      7 Ọkpara Chineke nwekwuru ihe ndị ọ ga-amụta, n’ihi na nzube Jehova bụ ịkwadebe Ọkpara ya ịbụ Onyeisi Nchụàjà nwere ọmịiko, na-enwe ike “iji obi soo anyị hụkọọ ahụhụ n’adịghị ike anyị.” (Ndị Hibru 4:15) Otu n’ime ihe ndị mere Ọkpara ahụ ji bịa n’ụwa dị ka mmadụ bụ iji ruo ihe a chọrọ maka ọrụ a. N’ebe a, dị ka mmadụ nwere anụ ahụ na ọbara, e kpughepụrụ Jisọs nye ọnọdụ na mmetụta ndị ọ nọbu n’eluigwe na-ekiri nanị nkiri. Ugbu a ya onwe ya nwere mmetụta na mmetụta uche nke ndị mmadụ na-enwe. Mgbe ụfọdụ ike gwụrụ ya, akpịrị kpọrọ ya nkụ, agụụ gụkwara ya. (Matiu 4:2; Jọn 4:6, 7) Ọbụna karị, o diri ụdị ihe isi ike na ahụhụ nile. O si otú a ‘mụta ịṅa ntị’ ma ruchaa nnọọ eru maka ọrụ ya dị ka Onyeisi Nchụàjà.—Ndị Hibru 5:8-10.

      8. Gịnị ka anyị maara banyere oge Jisọs bụ nwata n’ụwa?

      8 Gịnị banyere ahụmahụ ndị Jisọs nwere n’oge ndụ ya n’ụwa? Akụkọ banyere oge ọ bụ nwata dị nnọọ mkpirikpi. N’ezie, nanị Matiu na Luk kọrọ ihe ndị mere n’oge ọmụmụ ya. Ndị dere Oziọma ndị ahụ maara na Jisọs ebiwo ndụ n’eluigwe tupu ọ bịa n’ụwa. Ịdị adị ya tupu ọ ghọọ mmadụ gosipụtara, karịa ihe ọ bụla ọzọ, ụdị mmadụ ọ ghọrọ. Otú o sina dị, Jisọs bụ mmadụ n’ozuzu ya. Ọ bụ ezie na o zuru okè, ọ ghaghị ito site n’oge ịbụ nwa ọhụrụ ruo na nwata nakwa site n’oge uto ruo ná ntozu okè, na-amụta ihe n’oge ahụ nile. (Luk 2:51, 52) Bible na-ekpughe ihe ụfodụ banyere oge Jisọs bụ nwata bụ́ ndị obi abụọ na-adịghị ya na ha metụtara ya.

      9. (a) Gịnị na-egosi na a mụrụ Jisọs n’ezinụlọ dara ogbenye? (b) N’ọnọdụ dị aṅaa ka o yiri ka Jisọs ò tolitere na ya?

      9 Ihe àmà na-egosi na a mụrụ Jisọs n’ezinụlọ dara ogbenye. Ihe ịchụ àjà nke Josef na Meri wetara n’ụlọ nsọ ihe dị ka ụbọchị 40 a mụsịrị ya, gosipụtara nke a. Kama iweta otu nwa ebule dị ka àjà nsure ọkụ na otu nduru ma ọ bụ otu kpalakwukwu dị ka àjà mmehie, ha wetara “nduru abụọ, ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ.” (Luk 2:24) Dị ka Iwu Mosis si dị, ọ bụ ndị dara ogbenye ka e meere ndokwa iji ihe dị otú a chụọ àjà. (Levitikọs 12:6-8) Ka oge na-aga, ezinụlọ a dara ogbenye mụbara. Josef na Meri mụrụ ma ọ dịkarịa ala ụmụ isii ndị ọzọ site n’ụzọ nkịtị mgbe a mụsịrị Jisọs n’ụzọ ọrụ ebube. (Matiu 13:55, 56) Ya mere Jisọs tolitere n’ezinụlọ buru ibu, ma eleghị anya nọrọ n’ọnọdụ dị ala.

      10. Gịnị na-egosi na Meri na Josef bụ ndị na-atụ egwu Chineke?

      10 Ọ bụ nne na nna na-atụ egwu Chineke zụlitere Jisọs, ha lekọtakwara ya. Nne ya, bụ́ Meri, bụ nwanyị pụrụ iche. Cheta na mgbe ọ na-ekele ya, mmụọ ozi Gebriel kwuru, sị: “Ekele, gị onye Chineke meworo ka ị nara amara, Onyenwe anyị nọnyeere gị.” (Luk 1:28) Josef bụkwa nwoke ji okpukpe kpọrọ ihe. Kwa afọ, ọ na-eji ikwesị ntụkwasị obi eme njem ahụ dị kilomita 150 gaa Jerusalem maka Ememe Ngabiga. Meri jekwara, n’agbanyeghị na ọ bụ nanị ndị ikom ka a chọrọ ka ha mee otú ahụ. (Ọpụpụ 23:17; Luk 2:41) N’otu oge dị otú ahụ, mgbe Josef na Meri jisịrị ịdị uchu chọgharịa ya, ha hụrụ Jisọs ahụ dị afọ 12 n’ụlọ nsọ n’etiti ndị ozizi. Jisọs gwara nne na nna ya, bụ́ ndị na-echegbu onwe ha, sị: “Ùnu amataghị na aghaghị m ịdị n’ihe nke Nna m?” (Luk 2:49) “Nna”—okwu ahụ aghaghị inyewo Jisọs ahụ na-eto eto echiche nke ịhụnanya na izi ezi. Otu ihe bụ na, ihe àmà na-egosi na a gwawo ya na Jehova bụ Nna ya nke ezigbo ya. Tụkwasị na nke a, Josef aghaghị ịbụwo ezi nna nkuchi nye Jisọs. N’ezie Jehova agaghị ahọrọwo nwoke dị aka ike ma ọ bụ nwee obi ọjọọ ịzụlite Ọkpara Ọ hụrụ n’anya!

      11. Ọrụ aka dị aṅaa ka Jisọs mụrụ, n’oge Bible kwa, gịnị ka ịrụ ọrụ aka a gụnyere?

      11 N’afọ ndị ọ nọrọ na Nazaret, Jisọs mụtara ọrụ aka bụ́ ịkwa nkà, ma eleghị anya site n’aka nna nkuchi ya, bụ́ Josef. Jisọs mụtara nnọọ ọrụ aka ahụ nke ọma nke na a kpọrọ ya onwe ya “onye ọkà.” (Mak 6:3) N’oge Bible, e were ndị ọkwa nkà n’ọrụ iwu ụlọ, ịrụ arịa (na-agụnye tebụl, oche, na oche ogologo), na ịrụ ngwá ọrụ ndị e ji arụ ọrụ ugbo. N’akwụkwọ ya bụ́ Dialogue With Trypho, Justin Martyr, nke narị afọ nke abụọ O.A., dere banyere Jisọs, sị: “Ọ rụrụ ọrụ karịsịa dị ka ọkwa nkà mgbe ọ nọ n’etiti ụmụ mmadụ, na-arụpụta ọgụ na yoke.” Ọrụ dị otú ahụ adịghị mfe, n’ihi na ma eleghị anya ọkwa nkà oge gboo apụghị ịzụ osisi ya azụ. O yikarịrị ka ọ na-apụ ma họpụta otu osisi, gbutuo ya, ma bulaa osisi ahụ n’ụlọ. Ya mere, Jisọs pụrụ ịmawo ihe ịma aka ndị dị n’inweta ihe ndị e ji ebi ndụ na n’imeso ndị ahịa ihe.

      12. Gịnị na-egosi na ma eleghị anya Josef bu Jisọs ụzọ nwụọ, gịnịkwa ka nke a pụrụ ịpụtaworo Jisọs?

      12 Dị ka diọkpara, ma eleghị anya Jisọs nyere aka n’ilekọta ezinụlọ ha, karịsịa ebe ọ bụ na o yiri ka Josef ò bu Jisọs ụzọ nwụọ.b Zion’s Watch Tower nke January 1, 1900, kwuru, sị: “Echiche nke oge ahụ na-ekwu na Josef nwụrụ mgbe Jisọs ka dị obere, nakwa na Jisọs weghaara ọrụ ịkwa nkà ahụ ma ghọọ onye na-akwado ezinụlọ ahụ. Akaebe Akwụkwọ Nsọ ahụ e nwere bụ́ ebe a kpọrọ Jisọs n’onwe ya onye nkà, ebe a kpọtụkwara nne ya na ụmụnne ya aha, ma a kpọtụghị Josef, na-akwadotụ nke a. (Mak 6:3) . . . Mgbe ahụ, o yikarịrị ka e tinyere ogologo oge nke afọ iri na asatọ nke ndụ Onyenwe anyị, site n’oge ihe ahụ [e dekọrọ na Luk 2:41-49] mere ruo n’oge baptism ya, n’ịrụ ọrụ nkịtị ndị a na-arụ ná ndụ.” O yiri ka Meri na ụmụ ya, gụnyere Jisọs, hà maara ihe mgbu a na-enweta mgbe di na nna a hụrụ n’anya nwụrụ.

      13. Mgbe Jisọs malitere ozi ya, n’ihi gịnị ka o ji jiri ihe ọmụma, nghọta, na mmetụta miri emi nke nwoke ọzọ na-apụghị inwewo malite?

      13 O doro anya na a mụghị Jisọs ná ndụ nke ntụsara ahụ. Kama nke ahụ, o nwetara n’onwe ya ahụmahụ nke ndụ ndị mmadụ nkịtị. Mgbe ahụ, na 29 O.A., oge Jisọs ga-arụ ọrụ ahụ Chineke nyere ya bụ́ nke na-eche ya, ruru. N’oge mgbụsị akwụkwọ nke afọ ahụ, e mere ya baptism n’ime mmiri, a mụọkwa ya dị ka Nwa ime mmụọ nke Chineke. ‘E megheere ya eluigwe,’ ma eleghị anya na-egosi na ọ pụziri icheta ndụ ọ dị n’eluigwe tupu ọ ghọọ mmadụ, gụnyere echiche na mmetụta ndị ya na ya na-agakọ. (Luk 3:21, 22) Ya mere mgbe Jisọs malitere ozi ya, o ji ihe ọmụma, nghọta, na mmetụta miri emi nke ọ na-adịghị nwoke ọzọ pụrụ inwewo ya, malite. E nwere ezi ihe mere ndị dere Oziọma ndị ahụ ji dee banyere ihe ndị mere n’oge ozi Jisọs n’ihe ka ọtụtụ n’ihe odide ha. N’agbanyeghị nke ahụ, ha apụghị idetucha ihe nile o kwuru ma mee. (Jọn 21:25) Ma ihe e nyere ha ike mmụọ nsọ idekọ na-eme ka anyị nwee ike inyoba anya n’uche nke nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ.

      Ihe Jisọs Dị Ka Ya Mgbe Ọ Bụ Mmadụ

      14. Olee otú Oziọma ndị ahụ si egosi Jisọs dị ka nwoke nwere ọmịiko na mmetụta mmiri emi?

      14 Àgwà Jisọs bụ́ nke a na-ahụ site n’Oziọma ndị ahụ bụ nke nwoke na-ahụ n’anya, nke nwekwara mmetụta miri emi. O gosipụtara mmetụta uche n’ụzọ sara mbara: ọmịiko n’ebe onye ekpenta nọ (Mak 1:40, 41); iruru ndị na-adịghị ege ntị újú (Luk 19:41, 42); iwe ziri ezi n’ebe ndị anyaukwu na-agbanwe ego nọ (Jọn 2:13-17). N’ịbụ nwoke nwere mmetụta ọmịiko, a pụrụ imepụ Jisọs anya mmiri, o zochighịkwa mmetụta ya. Mgbe ezi enyi ya bụ́ Lazarọs nwụrụ, ọhụhụ ọ hụrụ Meri, bụ́ nwanne Lazarọs nke nwanyị, ka ọ na-ebe ákwá, metụrụ Jisọs n’ahụ nke ukwuu nke na anya mmiri pụrụ ya onwe ya n’anya, ya bewe ákwá n’ihu ndị mmadụ.—Jọn 11:32-36.

      15. Olee otú obi ọmịiko Jisọs si pụta ìhè n’ụzọ o si lee ndị ọzọ anya ma mesoo ha ihe?

      15 Obi ọmịiko Jisọs pụtara ìhè karịsịa n’ụzọ o si lee ndị ọzọ anya ma mesoo ha ihe. Ọ gakwuuru ndị ogbenye na ndị a na-emegbu emegbu, na-enyere ha aka ‘ịhụ izu ike nye mkpụrụ obi ha.’ (Matiu 11:4, 5, 28-30) O jighị ọrụ n’aka ruo n’ókè nke na o meghị ihe banyere mkpa nke ndị na-ahụju anya, ma ọ̀ bụ nwanyị oruru ọbara nke ji nwayọọ metụ uwe ya aka ma ọ bụ onye arịrịọ kpuru ìsì nke a na-agaghị akwụsịli ikwu okwu. (Matiu 9:20-22; Mak 10:46-52) Jisọs lere anya maka ebe ndị ọzọ na-eme nke ọma, jaakwa ha mma; ma, ọ dịkwa njikere inye ịdọ aka ná ntị mgbe ọ dị mkpa. (Matiu 16:23; Jọn 1:47; 8:44) N’oge e nwere ihe ole na ole ruuru ndị inyom, Jisọs ji ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị nke nkwanye ùgwù mesoo ha ihe. (Jọn 4:9, 27) N’ụzọ kwere nghọta, otu ìgwè ndị inyom ji ọchịchọ obi jeere ya ozi site n’ihe onwunwe ha.—Luk 8:3.

      16. Gịnị na-egosi na Jisọs nwere echiche ziri ezi banyere ndụ na ihe onwunwe?

      16 Jisọs nwere echiche ziri ezi banyere ndụ. Ihe onwunwe abụghị ihe kasị mkpa nye ya. N’ụzọ ihe onwunwe, o yiri ka o nwere ntakịrị ihe. O kwuru na ya “enweghị ebe ịtọgbọ isi Ya.” (Matiu 8:20) N’otu oge ahụ, Jisọs mere ka ndị ọzọ nwekwuo ọṅụ. Mgbe ọ gara oriri agbamakwụkwọ—ihe omume a na-ahụkarị egwú, ịgụ egwú, na ịṅụrị ọṅụ na ya—o doro anya na ọ gaghị ebe ahụ iji mee ka ememe ahụ ghara ikpo ọkụ. N’ezie, Jisọs rụrụ ọrụ ebube mbụ ya n’ebe ahụ. Mgbe mmanya ha gwụrụ, o mere ka mmiri ghọọ ọmarịcha mmanya, bụ́ ihe ọṅụṅụ “na-eme ka obi mmadụ ṅụrịa.” (Abụ Ọma 104:15; Jọn 2:1-11) N’ihi ya, ememe ahụ gara n’ihu, obi abụọ adịghịkwa ya na e mere ka nwoke na nwanyị ahụ na-alụ ọhụrụ ghara inwe mmechuihu. E gosipụtakwuru echiche ziri ezi o nwere n’oge ka ukwuu ndị a kpọtụrụ aha bụ́ ndị Jisọs ji rụsie ọrụ ike ruo ogologo oge n’ozi ya.—Jọn 4:34.

      17. N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị bụrụ ihe ijuanya na Jisọs bụ Onye Ọkà Ozizi, gịnịkwa ka ozizi ya na-egosipụta?

      17 Jisọs bụ Onye Ọkà Ozizi. Ọtụtụ n’ime ihe ndị ọ kụziri gosipụtara ihe ndị na-eme eme ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị, bụ́ ndị ọ maara nke ọma. (Matiu 13:33; Luk 15:8) Ụzọ izi ihe ya enweghị atụ—ọ na-edo anya, na-adị mfe, ma na-adị irè mgbe nile. Ihe ndị ọ kụziri dị ịrịba ama ọbụna karị. Ozizi ya gosipụtara ọchịchọ nke sitere n’ala ala obi ya ime ka ndị na-ege ya ntị mata echiche, mmetụta, na ụzọ nke Jehova.—Jọn 17:6-8.

      18, 19. (a) Olee okwu ihe atụ doro anya ndị Jisọs ji kọwaa Nna ya? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

      18 N’iji ihe atụ akụzi ihe mgbe mgbe, Jisọs ji okwu ihe atụ ndị doro anya a na-apụghị ichefu ngwa ngwa kpughee Nna ya. Ọ bụ otu ihe ịdị na-ekwu okwu banyere ebere Chineke. Ọ bụkwa ihe ọzọ iji Jehova tụnyere Nna nke na-ahụ n’anya bụ́ onye nwere ọmịiko n’ụzọ dị ukwuu mgbe ọ hụrụ nwa ya nwoke na-alọtanụ nke na ọ ‘gbara ọsọ, wee makụọ ya n’olu, sutukwa ya ọnụ nke ukwuu.’ (Luk 15:11-24) N’ịjụ ọdịbendị aka ike nke ndị ndú okpukpe ji na-eleda ndị nkịtị anya, Jisọs kọwara na Nna ya bụ Chineke nke a pụrụ ijekwuru ejekwuru, nke nabatara arịrịọ onye ọna ụtụ dị obi umeala karịa ekpere ngosi onwe nke onye Farisii na-etu ọnụ. (Luk 18:9-14) Jisọs gosipụtara Jehova dị ka Chineke nke na-ahụ n’anya bụ́ onye na-ama mgbe egwele dị nnọọ nta dara n’ala. “Unu atụla egwu,” ka Jisọs mesiri ndị na-eso ụzọ ya obi ike, “ọnụ ahịa unu onwe unu karịrị nke ọtụtụ egwele.” (Matiu 10:29, 31) N’ụzọ kwere nghọta, ibobo nwụrụ ndị mmadụ n’ahụ n’ihi ‘ụzọ Jisọs si ezi ihe,’ a dọtakwara ha n’ebe ọ nọ. (Matiu 7:28, 29, NW) Leenụ, n’otu oge, ya na “oké ìgwè mmadụ” nọgidere ruo ụbọchị atọ, ọbụna n’erighị nri!—Mak 8:1, 2.

      19 Anyị pụrụ inwe ekele na n’Okwu ya, Jehova ekpughewo uche nke Kraịst! Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi zụlite ma gosipụta uche nke Kraịst ná mmekọrịta anyị na ndị ọzọ? A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.

      [Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

      a E gosiri na ndị ha na ihe ndị e kere eke bụ́ mmụọ na-akpakọrịta pụrụ inwe mmetụta n’ebe ha nọ ná Mkpughe 12:3, 4. E gosipụtara Setan n’ebe ahụ dị ka “dragọn” bụ́ onye ji ikike ya mee ihe iji nweta “kpakpando,” ma ọ bụ ụmụ Chineke ndị ọzọ bụ́ mmụọ, isonyere ya n’ụzọ nke nnupụisi.—Tụlee Job 38:7.

      b Ebe ikpeazụ a kpọtụrụ Josef aha kpọmkwem bụ mgbe a hụrụ Jisọs ahụ dị afọ 12 n’ụlọ nsọ. E nweghị ebe e zoro aka na Josef nọ n’ememe agbamakwụkwọ ahụ e mere na Kena ná mmalite nke ozi Jisọs. (Jọn 2:1-3) Na 33 O.A., Jisọs ahụ a kpọgidere n’elu osisi nyefere Meri n’aka onyeozi ọ hụrụ n’anya bụ́ Jọn ilekọta ya anya. Nke ahụ bụ ihe ọ na-eyighị ka Jisọs ọ̀ ga-eme ma ọ bụrụ na Josef ka nọ ndụ.—Jọn 19:26, 27.

  • Ì Nwere “Uche nke Kraịst”?
    Ụlọ Nche—2000 | Febụwarị 15
    • Ì Nwere “Uche nke Kraịst”?

      “Ma ka Chineke nke ntachi obi na nke nkasi obi nye unu ka unu tụkwasị uche n’otu ihe ahụ . . . dị ka Kraịst Jisọs si chọọ.”—NDỊ ROM 15:5.

      1. Olee ụzọ e si ese Jisọs n’ọtụtụ ihe osise Krisendọm, gịnịkwa mere nke a na-ejighị bụrụ ụzọ ziri ezi isi see Jisọs?

      “A HỤTỤBEGHỊ ya ma ọlị ebe ọ na-achị ọchị.” Otú ahụ ka e si kọwaa Jisọs n’otu akwụkwọ nke e ji ụgha na-azọrọ na ọ bụ otu onye ọchịchị Rom oge ochie dere ya. A sịrị na akwụkwọ a, bụ́ nke a mawooro n’ụdị ọ dị ugbu a kemgbe ihe dị ka narị afọ nke 11, enwewo mmetụta n’ebe ọtụtụ ndị na-ese ihe nọ.a N’ọtụtụ ihe osise, a na-ese Jisọs dị ka onye gbarụrụ ihu, onye ọ na-esiri ike ịmụmụ ọnụ ọchị, ma ọ bụrụdị na ọ na-amụmụ. Ma nke ahụ abụtụghị ụzọ ziri ezi isi see Jisọs, bụ́ onye Oziọma ndị ahụ na-egosipụta dị ka nwoke ịhụnanya na obiọma, onye nwere mmetụta ndị miri emi.

      2. Olee otú anyị pụrụ isi “tụkwasị uche n’otu ihe ahụ . . . dị ka Kraịst Jisọs si chọọ,” gịnịkwa ka nke a ga-eme ka anyị dị njikere ime?

      2 N’ụzọ doro anya, iji mara Jisọs ahụ nke bụ ezigbo ya, anyị aghaghị iburu ezi nghọta banyere ụdị onye Jisọs bụ n’ezie mgbe ọ nọ n’ụwa ebe a n’uche na n’obi anyị. Ya mere ka anyị nyochaa ihe ndekọ nke Oziọma ụfọdụ ndị na-enye anyị nghọta banyere “uche nke Kraịst”—ya bụ, mmetụta ya, ụzọ o si ele ihe anya, echiche ya, na otú o si atụle ihe. (1 Ndị Kọrint 2:16) Ka anyị na-eme nke ahụ, ka anyị tụlee otú anyị pụrụ isi “tụkwasị uche n’otu ihe ahụ . . . dị ka Kraịst Jisọs si chọọ.” (Ndị Rom 15:5) N’ụzọ dị otú ahụ, anyị ga-aka adị njikere ịgbaso ụkpụrụ o setịpụụrụ anyị ná ndụ anyị nakwa ná mmekọrịta anyị na ndị ọzọ.—Jọn 13:15.

      Onye Na-adị Mfe Njekwuru

      3, 4. (a) Olee ebe ihe ahụ e dekọrọ na Mak 10:13-16 nọ mee? (b) Olee otú Jisọs si meghachi omume mgbe ndị na-eso ụzọ ya nwara igbochi ụmụntakịrị ịbịakwute ya?

      3 A na-adọta ndị mmadụ n’ebe Jisọs nọ. N’oge dị iche iche, ndị mmadụ nọ n’afọ ndụ dị iche iche bụ́ ndị nwekwara nzụlite dịgasị iche jekwuuru ya n’enweghị ihe mgbochi. Tụlee ihe omume ahụ e dekọrọ na Mak 10:13-16. O mere ná ngwụsị nke ozi ya ka ọ na-aga Jerusalem na nke ikpeazụ ya, ije nwụọ ọnwụ na-egbu mgbu.—Mak 10:32-34.

      4 See onyinyo ebe ihe ahụ na-eme. Ndị mmadụ amalite ịkpọta ụmụntakịrị, gụnyere ụmụ ọhụrụ, ka Jisọs gọzie ha.b Otú ọ dị, ndị na-eso ụzọ Jisọs anwaa igbochi ụmụntakịrị ahụ ijekwuru ya. Ikekwe ndị na-eso ụzọ ya echee n’ezie na Jisọs achọghị ka ụmụntakịrị nye ya nsogbu n’izu ndị a dị oké mkpa. Ma ha dara ya. Mgbe Jisọs ghọtara ihe ndị na-eso ụzọ ya na-eme, ọ tọghị ya ụtọ. Jisọs akpọta ụmụntakịrị ahụ, na-asị: “Kwenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m; unu egbochila ha.” (Mak 10:14) Ya emezie ihe na-ekpughe àgwà ịdị nro na nke ịhụnanya ziri ezi. Ihe ndekọ ahụ na-ekwu, sị: “O wee kuru ha n’aka Ya, bikwasị ha aka Ya abụọ, wee gọzie ha nke ọma.” (Mak 10:16) O doro anya na ụmụntakịrị ahụ nwere ahụ iru ala ka Jisọs na-ekuru ha n’aka ya n’ụzọ ịhụnanya.

      5. Gịnị ka ihe ndekọ dị na Mak 10:13-16 na-agwa anyị banyere ụdị onye Jisọs bụ?

      5 Ihe ndekọ ahụ dị mkpirikpi na-agwa anyị ihe dị ukwuu banyere ụdị onye Jisọs bụ. Rịba ama na ọ bụ onye dị mfe njekwuru. N’agbanyeghị na ọ nọwo n’ọnọdụ dị elu n’eluigwe, ọ dịghị emenye ụmụ mmadụ na-ezughị okè ụjọ ma ọ bụ na-eleda ha anya. (Jọn 17:5) Ọ́ bụghịkwa ihe dị ịrịba ama na ọbụna ụmụntakịrị nwere ahụ iru ala mgbe ha na ya nọ? N’ezie a garaghị adọtawo ha n’ebe onye na-enweghị mmetụta, nke na-adịghị enwe ọṅụ bụ́ onye na-amụmụtụbeghị ọnụ ọchị ma ọ bụ chịa ọchị ma ọlị, nọ! Ndị nọ n’afọ ndụ nile jekwuuru Jisọs n’ihi na ha ghọtara na ọ bụ onye nwere ịhụnanya nke na-echebara ndị ọzọ echiche, ha nwekwara obi ike na ọ gaghị achụghachi ha azụ.

      6. Olee otú ndị okenye pụrụ isi mee ka ọ na-adịkwu mfe ijekwuru ha?

      6 N’ịtụgharị uche n’ihe ndekọ a, anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị, ‘Ènwere m uche nke Kraịst? Àbụ m onye na-adị mfe mbịakwute?’ N’oge a dị oké egwu, ndị ọzụzụ atụrụ bụ́ ndị dị mfe njekwuru, ndị ikom dị ka “ebe izonahụ ifufe,” dị atụrụ Chineke mkpa. (Aịsaịa 32:1, 2; 2 Timoti 3:1) Ndị okenye, ọ bụrụ na unu azụlite mmasị si n’ezi obi n’ebe ụmụnna unu nọ ma dị njikere inye onwe unu maka ọdịmma ha, ha ga-achọpụta nchegbu unu nwere maka ha. Ha ga-ahụ ya n’otú unu dewere ihu, nụ ya n’olu okwu unu, ma chọpụta ya n’àgwà unu. Ezi ịhụnanya na nchegbu dị otú ahụ pụrụ ime ka e nwee ebe e nwere ntụkwasị obi bụ́ ebe ọ na-adịrị ndị ọzọ, gụnyere ụmụntakịrị, mfe ịbịakwute unu. Otu nwanyị bụ́ onye Kraịst na-akọwa ihe mere o ji nwee ike ịgwa otu okenye obi ya: “Ọ gwara m okwu n’ụzọ dị nro na n’ụzọ ọmịiko. Ma ọ bụghị ya, ikekwe agaraghị m ekwu ihe ọ bụla. O mere ka m nwee mmetụta nke ịbụ onye nọ ná nchebe.”

      Ichebara Ndị Ọzọ Echiche

      7. (a) Olee otú Jisọs si gosipụta na ọ na-echebara ndị ọzọ echiche? (b) N’ihi gịnị ka Jisọs pụrụ ijiwo jiri nke nta nke nta mee ka otu nwoke kpuru ìsì malite ịhụ ụzọ?

      7 Jisọs na-echebara ndị ọzọ echiche. Ọ na-echebara mmetụta ha echiche. Nanị ịhụ ndị na-ahụsi anya metụrụ ya nnọọ n’ahụ nke ukwuu nke na a kpaliri ya ime ka ha nwere onwe ha pụọ n’ahụhụ ha. (Matiu 14:14) Ọ na-echebakwara erughị eru na mkpa nke ndị ọzọ echiche. (Jọn 16:12) N’otu oge, ndị mmadụ duteere ya nwoke kpuru ìsì ma rịọ Jisọs ka ọ gwọọ ya. Jisọs mere ka nwoke ahụ malite ịhụ ụzọ, ma o ji nke nta nke nta mee otú ahụ. Na mbụ, nwoke ahụ hụrụ ndị mmadụ nanị n’ụzọ dị inyoghi inyoghi—“ha dị ka osisi, ha na-ejegharị.” E mesịa, Jisọs mere ka ọ hụ ụzọ nke ọma. N’ihi gịnị ka o ji jiri nke nta nke nta gwọọ nwoke ahụ? Nke a pụrụ nnọọ ịbụ iji mee ka onye ịnọ n’ọchịchịrị mawooro ahụ nwee ike ịnagide nkụja nke ịhụ ụwa nke anwụ na-acha na ya na nke dị mgbagwoju anya.—Mak 8:22-26.

      8, 9. (a) Gịnị mere ngwa ngwa Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya banyesịrị n’ókèala Dekapọlis? (b) Kọwaa ọgwụgwọ Jisọs gwọrọ nwoke ahụ ntị chiri.

      8 Tụleekwa ihe mere mgbe Ememe Ngabiga nke 32 O.A. gasịrị. Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya abawo n’ókèala Dekapọlis, n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Galili. N’oge na-adịghị anya, oké ìgwè mmadụ hụrụ ha n’ebe ahụ ma kutere Jisọs ọtụtụ ndị ahụ na-esighị ike na ndị nwere nkwarụ, ọ gwọkwara ha nile. (Matiu 15:29, 30) N’ụzọ na-akpali mmasị, Jisọs họpụtara otu nwoke maka nlebara anya pụrụ iche. Onye so dee Oziọma bụ́ Mak, bụ́ nanị onye dekọrọ ihe omume a, na-akọ ihe merenụ.—Mak 7:31-35.

      9 Ntị chiri nwoke ahụ, ikwu okwu na-esikwara ya ike. Jisọs pụrụ ịhụwo na nwoke a na-atụ egwu ma na-asọ ihere n’ụzọ pụrụ iche. Jisọs mere ihe ọ na-adịghị emekebe. O kpọpụrụ ya iche, site n’ebe ìgwè mmadụ ahụ nọ, gaa n’ebe mmadụ na-anọghị. E mesịa, Jisọs ji mmegharị ahụ ụfọdụ mee ka nwoke ahụ mata ihe ọ na-aga ime. O “wee tinye mkpịsị aka Ya ná ntị ya abụọ, bụọkwa ọnụ mmiri, metụ ire ya.” (Mak 7:33) Ọzọkwa, Jisọs leliri anya n’eluigwe ma sụọ ude n’ụzọ ekpere. Ihe ndị a o mere n’ụzọ ihe ngosi ga-agwa nwoke ahụ, sị, ‘Ihe m gaje imere gị sitere n’ike Chineke.’ N’ikpeazụ, Jisọs sịrị: “Ghere oghe.” (Mak 7:34) Ka o kwuru nke ahụ, nwoke ahụ nụwara ihe, o nwekwara ike ikwu okwu nke ọma.

      10, 11. Olee otú anyị pụrụ isi chebara mmetụta nke ndị ọzọ echiche n’ọgbakọ? n’ezinụlọ?

      10 Lee otú Jisọs si na-echebara ndị ọzọ echiche! O chebaara mmetụta ndị ọzọ echiche, nchebara echiche ọmịiko a, n’aka nke ya, kwaliri ya ime ihe n’ụzọ ndị na-emejọghị mmetụta ha. Dị ka ndị Kraịst, anyị ga-eme nke ọma ịzụlite na igosipụta uche nke Kraịst n’akụkụ a. Bible na-agba anyị ume, sị: “Nwekọọnụ otu uche, unu nile, werenụ obi sorịta onwe unu hụkọọ ahụhụ, bụrụnụ ndị na-ahụ ụmụnna unu n’anya, ndị nwere obi ọmịiko, ndị nwere uche dị umeala.” (1 Pita 3:8) N’ezie nke a chọrọ anyị ikwu okwu na ịkpa àgwà n’ụzọ ndị na-egosi nchebara echiche n’ebe mmetụta ndị ọzọ nọ.

      11 N’ime ọgbakọ, anyị pụrụ ichebara mmetụta ndị ọzọ echiche site n’ịkwanyere ha ùgwù, na-emeso ha ihe dị ka anyị ga-achọ ka e mesoo anyị. (Matiu 7:12) Nke ahụ ga-agụnye ịkpachara anya banyere ihe anyị na-ekwu na otú anyị si ekwu ya. (Ndị Kọlọsi 4:6) Cheta na ‘okwu ndị e kwuru n’echeghị eche pụrụ ịdụpu adụpu dị ka mma agha.’ (Ilu 12:18) Gịnị banyere n’ime ezinụlọ? Di na nwunye bụ́ ndị hụrụ ibe ha n’anya n’ezie na-echebara mmetụta ibe ha echiche. (Ndị Efesọs 5:33) Ha na-ezere okwu ike, nkatọ na-enweghị ọgwụgwụ, na okwu mkparị ndị na-agbakasị ahụ—ha nile pụrụ ịkpata mwute nke a na-apụghị ịgwọta n’ụzọ dị mfe. Ihe na-emetụtakwa ụmụaka, ndị nne na nna na-ahụ n’anya na-echebakwara nke a echiche. Mgbe mgbazi dị mkpa, ndị nne na nna dị otú ahụ na-enye ya n’ụzọ ndị na-asọpụrụ ùgwù nke ụmụ ha ma chebe ha pụọ ná mmechuihu ndị na-enweghị isi.c (Ndị Kọlọsi 3:21) Mgbe anyị si otú ahụ na-echebara ndị ọzọ echiche, anyị na-egosi na anyị nwere uche nke Kraịst.

      Ịdị Njikere Ịtụkwasị Ndị Ọzọ Obi

      12. Echiche dị aṅaa ziri ezi, nke kwesịrị ekwesị ka Jisọs nwere banyere ndị na-eso ụzọ ya?

      12 Jisọs nwere echiche ziri ezi, nke kwesịrị ekwesị banyere ndị na-eso ụzọ ya. Ọ maara nke ọma na ha ezughị okè. E kwuwerị, ọ pụrụ ịma ihe dị n’obi ụmụ mmadụ. (Jọn 2:24, 25) N’agbanyeghị nke ahụ, o lere ha anya ọ bụghị nanị n’akụkụ nke ezughị okè ha kama n’akụkụ nke ezi àgwà ha. Ọ hụkwara ihe ndị ikom a Jehova dọtaworo ga-aghọ. (Jọn 6:44) Echiche ziri ezi Jisọs nwere banyere ndị na-eso ụzọ ya pụtara ìhè n’ụzọ o si mesoo ha ihe. Otu ihe bụ na o gosipụtara ịdị njikere ịtụkwasị ha obi.

      13. Olee otú Jisọs si gosipụta na ọ tụkwasịrị ndị na-eso ụzọ ya obi?

      13 Olee otú Jisọs si gosipụta ntụkwasị obi ahụ? Mgbe ọ hapụrụ ụwa, o nyefere ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ ibu ọrụ dị arọ. O nyefere ha ibu ọrụ nke ilekọta ọdịmma nke Alaeze ya n’ụwa nile. (Matiu 25:14, 15; Luk 12:42-44) N’oge ozi ya, o gosipụtara ọbụna n’ụzọ ndị dị nta, ndị na-apụtachaghị ìhè, na ọ tụkwasịrị ha obi. Mgbe ọ mụbara nri n’ụzọ ọrụ ebube iji nye ìgwè mmadụ nri, o nyefere ndị na-eso ụzọ ya ibu ọrụ nke ikesa nri ahụ.—Matiu 14:15-21; 15:32-37.

      14. Olee otú ị ga-esi chịkọta ihe ahụ e dekọrọ na Mak 4:35-41?

      14 Tụleekwa ihe ahụ e dekọrọ na Mak 4:35-41. N’oge a Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya banyere otu ụgbọ ma kwọrọ gaa n’ebe ọwụwa anyanwụ gabiga ófè Osimiri Galili. N’oge na-adịghị anya mgbe ha kwọpụsịrị, Jisọs dinara ala n’azụ ụgbọ ahụ ma rahụ ụra. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, “oké ajọ ifufe wee fee.” Oké ifufe dị otú ahụ abụghị ihe ọhụrụ n’Osimiri Galili ahụ. Ebe ọ bụ na ọ dị ala (ihe dị ka mita 200 karịa ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke oké osimiri), ifufe na-ekpo ọkụ n’ebe ahụ karịa n’ebe gbara ya gburugburu, nke a na-emekwa ka ikuku na-enye nsogbu. Tụkwasị na nke a, oké ifufe na-efedasi ike na Ndagwurugwu Jọdan site n’Ugwu Hemọn, bụ́ nke dị n’ebe ugwu. Ịda jụụ e nwere nwa mgbe pụrụ ịghọ oké ifufe na mberede. Chee banyere nke a: obi abụọ adịghị ya na Jisọs maara banyere oké ifufe ahụ a na-enwekarị, n’ihi na a zụlitere ya na Galili. Ma, o hiiri ụra gawa, na-atụkwasị obi na nkà nke ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ọkụ azụ̀.—Matiu 4:18, 19.

      15. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie njikere Jisọs dị ịtụkwasị ndị na-eso ụzọ ya obi?

      15 Ànyị pụrụ iṅomi njikere Jisọs dị ịtụkwasị ndị na-eso ụzọ ya obi? Ọ na-esiri ụfọdụ ndị ike ikenye ndị ọzọ ibu ọrụ. Ha aghaghị ịnọ n’isi, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Ha pụrụ iche, sị, ‘Ọ bụrụ na m chọrọ ka e mezie ihe emezie, aghaghị m ime ya n’onwe m!’ Ma ọ bụrụ na anyị aghaghị ime ihe nile n’onwe anyị, anyị nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị ike gwụrụ, ma eleghịkwa anya na-ebelata oge anyị na ezinụlọ anyị ga-eji nọkọọ, n’ụzọ na-enweghị isi. E wezụga nke ahụ, ọ bụrụ na anyị ekenyeghị ndị ọzọ ọrụ na ibu ọrụ ndị kwesịrị ekwesị, anyị pụrụ ịdị na-anapụ ha ahụmahụ na ọzụzụ ndị dị ha mkpa. Ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ịmụta ịtụkwasị ndị ọzọ obi, na-ekenye ha ibu ọrụ. Anyị ga-eme nke ọma ịjụ onwe anyị n’ụzọ eziokwu, sị, ‘Ènwere m uche nke Kraịst n’okwu a? Àna m eji ọchịchọ obi ekenye ndị ọzọ ọrụ, na-atụkwasị obi na ha ga-eme ihe nile ha nwere ike ime?’

      O Gosipụtara Okwukwe n’Ebe Ndị Na-eso Ụzọ Ya Nọ

      16, 17. N’abalị ikpeazụ nke ndụ ya n’elu ala, mmesi obi ike dị aṅaa ka Jisọs nyere ndị ozi ya, n’agbanyeghị na ọ maara na ha gaje ịgbahapụ ya?

      16 Jisọs gosipụtara echiche ziri ezi banyere ndị na-eso ụzọ ya n’otu ụzọ ọzọ dị mkpa. O mere ka ha mara na ya nwere obi ike n’ebe ha nọ. Nke a pụtara nnọọ ìhè n’okwu mmesi obi ike ndị ọ gwara ndị ozi ya n’abalị ikpeazụ nke ndụ elu ala ya. Rịba ama ihe merenụ.

      17 Ọ bụ anyasị nke iji ọrụ n’aka nye Jisọs. Ọ kụziiri ndị ozi ya ihe gbara ọkpụrụkpụ banyere ịdị umeala n’obi site n’ịsa ụkwụ ha. Mgbe nke ahụ gasịrị, o hiwere nri anyasị nke ga-abụ ihe ncheta nke ọnwụ ya. E mesịa, ndị ozi ya banyekwara ọzọ n’arụmụka kpụ ọkụ n’ọnụ banyere onye nke n’ime ha yiri ka ọ bụ ya kasị ukwuu. Jisọs, bụ́ onye nwere ndidi mgbe nile, agwakasịghị ha okwu ahụ kama o sooro ha tụgharịa uche. Ọ gwara ha ihe dị n’ihu, sị: “A ga-eme ka unu onwe unu nile maa n’ọnyà n’ahụ m abalị taa: n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, M ga-etigbu Onye ọzụzụ atụrụ, a ga-agbasakwa atụrụ nke ìgwè atụrụ ya.” (Matiu 26:31; Zekaraịa 13:7) Ọ maara na ezi ndị enyi ya ga-agbahapụ ya n’oge ọ nọ ná mkpa. Ma, ọ katọghị ha. N’ụzọ megidere nke ahụ, ọ gwara ha, sị: “Ma mgbe e mere ka M si n’ọnwụ bilie, M ga-eburu unu ụzọ gaa Galili.” (Matiu 26:32) Ee, o mesiri ha obi ike na ọ bụ ezie na ha ga-agbahapụ ya, ọ gaghị agbahapụ ha. Mgbe ahụmahụ ọjọọ a ga-agabiga, ọ ga-ezute ha ọzọ.

      18. Na Galili, nnukwu ọrụ dị aṅaa ka Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya, oleekwa otú ndị ozi ahụ si rụọ ya?

      18 Jisọs mezuru ihe o kwuru. E mesịa, na Galili, Jisọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie pụtara n’ihu ndị ozi 11 ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị ihe àmà na-egosi na ha so ndị ọzọ gbakọta. (Matiu 28:16, 17; 1 Ndị Kọrint 15:6) N’ebe ahụ, Jisọs nyere ha otu nnukwu ọrụ: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi na-enye anyị ihe àmà doro anya na ndị ozi ahụ rụrụ ọrụ ahụ. Ha ji ikwesị ntụkwasị obi bute ụzọ n’ọrụ nke ikwusa ozi ọma ahụ na narị afọ mbụ.—Ọrụ 2:41, 42; 4:33; 5:27-32.

      19. Gịnị ka ihe ndị Jisọs mere mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ na-akụziri anyị banyere uche nke Kraịst?

      19 Gịnị ka ihe ndekọ a na-ekpughe ihe na-akụziri anyị banyere uche nke Kraịst? Jisọs ahụwo nnọọ emezighị emezi nke ndị ozi ya, ma ọ “hụrụ ha n’anya ruo ọgwụgwụ.” (Jọn 13:1) N’agbanyeghị emezighị emezi ha, o mere ka ha mara na ya nwere okwukwe n’ebe ha nọ. Rịba ama na obi ike Jisọs ehieghị ụzọ. Obi abụọ adịghị ya na obi ike na okwukwe o gosipụtaworo n’ebe ha nọ wusiri ha ike ikpebisi ike n’obi ha ịrụ ọrụ o nyere ha iwu ka ha ruọ.

      20, 21. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta echiche ziri ezi banyere ndị kwere ekwe ibe anyị?

      20 Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta uche nke Kraịst n’akụkụ a? Abụla onye na-adịghị enwe obi ike n’ebe ndị kwere ekwe ibe gị nọ. Ọ bụrụ na ị na-eche ihe dị nnọọ njọ, o yikarịrị ka okwu na omume gị hà ga-egosipụta ya. (Luk 6:45) Otú ọ dị, Bible na-agwa anyị na ịhụnanya “na-ekwere ihe nile.” (1 Ndị Kọrint 13:7) Ịhụnanya na-enwe nchekwube, ọ bụghị obi abụọ. Ọ na-ewuli elu kama itida etida. Ndị mmadụ na-aka anabata ịhụnanya na agbamume ngwa ngwa karịa mmaja. Anyị pụrụ iwulite ndị ọzọ na ịgba ha ume site n’igosipụta obi ike n’ebe ha nọ. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:11) Ọ bụrụ na, dị ka Kraịst, anyị enwee echiche ziri ezi banyere ụmụnna anyị, anyị ga-emeso ha ihe n’ụzọ ndị ga-ewuli ha elu ma wepụta ihe kasị mma n’ime ha.

      21 Ịzụlite na igosipụta uche nke Kraịst karịrị nanị iṅomi ihe ụfọdụ Jisọs mere. Dị ka a kpọtụrụ uche n’isiokwu bu ụzọ, ọ bụrụ na anyị ga-akpa àgwà n’ezie dị ka Jisọs, anyị aghaghị ibu ụzọ mụta ile ihe anya dị ka o si ele ha. Oziọma ndị ahụ na-eme ka anyị nwee ike ịhụ akụkụ ọzọ nke àgwà ya, echiche na mmetụta ya banyere ọrụ e nyere ya, dị ka isiokwu na-esonụ ga-atụle.

      [Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

      a N’akwụkwọ ahụ, onye ụgha ahụ kọwara otú o chere Jisọs dị, gụnyere ụcha agịrị isi, afụ ọnụ, na anya ya. Onye nsụgharị Bible bụ́ Edgar J. Goodspeed na-akọwa na ‘a gbasara ụgha a iji mee ka a nakwere nkọwa dị n’akwụkwọ onye ọkà n’ise ihe ahụ banyere ọdịdị Jisọs.’

      b Ihe àmà na-egosi na ụmụntakịrị ahụ nọ n’afọ ndụ dịgasị iche. E jikwa okwu a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “ụmụntakịrị” mee ihe n’ebe nwa nwanyị Jairọs nke dị afọ 12 nọ. (Mak 5:39, 42; 10:13) Otú ọ dị, n’ihe ndekọ nke ya na nke a bụ otu ihe, Luk ji okwu e jikwa eme ihe maka ụmụ ọhụrụ, mee ihe.—Luk 1:41; 2:12; 18:15.

      c Lee isiokwu bụ́ “Ị̀ Na-asọpụrụ Ùgwù Ha?” nke dị ná mbipụta Ụlọ Nche nke April 1, 1998.

  • À Na-akwali Gị Ime Ihe Dị Ka A Kwaliri Jisọs?
    Ụlọ Nche—2000 | Febụwarị 15
    • À Na-akwali Gị Ime Ihe Dị Ka A Kwaliri Jisọs?

      “O wee . . . hụ oké ìgwè mmadụ, O wee nwee ọmịiko n’ahụ ha, n’ihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha: O wee malite izi ha ọtụtụ ihe.”—MAK 6:34.

      1. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe kwere nghọta na ndị mmadụ na-egosipụta àgwà ndị dị mma?

      N’AKỤKỌ ihe mere eme nile, ọtụtụ ndị mmadụ n’otu n’otu egosipụtawo àgwà ndị dị mma. Ị pụrụ ịghọta ihe kpatara ya. Jehova Chineke nwere ma na-egosipụta ịhụnanya, obiọma, mmesapụ aka, na àgwà ndị ọzọ anyị ji akpọrọ ihe. E kere ndị mmadụ n’onyinyo Chineke. Ya mere, anyị pụrụ ịghọta ihe mere ọtụtụ ndị ga-eji gosipụta ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ịhụnanya, obiọma, ọmịiko, na àgwà nsọpụrụ Chineke ndị ọzọ, ọbụna dị ka ihe ka ọtụtụ n’ime ha na-egosipụta ọnọdụ akọ na uche. (Jenesis 1:26; Ndị Rom 2:14, 15) Otú ọ dị, ị pụrụ ịchọpụta na ụfọdụ na-adị njikere igosipụta àgwà ndị a karịa ndị ọzọ.

      2. Olee ụfọdụ ọrụ ọma ndị mmadụ pụrụ ịrụ, ikekwe na-eche na ha na-eṅomi Kraịst?

      2 Ma eleghị anya ị maara ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị na-eletakarị ndị ọrịa ma ọ bụ na-enyere ha aka, na-emere ndị ọrụsị ọmịiko, ma ọ bụ na-emesapụrụ ndị ogbenye aka. Cheekwa banyere ndị ọmịiko ha na-akwali itinye ndụ ha n’ịrụ ọrụ n’ógbè ndị ekpenta ma ọ bụ n’ogige ụmụ mgbei, ndị na-arụ ọrụ afọ ofufo n’ụlọ ọgwụ ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ ebe a na-elekọta ndị na-arịakarị ọrịa, ma ọ bụ ndị na-agbalịsi ike inyere ndị na-enweghị ebe obibi ma ọ bụ ndị gbara ọsọ ndụ aka. Ma eleghị anya, ụfọdụ n’ime ha na-eche na ha na-eṅomi Jisọs, bụ́ onye setịpụụrụ ndị Kraịst ụkpụrụ ahụ. Anyị na-agụ n’Oziọma ndị ahụ na Kraịst gwọrọ ndị ọrịa ma nye ndị agụụ na-agụ nri. (Mak 1:34; 8:1-9; Luk 4:40) Ngosipụta Jisọs gosipụtara ịhụnanya, ịdị nro, na ọmịiko na-eme ka “uche nke Kraịst” pụta ìhè, bụ́ onye n’aka nke ya nọ na-eṅomi Nna ya nke eluigwe.—1 Ndị Kọrint 2:16.

      3. Iji nwee echiche ziri ezi banyere ọrụ ọma ndị Jisọs rụrụ, gịnị ka ọ dị anyị mkpa ịtụle?

      3 Otú ọ dị, ị̀ chọpụtawo na ọtụtụ n’ime ndị nwere mmasị taa n’ịhụnanya na ọmịiko Jisọs leghaara akụkụ bụ́ isi nke uche nke Kraịst anya? Anyị pụrụ ịghọta nke a site n’iji nlezianya tụlee Mak isi nke 6. Anyị na-agụ n’ebe ahụ na ndị mmadụ duteere Jisọs ndị ọrịa ka o wee gwọọ ha. N’ihe a na-ekwu banyere ya, anyị matakwara na mgbe Jisọs hụrụ na agụụ ejidela ọtụtụ puku ndị bịakwutere ya, o nyere ha nri n’ụzọ ọrụ ebube. (Mak 6:35-44, 54-56) Ịgwọ ndị ọrịa na inye ndị agụụ na-agụ nri bụ ngosipụta pụtara ìhè nke ọmịiko ịhụnanya, ma hà bụ ụzọ ndị bụ́ isi Jisọs si nyere ndị ọzọ aka? Oleekwa otú anyị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya ya zuru okè nke ịhụnanya, obiọma, na ọmịiko, ọbụna dị ka o si ṅomie Jehova?

      A Kpaliri Ya Ilebara Mkpa Ime Mmụọ Anya

      4. Olee ebe ihe ndekọ ahụ dị na Mak 6:30-34 mere?

      4 Jisọs nwere ọmịiko n’ebe ndị nọ ya gburugburu nọ n’ụzọ bụ́ isi n’ihi mkpa ime mmụọ ha. Mkpa ndị ahụ dị mkpa n’ụzọ bụ́ isi, karịa nnọọ mkpa anụ ahụ. Tụlee ihe ndekọ dị na Mak 6:30-34. Ihe e dekọrọ n’ebe ahụ mere n’ikperé mmiri nke Osimiri Galili, mgbe oge Ememe Ngabiga nke 32 O.A. na-eru nso. Ndị ozi ahụ nwere oké mmasị, e nwekwara ezi ihe kpatara ya. N’ịbụ ndị ka mesịrị nnọọ njem sara mbara, ha bịakwutere Jisọs, obi abụọ adịghị ya na ha nwere oké mmasị ịgwa ya ahụmahụ ha nwere. Otú ọ dị, ìgwè mmadụ gbakọrọ. O buru nnọọ ibu nke na Jisọs na ndị ozi ya apụghị iri ihe ma ọ bụ zuo ike. Jisọs gwara ndị ozi ahụ, sị: “Unu onwe unu bịa iche n’ebe bụ́ ọhịa, ka unu zuru ike nke nta.” (Mak 6:31) N’ịbanye n’otu ụgbọ, ma eleghị anya na nso Kapanọm, ha seere gaa n’ebe dara jụụ n’ofé Osimiri Galili. Ma ìgwè mmadụ ahụ gbara ọsọ n’ogologo ikperé mmiri ahụ ma buru ụgbọ ahụ ụzọ ruo. Olee otú Jisọs ga-esi meghachi omume? Ò were iwe na e nyere ya nsogbu mgbe ọ chọrọ ịnọrọ nanị ya? Ọ dịghị ma ọlị!

      5. Olee mmetụta Jisọs nwere n’ebe ìgwè mmadụ ahụ bịakwutere ya nọ, oleekwa otú o si meghachi omume?

      5 Ọhụhụ Jisọs hụrụ ìgwè a nke ọtụtụ puku mmadụ mejupụtara, gụnyere ndị ọrịa, bụ́ ndị ji oké mmasị na-echere ya, metụrụ ya n’obi. (Matiu 14:14; Mak 6:44) N’ilekwasị anya n’ihe kpaliri ọmịiko Jisọs na n’otú o si meghachi omume, Mak dere, sị: “O wee . . . hụ oké ìgwè mmadụ, O wee nwee ọmịiko n’ahụ ha, n’ihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha: O wee malite izi ha ọtụtụ ihe.” (Mak 6:34) Jisọs hụrụ ihe karịrị ìgwè mmadụ. Ọ hụrụ ndị mmadụ nwere mkpa ime mmụọ. Ha dị ka atụrụ na-akpafu akpafu n’enweghị enyemaka, n’enweghị onye ọzụzụ atụrụ iduzi ha gaa n’ala ahịhịa ndụ ma ọ bụ ichebe ha. Jisọs maara na ndị ndú okpukpe ahụ obi tara mmiri, bụ́ ndị kwesịrị ịbụ ndị ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya, na-elelị ndị nkịtị anya n’ezie ma na-eleghara mkpa ime mmụọ ha anya. (Ezikiel 34:2-4; Jọn 7:47-49) Jisọs ga-emeso ha ihe n’ụzọ dị iche, na-emere ha ihe ọma kasịnụ dị ka o kwere mee. Ọ malitere ịkụziri ha banyere Alaeze Chineke.

      6, 7. (a) Gịnị ka Oziọma ndị ahụ na-ekpughe na e butere ụzọ n’ụzọ Jisọs si gboo mkpa ndị mmadụ? (b) Gịnị kwaliri Jisọs ime nkwusa na izi ihe?

      6 Rịba ama usoro na echiche e nyere banyere ihe ndị bu ụzọ mee bụ́ nke pụtara ìhè n’ihe ndekọ yiri ya. Ọ bụ Luk, bụ́ onye dibịa nke nwekwara mmasị dị ukwuu n’ọdịmma ndị ọzọ, dere nke a. “Ìgwè mmadụ nile . . . sooro [Jisọs]: O wee nara ha nke ọma, wee gwa ha okwu banyere alaeze Chineke, na-emekwa ka ahụ dị ha ike, bụ́ ndị ọ dị mkpa ka e mee ka ahụ ha dị ike.” (Luk 9:11, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche; Ndị Kọlọsi 4:14) Ọ bụ ezie na ọ dịghị otú ahụ n’ihe ndekọ nile banyere ọrụ ebube, na nke a, gịnị ka ihe ndekọ Luk dere n’ike mmụọ nsọ bu ụzọ rịba ama? Ọ bụ eziokwu ahụ bụ́ na Jisọs kụziiri ndị ahụ ihe.

      7 Nke a kwekọrọ n’ezie n’ihe ahụ e mesiri ike bụ́ nke anyị na-ahụ na Mak 6:34. Amaokwu ahụ na-egosi n’ụzọ doro anya otú e si kpalie Jisọs n’ụzọ bụ́ isi igosipụta ọmịiko ya. Ọ ziri ndị ahụ ihe, na-egbo mkpa ime mmụọ ha. N’oge bu ụzọ n’ozi ya, Jisọs kwuru, sị: “Aghaghị m izikwa obodo nile ọzọ ozi ọma alaeze Chineke: n’ihi na e zitere m ime nke a.” (Luk 4:43) Otú ọ dị, anyị na-ehie ụzọ ma ọ bụrụ na anyị echee na Jisọs kpọsara ozi Alaeze ahụ nanị dị ka ọrụ dịịrị ya, dị ka a ga-asị na ọ na-arụ ọrụ nkwusa ahụ ọ na-aghaghị ịrụ, iji mezuo iwu. Ee e, ọmịiko ịhụnanya ya n’ebe ndị mmadụ nọ bụ isi ihe kwaliri ya isoro ha kerịta ozi ọma ahụ. Ihe ọma kasịnụ nke Jisọs pụrụ ime—ọbụna nye ndị ọrịa, ndị ndị mmụọ ọjọọ na-emekpa ahụ, ndị ogbenye, ma ọ bụ ndị agụụ na-agụ—bụ inyere ha aka ịmara, ịnakwere, na inwe mmasị n’eziokwu banyere Alaeze Chineke. Eziokwu ahụ dị oké mkpa n’ụzọ bụ́ isi n’ihi ókè Alaeze ahụ na-ekere n’iwepụ ọbụbụeze Jehova n’ụta nakwa n’iwetara ụmụ mmadụ ngọzi na-adịgide adịgide.

      8. Olee mmetụta Jisọs nwere banyere ime nkwusa na izi ihe ya?

      8 Ime nkwusa dị irè banyere Alaeze ahụ bụ isi ihe mere Jisọs ji bịa n’ụwa. Ná ngwụsị nke ozi elu ala ya, Jisọs gwara Paịlet, sị: “A mụwo Mụ onwe m ime ihe a, abịawokwa m n’ime ụwa ime ihe a, ka M wee gbaara eziokwu àmà. Onye ọ bụla nke sitere n’eziokwu ahụ na-anụ olu m.” (Jọn 18:37) Anyị arịbawo ama n’isiokwu abụọ ndị bu ụzọ na Jisọs bụ onye nwere mmetụta miri emi—onye na-eche banyere ndị ọzọ, onye dị mfe njekwuru, onye na-echebara ndị ọzọ echiche, onye na-atụkwasị ndị ọzọ obi, karịsịakwa, onye na-ahụ n’anya. Anyị kwesịrị inwe ekele maka akụkụ ndị ahụ nke àgwà ya ma ọ bụrụ na anyị chọrọ n’ezie ịghọta uche nke Kraịst. Ọ dịkwa mkpa ịghọta na uche nke Kraịst gụnyere mbute o butere ọrụ nkwusa na izi ihe ya ụzọ.

      Ọ Gbara Ndị Ọzọ Ume Ịgba Àmà

      9. Nye ole ndị ka ime nkwusa na izi ihe ga-ebute ụzọ?

      9 Ibute ime nkwusa na izi ihe ụzọ—dị ka ngosipụta nke ịhụnanya na ọmịiko—adịrịghị nanị Jisọs. Ọ gbara ụmụazụ ya ume iṅomi ebumnobi ya, ihe ndị o butere ụzọ, na ihe ndị o mere. Dị ka ihe atụ, mgbe Jisọs họpụtasịrị ndị ozi 12 ya, gịnị ka ha ga-eme? Mak 3:14, 15 na-agwa anyị, sị: “O wee mee ndị ikom iri na abụọ, ka Ya na ha wee biri, ka O wee na-ezipụkwa ha ikwusa ozi ọma, na inwe ike ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ị̀ hụrụ ihe ọ bụla ndị ozi ahụ ga-ebute ụzọ?

      10, 11. (a) Mgbe Jisọs na-ezipụ ndị ozi ahụ, gịnị ka ọ gwara ha ka ha mee? (b) N’ihe banyere izipụ ndị ozi ahụ, gịnị ka e lekwasịrị anya?

      10 Ka oge na-aga, Jisọs mere ka mmadụ 12 ahụ nwee ike ịgwọ ndị ọzọ na ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ. (Matiu 10:1; Luk 9:1) O zipụziri ha ijekwuru “atụrụ furu efu nke ụlọ Israel.” Iji mee gịnị? Jisọs nyere ha ntụziaka, sị: “Mgbe unu na-aga, na-ekwusanụ, sị, Alaeze eluigwe dị nso. Meenụ ndị ahụ ha na-adịghị ike ka ahụ dị ha ike, meenụ ndị nwụrụ anwụ ka ha si n’ọnwụ bilie, meenụ ndị ekpenta ka ha dị ọcha, chụpụnụ ndị mmụọ ọjọọ.” (Matiu 10:5-8; Luk 9:2) Gịnị n’ezie ka ha mere? “Ha wee pụọ, [1] kwusaa ka mmadụ chegharịa. [2] Ha na-achụpụkwa ọtụtụ mmụọ ọjọọ, werekwa mmanụ olive tee ọtụtụ ndị nrịanrịa, wee mee ka ahụ dị ha ike.”—Mak 6:12, 13.

      11 Ebe ọ bụ na ọ bụghị oge nile ka e bu ụzọ kpọtụ izi ihe aha, ịrịba usoro ahụ dị n’elu ama ọ̀ ga-abụ iji ihe banyere ibute ihe ụzọ ma ọ bụ ebumnobi ndị ọ gụnyere, kpọbigara ihe ókè? (Luk 10:1-8) Anyị ekwesịghị ibelata ugboro ole e bu ụzọ kpọtụ izi ihe aha tupu ọgwụgwọ. Tụlee ihe a na-ekwu banyere ya n’okwu a. Ntakịrị oge tupu Jisọs ezipụ ndị ozi 12 ahụ, ọnọdụ nke ìgwè mmadụ ahụ metụrụ ya n’ahụ. Anyị na-agụ, sị: “Jisọs wee na-ejegharị n’obodo na obodo nta ha nile, na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ nile ha, na-ekwusakwa ozi ọma nke alaeze ahụ, na-agwọkwa ọrịa nile dị iche iche na nrịanrịa nile dị iche iche. Ma mgbe Ọ hụrụ ìgwè mmadụ nile, O nwere ọmịiko n’ahụ ha, n’ihi na a na-esogbu ha, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. Mgbe ahụ Ọ sị ndị na-eso ụzọ Ya, Owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ, ka O zipụ ndị ọrụ baa n’owuwe ihe ubi Ya.”—Matiu 9:34-38.

      12. Olee nzube ọzọ ọrụ ebube nke Jisọs na ndị ozi pụrụ imezu?

      12 Site n’ịnọnyere ya, ndị ozi ahụ pụrụ inwetatụ uche nke Kraịst. Ha pụrụ ịhụ na ha ịdị na-ahụ n’anya ma na-enwe ọmịiko n’ezie n’ebe ndị mmadụ nọ gụnyere ime nkwusa na izi ihe banyere Alaeze ahụ—nke ahụ ga-abụ akụkụ bụ́ isi nke ọrụ ọma ha. N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, ọrụ ọma a rụrụ n’ụzọ anụ ahụ, dị ka ịgwọ ndị ọrịa, rụzuru ihe karịrị nanị inyere ndị nọ ná mkpa aka. Dị ka ị pụrụ iche n’echiche, a pụrụ iji ọgwụgwọ na inye nri n’ụzọ ọrụ ebube dọta ụfọdụ ndị. (Matiu 4:24, 25; 8:16; 9:32, 33; 14:35, 36; Jọn 6:26) Otú ọ dị, e wezụga ịbụ enyemaka n’ụzọ anụ ahụ, ọrụ ndị ahụ kpaliri ndị na-ekiri ihe na-emenụ n’ezie ịghọta na Jisọs bụ Ọkpara Chineke nakwa “onye amụma ahụ” nke Mosis buru n’amụma.—Jọn 6:14; Deuterọnọmi 18:15.

      13. Amụma ahụ dị na Deuterọnọmi 18:18 na-eme ka ọrụ dị aṅaa dịịrị “onye amụma ahụ” nke gaje ịbịa pụta ìhè?

      13 N’ihi gịnị ka o ji pụta ìhè na Jisọs bụ “onye amụma ahụ”? Gịnị bụ ọrụ bụ́ isi e buru n’amụma na onye ahụ ga-arụ? “Onye amụma ahụ” ọ̀ ga-abụ onye a ma ama maka ịgwọ ọrịa n’ụzọ ọrụ ebube ma ọ bụ iji obi ọmịiko enye ndị agụụ na-agụ nri? Deuterọnọmi 18:18 buru n’amụma, sị: “M ga-eme ka onye amụma, nke dị ka gị [Mosis], biliere ha site n’etiti ụmụnne ha; M ga-etinyekwa okwu m nile n’ọnụ ya, ọ ga-agwakwa ha okwu nile nke M ga-enye ya n’iwu.” Ka ndị ozi ahụ na-amụta inwe na igosipụta mmetụta miri emi, ha pụrụ ikwubi na uche nke Kraịst ga-apụtakwa ìhè n’ọrụ ime nkwusa na izi ihe ha. Nke ahụ ga-abụ ihe kasị mma ha pụrụ imere ndị mmadụ. N’ụzọ dị otú ahụ, ndị ọrịa na ndị ogbenye pụrụ inweta abamuru ndị na-adịgide adịgide, ọ bụghị nanị ndị ahụ ga-adịrụ nanị ná mkpirikpi oge mmadụ na-adịru ndụ ma ọ bụ n’oge otu nri ma ọ bụ abụọ.—Jọn 6:26-30.

      Zụlite Uche nke Kraịst Taa

      14. Olee ụzọ inwe uche nke Kraịst si metụta ime nkwusa anyị?

      14 Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị nke ga-ele uche nke Kraịst anya dị ka nke dịrị nanị narị afọ mbụ—nye Jisọs na ndị na-eso ụzọ nke oge mbụ bụ́ ndị Pọl onyeozi dere banyere ha, sị: “Anyị onwe anyị nwere uche nke Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 2:16) Anyị ga-ekwetakwa ngwa ngwa na iwu ji anyị ikwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Ma, ọ bara uru ịtụgharị uche n’ebumnobi anyị ji na-arụ ọrụ ahụ. O kwesịghị ịbụ nanị n’ihi na ọ bụ ọrụ dịịrị anyị. Ịhụnanya n’ebe Chineke nọ bụ isi ihe mere anyị ji ekere òkè n’ozi, ịdịkwa ka Jisọs n’ezie gụnyere ịbụ ndị ọmịiko kpaliri ime nkwusa na izi ihe.—Matiu 22:37-39.

      15. N’ihi gịnị ka ọmịiko ji bụrụ akụkụ kwesịrị ekwesị nke ozi ihu ọha anyị?

      15 N’eziokwu, ọ dịghị adịcha mfe inwe ọmịiko n’ebe ndị na-ekweghị ihe anyị kweere nọ, karịsịa mgbe anyị zutere enweghị mmasị, ọjụjụ, ma ọ bụ mmegide. Ma, ọ bụrụ na anyị ahapụ inwe ịhụnanya na ọmịiko n’ebe ndị mmadụ nọ, anyị agaghịzi enwe mkpali dị mkpa maka ikere òkè n’ozi ndị Kraịst. Oleezi otú anyị pụrụ isi zụlite ọmịiko? Anyị pụrụ ịgbalị ile ndị mmadụ anya dị ka Jisọs si lee ha, dị ka ndị ‘a na-esogbu, na-achụsakwa, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.’ (Matiu 9:36) Nke ahụ ọ̀ dịghị akọwa ọtụtụ ndị taa? Ndị ọzụzụ atụrụ okpukpe ụgha elegharawo ha anya, meekwa ka ha kpuo ìsì n’ụzọ ime mmụọ. N’ihi ya, ha amaghị banyere nduzi ahụ bụ́ ịgba nke a na-achọta n’ime Bible, ha amaghịkwa banyere ọnọdụ Paradaịs ndị Alaeze Chineke ga-eweta n’isi nso n’elu ala anyị. Ha na-eche nsogbu nke ndụ a na-adị kwa ụbọchị ihu—gụnyere ịda ogbenye, adịghị n’otu nke ezinụlọ, ọrịa, na ọnwụ—n’enweghị olileanya nke Alaeze ahụ. Anyị nwere ihe dị ha mkpa: ozi ọma Alaeze Chineke nke e guzobeworo ugbu a n’eluigwe!

      16. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji chọọ isoro ndị ọzọ kerịta ozi ọma ahụ?

      16 Mgbe i chere echiche banyere mkpa ime mmụọ nke ndị nọ gị gburugburu, obi gị ọ́ dịghị akwali gị ịchọ ime ihe nile ị pụrụ ime iji gwa ha banyere nzube ịhụnanya nke Chineke? Ee, ọrụ anyị bụ ọrụ ọmịiko. Mgbe anyị nwere ọmịiko n’ebe ndị mmadụ nọ dị ka Jisọs nwere, ọ ga-apụta ìhè n’ụda olu anyị, n’ọdịdị ihu anyị, n’ụzọ anyị si ezi ihe. Ihe ndị ahụ nile ga-eme ka ozi anyị masịkwuo ndị ahụ “e doro ịnata ndụ ebighị ebi.”—Ọrụ 13:48.

      17. (a) Olee ụfọdụ ụzọ anyị pụrụ isi gosipụta ịhụnanya na ọmịiko anyị n’ebe ndị ọzọ nọ? (b) N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị bụrụ okwu banyere ma ọ́ bụghị na a rụrụ ọrụ ọma ọ bụrụ na e keere òkè n’ozi ihu ọha?

      17 Ịhụnanya na ọmịiko anyị kwesịrị, n’ezie, ịpụta ìhè n’ụzọ ndụ anyị nile. Nke a gụnyere anyị inwe obiọma n’ebe ndị ụwa na-atụ n’ọnụ, ndị ọrịa, na ndị ogbenye nọ—na-eme ihe anyị pụrụ ime n’ụzọ ezi uche dị na ya iji belata ahụhụ ha. Ọ gụnyere mgbalị anyị n’okwu na n’omume iji wepụ iru ùjù nke ndị ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụworo. (Luk 7:11-15; Jọn 11:33-35) Ma, ngosipụta ndị dị otú ahụ nke ịhụnanya, obiọma, na ọmịiko agaghị aghọ ebe ọrụ ọma anyị nile hiwere isi karịsịa, dị ka ha ghọwooro ụfọdụ ndị na-akwalite ọdịmma ndị mmadụ. Mgbalị ndị inwe àgwà Chineke ndị yiri ndị ahụ kwaliri, bụ́ ndị a na-egosipụta n’òkè a na-ekere n’ọrụ ime nkwusa na izi ihe ndị Kraịst, bara uru n’ụzọ na-adịgide adịgide karịsịa. Cheta ihe Jisọs kwuru banyere ndị ndú okpukpe ndị Juu, sị: “Unu na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke mkpa akwụkwọ na-esi ísì ụtọ na anise na cummin, unu ahapụwokwa ihe ka arọ n’iwu, bụ́ ikpe, na ebere, na okwukwe: ma ọ dị mkpa ka unu mee ihe ndị a, ka unu gharakwa ịhapụ ihe ahụ.” (Matiu 23:23) Nye Jisọs, ọ bụghị ihe banyere ma a họrọghị nke a a họrọ nke a—ma ọ́ bụghị inyere ndị mmadụ aka ná mkpa anụ ahụ ha ọ bụrụ izi ha ihe ime mmụọ ndị na-enye ndụ. Jisọs mere ha abụọ. Ma, o doro anya na ọrụ izi ihe ya butere ụzọ n’ihi na ezi ihe ọ rụzuru pụrụ ịbụ ihe enyemaka na-adịru ebighị ebi.—Jọn 20:16.

      18. Anyị ịtụle uche nke Kraịst kwesịrị ịkwali anyị ime gịnị?

      18 Lee ekele anyị pụrụ inwe na Jehova ekpugheworo anyị uche nke Kraịst! Site n’Oziọma ndị ahụ, anyị pụrụ ịbịa mara n’ụzọ ka mma echiche, mmetụta, àgwà, ihe omume nke nwoke ahụ kasị ukwuu nke dịworo ndụ, nakwa ihe ndị o butere ụzọ. Ọ dịịrị anyị ịgụ, ịtụgharị uche, na itinye n’ọrụ ihe Bible na-ekpughe banyere Jisọs. Cheta na ọ bụrụ n’ezie na anyị ga-eme dị ka Jisọs, anyị aghaghị ibu ụzọ mụta iche echiche, inwe mmetụta, na ịtụle ihe dị ka o mere, ruo n’ókè ike kwere anyị dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè. Ka anyị kpebisizie ike ịzụlite na igosipụta uche nke Kraịst. Ọ dịghị ụzọ ọzọ ka mma isi bie ndụ, ọ dịghị ụzọ ọzọ ka mma isi mesoo ndị mmadụ ihe, ọ dịghịkwa ụzọ ọzọ ka mma anyị na ndị ọzọ pụrụ isi bịaruo onye ahụ ọ na-eṅomi n’ụzọ zuru ezu, bụ́ Chineke anyị nke nwere ọmịiko, bụ́ Jehova, nso.—2 Ndị Kọrint 1:3; Ndị Hibru 1:3.

  • À Na-akwali Gị Ime Ihe Dị Ka A Kwaliri Jisọs?
    Ụlọ Nche—2000 | Febụwarị 15
    • [Foto dị na peeji nke 23]

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya