Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 8/15 p. 29-31
  • Ị̀ Na-agọpụ Ọchịchọ Ime Mmehie?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-agọpụ Ọchịchọ Ime Mmehie?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mere Ime Ngọpụ Ji Dị Oké Njọ
  • Wusie Onwe Gị Ike!
  • Nakwere Ya ma Mee Ihe
  • È Nwere Ụzọ Mgbapụ Dịịrị Ọnọdụ Mmehie Mmadụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • N’ihi Gịnị Ka Anyị Ji Aka Nká, Na-anwụkwa Anwụ?
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Baịbụl Ọ̀ Ka Na-agbanwe Ndụ Gị?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Na-anụ Olu Jehova n’Ebe Ọ Bụla Ị Nọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 8/15 p. 29-31

Ị̀ Na-agọpụ Ọchịchọ Ime Mmehie?

“YA MERE ahụrụ m iwu a, na ihe ọjọọ dị m nso n’ebe aka m ga-eru, mụ, bụ́ onye na-achọ ime ihe ọma. N’ihi na mụ na iwu Chineke na-enwekọ obi ụtọ dị ka mmadụ ime m si dị: ma ana m ahụ iwu dị iche n’ihe nile dị m n’ahụ, na-ebu agha megide iwu nke uche m, na-adọtakwa m n’agha nye iwu nke mmehie nke dị n’ihe nile dị m n’ahụ.”—Ndị Rom 7:21-23.

Ọ chọrọ ịdị umeala n’obi ka Pọl onyeozi nakwere ihe ahụ e dere n’elu. Ma, site na ya ime otú ahụ, o nyeere onwe ya aka igbochi ọchịchọ nile nke ezughị okè ya ka ha ghara irikpu ya.

Ọnọdụ dịkwa otú ahụ n’ebe ezi ndị Kraịst nọ taa. Mgbe anyị nwetara ezi ihe ọmụma nke eziokwu Bible, anyị mere mgbanwe ndị dị mkpa n’ụzọ ndụ anyị, na-ekwekọ n’ụkpụrụ nile nke Jehova. Ma, ọchịchọ ime mmehie na-adịgide, “n’ihi na nchepụta nke obi mmadụ dị njọ site na nwata.” (Jenesis 8:21) Ànyị na-ekwu eziokwu ruo n’ókè ịnakwere nye onwe anyị ihe bụ kpọmkwem ọchịchọ ndị na-akpatara anyị nrụgide? Ka ànyị na-agọpụ na anyị enweghị ha, ma eleghị anya na-ekwubi, sị, ‘Ndị a pụrụ ịbụrụ ndị ọzọ ihe isi ike ma ọ bụghịrị m’?

Nduhie onwe onye dị otú ahụ pụrụ ịkpata ọnwụ. Otu ihe atụ dabeere na Bible pụrụ inyere anyị aka ịghọta mkpa ọ dị ịnakwere ọchịchọ mmehie ndị anyị nwere nakwa ịchịkwa ha.

Ihe Mere Ime Ngọpụ Ji Dị Oké Njọ

N’oge Bible, e ji mgbidi chebe ọtụtụ obodo. Ọnụ ụzọ ámá ha—ndị a na-ejikarị osisi eme—na-abụkarị ebe dị mfe mwakwasị ma e jiri ya tụnyere akụkụ ndị ọzọ nke mgbidi ime ime nke obodo; n’ihi ya, a na-echebesi ha ike. Ndị bi n’obodo ahụ na-ewu nanị ọnụ ụzọ ámá ole ndị dị mkpa maka njegharị n’oge udo. A na-ejikarị ihe ígwè kpuchite ọnụ ụzọ ámá ndị e ji osisi mee, iji mee ka ọkụ ghara irepịa ha. A na-ewunye ụlọ elu dị iche iche ná mgbidi ahụ ka ndị nche ndị nọ na ha wee nwee ike ịhụ ndị iro na-abịa abịa site n’ebe dị anya.

Ugbu a, chee echiche: Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na ndị bi n’otu obodo ahụ ajụ ịnakwere na ọnụ ụzọ ámá nile nke obodo ahụ bụ ndị dị mfe mwakwasị wee ghara ime ihe kwesịrị ekwesị iji chebe ha? Ọ ga-adịrị usuu ndị agha ndị iro mfe ịbata n’obodo ahụ, wee duje ná mmeri ya.

Otú a ka ọ dị n’ebe anyị nọ. Jehova maara akụkụ dị iche iche ebe anyị na-esighị ike. “Ọ dịghịkwa ihe e kere eke nke na-apụtaghị ìhè n’ihu ya: kama ihe nile gba ọtọ bụrụkwa ihe e megheworo n’anya ya, bụ́ onye anyị ga-akọrọ akụkọ banyere omume anyị.” (Ndị Hibru 4:13) Setan pụkwara ịhụtaworị ụfọdụ ọchịchọ mmehie dị n’ime anyị, ma ọ̀ bụ ọchịchọ anyị ịgbagọ ihe bụ eziokwu, iwe iwe ọkụ, inwe mmasị ná mmekọahụ na-adịghị ọcha, ịhụ ihe onwunwe n’anya, mpako, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ. Ọ bụrụ na anyị agọpụ na anyị nwere ọchịchọ ime mmehie, anyị na-ekpughe onwe anyị karị nye mwakwasị Setan na-awakwasị okwukwe anyị. (1 Pita 5:8) A pụrụ imeri anyị mgbe ọchịchọ na-ezighị ezi na-aga n’ihu wee gabiga ịbụ ọchịchọ efu wee mụpụta mmehie. (Jemes 1:14, 15) Ọ dị mkpa ka anyị yie Pọl, jiri obi eziokwu na-anakwere ‘ọnụ ụzọ ámá ọ bụla e ji osisi mee’ ndị anyị pụrụ inwe.

Wusie Onwe Gị Ike!

Ọ ga-abụ ihe na-abaghị uru ịchọpụta ọchịchọ ndị na-ezighị ezi anyị nwere ma ghara ime ihe ọ bụla banyere ha. Nke a ga-adị ka nwoke ahụ onye kirisịrị onwe ya n’enyo, chọpụta akụkụ ndị e kwesịrị ilebara anya, ma pụọ n’emeghị mgbanwe ndị ahụ dị mkpa. (Jemes 1:23-25) Ee, ọ dị anyị mkpa ime ihe iji chebe onwe anyị pụọ n’ịbụ ndị ọchịchọ mmehie rikpuru. Olee ụzọ anyị pụrụ isi mee nke ahụ?

Ọtụtụ mgbe, n’oge Bible, obodo ndị dị nta karị, ma ọ bụ “ụmụ obodo,” na-abụ ndị na-enweghị mgbidi gburugburu ha. (Ọnụ Ọgụgụ 21:25, 32; Ndị Ikpe 1:27; 1 Ihe Emere 18:1; Jeremaịa 49:2) Ndị bi n’ime obodo ndị a pụrụ ịgbaga n’obodo ndị nwere mgbidi mgbe ndị iro wakwasịrị ha. Obodo ndị e wusiri ike na-esi otú a bụrụ ebe mgbaba nye ndị bi n’ógbè gbara ya gburugburu.

Bible na-akọwa Jehova Chineke dị ka ụlọ elu, ebe mgbaba, mgbidi nke anyị pụrụ ịgbakwuru iji nweta nchebe. (Ilu 18:10; Zekaraịa 2:4, 5) Ya mere, Jehova bụ ihe nchebe bụ isi nye ndị ohu ya. Ikpeku ya ekpere n’esepụghị aka dị oké mkpa. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:17) Ihe enyemaka ọzọ bụ Bible. N’iji Okwu Chineke eme ihe, anyị ga-eme nke ọma ime nnyocha pụrụ iche banyere akụkụ ebe ndị ahụ anyị na-adịghị ike. Anyị pụkwara iwepụta iche ihe odide ndị dabeere na Bible, ndị na-ekwu ihe banyere ‘ọnụ ụzọ ámá dị iche iche e ji osisi mee’ ndị anyị nwere n’otu n’otu iji wee na-enyocha ha ugboro ugboro.

Ọzọkwa, dị ka ndị nche nke nọ n’ụlọ elu, anyị pụrụ ịhụ onye iro site n’ebe dị anya, dị ka a pụrụ ikwu ya, wee mee ihe anyị kwesịrị ime. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’izere ọnọdụ ebe anyị pụrụ iche ọnwụnwa ma ọ bụ nrụgide ihu. Dị ka ihe atụ, onye nke na-arụ ọrụ iji belata ọṅụṅụ ọ na-aṅụ ihe na-aba n’anya ga-eji amamihe mee ihe wee họrọ izere ebe ndị a na-aṅụkarị mmanya ma ọ bụ na-agba ume ịṅụ ya.

Ihe a nile chọrọ mgbalị. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ọ dịrị mkpa ka Pọl onyeozi ‘tipụta ahụ ya ọnyá’ ka o wee guzogide ọchịchọ ndị ezughị okè na-akpata, ọ̀ bụ na ọ dịghị mkpa ka anyị tinyekwa mgbalị? Ịmụrụ anya otú ahụ n’ilebara ọchịchọ mmehie anyị anya ga-egosipụta na anyị na-agbaso ntụziaka Pita onyeozi, bụ́: “Na-anụnụ ọkụ n’obi ka e wee hụ unu n’udo, ndị na-enweghị ntụpọ, ndị a na-apụghịkwa ịta ụta n’ihu ya.”—1 Ndị Kọrint 9:27; 2 Pita 3:14.

Nakwere Ya ma Mee Ihe

Enwela nkụda aka ma ọ bụru na, n’agbanyeghị mgbalị gị nile, ọchịchọ nile ezughị okè na-akpatara gị apụchaghị. Ebe ọ bụ na anyị ka bụ ndị na-ezughị okè, ọchịchọ ndị na-ezighị ezi ga na-adịgide ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ, dị ka ọ bụ eziokwu n’ọnọdụ Pọl. Ma ọ dị mkpa ka anyị nọgide na-arụ ọrụ iji merie ọchịchọ ndị a, iji wee gbochie ha iduba anyị ná mmehie.

Otú ọ dị, mara banyere ọdịiche dị n’etiti ịnakwere na ezughị okè dị adị na ịgbachi ya nkịtị ka ọ dịrị na-aga. A pụrụ ime ihe atụ nke ahụ site n’ikwu banyere nwoke nke obi ya na-adịghị arụzi ọrụ nke ọma. O kwesịrị iche eziokwu nke a ihu site n’ịgbalị ịhụ na obi ya nọ n’ọnọdụ dị mma ruo ókè ọ pụrụ inwe olileanya idebe ya. Ọ dịghị asị na ebe ọ bụ na mkpụrụ obi nkịtị ya adịghị ike, na ọ ga-adịkwa nnọọ mma ma o wepụsịa ihe mgbochi nile wee na-adị ndụ otú ọ bụla masịrị ya.

Ya mere, mara na ike anyị adabereghị n’ịgbachi nkịtị na-agọpụ ọchịchọ ime mmehie, kama ọ bụ n’ịnakwere ha ma na-eme ihe megide ha. Ya mere, atụla egwu ịgwa onwe gị eziokwu, gwakwa Jehova eziokwu banyere akụkụ ebe ndị a na-ewetakarịrị gị ọnwụnwa na nrụgide. Ọ dịghị mkpa ịghara inwechakwa mmasị n’ebe onwe gị dị maka ime nke ahụ, ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ị nọ agaghị ebelatakwa. N’eziokwu, ka i ji ezi ọchịchọ obi inweta nnwapụta Chineke na-abịa ya nso karị, ọ ga-abịa gị nso ọbụna karị.—Jemes 4:8.

[Foto dị na peeji nke 31]

Ihe osise nke a nke Megido na-eme ihe atụ ọnụ ụzọ ámá ndị e mesiwanyere ike na mgbidi nchebe nke obodo oge ochie dị iche iche

[Ebe E Si Nweta Foto]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya