Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 9/1 p. 4-7
  • Ị̀ Pụrụ Ịtụkwasị Akọ na Uche Gị Obi?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Pụrụ Ịtụkwasị Akọ na Uche Gị Obi?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịzụ Akọ na Uche
  • Ime Ka Echiche Anyị Kwekọọ na nke Chineke
  • Ihe Enyemaka n’Ịzụ Akọ na Uche
  • Inweta “Uche nke Kraịst”
  • Irite Uru Site n’Akọ na Uche A Zụrụ Azụ
  • Olee Otú Ị Ga-esi Na-enwe Ezi Akọnuche?
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • À Zụrụ Akọ na Uche Gị Azụ nke Ọma?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Nụrụ Olu Na-agwa Gị Okwu n’Ime Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Kwe Ka Iwu na Ụkpụrụ Chineke Na-azụ Akọnuche Gị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 9/1 p. 4-7

Ị̀ Pụrụ Ịtụkwasị Akọ na Uche Gị Obi?

N’ỌNỌDỤ ndị dị otú ha kwesịrị, compass (ihe na-eduzi ụzọ) bụ ngwá ọrụ a pụrụ ịtụkwasị obi. Agịga ya, nke ebe ike ndọta ụwa ruru na-eduzi, na-anọgide na-atụ aka n’ebe ugwu. N’ihi ya, ndị njem pụrụ ịdabere na compass maka nduzi mgbe ihe ndị e ji amata ebe a nọ na-adịghị iji duzie ha. Ma gịnị na-eme mgbe e debere ihe nwere ike ndọta n’akụkụ compass ahụ? Agịga ahụ ga-atụgharị tụdo aka n’ihe ndọta ahụ kama ịtụdo aka n’ebe ugwu. Ọ bụghịzi ihe nduzi a pụrụ ịdabere na ya.

Ihe yiri nke ahụ pụrụ ime akọ na uche mmadụ. Onye Okike kụnyere ikike uche a n’ime anyị ka o jee ozi dị ka ihe nduzi a pụrụ ịdabere na ya. Ebe ọ bụ na e mere anyị n’onyinyo Chineke, akọ na uche kwesịrị ịnọgide na-eduzi anyị n’ụzọ ziri ezi mgbe anyị chọrọ ime mkpebi. O kwesịrị ịkwali anyị igosipụta ụkpụrụ omume ọma Chineke. (Jenesis 1:27) Ọtụtụ mgbe, ọ na-eme otú ahụ. Dị ka ihe atụ, onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi dere na ọbụna ụfọdụ ndị na-enweghị iwu Chineke e kpughere ekpughe “na-eme ihe nile dị n’iwu site ka e si mụọ ha.” N’ihi gịnị? N’ihi na “akọ na uche ha na-esokwa [ha] na-agba àmà.”—Ndị Rom 2:14, 15.

Otú o sina dị, ọ bụghị mgbe nile ka akọ na uche na-emeghachi omume mgbe o kwesịrị. N’ihi ezughị okè mmadụ, anyị nwere ọchịchọ nke ime ihe ndị anyị maara na ha dị njọ. “Mụ na iwu Chineke na-enwekọ obi ụtọ dị ka mmadụ ime m si dị,” ka Pọl kwetara, “ma ana m ahụ iwu dị iche n’ihe nile dị m n’ahụ, na-ebu agha megide iwu nke uche m, na-adọtakwa m n’agha nye iwu nke mmehie nke dị n’ihe nile dị m n’ahụ.” (Ndị Rom 7:22, 23) Ọ bụrụ na anyị ana-adaba n’ọchịchọ na-ezighị ezi mgbe mgbe, akọ na uche anyị pụrụ iji nwayọọ nwayọọ gharakwa ịdị nkọ, n’ikpeazụ ọ ga-akwụsịkwa ịgwa anyị na ụdị omume ahụ ezighị ezi.

Otú ọ dị, n’agbanyeghị ezughị okè, anyị pụrụ ime ka akọ na uche anyị na-ekwekọ n’ụkpụrụ Chineke. N’ezie, ọ dị mkpa ka anyị mee otú ahụ. Akọ na uche dị ọcha, nke a zụrụ nke ọma adịghị eduje nanị ná mmekọrịta onwe onye na-ekpo ọkụ nke anyị na Chineke, kamakwa ọ dị mkpa maka nzọpụta anyị. (Ndị Hibru 10:22; 1 Pita 1:15, 16) Ọzọkwa, ezi akọ na uche ga-enyere anyị aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha ná ndụ, bụ́ nke ga-eduga n’udo na obi ụtọ anyị. Onye ọbụ abụ ahụ kwuru banyere onye nwere akọ na uche dị otú ahụ, sị: “Iwu Chineke ya dị n’obi ya; nzọụkwụ ya nile agaghị agbụchapụkwa.”—Abụ Ọma 37:31.

Ịzụ Akọ na Uche

Ịzụ akọ na uche na-agụnye ihe karịrị nanị iburu ndepụta nke iwu ụfọdụ n’isi ma na-agbasosizi ha ike. Nke ahụ bụ ihe ndị Farisii nke oge Jisọs mere. Ndị ndú okpukpe a maara Iwu ahụ, ha ewulitewokwa ọdịnala sara mbara nke e chere na ọ bụ iji nyere ndị mmadụ aka izere imebi Iwu ahụ. N’ihi ya, ha mere mkpesa ngwa ngwa mgbe ndị na-eso ụzọ Jisọs ghọọrọ ọka taa n’Ụbọchị Izu Ike. Ha makwara Jisọs aka mgbe ọ gwọrọ aka kpọnwụrụ akpọnwụ nke otu nwoke n’Ụbọchị Izu Ike. (Matiu 12:1, 2, 9, 10) Dị ka ọdịnala ndị Farisii si dị, omume abụọ ndị a bụ imebi iwu nke anọ.—Ọpụpụ 20:8-11.

N’ụzọ doro anya, ndị Farisii mụrụ Iwu ahụ. Ma akọ na uche ha ò kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke? Ọ dịghị ma ọlị! Leenụ, ngwa ngwa ha katọsịrị ihe ha chere na ọ bụ mmebi na-awụ akpata oyi nke iwu Ụbọchị Izu Ike, ndị Farisii gbara izù megide Jisọs “ka ha ga-esi laa Ya n’iyi.” (Matiu 12:14) Cheedị echiche—ndị ndú okpukpe a bụ́ ndị ezi omume n’anya onwe ha were iwe n’ihi ịta ọka a ka ghọtara aghọta nakwa n’ihi ịgwọ ọrịa n’Ụbọchị Izu Ike; ma akọ na uche ha amatụghị ha ikpe maka ịgba izù igbu Jisọs!

Ndị isi nchụàjà gosipụtakwara ụdị echiche ahụ gbagọrọ agbagọ. Ndị ikom ndị a rụrụ arụ enwetụghị obi amamikpe mgbe ha nyere Judas ego ọlaọcha 30 site n’ebe a na-edebe ego n’ụlọ nsọ iji rara Jisọs nye. Ma mgbe Judas weghachiri ego ahụ n’ụzọ ha na-atụghị anya ya, na-atụbaghachi ya n’ime ụlọ nsọ ahụ, akọ na uche ndị isi nchụàjà ahụ chere nsogbu iwu a na-amaghị ihe a ga-eme banyere ya ihu. “O zighị ezi n’iwu,” ka ha sịrị, “ịtụba ha [mkpụrụ ego ndị ahụ] n’ebe a na-edebe ihe e nyere Chineke, ebe ọ bụ ọnụ ahịa ọbara.” (Matiu 27:3-6) Ihe àmà na-egosi na ndị isi nchụàjà ahụ nwere nchegbu na ego Judas bụzi ihe na-adịghị ọcha. (Tụlee Deuterọnọmi 23:18.) Ma, otu ìgwè ndị ikom a ahụghị ihe dị njọ n’imefu ego iji hụ na a raara Ọkpara Chineke nye!

Ime Ka Echiche Anyị Kwekọọ na nke Chineke

Ihe atụ ndị ahụ dị n’elu na-egosi na ịzụ akọ na uche na-achọ ihe karịrị iji ọtụtụ ndepụta iwu na-emeju uche. N’eziokwu, ihe ọmụma nke iwu Chineke bara uru, irubere ha isi dịkwa mkpa maka nzọpụta. (Abụ Ọma 19:7-11) Otú ọ dị, tụkwasị n’ịmụ iwu Chineke, anyị aghaghị ịzụlite obi nke kwekọrọ n’echiche Chineke. Mgbe ahụ anyị pụrụ ịhụ mmezu nke amụma Jehova site n’ọnụ Aịsaịa, nke na-asị: “Anya gị abụọ ga na-ahụ [Onye Ozizi Ukwu, NW] gị: ntị gị abụọ ga-anụkwa okwu n’azụ gị, sị, Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya; mgbe unu na-eche ihu n’aka nri, na mgbe unu na-eche ihu n’aka ekpe.”—Aịsaịa 30:20, 21; 48:17.

N’ezie, nke a apụtaghị na mgbe anyị chere mkpebi siri ike ihu, na olu nkịtị ga-agwa anyị ihe anyị ga-eme. Otú o sina dị, mgbe echiche anyị kwekọrọ n’echiche Chineke n’okwu dị iche iche, akọ na uche anyị ga-enwe ike karị inyere anyị aka ime mkpebi ndị ga-adị ya mma.—Ilu 27:11.

Tụlee Josef, onye dịrị ndụ na narị afọ nke 18 T.O.A. Mgbe nwunye Pọtịfa rịọrọ ya ka ha kwaa iko, Josef jụrụ ajụ, na-asị: “M̀ ga-esikwa aṅaa mee oké ihe ọjọọ nke a, mehie megide Chineke?” (Jenesis 39:9) N’oge Josef, e nweghị iwu e dere ede sitere n’aka Chineke nke na-akatọ ịkwa iko. Ọzọkwa, Josef bi n’Ijipt, ebe dị anya pụọ n’ọzụzụ ezinụlọ ma ọ bụ ụkpụrụ nduzi ndị nna ochie. Gịnịzi nyeere Josef aka iguzogide ọnwụnwa? N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ọ bụ akọ na uche ya a zụrụ azụ. Josef nakweere echiche Chineke nke bụ́ na di na nwunye ga-abụ “otu anụ ahụ.” (Jenesis 2:24) N’ihi ya, ọ hụrụ na ọ ga-abụ ihe dị njọ ịkpọrọ nwunye nwoke ọzọ. Echiche Josef kwekọrọ n’echiche Chineke n’okwu ahụ. Ịkwa iko megidere echiche omume ọma ya.

Taa, e nwere mmadụ ole na ole dị ka Josef. Mmekọahụ rụrụ arụ jupụtara ebe nile, ọtụtụ adịghịkwa eche na ha nwere ibu ọrụ n’ebe Onye Okike ha nọ, n’ebe ha onwe ha nọ, ma ọ bụ ọbụna n’ebe ndị òtù ọlụlụ ha nọ ịnọgide na-adị ọcha n’ụzọ omume. Ọnọdụ ahụ dị nnọọ ka nke a kọwara n’akwụkwọ Jeremaịa, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla chegharịworo uche n’ihe ọjọọ ya, sị, Gịnị ka m meworo? onye ọ bụla echigharịwo baa n’ọgbụgba ọsọ ya, dị ka ịnyịnya nke na-agbabiga ọsọ ókè n’agha.” (Jeremaịa 8:6) Ya mere, e nwere mkpa ka ukwuu karịa mgbe ọ bụla ọzọ ime ka echiche anyị kwekọọ na nke Chineke. Anyị nwere otu onyinye dị ebube nke ga-enyere anyị aka ime otú ahụ.

Ihe Enyemaka n’Ịzụ Akọ na Uche

Akwụkwọ Nsọ sitere n’ike mmụọ nsọ “bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume: ka onye nke Chineke wee zuo okè, onye e meworo ka o zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.” (2 Timoti 3:16, 17) Ọmụmụ Bible ga-enyere anyị aka ịzụ ihe Bible na-akpọ “nghọta” anyị, iji mara ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ. (Ndị Hibru 5:14) Ọ ga-enyere anyị aka iwulite ịhụnanya maka ihe ndị Chineke hụrụ n’anya na ịsọ oyi maka ihe ndị ọ kpọrọ asị.—Abụ Ọma 97:10; 139:21.

Ya mere, nzube nke ọmụmụ Bible bụ inweta ezi nghọta na abamuru nke eziokwu ahụ kama ịma nanị ihe ọ na-ekwu. Ná mbipụta ya nke March 1, 1977, Ụlọ Nche kwuru, sị: “N’ọmumu ayi namu ihe nile edere n’Akwukwọ nsọ, o kwesiri ka ayi gbalia ighọta ikpe Chineke, ihu-n’anya-ya na ezi omume-ya, we kùa ihe ndia nime obi-ayi dika nkpuru ka ha we buru ihe riri ayi aru dika iri ihe na iku ume. O kwesiri ka ayi gbalia ibu ndi mu anya nke ọma kari n’imata omume ayi kwesiri ime site n’izùlite nghọta doro anya nke ihe bu ezi ihe na ihe bu ihe ọjọ. Kari kwa nka, o kwesiri ka ayi me ka akọ-na-uche-ayi namata nke-ọma ugwọ o ji n’iru Onye ahu nenye iwu na Onye-ikpe ahu nke zuru okè. (Aisa. 33:22) Ya mere mgbe ayi namuta ihe di iche iche bayere Chineke, o kwesiri ka ayi nagbali iṅomi Ya n’akuku ọ bula nke ndu.”

Inweta “Uche nke Kraịst”

Ọmụmụ Bible ga-enyekwara anyị aka inweta “uche nke Kraịst,” bụ́ ọnọdụ uche nke nrubeisi na ịdị umeala n’obi ahụ nke Jisọs gosipụtara. (1 Ndị Kọrint 2:16) Ime ihe Nna ya na-achọ bụ ihe ọṅụ, ọ bụghị nanị usoro ihe omume a ga-agbaso ozugbo, n’echeghị echiche. A kọwara omume ya n’ụzọ amụma site n’ọnụ onye ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid, onye dere, sị: “Ime ihe dị Gị ụtọ atọwo m ụtọ, Chineke; iwu Gị dịkwa n’ime obi m.”a—Abụ Ọma 40:8.

Inweta “uche nke Kraịst” dị mkpa n’ịzụ akọ na uche. Mgbe ọ nọ n’elu ala dị ka nwoke zuru okè, Jisọs gosipụtara àgwà na ụdị onye Nna ya bụ n’ụzọ zuru ezu ruo n’ókè nke mmadụ pụrụ imeli. N’ihi ya, ọ pụrụ ịsị: “Onye hụworo m anya ahụwo Nna m anya.” (Jọn 14:9) N’ọnọdụ nile ndị o chere ihu n’elu ala, Jisọs mere kpọmkwem ihe Nna ya chọrọ ka o mee. Ya mere, mgbe anyị na-amụ ndụ Jisọs, anyị na-ahụ n’ụzọ doro anya ihe Jehova Chineke dị ka ya.

Anyị na-agụ na Jehova bụ onye nwere “obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere.” (Ọpụpụ 34:6) Ugboro ugboro, Jisọs gosipụtara àgwà ndị a n’imeso ndị ozi ya ihe. Mgbe ha rụrịtara ụka ọtụtụ ugbo banyere onye ka ukwuu, Jisọs ji ndidi kụziere ha site n’okwu nakwa n’omume na “onye ọ bụla nke na-achọ ka e mee ya onye ukwu n’etiti unu, ọ ga-abụ onye na-ejere unu ozi; ọzọ, onye ọ bụla nke na-achọ ka ọ bụrụ onyeisi n’etiti unu, ọ ga-abụ ohu unu.” (Matiu 20:26, 27) Nke a bụ nanị otu ihe atụ iji gosi na anyị pụrụ ime ka echiche anyị kwekọọ na nke Chineke site n’ịtụle ndụ Jisọs.

Ka anyị na-amụtakwu banyere Jisọs, otú ahụ ka anyị ga-enwe ike karị iṅomi Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova. (Ndị Efesọs 5:1, 2) Akọ na uche nke kwekọrọ n’echiche Chineke ga-eduzi anyị n’ụzọ ziri ezi. Jehova na-ekwe ndị na-atụkwasị ya obi nkwa, sị: “M ga-eme ka i nwee uche, M ga ezikwa gị ihe n’ụzọ nke ị ga-eje ije n’ime ya: M ga-adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa gị n’ahụ.”—Abụ Ọma 32:8.

Irite Uru Site n’Akọ na Uche A Zụrụ Azụ

N’ịmata àgwà isi ike nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè, Mosis dọrọ ụmụ Israel aka ná ntị, sị: “Tụkwasị obi unu n’okwu nile nke mụ onwe m na-agbara unu àmà taa; nke unu ga-enye ụmụ unu n’iwu, ka ha lezie anya ime okwu nile nke iwu a.” (Deuterọnọmi 32:46) Anyị onwe anyị aghaghịkwa idekwasị iwu Chineke n’obi anyị. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, o yikarịrị ka akọ na uche anyị ọ̀ ga-eduzi nzọụkwụ anyị ma nyere anyị aka ime mkpebi ndị ziri ezi.

N’ezie, anyị aghaghị ịkpachara anya. Ilu Bible na-asị: “Ụzọ dị nke ziri ezi n’ihu mmadụ, ma nsọtụ ya bụ ụzọ nile nke ọnwụ.” (Ilu 14:12) Gịnị mere o ji adịkarị otú ahụ? N’ihi na, dị ka Bible si ekwu ya: “Obi dị aghụghọ karịa ihe nile, ihe na-adịghị ngwọta ka ọ bụkwa: ònye ga-amara ya?” (Jeremaịa 17:9) Ya mere, ọ dị mkpa ka anyị nile gbasoo ndụmọdụ nke Ilu 3:5, 6: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala [ná] nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru, Pọl onyeozi ji okwu nke Abụ Ọma nke 40 mee ihe maka Jisọs Kraịst.—Ndị Hibru 10:5-10.

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Dị ka “compass,” akọ na uche e ji Bible zụọ pụrụ iduzi anyị n’ụzọ ziri ezi

[Ebe E Si Nweta Foto]

Compass: Courtesy, Peabody Essex Museum, Salem, Mass.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya