Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ị̀ Na-eso Eme Ka Ọmụmụ Ihe Na-ewuli Elu?
    Ụlọ Nche—2010 | Ọktoba 15
    • Ọmụmụ Ihe nke ‘Na-ewuli Elu, Na-agba Ume, ma Na-agụgụ Obi’

      13. (a) Olee otú obi kwesịrị ịdị ndị bịara ọmụmụ ihe ma ha na-ala? (b) Olee ajụjụ dị ezigbo mkpa ndị okenye kwesịrị ịjụ onwe ha?

      13 Pọl kwuru na ihe dị mkpa mere anyị ji aga ọmụmụ ihe bụ ka anyị ‘wulie ndị bịara ya elu, gbaakwa ha ume ma gụgụọ ha obi.’c (1 Kọr. 14:3) Taa, olee otú ndị okenye ga-esi na-eme ihe omume ha otú ga-ewuli ụmụnna ha elu, gụgụọkwa ha obi? Iji zaa ajụjụ a, ka anyị tụlee banyere nnọkọ Jizọs duziri obere oge ka a kpọlitechara ya n’ọnwụ.

      14. (a) Olee ihe ndị mere tupu Jizọs na ndịozi ya enwee nnọkọ? (b) Gịnị mere ọ ga-eji bụrụ na obi ruru ndịozi Jizọs ala mgbe ‘ọ bịakwutere ha gwa ha okwu’?

      14 Ihe mbụ anyị kwesịrị ịtụle bụ ihe ndị mere tupu ha enwee nnọkọ ahụ. Tupu e gbuo Jizọs, ndịozi ya ‘hapụrụ ya gbaa ọsọ,’ ‘a chụsasịkwara ha, onye ọ bụla alaa n’ụlọ ya,’ dị ka e buru n’amụma. (Mak 14:50; Jọn 16:32) Mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ọ kpọrọ ndịozi ya dara mbà n’obi òkù ka ha bịa nnọkọ pụrụ iche.d “Mmadụ iri na otu ahụ bụ́ ndị na-eso ụzọ ya banyere Galili gaa n’ugwu, bụ́ ebe Jizọs mere ndokwa ka ha gaa.” Mgbe ha rutere, ‘Jizọs bịakwutere ha, gwa ha okwu.’ (Mat. 28:10, 16, 18) Chegodị otú obi si ruo ndịozi ahụ ala mgbe Jizọs gakwuuru ha wee gwa ha okwu! Gịnị ka ọ gwara ha?

      15. (a) Gịnị ka Jizọs gwara ndịozi ya, gịnịkwa ka ọ na-agwaghị ha? (b) Olee otú obi dị ndịozi ya mgbe ha na ya nwechara nnọkọ ahụ?

      15 Jizọs malitere nnọkọ ahụ site n’ikwu, sị: “E nyewo m ikike niile n’eluigwe na n’elu ụwa.” Mgbe o kwuchara nke a, o nyere ha ọrụ ha ga-arụ, sị: “Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” N’ikpeazụ, o mesiri ha obi ike, sị: “M nọnyeere unu ụbọchị niile.” (Mat. 28:18-20) Ma, ị̀ chọpụtara ihe Jizọs na-emeghị? Ọ baghịrị ndịozi ya mba; o jighịkwa nnọkọ ahụ kwuo ihe na-egosi na ya na-enyo ha enyo ma ọ bụkwanụ chetara ha na ha gbara ọsọ mgbe e jidere ya, ka obi wee jọọ ha njọ. Kama nke ahụ, Jizọs mere ka obi sie ha ike na ya na Nna ya hụrụ ha n’anya site n’inye ha nnukwu ọrụ. Olee otú obi dị ndịozi ya n’ihi otú a o si gwa ha okwu? O wuliri ha elu, gbaa ha ume, ma gụgụọ ha obi nke na n’oge na-adịghị anya mgbe ha na ya nwechara nnọkọ ahụ, ha maliteghachiri ‘na-akụzi ihe, na-ezisakwa ozi ọma.’—Ọrụ 5:42.

      16. Olee otú ndị okenye kwesịrị isi na-eme ka Jizọs site n’iduzi ọmụmụ ihe otú ọ ga-ewuli ụmụnna ha elu?

      16 Dị ka Jizọs mere, taa, ndị okenye na-eji oge ọmụmụ ihe anyị eme ka obi sikwuo ụmụnna ha ike na Jehova hụrụ ha n’anya nke ukwuu. (Rom 8:38, 39) Ya mere, mgbe ndị okenye na-eme ihe omume n’ọmụmụ ihe, ha na-ekwukarị okwu banyere ebe ụmụnna ha na-eme nke ọma ọ bụghị ebe ha na-anaghị eme nke ọma. Ha ekwesịghị ikwu ihe na-egosi na ha na-enyo ụmụnna ha enyo. Kama, ha kwesịrị ịna-ekwu ihe na-egosi na ha kwere na ụmụnna ha hụrụ Jehova n’anya ma chọọ ịna-eme ihe ziri ezi. (1 Tesa. 4:1, 9-12) O nwekwara mgbe ọ na-adị mkpa ka ndị okenye nye ọgbakọ dum ndụmọdụ. Ma, ọ bụrụ na ọ bụ mmadụ ole na ole ka ha kwesịrị inye ndụmọdụ, ha kwesịrị inye ha ya mgbe naanị ha na ha nọ. (Gal. 6:1; 2 Tim. 2:24-26) Mgbe ndị okenye na-agwa ọgbakọ dum okwu, ha kwesịrị ịja ha mma n’ebe ndị ha na-eme nke ọma. (Aịza. 32:2) Ha ga-agbalị na-ekwu ihe ọ ga-abụ ụmụnna na-ala ọmụmụ ihe, obi adị ha mma, okwukwe ha esikwuokwa ike.—Mat. 11:28; Ọrụ 15:32.

  • Ị̀ Na-eso Eme Ka Ọmụmụ Ihe Na-ewuli Elu?
    Ụlọ Nche—2010 | Ọktoba 15
    • c Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru ihe dị iche ‘n’ịgba ume’ na ‘ịgụgụ obi.’ O kwuru na okwu Grik e si sụgharịta “ịgụgụ obi” na-egosi na mmadụ nwere ike ‘ịgba onye ọ bụla ume, ma, onye mmadụ na-agụgụ obi bụ onye ọ hụrụ n’anya.’—Tụlee Jọn 11:19.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya