Ị̀ Na-echeta?
Ì nwewo mmasị n’ịgụ mbipụta ndị ọhụrụ nke Ụlọ Nche? Ọ dị mma, lee ma ị̀ pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:
◻ Ihe ndabere dị aṅaa ka ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ nwere iji buru ụzọ mee ihe n’ịkpọtụrụ ụfọdụ ndị a chụpụrụ achụpụ iji hụ ma à pụrụ ịkpali ha inwe nchegharị?
Ọbụna mgbe ụmụ Israel ka nọ ná ndọta n’agha, mgbe ha na-echegharịbeghịkwa, Jehova, dị ka onye ọzụzụ atụrụ, buru ụzọ mee ihe ịchọ ha, na-ezipụrụ ha ndị amụma ya. Ndị ọzụzụ atụrụ bụ ndị Kraịst nwere mmasị n’inyere ndị ọ bụla nwere nchegharị aka, bụ́ ndị pụrụ iyi atụrụ furu efu. (Tụlee Luk 15:4-7.)—4/15, peji 21-23.
◻ Olee ụzọ ihe atụ Jisọs banyere nwa mmefu ahụ si gosi ihe mmetụta anyị na omume anyị kwesịrị ịbụ mgbe a kpọbataghachiri mmadụ n’ọgbakọ ndị Kraịst? (Luk 15:22-32)
Ihe mgbaru ọsọ anyị kwesịrị ịbụ iṅomi nna ahụ, onye gosiri obi ụtọ ná nlọghachi nke nwa ya kpafuburu akpafu. N’ihi ya, anyị kwesịrị ikwunyere nwanna ahụ a kpọbataghachiworo okwu, gbaakwa ya ume ịmalite ugbu a na-enwe ọganihu n’eziokwu ahụ.—4/15, peji 25.
◻ Aro dịgasị aṅaa bara uru ka a pụrụ ịgbaso iji zere ịbụ onye imempụ metụtara?
Mgbe ọ bụla o kwere omume, zere ịnọ n’ógbè ebe ndị dị ize ndụ n’anyasị. Zochie ọla na ihe ịchọ mma ndị i ji ezochi, tinyekwa ihe ndị dị ka kamera n’ime akpa. Lezie anya banyere ịga ije kpọmkwem n’akụkụ okporo ụzọ, karịsịa ma ọ bụrụ na i bu igbe nta ma ọ bụ akpa. (Lee Ilu 3:21-23.)—5/1, peji 5-6.
◻ N’ihi gịnị ka amụma Zefanaịa 2:3 ji kwuo, sị: “eleghị anya a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova”?
Nzọpụta baa ná ndụ dabeere n’ikwesị ntụkwasị obi na inwe ndidi. (Matiu 24:13) N’ihi ya, ọ bụ nanị ndị ahụ na-eme ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume nile nke Chineke, ndị nọgidekwara na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha ka a ga-ezobe n’ụbọchị iwe Jehova. (Zefanaịa 2:1, 2)—5/1, peji 14.
◻ Gịnị ka a gụnyere n’idebe Chineke n’ọkwá mbụ ná ndụ ezinụlọ?
Ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha aghaghị ife Jehova, ruokwa ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ya nile dị ka e setịpụrụ ha n’ime Bible.—5/15, peji 5.
◻ N’ihi gịnị ka Jehova na-adịghị enye ndị mmehie ahụhụ ozugbo?
Otu ihe kpatara nke a bụ na a ghaghị ime ka a mara aha Chineke n’elu ụwa dum. (Tụlee Ndị Rom 9:17.) Ihe ọzọ bụ iji nye ohere maka idozi ihe iseokwu ndị ahụ metụtara ịbụ ọkaaka nke Chineke na iguzosi ike n’ezi ihe nke mmadụ, bụ́ ndị bilitere site ná nnupụisi ahụ e mere n’Iden. Ọzọkwa, ogologo ntachi obi nke Chineke na-enye ndị na-emehie emehie ohere inwe nchegharị, doziekwa ụzọ ha. (2 Pita 3:9)—5/15, peji 11-12.
◻ Eziokwu dịgasị aṅaa na-agba akaebe na Bible sitere n’ebe karịrị mmadụ elu?
Ihe dị ka 40 ndị odeakwụkwọ dị iche iche so dee Bible, bụ́ ndị na-arụ ụdị ọrụ dị iche iche ná ndụ, ndị dịkwara ndụ n’ogologo oge nke 1,600 afọ; ma ndị odeakwụkwọ ndị a nile gbasoro otu isiokwu bụ isi. Nkwekọ nke a dị n’ime Bible agaghị ekwe omume ma ọ bụrụ na a hapụrụ ya ihe ndabara ma ọ bụ nduzi nke mmadụ efu.—6/1, peji 5.
◻ Ihe omume dị aṅaa nke na-eju anya na ọrụ dị ịtụnanya, nke e buru amụma ya n’Aịsaịa 28:21, ka Jehova gaje ịrụ n’oge anyị a?
Ịdọ aka ná ntị dị ná Mkpughe 17:16 na-egosi na ndị enyi ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Babilọn Ukwu ahụ ga-emesịa chigharịa imegide ya. N’ihi nke a, a ga-ebibi Krisendọm kpam kpam ya na okpukpe ụgha ndị ọzọ nile. Nke a ga-abụ ihe omume na-eju anya nke Jehova na ọrụ ya dị ịtụnanya maka oge anyị a.—6/1, peji 23.
◻ Gịnị ka ndị inyom bụ ndị Kraịst kwesịrị iburu n’uche banyere iji ọla na ihe ịchọ mma dị iche iche eme ihe?
Bible amachibidoghị iji ihe ịchọ mma ndị dị otú ahụ eme ihe iwu. (Ọpụpụ 32:2, 3; Esta 2:7, 12, 15) Ma e kwesịrị iji imeru ihe n’ókè na-eme ihe. Ọ pụrụ ịdị mfe nwanyị ịmalite iṅomi usoro dị iche iche nke ndị ụwa, na-eji ihe a na-ete n’ọnụ, ihe a na-ete na ntì, ma ọ bụ ihe a na-ete n’iku anya mee ihe gabiga ókè, ọbụna dị ka Jezebel mere. (2 Ndị Eze 9:30) Ọ dị mkpa iji nlezianya mee ihe ka a ghara iji ihe otite mee ihe gabiga ókè, ka ọla ndị e ji mee ihe gharakwa ịbụ n’ụzọ na-adịghị mma n’anya.—6/1, peji 30-31.
◻ Olee ụzọ ndị Israel si zere “nrịarịa ọjọọ nile nke Ijipt” ndị zuru ebe nile n’oge ochie? (Deuterọnọmi 7:15)
Ihe àmà gosiri na ha zeere ọrịa ndị dị otú ahụ n’ụzọ bụ isi n’ihi ịgbaso ụkpụrụ ndị dị elu nke idebe ihe ọcha ndị e nyere n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ.—6/15, peji 4.
◻ N’ihi gịnị ka Chineke jiworo nye iwu na ụmụ mmadụ ekwesịghị iri ọbara? (Jenesis 9:3, 4; Levitikọs 17:10, 11; Ọrụ 15:22-29)
Ndụ bụ onyinye sitere n’aka Chineke, ndụ mmadụ daberekwara n’ihe ahụ dị mmiri mmiri e ji akwado ndụ, nke a na-akpọ ọbara. (Abụ Ọma 36:9) Site n’ịkwanyere ọbara ugwu dị ka ihe pụrụ iche, ụmụ mmadụ na-egosi ndabere ha n’ebe Chineke nọ maka ndụ. N’ihi ya, ihe bụ isi kpatara iwu Chineke banyere ọbara abụghị na iri ọbara pụrụ ịkpata nsogbu ahụ ike, kama ọ bụ na ọbara pụtara ihe pụrụ iche nye Chineke.—6/15, peji 8-9.
◻ Olee ụzọ ndị mụrụ ụmụ na ndị ntorobịa bụ ndị Kraịst pụrụ isi wusie echiche ahụ ike nke bụ na a pụrụ ịsọpụrụ ọjụjụ onye bụ nwata jụrụ ịnara mmịnye ọbara?
Ọ bụ ezie na ọ bụbeghị onye tozuru okè dị ka iwu si ele ihe anya, onye ntorobịa bụ onye Kraịst kwesịrị inwe ike ịkọwa n’ụzọ doro anya, n’ụzọ sikwara ike, ihe siri ike ndị metụtara okpukpe, bụ́ ndị mere o ji ajụ ịnara ọbara. Ndị mụrụ ụmụ pụrụ iso ụmụ ha mụghachi ihe a ga-eme ka ụmụ ha wee nweta ahụmahụ n’ịkọwa ihe ndị ha onwe ha kweere na ha.—6/15, peji 18.
◻ Olee ụzọ e si nye ndị inyom ngọzi dị ukwuu n’oge ije ozi elu ala nke Jisọs?
Jisọs malitere ọrụ nke wetaara ndị inyom si n’agbụrụ nile nkasi obi, olileanya, na nkwanye ùgwù ọhụrụ. Ọ kụziiri ndị inyom eziokwu ime mmụọ ndị dị omimi. (Jọn 4:7, 24-26) N’oge ije ozi ya, ọ naara ije ozi nke ndị inyom mgbe ọ nọ na-ejegharị gburugburu ala ahụ. (Mak 15:40, 41)—7/1, peji 14-15.
◻ Ụkpụrụ izi ihe dịgasị aṅaa nke Jisọs ka ndị mụrụ ụmụ hụworo na ha na-adị irè iji mee ihe n’ebe ụmụ ha nọ?
Ndị mụrụ ụmụ na-eme nke ọma iji ihe atụ dị iche iche na-eme ka eziokwu ndị Kraịst bụrụ ihe na-adọrọ adọrọ nye obi nke ụmụntakịrị ha, ha pụkwara iji ajụjụ ndị e chepụtara nke ọma mee ihe iji chọpụta ihe ụmụ ha ndị meworo okenye karị na-eche n’ezie. (Tụlee Matiu 17:24-27.)—7/1, peji 26.
◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji gbasoo obi ebere ịhụnanya?
Àgwà nke obi ebere ịhụnanya na-eme ka Chineke na ndị ọzọ hụ anyị n’anya. Ọ na-akwalite ile ndị ọbịa anya nke ọma, na-emekwa ka anyị na-echebara ndị ọzọ echiche karị. Ọ na-ewusi njikọ dị n’ime ezinụlọ na n’ime ọgbakọ ndị Kraịst ike. Karịa ihe nile, obi ebere ịhụnanya na-ewetara Jehova otuto.—7/15, peji 22.
◻ N’ihi gịnị ka o ji kwe omume onye Kraịst ịbụ onye e duhiere n’ihe banyere mkpakọrịta? (1 Ndị Kọrint 15:33)
Mmadụ pụrụ iyi onye bụ enyi na onye bụ ezi mmadụ, ma ọ bụrụ na o nweghị otu ụdị nchegbu ndị Kraịst ahụ banyere ijere Jehova ozi ma ọ bụ ọbụna kwere na Bible, ọ bụ onye mkpakọrịta ọjọọ. N’ihi gịnị? N’ihi na ndụ ya dabeere n’ụkpụrụ ndị dị iche, ihe ndị dị mkpa nye onye Kraịst pụkwara ịbụ na ha adịghị oké mkpa nye ya.—7/15, peji 23.
◻ N’ihi gịnị ka Ụbọchị Ikpe ji bụrụ oge inwe olileanya?
Ụbọchị Ikpe bụ ogologo oge dị otu puku afọ. Ọ bụ Chineke onwe ya na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, onye Chineke họpụtaworo ịrụ ọrụ dị ka Onye Ikpe, ga-eduzi ihe ga-eme n’ụbọchị ahụ. Nke a ga-abụ oge iwetaghachiri ihe a kpọrọ mmadụ ndụ zuru okè nke Adam mere ka o funarị ụmụ ya nile. (1 Ndị Kọrint 15:21, 22)—8/1, peji 5-7.