Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w00 2/15 p. 15-20
  • Ì Nwere “Uche nke Kraịst”?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ì Nwere “Uche nke Kraịst”?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye Na-adị Mfe Njekwuru
  • Ichebara Ndị Ọzọ Echiche
  • Ịdị Njikere Ịtụkwasị Ndị Ọzọ Obi
  • O Gosipụtara Okwukwe n’Ebe Ndị Na-eso Ụzọ Ya Nọ
  • “Jizọs . . . Hụrụ Ha n’Anya Ruo Ọgwụgwụ”
    ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
  • “Kraịst Ike nke Chineke”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Ị̀ Ga-anara Ịhụnanya Jisọs?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Jisọs Wepụtara Oge Soro Ụmụntakịrị Nọkọọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
w00 2/15 p. 15-20

Ì Nwere “Uche nke Kraịst”?

“Ma ka Chineke nke ntachi obi na nke nkasi obi nye unu ka unu tụkwasị uche n’otu ihe ahụ . . . dị ka Kraịst Jisọs si chọọ.”—NDỊ ROM 15:5.

1. Olee ụzọ e si ese Jisọs n’ọtụtụ ihe osise Krisendọm, gịnịkwa mere nke a na-ejighị bụrụ ụzọ ziri ezi isi see Jisọs?

“A HỤTỤBEGHỊ ya ma ọlị ebe ọ na-achị ọchị.” Otú ahụ ka e si kọwaa Jisọs n’otu akwụkwọ nke e ji ụgha na-azọrọ na ọ bụ otu onye ọchịchị Rom oge ochie dere ya. A sịrị na akwụkwọ a, bụ́ nke a mawooro n’ụdị ọ dị ugbu a kemgbe ihe dị ka narị afọ nke 11, enwewo mmetụta n’ebe ọtụtụ ndị na-ese ihe nọ.a N’ọtụtụ ihe osise, a na-ese Jisọs dị ka onye gbarụrụ ihu, onye ọ na-esiri ike ịmụmụ ọnụ ọchị, ma ọ bụrụdị na ọ na-amụmụ. Ma nke ahụ abụtụghị ụzọ ziri ezi isi see Jisọs, bụ́ onye Oziọma ndị ahụ na-egosipụta dị ka nwoke ịhụnanya na obiọma, onye nwere mmetụta ndị miri emi.

2. Olee otú anyị pụrụ isi “tụkwasị uche n’otu ihe ahụ . . . dị ka Kraịst Jisọs si chọọ,” gịnịkwa ka nke a ga-eme ka anyị dị njikere ime?

2 N’ụzọ doro anya, iji mara Jisọs ahụ nke bụ ezigbo ya, anyị aghaghị iburu ezi nghọta banyere ụdị onye Jisọs bụ n’ezie mgbe ọ nọ n’ụwa ebe a n’uche na n’obi anyị. Ya mere ka anyị nyochaa ihe ndekọ nke Oziọma ụfọdụ ndị na-enye anyị nghọta banyere “uche nke Kraịst”—ya bụ, mmetụta ya, ụzọ o si ele ihe anya, echiche ya, na otú o si atụle ihe. (1 Ndị Kọrint 2:16) Ka anyị na-eme nke ahụ, ka anyị tụlee otú anyị pụrụ isi “tụkwasị uche n’otu ihe ahụ . . . dị ka Kraịst Jisọs si chọọ.” (Ndị Rom 15:5) N’ụzọ dị otú ahụ, anyị ga-aka adị njikere ịgbaso ụkpụrụ o setịpụụrụ anyị ná ndụ anyị nakwa ná mmekọrịta anyị na ndị ọzọ.—Jọn 13:15.

Onye Na-adị Mfe Njekwuru

3, 4. (a) Olee ebe ihe ahụ e dekọrọ na Mak 10:13-16 nọ mee? (b) Olee otú Jisọs si meghachi omume mgbe ndị na-eso ụzọ ya nwara igbochi ụmụntakịrị ịbịakwute ya?

3 A na-adọta ndị mmadụ n’ebe Jisọs nọ. N’oge dị iche iche, ndị mmadụ nọ n’afọ ndụ dị iche iche bụ́ ndị nwekwara nzụlite dịgasị iche jekwuuru ya n’enweghị ihe mgbochi. Tụlee ihe omume ahụ e dekọrọ na Mak 10:13-16. O mere ná ngwụsị nke ozi ya ka ọ na-aga Jerusalem na nke ikpeazụ ya, ije nwụọ ọnwụ na-egbu mgbu.—Mak 10:32-34.

4 See onyinyo ebe ihe ahụ na-eme. Ndị mmadụ amalite ịkpọta ụmụntakịrị, gụnyere ụmụ ọhụrụ, ka Jisọs gọzie ha.b Otú ọ dị, ndị na-eso ụzọ Jisọs anwaa igbochi ụmụntakịrị ahụ ijekwuru ya. Ikekwe ndị na-eso ụzọ ya echee n’ezie na Jisọs achọghị ka ụmụntakịrị nye ya nsogbu n’izu ndị a dị oké mkpa. Ma ha dara ya. Mgbe Jisọs ghọtara ihe ndị na-eso ụzọ ya na-eme, ọ tọghị ya ụtọ. Jisọs akpọta ụmụntakịrị ahụ, na-asị: “Kwenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m; unu egbochila ha.” (Mak 10:14) Ya emezie ihe na-ekpughe àgwà ịdị nro na nke ịhụnanya ziri ezi. Ihe ndekọ ahụ na-ekwu, sị: “O wee kuru ha n’aka Ya, bikwasị ha aka Ya abụọ, wee gọzie ha nke ọma.” (Mak 10:16) O doro anya na ụmụntakịrị ahụ nwere ahụ iru ala ka Jisọs na-ekuru ha n’aka ya n’ụzọ ịhụnanya.

5. Gịnị ka ihe ndekọ dị na Mak 10:13-16 na-agwa anyị banyere ụdị onye Jisọs bụ?

5 Ihe ndekọ ahụ dị mkpirikpi na-agwa anyị ihe dị ukwuu banyere ụdị onye Jisọs bụ. Rịba ama na ọ bụ onye dị mfe njekwuru. N’agbanyeghị na ọ nọwo n’ọnọdụ dị elu n’eluigwe, ọ dịghị emenye ụmụ mmadụ na-ezughị okè ụjọ ma ọ bụ na-eleda ha anya. (Jọn 17:5) Ọ́ bụghịkwa ihe dị ịrịba ama na ọbụna ụmụntakịrị nwere ahụ iru ala mgbe ha na ya nọ? N’ezie a garaghị adọtawo ha n’ebe onye na-enweghị mmetụta, nke na-adịghị enwe ọṅụ bụ́ onye na-amụmụtụbeghị ọnụ ọchị ma ọ bụ chịa ọchị ma ọlị, nọ! Ndị nọ n’afọ ndụ nile jekwuuru Jisọs n’ihi na ha ghọtara na ọ bụ onye nwere ịhụnanya nke na-echebara ndị ọzọ echiche, ha nwekwara obi ike na ọ gaghị achụghachi ha azụ.

6. Olee otú ndị okenye pụrụ isi mee ka ọ na-adịkwu mfe ijekwuru ha?

6 N’ịtụgharị uche n’ihe ndekọ a, anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị, ‘Ènwere m uche nke Kraịst? Àbụ m onye na-adị mfe mbịakwute?’ N’oge a dị oké egwu, ndị ọzụzụ atụrụ bụ́ ndị dị mfe njekwuru, ndị ikom dị ka “ebe izonahụ ifufe,” dị atụrụ Chineke mkpa. (Aịsaịa 32:1, 2; 2 Timoti 3:1) Ndị okenye, ọ bụrụ na unu azụlite mmasị si n’ezi obi n’ebe ụmụnna unu nọ ma dị njikere inye onwe unu maka ọdịmma ha, ha ga-achọpụta nchegbu unu nwere maka ha. Ha ga-ahụ ya n’otú unu dewere ihu, nụ ya n’olu okwu unu, ma chọpụta ya n’àgwà unu. Ezi ịhụnanya na nchegbu dị otú ahụ pụrụ ime ka e nwee ebe e nwere ntụkwasị obi bụ́ ebe ọ na-adịrị ndị ọzọ, gụnyere ụmụntakịrị, mfe ịbịakwute unu. Otu nwanyị bụ́ onye Kraịst na-akọwa ihe mere o ji nwee ike ịgwa otu okenye obi ya: “Ọ gwara m okwu n’ụzọ dị nro na n’ụzọ ọmịiko. Ma ọ bụghị ya, ikekwe agaraghị m ekwu ihe ọ bụla. O mere ka m nwee mmetụta nke ịbụ onye nọ ná nchebe.”

Ichebara Ndị Ọzọ Echiche

7. (a) Olee otú Jisọs si gosipụta na ọ na-echebara ndị ọzọ echiche? (b) N’ihi gịnị ka Jisọs pụrụ ijiwo jiri nke nta nke nta mee ka otu nwoke kpuru ìsì malite ịhụ ụzọ?

7 Jisọs na-echebara ndị ọzọ echiche. Ọ na-echebara mmetụta ha echiche. Nanị ịhụ ndị na-ahụsi anya metụrụ ya nnọọ n’ahụ nke ukwuu nke na a kpaliri ya ime ka ha nwere onwe ha pụọ n’ahụhụ ha. (Matiu 14:14) Ọ na-echebakwara erughị eru na mkpa nke ndị ọzọ echiche. (Jọn 16:12) N’otu oge, ndị mmadụ duteere ya nwoke kpuru ìsì ma rịọ Jisọs ka ọ gwọọ ya. Jisọs mere ka nwoke ahụ malite ịhụ ụzọ, ma o ji nke nta nke nta mee otú ahụ. Na mbụ, nwoke ahụ hụrụ ndị mmadụ nanị n’ụzọ dị inyoghi inyoghi—“ha dị ka osisi, ha na-ejegharị.” E mesịa, Jisọs mere ka ọ hụ ụzọ nke ọma. N’ihi gịnị ka o ji jiri nke nta nke nta gwọọ nwoke ahụ? Nke a pụrụ nnọọ ịbụ iji mee ka onye ịnọ n’ọchịchịrị mawooro ahụ nwee ike ịnagide nkụja nke ịhụ ụwa nke anwụ na-acha na ya na nke dị mgbagwoju anya.—Mak 8:22-26.

8, 9. (a) Gịnị mere ngwa ngwa Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya banyesịrị n’ókèala Dekapọlis? (b) Kọwaa ọgwụgwọ Jisọs gwọrọ nwoke ahụ ntị chiri.

8 Tụleekwa ihe mere mgbe Ememe Ngabiga nke 32 O.A. gasịrị. Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya abawo n’ókèala Dekapọlis, n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Galili. N’oge na-adịghị anya, oké ìgwè mmadụ hụrụ ha n’ebe ahụ ma kutere Jisọs ọtụtụ ndị ahụ na-esighị ike na ndị nwere nkwarụ, ọ gwọkwara ha nile. (Matiu 15:29, 30) N’ụzọ na-akpali mmasị, Jisọs họpụtara otu nwoke maka nlebara anya pụrụ iche. Onye so dee Oziọma bụ́ Mak, bụ́ nanị onye dekọrọ ihe omume a, na-akọ ihe merenụ.—Mak 7:31-35.

9 Ntị chiri nwoke ahụ, ikwu okwu na-esikwara ya ike. Jisọs pụrụ ịhụwo na nwoke a na-atụ egwu ma na-asọ ihere n’ụzọ pụrụ iche. Jisọs mere ihe ọ na-adịghị emekebe. O kpọpụrụ ya iche, site n’ebe ìgwè mmadụ ahụ nọ, gaa n’ebe mmadụ na-anọghị. E mesịa, Jisọs ji mmegharị ahụ ụfọdụ mee ka nwoke ahụ mata ihe ọ na-aga ime. O “wee tinye mkpịsị aka Ya ná ntị ya abụọ, bụọkwa ọnụ mmiri, metụ ire ya.” (Mak 7:33) Ọzọkwa, Jisọs leliri anya n’eluigwe ma sụọ ude n’ụzọ ekpere. Ihe ndị a o mere n’ụzọ ihe ngosi ga-agwa nwoke ahụ, sị, ‘Ihe m gaje imere gị sitere n’ike Chineke.’ N’ikpeazụ, Jisọs sịrị: “Ghere oghe.” (Mak 7:34) Ka o kwuru nke ahụ, nwoke ahụ nụwara ihe, o nwekwara ike ikwu okwu nke ọma.

10, 11. Olee otú anyị pụrụ isi chebara mmetụta nke ndị ọzọ echiche n’ọgbakọ? n’ezinụlọ?

10 Lee otú Jisọs si na-echebara ndị ọzọ echiche! O chebaara mmetụta ndị ọzọ echiche, nchebara echiche ọmịiko a, n’aka nke ya, kwaliri ya ime ihe n’ụzọ ndị na-emejọghị mmetụta ha. Dị ka ndị Kraịst, anyị ga-eme nke ọma ịzụlite na igosipụta uche nke Kraịst n’akụkụ a. Bible na-agba anyị ume, sị: “Nwekọọnụ otu uche, unu nile, werenụ obi sorịta onwe unu hụkọọ ahụhụ, bụrụnụ ndị na-ahụ ụmụnna unu n’anya, ndị nwere obi ọmịiko, ndị nwere uche dị umeala.” (1 Pita 3:8) N’ezie nke a chọrọ anyị ikwu okwu na ịkpa àgwà n’ụzọ ndị na-egosi nchebara echiche n’ebe mmetụta ndị ọzọ nọ.

11 N’ime ọgbakọ, anyị pụrụ ichebara mmetụta ndị ọzọ echiche site n’ịkwanyere ha ùgwù, na-emeso ha ihe dị ka anyị ga-achọ ka e mesoo anyị. (Matiu 7:12) Nke ahụ ga-agụnye ịkpachara anya banyere ihe anyị na-ekwu na otú anyị si ekwu ya. (Ndị Kọlọsi 4:6) Cheta na ‘okwu ndị e kwuru n’echeghị eche pụrụ ịdụpu adụpu dị ka mma agha.’ (Ilu 12:18) Gịnị banyere n’ime ezinụlọ? Di na nwunye bụ́ ndị hụrụ ibe ha n’anya n’ezie na-echebara mmetụta ibe ha echiche. (Ndị Efesọs 5:33) Ha na-ezere okwu ike, nkatọ na-enweghị ọgwụgwụ, na okwu mkparị ndị na-agbakasị ahụ—ha nile pụrụ ịkpata mwute nke a na-apụghị ịgwọta n’ụzọ dị mfe. Ihe na-emetụtakwa ụmụaka, ndị nne na nna na-ahụ n’anya na-echebakwara nke a echiche. Mgbe mgbazi dị mkpa, ndị nne na nna dị otú ahụ na-enye ya n’ụzọ ndị na-asọpụrụ ùgwù nke ụmụ ha ma chebe ha pụọ ná mmechuihu ndị na-enweghị isi.c (Ndị Kọlọsi 3:21) Mgbe anyị si otú ahụ na-echebara ndị ọzọ echiche, anyị na-egosi na anyị nwere uche nke Kraịst.

Ịdị Njikere Ịtụkwasị Ndị Ọzọ Obi

12. Echiche dị aṅaa ziri ezi, nke kwesịrị ekwesị ka Jisọs nwere banyere ndị na-eso ụzọ ya?

12 Jisọs nwere echiche ziri ezi, nke kwesịrị ekwesị banyere ndị na-eso ụzọ ya. Ọ maara nke ọma na ha ezughị okè. E kwuwerị, ọ pụrụ ịma ihe dị n’obi ụmụ mmadụ. (Jọn 2:24, 25) N’agbanyeghị nke ahụ, o lere ha anya ọ bụghị nanị n’akụkụ nke ezughị okè ha kama n’akụkụ nke ezi àgwà ha. Ọ hụkwara ihe ndị ikom a Jehova dọtaworo ga-aghọ. (Jọn 6:44) Echiche ziri ezi Jisọs nwere banyere ndị na-eso ụzọ ya pụtara ìhè n’ụzọ o si mesoo ha ihe. Otu ihe bụ na o gosipụtara ịdị njikere ịtụkwasị ha obi.

13. Olee otú Jisọs si gosipụta na ọ tụkwasịrị ndị na-eso ụzọ ya obi?

13 Olee otú Jisọs si gosipụta ntụkwasị obi ahụ? Mgbe ọ hapụrụ ụwa, o nyefere ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ ibu ọrụ dị arọ. O nyefere ha ibu ọrụ nke ilekọta ọdịmma nke Alaeze ya n’ụwa nile. (Matiu 25:14, 15; Luk 12:42-44) N’oge ozi ya, o gosipụtara ọbụna n’ụzọ ndị dị nta, ndị na-apụtachaghị ìhè, na ọ tụkwasịrị ha obi. Mgbe ọ mụbara nri n’ụzọ ọrụ ebube iji nye ìgwè mmadụ nri, o nyefere ndị na-eso ụzọ ya ibu ọrụ nke ikesa nri ahụ.—Matiu 14:15-21; 15:32-37.

14. Olee otú ị ga-esi chịkọta ihe ahụ e dekọrọ na Mak 4:35-41?

14 Tụleekwa ihe ahụ e dekọrọ na Mak 4:35-41. N’oge a Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya banyere otu ụgbọ ma kwọrọ gaa n’ebe ọwụwa anyanwụ gabiga ófè Osimiri Galili. N’oge na-adịghị anya mgbe ha kwọpụsịrị, Jisọs dinara ala n’azụ ụgbọ ahụ ma rahụ ụra. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, “oké ajọ ifufe wee fee.” Oké ifufe dị otú ahụ abụghị ihe ọhụrụ n’Osimiri Galili ahụ. Ebe ọ bụ na ọ dị ala (ihe dị ka mita 200 karịa ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke oké osimiri), ifufe na-ekpo ọkụ n’ebe ahụ karịa n’ebe gbara ya gburugburu, nke a na-emekwa ka ikuku na-enye nsogbu. Tụkwasị na nke a, oké ifufe na-efedasi ike na Ndagwurugwu Jọdan site n’Ugwu Hemọn, bụ́ nke dị n’ebe ugwu. Ịda jụụ e nwere nwa mgbe pụrụ ịghọ oké ifufe na mberede. Chee banyere nke a: obi abụọ adịghị ya na Jisọs maara banyere oké ifufe ahụ a na-enwekarị, n’ihi na a zụlitere ya na Galili. Ma, o hiiri ụra gawa, na-atụkwasị obi na nkà nke ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ọkụ azụ̀.—Matiu 4:18, 19.

15. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie njikere Jisọs dị ịtụkwasị ndị na-eso ụzọ ya obi?

15 Ànyị pụrụ iṅomi njikere Jisọs dị ịtụkwasị ndị na-eso ụzọ ya obi? Ọ na-esiri ụfọdụ ndị ike ikenye ndị ọzọ ibu ọrụ. Ha aghaghị ịnọ n’isi, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Ha pụrụ iche, sị, ‘Ọ bụrụ na m chọrọ ka e mezie ihe emezie, aghaghị m ime ya n’onwe m!’ Ma ọ bụrụ na anyị aghaghị ime ihe nile n’onwe anyị, anyị nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị ike gwụrụ, ma eleghịkwa anya na-ebelata oge anyị na ezinụlọ anyị ga-eji nọkọọ, n’ụzọ na-enweghị isi. E wezụga nke ahụ, ọ bụrụ na anyị ekenyeghị ndị ọzọ ọrụ na ibu ọrụ ndị kwesịrị ekwesị, anyị pụrụ ịdị na-anapụ ha ahụmahụ na ọzụzụ ndị dị ha mkpa. Ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ịmụta ịtụkwasị ndị ọzọ obi, na-ekenye ha ibu ọrụ. Anyị ga-eme nke ọma ịjụ onwe anyị n’ụzọ eziokwu, sị, ‘Ènwere m uche nke Kraịst n’okwu a? Àna m eji ọchịchọ obi ekenye ndị ọzọ ọrụ, na-atụkwasị obi na ha ga-eme ihe nile ha nwere ike ime?’

O Gosipụtara Okwukwe n’Ebe Ndị Na-eso Ụzọ Ya Nọ

16, 17. N’abalị ikpeazụ nke ndụ ya n’elu ala, mmesi obi ike dị aṅaa ka Jisọs nyere ndị ozi ya, n’agbanyeghị na ọ maara na ha gaje ịgbahapụ ya?

16 Jisọs gosipụtara echiche ziri ezi banyere ndị na-eso ụzọ ya n’otu ụzọ ọzọ dị mkpa. O mere ka ha mara na ya nwere obi ike n’ebe ha nọ. Nke a pụtara nnọọ ìhè n’okwu mmesi obi ike ndị ọ gwara ndị ozi ya n’abalị ikpeazụ nke ndụ elu ala ya. Rịba ama ihe merenụ.

17 Ọ bụ anyasị nke iji ọrụ n’aka nye Jisọs. Ọ kụziiri ndị ozi ya ihe gbara ọkpụrụkpụ banyere ịdị umeala n’obi site n’ịsa ụkwụ ha. Mgbe nke ahụ gasịrị, o hiwere nri anyasị nke ga-abụ ihe ncheta nke ọnwụ ya. E mesịa, ndị ozi ya banyekwara ọzọ n’arụmụka kpụ ọkụ n’ọnụ banyere onye nke n’ime ha yiri ka ọ bụ ya kasị ukwuu. Jisọs, bụ́ onye nwere ndidi mgbe nile, agwakasịghị ha okwu ahụ kama o sooro ha tụgharịa uche. Ọ gwara ha ihe dị n’ihu, sị: “A ga-eme ka unu onwe unu nile maa n’ọnyà n’ahụ m abalị taa: n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, M ga-etigbu Onye ọzụzụ atụrụ, a ga-agbasakwa atụrụ nke ìgwè atụrụ ya.” (Matiu 26:31; Zekaraịa 13:7) Ọ maara na ezi ndị enyi ya ga-agbahapụ ya n’oge ọ nọ ná mkpa. Ma, ọ katọghị ha. N’ụzọ megidere nke ahụ, ọ gwara ha, sị: “Ma mgbe e mere ka M si n’ọnwụ bilie, M ga-eburu unu ụzọ gaa Galili.” (Matiu 26:32) Ee, o mesiri ha obi ike na ọ bụ ezie na ha ga-agbahapụ ya, ọ gaghị agbahapụ ha. Mgbe ahụmahụ ọjọọ a ga-agabiga, ọ ga-ezute ha ọzọ.

18. Na Galili, nnukwu ọrụ dị aṅaa ka Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya, oleekwa otú ndị ozi ahụ si rụọ ya?

18 Jisọs mezuru ihe o kwuru. E mesịa, na Galili, Jisọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie pụtara n’ihu ndị ozi 11 ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị ihe àmà na-egosi na ha so ndị ọzọ gbakọta. (Matiu 28:16, 17; 1 Ndị Kọrint 15:6) N’ebe ahụ, Jisọs nyere ha otu nnukwu ọrụ: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi na-enye anyị ihe àmà doro anya na ndị ozi ahụ rụrụ ọrụ ahụ. Ha ji ikwesị ntụkwasị obi bute ụzọ n’ọrụ nke ikwusa ozi ọma ahụ na narị afọ mbụ.—Ọrụ 2:41, 42; 4:33; 5:27-32.

19. Gịnị ka ihe ndị Jisọs mere mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ na-akụziri anyị banyere uche nke Kraịst?

19 Gịnị ka ihe ndekọ a na-ekpughe ihe na-akụziri anyị banyere uche nke Kraịst? Jisọs ahụwo nnọọ emezighị emezi nke ndị ozi ya, ma ọ “hụrụ ha n’anya ruo ọgwụgwụ.” (Jọn 13:1) N’agbanyeghị emezighị emezi ha, o mere ka ha mara na ya nwere okwukwe n’ebe ha nọ. Rịba ama na obi ike Jisọs ehieghị ụzọ. Obi abụọ adịghị ya na obi ike na okwukwe o gosipụtaworo n’ebe ha nọ wusiri ha ike ikpebisi ike n’obi ha ịrụ ọrụ o nyere ha iwu ka ha ruọ.

20, 21. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta echiche ziri ezi banyere ndị kwere ekwe ibe anyị?

20 Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta uche nke Kraịst n’akụkụ a? Abụla onye na-adịghị enwe obi ike n’ebe ndị kwere ekwe ibe gị nọ. Ọ bụrụ na ị na-eche ihe dị nnọọ njọ, o yikarịrị ka okwu na omume gị hà ga-egosipụta ya. (Luk 6:45) Otú ọ dị, Bible na-agwa anyị na ịhụnanya “na-ekwere ihe nile.” (1 Ndị Kọrint 13:7) Ịhụnanya na-enwe nchekwube, ọ bụghị obi abụọ. Ọ na-ewuli elu kama itida etida. Ndị mmadụ na-aka anabata ịhụnanya na agbamume ngwa ngwa karịa mmaja. Anyị pụrụ iwulite ndị ọzọ na ịgba ha ume site n’igosipụta obi ike n’ebe ha nọ. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:11) Ọ bụrụ na, dị ka Kraịst, anyị enwee echiche ziri ezi banyere ụmụnna anyị, anyị ga-emeso ha ihe n’ụzọ ndị ga-ewuli ha elu ma wepụta ihe kasị mma n’ime ha.

21 Ịzụlite na igosipụta uche nke Kraịst karịrị nanị iṅomi ihe ụfọdụ Jisọs mere. Dị ka a kpọtụrụ uche n’isiokwu bu ụzọ, ọ bụrụ na anyị ga-akpa àgwà n’ezie dị ka Jisọs, anyị aghaghị ibu ụzọ mụta ile ihe anya dị ka o si ele ha. Oziọma ndị ahụ na-eme ka anyị nwee ike ịhụ akụkụ ọzọ nke àgwà ya, echiche na mmetụta ya banyere ọrụ e nyere ya, dị ka isiokwu na-esonụ ga-atụle.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’akwụkwọ ahụ, onye ụgha ahụ kọwara otú o chere Jisọs dị, gụnyere ụcha agịrị isi, afụ ọnụ, na anya ya. Onye nsụgharị Bible bụ́ Edgar J. Goodspeed na-akọwa na ‘a gbasara ụgha a iji mee ka a nakwere nkọwa dị n’akwụkwọ onye ọkà n’ise ihe ahụ banyere ọdịdị Jisọs.’

b Ihe àmà na-egosi na ụmụntakịrị ahụ nọ n’afọ ndụ dịgasị iche. E jikwa okwu a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “ụmụntakịrị” mee ihe n’ebe nwa nwanyị Jairọs nke dị afọ 12 nọ. (Mak 5:39, 42; 10:13) Otú ọ dị, n’ihe ndekọ nke ya na nke a bụ otu ihe, Luk ji okwu e jikwa eme ihe maka ụmụ ọhụrụ, mee ihe.—Luk 1:41; 2:12; 18:15.

c Lee isiokwu bụ́ “Ị̀ Na-asọpụrụ Ùgwù Ha?” nke dị ná mbipụta Ụlọ Nche nke April 1, 1998.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Olee otú Jisọs si meghachi omume mgbe ndị na-eso ụzọ ya nwara igbochi ụmụntakịrị ịbịakwute ya?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jisọs si chebara ndị ọzọ echiche?

• Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie njikere Jisọs dị ịtụkwasị ndị na-eso ụzọ ya obi?

• Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie obi ike Jisọs gosipụtara n’ebe ndị ozi ya nọ?

[Foto dị na peeji nke 16]

Ụmụntakịrị nwere ahụ iru ala mgbe ha na Jisọs nọ

[Foto dị na peeji nke 17]

Jisọs mesoro ndị ọzọ ihe n’ụzọ ọmịiko

[Foto dị na peeji nke 18]

Ndị okenye bụ́ ndị dị mfe njekwuru bụ ngọzi

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya