“Ndọgbu Unu Na-adọgbu Onwe Unu n’Ọrụ Abụghị Ihe Efu”
1 Lee echiche na-agba ume nke ahụ bụ! Ndọgbu unu na-adọgbu onwe unu n’ọrụ n’ozi Jehova abụghị ihe efu. (1 Kọr. 15:58) N’ụzọ megidere nke ahụ, chee banyere otú ndị mmadu si na-agbalịsi ike ime ka ọnọdụ ha ná ndụ, ma ọ bụ n’ụzọ ego ka mma. Ha pụrụ ịchụso agụmakwụkwọ dị elu ruo ọtụtụ afọ, ma ọ bụ na-adọgbu onwe ha n’ọrụ iji nweta ihe onwunwe karịa ndị ọzọ. Ma n’ihi “mgbe na ihe ndapụta,” ha nwere ike ghara inweta ihe ùgwù ha na-achọ, ma ọ bụ bụrụ ndị a manyere inwe ihe onwunwe dị nta karịa ka ha chọrọ inwe. Dị ka “ịchọ ijide ifufe,” mgbalị ha bụ ihe efu. (Ekli. 1:14; 9:11) Mgbe ahụ, lee mkpa ọ dị ka anyị nwee ọtụtụ ihe ime n’ọrụ ahụ nke ọ bụ nanị ya bụ nke na-abụghị ihe efu n’ihi na o nwere abamuru na-adịgide adịgide!
2 Ọrụ ahụ nke Dị Mkpa n’Ezie: Ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke bụ ọrụ kasị mkpa n’ụwa. Ọ bụ ọrụ a na-aghaghị ịrụ ma ndị mmadụ hà gere ntị ma ọ bụ na hà egeghị. Anyị chọrọ ikwu dị ka Pọl kwuru, sị: “Adị m ọcha n’ebe ọbara mmadụ nile dị. N’ihi na egwu emeghị m ka m ghara ịkọrọ unu ìzù nile nke Chineke.”—Ọrụ 20:26, 27.
3 Mgbe ndị mmadụ gere ntị ma nakwere ozi Alaeze ahụ, lee aha ọṅụ anyị na-enwe! Daada otu nwa agbọghọ nwụnahụrụ ya. O chere echiche banyere ebe daada ya gara—ọ̀ bụ eluigwe ka ọ̀ bụ ọkụ mmụọ? O kpegaara Chineke ekpere maka enyemaka, na-eji aha ahụ bụ́ Jehova, dị ka nwanne ya nwanyị kụziwooro ya ime. N’oge na-adịghị anya, ọ malitere ịmụ Bible ma na-aga nzukọ ndị Kraịst. O nwetara echiche dịwagara ọhụrụ banyere ndụ ma gbubie ihe jikọrọ ya na òtù ndị na-eme ihe ike n’okporo ámá. Nwa agbọghọ ahụ kwụsịrị ise siga, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, na izu ohi. O kwetara, sị: “Nanị ịhụnanya maka Jehova mere ka m hapụ ajọ ụzọ ndụ dị otú ahụ. Nanị Jehova n’oké ebere ya pụrụ inye m olileanya nke ndụ ebighị ebi.” Ọ dịghị etinyezi ndụ ya n’ịchụso ihe efu.
4 Ọbụna mgbe ndị mmadụ jụrụ ige gị ntị, ị ka rụzuru ihe bara uru. Ha maara na Ndịàmà Jehova eletawo ha. Iguzosi ike n’ihe, ikwesị ntụkwasị obi, na ịhụnanya gị na-apụta ìhè. Mgbe ahụ, ndọgbu ị na-adọgbu onwe gị n’ọrụ Onyenwe anyị, ọ̀ bụ ihe efu? Ọ dịghị ma ọlị!