Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 8/1 p. 15-20
  • Ekwela Ka Onye Ọ Bụla Mebie Omume Ọma Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ekwela Ka Onye Ọ Bụla Mebie Omume Ọma Gị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndụmọdụ Dịịrị Ha ma Dịịrị Anyị
  • Zere Ịbụ Onye E Duhiere
  • Omume Ntorobịa Kwa
  • Ime Ezi Ihe iji Chebe Omume Anyị
  • Zere Mkpakọrịta Ọjọọ n’Oge Ikpeazụ A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • ‘Na-emenụ Ihe Nile Ka E Wee Nye Chineke Otuto’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • “Na-ekwusa Ozi Ọma, Adala Mbà”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • ‘A Ga-eme Ka Ndị Nwụrụ Anwụ Si n’Ọnwụ Bilie’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 8/1 p. 15-20

Ekwela Ka Onye Ọ Bụla Mebie Omume Ọma Gị

“Unu ekwela ka e duhie unu: mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma.”—1 NDỊ KỌRINT 15:⁠33.

1, 2. (a) Mmetụta dị aṅaa ka Pọl onyeozi nwere n’ebe ndị Kọrint bụ́ ndị Kraịst nọ, n’ihi gịnịkwa? (b) Ndụmọdụ dị aṅaa kpọmkwem ka anyị ga-atụle?

LEE aha mmetụta dị ike nke ịhụnanya ndị mụrụ ụmụ bụ! Ọ na-akpali ndị mụrụ ụmụ iji ihe ụfọdụ chụọ àjà maka ụmụ ha, izi ha ihe na inye ha ndụmọdụ. Ọ pụrụ ịbụ na Pọl onyeozi abụghị nna n’anụ ahụ, ma o degaara ndị Kraịst nọ na Kọrint, sị: “A sị na unu nwere [iri puku ndị ozizi] n’ime Kraịst, ma unu enweghị ọtụtụ nna: n’ihi na mụ onwe m n’ime Kraịst Jisọs weere ozi ọma mụọ unu.”​—⁠1 Ndị Kọrint 4:15.

2 Na mbụ, Pọl emewo njem gaa Kọrint, bụ́ ebe o kwusaara ndị Juu na ndị Grik ozi ọma. O nyere aka iguzobe ọgbakọ na Kọrint. N’akwụkwọ ozi ọzọ Pọl ji nlekọta ya tụnyere nke nne ku nwa n’aka, ma ọ dị ka nna n’ebe ndị Kọrint nọ. (1 Ndị Tesalọnaịka 2:7) Dị ka nna anụ ahụ na-ahụ n’anya si eme, Pọl nyere ụmụ ime mmụọ ya ndụmọdụ. Ị pụrụ irite uru site ná ndụmọdụ nna nke a o nyere ndị Kraịst nọ na Kọrint: “Unu ekwela ka e duhie unu: mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma.” (1 Ndị Kọrint 15:33) N’ihi gịnị ka Pọl ji degara ndị Kọrint nke ahụ? Olee ụzọ anyị pụrụ isi tinye ndụmọdụ ahụ n’ọrụ?

Ndụmọdụ Dịịrị Ha ma Dịịrị Anyị

3, 4. Gịnị ka anyị maara banyere Kọrint narị afọ mbụ na ndị bi na ya?

3 Na narị afọ mbụ, onye Grik bụ́ ọkà ná mbara ala bụ́ Strabo dere, sị: “A na-akpọ Kọrint ‘ọgaranya’ n’ihi azụmahịa ya, ebe ókèala ya dị n’Isthmus, bụrụkwa nke nwere ọdụ ụgbọ mmiri abụọ, nke otu n’ime ha gawara kpọmkwem n’Esia, nke ọzọkwa gawa Itali; ọ na-emekwa ka ọ dị mfe ịgbanwerịta ngwá ahịa site ná mba abụọ ahụ.” Kwa afọ abụọ ọ bụla Egwuregwu Isthmus ahụ a ma ama na-akpọta ọtụtụ ìgwè mmadụ na Kọrint.

4 Olee banyere ndị bi n’obodo a nke bụ ogige bụ isi nke ma ọchịchị gọọmenti ma nke ofufe mmekọahụ nke Aphrodite? Professor T. S. Evans kọwara, sị: “Ọnụ ọgụgụ ha [dị] ma eleghị anya ihe dị ka 400,000. Ọha mmadụ [nke] nwere ọdịnala dị elu, ma n’omume ha daa mbà, ọbụna rụọ arụ. . . . A maara ndị Grik bi n’Achaïa site n’inyochagharị ọgụgụ isi nakwa iji ịnụ ọkụ n’obi na-achọgharị ihe ọhụrụ. . . . Oké echiche banyere onwe ha bụ ihe pụrụ ịkpali ịrọ òtù.”

5. Ihe ize ndụ dị aṅaa ka ụmụnna ndị Kọrint chere ihu?

5 Mgbe oge na-aga ọbụna ọgbakọ ha ghọrọ nke ụfọdụ ndị nwere ọchịchọ iji mpako na-efesagharị akụkọ kewara. (1 Ndị Kọrint 1:10-⁠31; 3:2-⁠9) Otu nsogbu bụ isi bụ na ụfọdụ na-asị: “Mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ adịghị.” (1 Ndị Kọrint 15:12; 2 Timoti 2:​16-⁠18) N’agbanyeghị ihe bụ kpọmkwem nkwenkwe (ma ọ bụ nkwenkwe ụgha) ha, ọ dị mkpa ka Pọl gbazie ha olu site n’ihe àmà doro anya nke na e mewo ka Kraịst “si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.” Otú a, ndị Kraịst pụrụ ịtụkwasị obi na Chineke ga-enye ha “mmeri site n’aka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 15:​20, 51-⁠57) Ọ bụrụ na ị nọwo n’ebe ahụ, ị̀ gaara anọworị n’ihe ize ndụ?

6. Ndụmọdụ Pọl nke dị ná 1 Ndị Kọrint 15:33 metụtara ole ndị karịsịa?

6 Mgbe ọ na-enye ihe àmà siri ike nke na-egosi na a ga-eme ka ndị nwụrụ anwụ sị n’ọnwụ bilie, Pọl gwara ha, sị: “Unu ekwela ka e duhie unu: mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma.” Isi ihe dị na ndụmọdụ nke a metụtara ndị ahụ na-eso ọgbakọ na-akpakọrịta bụ́ ndị na-ekweghị n’ozizi mbilite n’ọnwụ. Ọ̀ ga-abụ nanị na ọ dị otu isi ihe na-edoghị ha anya nke ha na-aghọtaghị? (Tụlee Luk 24:38.) Ee e. Pọl dere na ‘ụfọdụ n’etiti unu na-ekwu na mbilite n’ọnwụ adịghị,’ ya mere ndị nke ahụ metụtara na-ekwupụta ihe ha na-ekwetaghị, ihe yiri ịdapụ n’ezi ofufe. Pọl maara nke ọma na ha pụrụ imebi omume na echiche ọma nke ndị ọzọ.​—⁠Ọrụ 20:30; 2 Pita 2:1.

7. Olee otu ọnọdụ ebe anyị pụrụ itinye 1 Ndị Kọrint 15:33 n’ọrụ?

7 Olee ụzọ anyị pụrụ isi tinye ịdọ aka ná ntị Pọl banyere mkparịta n’ọrụ? O bughị n’uche na anyị kwesịrị ịla azụ inyere onye nọ n’ọgbakọ aka nke na-enwe ihe isi ike ịghọta otu amaokwu ma ọ bụ ozizi Bible. N’ezie, Jud 22, 23 na-agba anyị ume iji obi ebere nyere ndị obi ha ziri ezi nwere obi abụọ dị otú ahụ aka. (Jemes 5:​19, 20) Otú ọ dị, ndụmọdụ Pọl yiri nke onye bụ nna kwesịrị n’ezie ịbụ ihe a ga-eji mee ihe ma ọ bụrụ na mmadụ anọgide na-enwe mkpasu iwe n’ihi ihe anyị maara bụ eziokwu Bible ma ọ bụ nọgide na-ekwu okwu nke ekwetachaghị ma ọ bụ nke na-ezighị ezi. Anyị kwesịrị ịnọ na nche megide iso ụdị ndị ahụ na-akpakọrịta. Otú ọ dị, ọ bụrụ na mmadụ aghọọ kpọmkwem onye si n’ezi ofufe dapụ, ọ ga-adị mkpa ka ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ mee ihe iji chebe ìgwè atụrụ ahụ.​—⁠2 Timoti 2:​16-⁠18; Taịtọs 3:​10, 11.

8. Olee ụzọ anyị pụrụ isi jiri nghọta mee ihe mgbe mmadụ na-ekwetaghị n’ozizi Bible?

8 Anyị pụkwara itinye okwu Pọl kwuru dị ka onye bụ nna ná 1 Ndị Kọrint 15:33 n’ọrụ mgbe a bịara n’ebe ndị na-anọghị n’ọgbakọ nọ bụ́ ndị na-akwalite ozizi ụgha. Olee ụzọ a pụrụ isi dọta anyị ná mkparịta ha? Ọ pụrụ ime ma ọ bụrụ na anyị aghọtaghị ọdịiche dị n’etiti ndị a pụrụ inyere aka ịmụta eziokwu ahụ na ndị na-ewelite nnọọ esemokwu iji kwalite ozizi ụgha. Dị ka ihe atụ, n’ọrụ ịgba àmà anyị, anyị pụrụ izute onye na-ekwenyeghị n’isi ihe ụfọdụ ma bụrụ onye dị njikere ịtụle ya gaa n’ihu. (Ọrụ 17:​32-⁠34) Nke ahụ n’onwe ya ekwesịghị iweta nsogbu, n’ihi na anyị na-eji obi ụtọ na-akọwara onye ọ bụla chọrọ n’ezie ịmata ihe dị otú ahụ eziokwu Bible, ọbụna na-alaghachi igosipụta ihe àmà na-edo anya. (1 Pita 3:15) Ma, o nwere ike ịbụ na ụfọdụ enweghị mmasị n’ezie n’ịchọta eziokwu Bible.

9. Olee ụzọ anyị kwesịrị isi meghachi omume n’ihe ịma aka na-abịa n’okwukwe anyị?

9 Ọtụtụ ndị ga-arụ ụka ruo ọtụtụ hour, kwa izu, ma ọ bụghị n’ihi na ha na-achọ eziokwu. Ha chọrọ nnọọ imebi okwukwe onye ọzọ ma na-etu ọnụ banyere agụmakwụkwọ ha chere na ha nwere n’asụsụ Hibru, Grik, ma ọ bụ nkà mmụta sayensị evolushọn. Mgbe e zutere ha, Ndịàmà ụfọdụ echewo na a mara ha aka wee si otú ahụ na-enwe mkparịta miri emi nke dabeere ná nkwenkwe okpukpe ụgha, nkà ihe ọmụma, ma ọ bụ ihie ụzọ nke nkà mmụta sayensị. Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na Jisọs ekweghị ka nke ahụ mee ya, ọ bụ ezie na ọ pụrụ imeriworị arụmụka nile nke ya na ndị ndú okpukpe bụ́ ndị a zụrụ n’asụsụ Hibru ma ọ bụ Grik. Mgbe a mara ya aka, Jisọs zaghachiri ná mkpirikpi, ma tụkwasịkwa uche ya ọzọ n’ebe ndị dị umeala n’obi nọ, ndị bụ atụrụ n’ezie.​—⁠Matiu 22:41-⁠46; 1 Ndị Kọrint 1:23-⁠2:2.

10. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ndị Kraịst nwere kọmputa ma nwee ike inweta bọdụ nzipụ ozi ígwè ọrụ eletrik kpachara anya?

10 Kọmputa ọgbara ọhụrụ ewepụtawo akụkụ ndị ọzọ na-eduga ná mkparịta ọjọọ. Ụfọdụ ụlọ ọrụ azụmahịa na-ekwere ka ndị na-atụ ụtụ n’aka ha, bụ́ ndị na-eji kọmputa na telifon eme ihe, zite ozi na bọdụ nzipụ ozi kọmputa; mmadụ pụrụ isi otú a zipụ ozi na bọdụ nzipụ ozi ahụ nke ndị nile na-atụ ụtụ pụrụ iji mee ihe. Nke a edubawo n’ihe a kpọrọ nrụrịta ụka ígwè ọrụ eletrik n’ihe ndị metụtara okpukpe. A pụrụ ịdọta onye Kraịst ná nrụrịta ụka dị otú ahụ, ọ pụkwara iji ọtụtụ hour nọnyere onye si n’ezi ofufe dapụ nke pụrụ ịbụ onye a chụpụrụ n’ọgbakọ. Ntụziaka ahụ dị na 2 Jọn 9-⁠11 na-emesi ike ndụmọdụ Pọl nyere dị ka onye bụ nna banyere izere mkparịta ọjọọ.a

Zere Ịbụ Onye E Duhiere

11. Ọnọdụ azụmahịa dị na Kọrint wepụtara ohere dị aṅaa?

11 Dị ka e kwuworo, Kọrint bụ ógbè azụmahịa, nke nwere ọtụtụ ụlọ ahịa na azụmahịa. (1 Ndị Kọrint 10:25) Ọtụtụ ndị bịara maka Egwuregwu Isthmus ga-ebi n’ụlọ ntu, n’oge ihe omume ahụ ndị na-ere ahịa ga-anọ n’ụlọ ntu ma ọ bụ ụlọ ahịa e mechiri elu ha emechi. (Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 18:​1-⁠3.) Nke a mere ka o kwe omume Pọl ịchọta ọrụ n’ebe ahụ dị ka onye na-akpa ákwà ụlọikwuu. Ọ pụkwara iji ebe ọrụ ahụ mee ihe ịgbasa ozi ọma. Professor J. Murphy-O’Connor dere, sị: “Site n’otu ụlọ ahịa dị n’ahịa juru eju . . . nke chere ihu n’okporo ámá na-ekwo ekwo, Pọl nọ n’ọnọdụ izute, ọ bụghị nanị ndị ọrụ ibe ya na ndị na-azụ ya ahịa, kamakwa ìgwè ndị nọ n’èzí. Mgbe ahịa na-adịghị ekwo ekwo ọ pụrụ iguzo n’ọnụ ụzọ ma jiri okwu jide ndị o chere na ha pụrụ ịṅa ntị . . . O siri ike iche na ọdịdị ya juru eju nakwa nkwenye ya siri ike emeghị ka ọ bụrụ ‘onye a ma ama’ ngwa ngwa n’agbata obi ya, nke a ga-adọtaworị ndị chọrọ ịma, ọ bụghị ndị ogbu oge kamakwa ndị ji ezi obi na-achọ ihe ọmụma. . . . Ụmụ nwanyị lụrụ di na ndị na-ejere ha ozi, bụ́ ndị nụrụ banyere ya, pụrụ iji na ha bịara ịzụrụ ihe bịa leta ya. N’oge ihe isi ike, mgbe mkpagbu ma ọ bụ mmaja nkịtị wetara iyi egwu, ndị kwere ekwe pụrụ ịbịakwute ya dị ka ndị na-azụ ya ahịa. Ebe ọrụ ahụ mere ka o zute ndị so na-achị obodo.”

12, 13. Olee ụzọ a pụrụ isi tinye 1 Ndị Kọrint 15:33 n’ọrụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’ebe a na-arụ ọrụ?

12 Otú ọ dị, Pọl ga-achọpụtaworị ohere maka “mkparịta nile ọjọọ” n’ebe ụlọ ọrụ. Anyị kwesịrị ime otú ahụ. N’ụzọ dị ịrịba ama, Pọl hotara otu àgwà ụfọdụ n’etiti ha na-akpa: “Ka anyị rie nụọkwa, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.” (1 Ndị Kọrint 15:32) O ji ndụmọdụ ya dị ka onye bụ nna sochie nke ahụ ozugbo: “Unu ekwela ka e duhie unu: mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma.” Olee ụzọ a pụrụ isi jikọta ebe ụlọ ọrụ na ịchọta mkpori ndụ n’iwepụta ihe ize ndụ siri ike?

13 Ndị Kraịst chọrọ imeso ndị ọrụ ibe ha dị ka enyi, ọtụtụ ahụmahụ na-egosikwa ụzọ nke a pụrụ isi dị irè n’imepe ụzọ maka ịgba àmà. Otú ọ dị, onye ọrụ ibe gị pụrụ ịkọwahie omume enyi dị ka ịchọ mkparịta iji kporie ndụ. Ọ pụrụ ịkpọ gị òkù nkịtị iso ya rie nri ehihie, ịkwụsịtụ ná mkpirikpi ma a gbasaa ọrụ iso ya ṅụọ mmanya, ma ọ bụ ịga nwee ntụrụndụ ná ngwụsị izu. Onye a pụrụ iyi onye nwere obi ọma na onye na-akwanyere onwe ya ùgwù, ọkpụkpọ òkù ahụ pụrụ iyi nke na-enweghị nzube ọjọọ. Ma, Pọl na-adụ anyị ọdụ, sị: “Ekwela ka e duhie unu.”

14. Olee ụzọ e siworo duhie ndị Kraịst ụfọdụ site ná mkparịta?

14 E duhiewo ụfọdụ ndị Kraịst. Ha na-eji nwayọọ nwayọọ zụlite àgwà ntụsara ahụ ná mkparịta nke ha na ndị ọrụ ibe ha. Eleghị anya o bilitere site n’inwekọ mmasị n’otu egwuregwu ma ọ bụ n’otu ihe e ji emegharị aka. Ma ọ bụ otu onye na-abụghị onye Kraịst n’ụlọ ọrụ unu pụrụ inwe obi ọma na nchebara echiche n’ụzọ pụrụ iche, nke dubara n’isoro onye ahụ na-anọkọ ọtụtụ mgbe, ọbụna na-ahọrọ nnọkọ dị otú ahụ karịa nke ndị ụfọdụ nọ n’ọgbakọ. Mgbe ahụ mkparịta ahụ pụrụ iduga n’ịhapụ nanị otu nzukọ. Ọ pụrụ ịkpata ịkpapụ n’otu uhuruchi na ịkwụsị usoro e ji ekere òkè n’ozi ubi n’oge ụtụtụ. Ọ pụrụ ịkpata ikiri otu ihe nkiri ma ọ bụ ụdị vidio nke ndị Kraịst ga-ajụ ikiri. ‘Oo, nke ahụ agaghị eme m,’ ka anyị pụrụ iche. Ma ihe ka ọtụtụ ná ndị e duhieworo pụrụ ikwuworị nke ahụ na mbụ. Ọ dị mkpa ka anyị jụọ onwe anyị, sị, ‘Ruo ókè hà aṅaa ka m kpebisiri ike itinye ndụmọdụ Pọl n’ọrụ?’

15. Àgwà ziri ezi dị aṅaa ka anyị kwesịrị inwe n’ebe ndị agbata obi nọ?

15 Ihe anyị tụleworo ugbu a banyere ebe a na-arụ ọrụ metụtakwara mkparịta anyị na ndị agbata obi. N’ezie, ndị Kraịst nọ na Kọrint oge ochie nwere ndị agbata obi. N’ógbè ụfọdụ ịbụ enyi na onye na-akwado ndị agbata obi bụ akụkụ nke ndụ. N’ime obodo, ndị agbata obi pụrụ ịdabere n’ebe ibe ha nọ n’ihi nnọpụiche. Mmekọrịta ezinụlọ siri ike karịsịa n’ọdịnala ụfọdụ, na-akpata ọtụtụ ịkpọ òkù oriri. N’ụzọ doro anya, echiche ziri ezi dị mkpa, dị ka Jisọs gosipụtara. (Luk 8:​20, 21; Jọn 2:12) Ná mmekọrịta anyị na ndị agbata obi ma ọ bụ ndị ikwu anyị, ànyị na-achọ ịnọgide na-eme dị ka anyị mere tupu anyị aghọọ ndị Kraịst? Kama nke ahụ, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịtụleghachi mmekọrịta ndị dị otú ahụ ma kpebie n’onwe anyị ókè kwesịrị ekwesị?

16. Olee ụzọ e kwesịrị isi ghọta okwu Jisọs kwuru na Matiu 13:​3, 4?

16 Ọ dị mgbe Jisọs ji okwu nke Alaeze tụnyere mkpụrụ ndị ‘dara n’akụkụ ụzọ, anụ ufe wee bịa tụtụrie ha.’ (Matiu 13:​3, 4, 19) Laa azụ n’oge ahụ, ala dị n’okporo ụzọ na-esi ike ka ọtụtụ ụkwụ na-esi na ya agafe. Ọ dị otú ahụ n’ebe ọtụtụ ndị nọ. Ndụ ha jupụtara ná ndị agbata obi, ndị ikwu, na ndị ọzọ na-abịanụ ma na-apụ, na-eme ka ha jide ọrụ n’aka. Nke a, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, na-azọ ụkwụ n’ala nke obi ha, na-eme ka o sie ike mkpụrụ nke eziokwu ịgbanye mkpọrọgwụ. Otu emeghachighị omume yiri nke ahụ pụrụ ibilite n’ọnọdụ onye ghọwororị onye Kraịst.

17. Olee ụzọ mkparịta anyị na ndị agbata obi anyị na ndị ọzọ pụrụ isi metụta anyị?

17 Ụfọdụ ndị ụwa bụ́ ndị agbata obi na ndị ikwu pụrụ inwe omume enyi ma na-enye aka, ọ bụ ezie na ha anọgidewo na-ajụ igosi mmasị n’ihe ime mmụọ ma ọ bụ ịhụnanya maka ezi omume. (Mak 10:21, 22; 2 Ndị Kọrint 6:14) Anyị ịghọ ndị Kraịst ekwesịghị ịpụta na anyị ga-aghọ ndị na-enweghị omume enyi, omume agbata obi. Jisọs nyere anyị ndụmọdụ igosipụta ezi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ. (Luk 10:​29-⁠37) Ma ndụmọdụ Pọl ilezi anya banyere mkparịta anyị bụkwa nke sitere n’ike mmụọ nsọ na nke dị mkpa. Ka anyị na-etinye ndụmọdụ nke mbụ n’ọrụ, anyị agaghị echefu nke ikpeazụ. Ọ bụrụ na anyị adịghị eburu ụkpụrụ abụọ ahụ n’uche, a pụrụ imetụta omume anyị. Olee otú omume gị dị ma e jiri ha tụnyere nke ndị agbata obi ma ọ bụ ndị ikwu gị n’ihe banyere ime ihe n’eziokwu ma ọ bụ irube isi n’iwu Siza? Dị ka ihe atụ, ha pụrụ iche na oge ịkwụ taks ruo, idepụta ihe na-erughị ụgwọ ọnwa ma ọ bụ uru azụmahịa ziri ezi, ọbụna dị mkpa maka nlanarị. Ha pụrụ iji ire ụtọ na-akọ banyere echiche ha n’oge nnọkọ nkịtị nke ịṅụ kọfị ma ọ bụ n’oge nleta dị mkpirikpi. Olee ụzọ nke ahụ pụrụ isi metụta echiche na omume ime ihe n’eziokwu gị? (Mak 12:17; Ndị Rom 12:2) “Unu ekwela ka e duhie unu: mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma.”

Omume Ntorobịa Kwa

18. N’ihi gịnị ka 1 Ndị Kọrint 15:33 jikwa metụta ndị ntorobịa?

18 Ndị na-eto eto na-abụkarị ndị ihe ha na-ahụ ma na-anụ na-emetụta. Ọ̀ bụ na ị hụbeghị ụmụaka ndị mmegharị ahụ ma ọ bụ àgwà ha yiri nke ndị mụrụ ha ma ọ bụ ụmụnne ha nke ukwuu? Mgbe ahụ, o kwesịghị iju anyị anya na ụmụaka pụrụ ịbụ ndị ndị na-eso ha egwuri egwu ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe ha na-emetụta. (Tụlee Matiu 11:​16, 17.) Ọ bụrụ na nwa gị nwoke ma ọ bụ nwanyị na-anọ n’etiti ndị ntorobịa ndị ọzọ na-ekwu okwu mkparị banyere ndị mụrụ ha, n’ihi gịnị ka i ji chee na nke a agaghị emetụta ụmụ gị? Gịnị ma ọ bụrụ na ha na-anụkarị ka ndị ntorobịa na-eji okwu rụrụ arụ eme ihe? Gịnị ma ọ bụrụ na ndị ọgbọ ha n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’agbata obi unu na-enwe oké mmasị banyere ụdị akpụkpọ ụkwụ ọhụrụ ma ọ bụ usoro iyi ọla? Ànyị kwesịrị iche na ndị Kraịst na-eto eto agaghị abụ ndị nke ahụ metụtara? Pọl ọ̀ sịrị na 1 Ndị Kọrint 15:33 metụtara ndị ruworo afọ ndụ ụfọdụ?

19. Echiche dị aṅaa ka ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịkụnye n’obi ụmụ ha?

19 Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ị̀ na-eburu ndụmọdụ ahụ n’uche mgbe i so ụmụ gị na-atụgharị uche ma na-eme mkpebi ndị metụtara ha? Eleghị anya ọ ga-enyere gị aka ma ọ bụrụ na ị ghọta na nke a apụtaghị na ndị ntorobịa nile ọzọ ha na ụmụ gị na-akpakọrịta n’agbata obi unu ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ adịghị mma. Ụfọdụ n’ime ha pụrụ ịdị mma, dịkwa ọcha, dị ka ụfọdụ n’ime ndị agbata obi gị, na ndị ọrụ ibe gị dị. Gbalịa inyere ụmụ gị aka ịghọta nke a nakwa ịghọta na i nwere echiche ziri ezi n’ụzọ i si etinye ndụmọdụ amamihe ahụ, nke Pọl nyere ndị Kọrint dị ka onye bụ nna, n’ọrụ. Ka ha na-aghọta ụzọ i si nwee echiche ziri ezi, ọ pụrụ inyere ha aka iṅomi gị.​—⁠Luk 6:40; 2 Timoti 2:22.

20. Ndị ntorobịa, ihe ịma aka dị aṅaa ka unu na-eche ihu?

20 Gị onye na-abụghị nwatakịrị, gbalịa ịghọta ụzọ isi tinye ndụmọdụ Pọl n’ọrụ, na-amara na ọ dị mkpa nye onye Kraịst ọ bụla, ndị na-eto eto ma ọ bụ ndị agadi. Nke a ga-eweta ihe ịma aka, ma gịnị ma ị dịrị njikere ịnagide ihe ịma aka ahụ? Ghọta na nanị n’ihi na ị marawo ụfọdụ n’ime ndị ntorobịa ahụ site ná nwata apụtaghị na ha apụghị imetụta omume gị, apụghị imebi omume ndị ị na-azụlite dị ka onye Kraịst na-eto eto.​—⁠Ilu 2:​1, 10-⁠15.

Ime Ezi Ihe iji Chebe Omume Anyị

21. (a) Mkpa dị aṅaa ka anyị nwere n’ihe banyere mkparịta? (b) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na mkparịta ụfọdụ pụrụ ịdị ize ndụ?

21 Mkparịta dị anyị nile mkpa. Otú ọ dị, anyị aghaghị ịmụrụ anya ịhụ eziokwu ahụ nke bụ na ndị anyị na ha na-akpakọrịta pụrụ imetụta anyị, n’ụzọ dị mma ma ọ bụ n’ụzọ dị njọ. Nke a mere eme n’ọnọdụ Adam nakwa mmadụ nile eri ọtụtụ narị afọ kemgbe ahụ. Dị ka ihe atụ, Jehoshafat, bụ́ eze ọma nke Juda, nwetara amara na ngọzi Jehova. Ma mgbe o kwere ka nwa ya nwoke lụọ nwa nwanyị nke Eze Ehab nke Israel, Jehoshafat malitere iso Ehab na-akpakọrịta. Ọ fọrọ nke nta ka mkparịta ọjọọ ahụ napụ Jehoshafat ndụ ya. (2 Ndị Eze 8:16-⁠18; 2 Ihe Emere 18:1-3, 29-⁠31) Ọ bụrụ na anyị emee nhọrọ ndị amamihe na-adịghị na ha banyere mkparịta anyị, ọ pụrụ ịdịkwa ize ndụ.

22. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi, n’ihi gịnịkwa?

22 Mgbe ahụ, ka obi anyị nabata ndụmọdụ ịhụnanya ahụ nke Pọl nyere anyị ná 1 Ndị Kọrint 15:33. Okwu ndị ahụ abụghị nanị okwu ndị anyị pụrụ ịnụwo ọtụtụ mgbe nke na anyị pụrụ ikwughachi ha n’eleghị anya n’akwụkwọ. Ha na-egosipụta ịhụnanya yiri nke nna nke Pọl nwere maka ụmụnna nwoke na nwanyị ndị Kọrint, ọ bụrụkwa na e setịa ya, nye anyị. Ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghịkwa na ha nwere ndụmọdụ nke Nna eluigwe anyị na-enye n’ihi na ọ chọrọ ka mgbalị anyị nwee ihe ịga nke ọma.​—⁠1 Ndị Kọrint 15:58.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ihe ize ndụ ọzọ dị na bọdụ nzipụ ozi dị otú ahụ bụ ọnwụnwa nke izubanye n’ime kọmputa ha ike mbipụtaghachi nke usoro ọrụ ma ọ bụ akwụkwọ n’anataghị ikike n’aka ndị mbụ nwee ha ma ọ bụ ndị dere ha, bụ́ nke ga-emegide iwu ike mbipụtaghachi nke mba nile.​—⁠Ndị Rom 13:1.

Ị̀ Na-echeta?

◻ N’ihi gịnị kpọmkwem ka Pọl ji dee 1 Ndị Kọrint 15:33?

◻ Olee ụzọ anyị pụrụ isi tinye ndụmọdụ Pọl n’ọrụ n’ebe a na-arụ ọrụ?

◻ Echiche ziri ezi dị aṅaa banyere ndị agbata obi ka anyị kwesịrị inwe?

◻ N’ihi gịnị ka 1 Ndị Kọrint 15:33 ji bụrụ ndụmọdụ kwesịrị ekwesị nye ndị ntorobịa karịsịa?

[Foto dị na peeji nke 17]

Pọl ji ebe a na-arụ ọrụ mee ihe iji gbasaa ozi ọma

[Foto dị na peeji nke 18]

Ndị ntorobịa ndị ọzọ pụrụ imebi omume ndị Kraịst gị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya