Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 10/1 p. 29-30
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ì Nwere Ike Inyere Di ma Ọ Bụ Nwunye Na-ekweghị Ekwe Aka?
    Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Gịnị Ka Achụmnta Ego Gị Ga-efu Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 10/1 p. 29-30

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ọ̀ ga-ekwesị ekwesị ka onye Kraịst soro onye na-ekweghị ekwe nwekọọ azụmahịa, ebe ọ bụ na Bible na-agwa anyị, sị: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu”?

Anyị na-achọta ndụmọdụ ahụ ná 2 Ndị Kọrint 6:14-16: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu, n’ihi na unu na ha dị iche: n’ihi na olee nkekọ ezi omume na imebi iwu na-ekekọ? Ma ọ bụ olee nnwekọ ìhè na ọchịchịrị na-enwekọ? Ọzọ, olee nnwekọ otu olu Kraịst na Belial na-enwekọ? Ma ọ bụ olee òkè onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe na-ekerịta? Ọzọ, olee nkwekọ ụlọ nsọ nke Chineke na arụsị na-ekwekọ?”

Ọ dịghị ihe a ga-eji kwere na Pọl onyeozi nyere ndụmọdụ nke a na-eburu n’uche iguzobe mmachibido ụfọdụ kpọmkwem, dị ka megide onye Kraịst isoro onye na-ekweghị ekwe nwekọọ azụmahịa. Ma, ndụmọdụ ya na-emetụta nke ahụ n’ezie, tinyekwara n’akụkụ ndị ọzọ nke ndụ.

Pọl degaara ụmụnna ya ndị Kraịst nọ na Kọrint oge ochie ndụmọdụ ahụ. N’ibi n’obodo nke rụrụ nnọọ arụ kpọmkwem, kwa ụbọchị ha na-alụ ọgụ megide ihe ize ndụ nke omume na ime mmụọ. Ọ gwụlakwa ma ha leziri anya, mkpughe nye mmetụta ndị na-adịghị mma pụrụ iji nwayọọ mebie mkpebi ha ịbụ ndị pụrụ iche, “ọgbọ ndị a họpụtaworo, òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nwetara.”—1 Pita 2:9.

Tupu o dee ihe pụtara ná 2 Ndị Kọrint 6:14-16, Pọl edoziwo otu nsogbu siri ike n’etiti ụmụnna ya ndị Kọrint. Ha ekwewo ka otu ọnọdụ metụtara ajọ omume rụrụ arụ dị n’etiti ha, ya mere Pọl nyere ha ntụziaka iwepụ, ma ọ bụ ịchụpụ, onye mmehie na-enweghị nchegharị. (1 Ndị Kọrint 5:1) Ajọ omume nke nwoke ahụ gosiri na mkpakọrịta ọjọọ ma ọ bụ mmadụ imikpu onwe ya kpam kpam n’usoro omume ụwa pụrụ imetụta onye Kraịst.

Ndị Kọrint bụ́ ndị Kraịst gaje izere iso nwoke ahụ a chụpụrụ na-akpakọrịta, ma nke ahụ ọ̀ pụtara na ọ dị mkpa ka ha kewapụ onwe ha kpam kpam n’ebe ndị na-ekweghị ekwe nọ? Hà gaje izerecha mmekọ ma ọ bụ mmeso nile n’etiti ndị na-abụghị ndị Kraịst, na-aghọ ndị dị ka ịrọ òtù ndị mọnk, dị ka ndị Juu gbagara na Qumran ná nso Osimiri Nwụrụ Anwụ? Ka Pọl zaa: “Edegaara m unu n’akwụkwọ ozi m ka unu na ndị na-akwa iko ghara imekọ ihe; ọ bụghị ndị nke ụwa nke a ndị na-akwa iko ma ọlị . . . ebe ọ ga-adị unu mkpa isi n’ụwa pụọ ma a sị na unu emee otú a.”—1 Ndị Kọrint 5:9, 10.

Ihe okwu ndị ahụ pụtara doro anya. Pọl ghọtara na ndị Kraịst ka nọ na mbara ala nke a, na-ebi n’etiti ndị na-ekweghị ekwe ma na-eso ha na-emekọ ihe kwa ụbọchị, bụ́ ndị omume ha rụrụ arụ, ndị ụkpụrụ ha dịkwa iche. Ebe nke ahụ na-agaghị ekwe nzere n’ụzọ bụ isi, ndị Kraịst kwesịrị ịmụrụ anya ịmata ihe ize ndụ dị ná mmekọ dị otú ahụ.

Ugbu a ka anyị tụlee akwụkwọ ozi nke abụọ Pọl degaara ndị Kọrint. Ọ kọwapụtara na ndị Kraịst e tere mmanụ ruru eru dị ka ndị ozi Chineke, ndị nnọchianya na-ejechitere Kraịst ozi. Ọ gwara ha ka ha nọrọ na nche megide ihe ọ bụla na-akpata ịsụ ngọngọ nke pụrụ iwetara ije ozi ha aha ọjọọ. (2 Ndị Kọrint 4:1–6:3) Pọl gbara ụmụnna ya ndị Kọrint ume hoo haa, bụ́ ndị dị ka ụmụ ime mmụọ ya, ka ha sawanye mbara n’ịhụnanya ha. (2 Ndị Kọrint 6:13) Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ gbara ume, sị: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu.” O ji ọtụtụ ajụjụ igosi ọdịiche, bụ́ ndị na-achọghị azịza mee ihe ịkọwapụta isi ihe ahụ.

Ihe a na-atụle na-egosi na Pọl adịghị elekwasị anya n’akụkụ ụfọdụ nke ndụ, dị ka azụmahịa ma ọ bụ ọrụ, na-esetịpụkwa ụkpụrụ iwu nke a ga-etinye n’ọrụ n’akụkụ nke a. Kama, ọ na-ewepụta ndụmọdụ sara mbara, nke ziri ezi, nke na-enye aka nye ụmụnna ndị ọ hụrụ n’anya nke ukwuu.

Dị ka ihe atụ, ndụmọdụ nke a ọ̀ ga-adaba n’ọnọdụ nke onye Kraịst nke nwere mmasị n’alụmdi na nwunye? Ee, n’ezie. N’akwụkwọ ozi mbụ ya, onyeozi ahụ dụrụ ndị Kraịst ọdụ bụ́ ndị chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ka ha mee otú ahụ “nanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 7:39) O mesiri amamihe dị n’okwu ndị ahụ ike site n’ihe o mesịrị dee, dị ka e kwuru ná 2 Ndị Kọrint 6:14-18. Ọ bụrụ na onye Kraịst na-eche echiche ịlụ onye na-abụghị ohu Jehova na onye na-abụghị onye na-eso ụzọ Kraịst, onye ahụ ga-abụ onye na-atụle inwe njikọ n’etiti onye na-ekweghị ekwe. (Tụlee Levitịkọs 19:19; Deuterọnọmi 22:10.) N’ụzọ doro anya, enweghị nkwekọrịta ahụ nke bụ isi ga-akpọ nsogbu òkù, tinyere ndị nke ime mmụọ. Dị ka ihe atụ, onye na-ekweghị ekwe pụrụ ịbụ onye nọ ugbu a ma ọ bụ onye ga-emesị n’ọdịnihu gbasoo ofufe nke chi ụgha. Pọl tụgharịrị uche, sị: “Olee nnwekọ otu olu Kraịst na Belial na-enwekọ?”

Otú ọ dị, gịnị banyere akụkụ ọzọ nke ndụ—isoro onye na-ekweghị ekwe banye n’azụmahịa? N’ọnọdụ ụfọdụ onye Kraịst pụrụ iche na ịkpata ihe e ji adị ndụ na ilekọta ezinụlọ ya chọrọ mmadụ iso onye na-abụghị onye Kraịst ibe ya banye ná mmekọrịta azụmahịa. (1 Timoti 5:8) Tụlee ihe ndị bụ nanị ihe atụ:

Onye Kraịst pụrụ ịchọ ịmalite azụmahịa nke ire ụdị ngwá ahịa ụfọdụ, ma nanị ụzọ isi mee nke ahụ ga-abụ ịnakwere njikọ aka nke onye pụrụ inwe ngwá ahịa ma ọ bụ ego ndị dị mkpa. Onye Kraịst ọzọ chọrọ ịrụ ọrụ ugbo (ma ọ bụ nwee ihe dị ka anụ a na-akpa akpa); ma ala adịghị, ya mere ọ ghaghị ime ya site ná njikọ aka nke onye dị njikere ịgbazinye ya ala iji wee keta òkè n’uru ọ bụla. Eleghị anya onye Kraịst ọzọ enweghị ike ịbanye n’ọrụ ịrụzi paịpụ mmiri n’ihi na Siza nyere nanị laịsensị ole na ole, a gbarachawokwa ha nile; nanị ụzọ isi mee nke ahụ ga-abụ ya isonyere onye ikwu na-ekweghị ekwe nke nwere laịsensị.—Mak 12:17.

Ndị a bụ nanị ihe atụ. Anyị adịghị agbalị iwepụtacha ọnọdụ nile, anyị adịghịkwa ekwu okwu inye nkwado ma ọ bụ enyeghị nkwado. Ma site n’iburu ihe atụ ndị a n’uche, ọ̀ bụ na ị pụghị ịhụ ihe mere a ga-eji ghara ileghara ndụmọdụ ahụ dị ná 2 Ndị Kọrint 6:14-18 anya?

Onye Kraịst nke sooro onye na-ekweghị ekwe banye n’azụmahịa, ma ọ bụ onye ikwu ma ọ bụ na ọ bụghị, pụkwara izute nsogbu na ọnwụnwa ndị ọ na-atụghị anya ha. Eleghị anya onye òtù ya kpebiri na ụzọ isi nweta uru dị mma bụ inye akụkọ na-ezughị ezu nke ihe a na-akpata ma ọ bụ iwe ndị mmadụ n’ọrụ n’edebaghị aha ha n’akwụkwọ, ọbụna ma à sị na nke ahụ megidere iwu ndị gọọmenti. Obi pụrụ ịdị ya ụtọ ịkwụ ndị na-ebutere ya ahịa ụgwọ ná nzuzo maka ngwá ahịa ndị a na-edepụtaghị n’akwụkwọ e depụtara ngwá ahịa e buteere ya. Onye Kraịst ọ̀ ga-ekere òkè n’ekwughị eziokwu nke ahụ ma ọ bụ nke yiri ya? Gịnịkwa ka onye Kraịst ahụ ga-eme mgbe oge ruru maka ha abụọ ịbịanye aka n’akwụkwọ taks ma ọ bụ akwụkwọ iwu ndị ọzọ banyere ụzọ ha si azụ ahịa?—Ọpụpụ 23:1; Ndị Rom 13:1, 7.

Ma ọ bụ onye òtù azụmahịa nke na-ekweghị ekwe pụrụ ịchọ ịkwasa ngwá ahịa ndị metụtara oge ezumike ndị ọgọ mmụọ, iziga kaadị ozi ekele oge ememe n’aha ụlọ ọrụ ahụ, na ịchọ ụlọ ọrụ ahụ mma maka ememe okpukpe. Pọl jụrụ, sị: “Olee nkwekọ ụlọ nsọ nke Chineke na arụsị na-ekwekọ? N’ihi na anyị onwe anyị bụ ụlọ nsọ nke Chineke dị ndụ.” Lee ka okwu ahụ si bụrụ ihe ziri ezi: “N’ihi nke a sinụ n’etiti ha pụta, guzokwanụ iche, ka Onyenwe anyị kwuru, unu emetụkwala ihe na-adịghị ọcha aka; mụ onwe m ga-akpọbatakwa unu”! (2 Ndị Kọrint 6:16, 17) N’itinye ndụmọdụ amamihe ahụ n’ọrụ, ọtụtụ ndị Kraịst ahọrọwo ụdị ọrụ ego nke ga-ekpughe ha gaa n’ihe ole na ole pụrụ ịbụ nsogbu.—Ndị Hibru 13:5, 6, 18.

E nyeghị ọgbakọ iwu itinye anya ma ọ bụ ime nnyocha banyere ihe nile ndị Kraịst na-eme n’ọrụ ego ha, ma ọ bụ dị ka ndị e were n’ọrụ ma ọ bụ dị ka ndị nwe azụmahịa. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ọ pụta ìhè na onye Kraịst tinyere aka n’ajọ omume, dị ka ịkwalite ofufe ụgha ma ọ bụ ụdị ụfọdụ nke ikwu okwu ụgha ma ọ bụ izu ohi, ọgbakọ aghaghị ime ihe iji bulie ụkpụrụ nile nke Jehova elu.

Otú ọ dị, isi ihe dị na ya bụ na ndụmọdụ Pọl ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu,” pụrụ inyere ndị Kraịst aka izere nsogbu na nnọkọ okwu ikpe ọ bụla dị mkpa. Ndị Kraịst maara ihe ga-eji obi ha nakwere ndụmọdụ ahụ, gharakwa ịhọrọ ịbanye n’ọnọdụ ebe ndị ha ga-anọkwu n’okpuru nrụgide imebi ụkpụrụ ndị dị na Bible. Ọ bụrụ na mmadụ echee na ya aghaghị iso onye na-ekweghị ekwe banye n’azụmahịa, ndị ọzọ ekwesịghị ịdị ngwa ikpe ya ikpe ma ọ bụ ịkatọ ya, na-aghọta na ọ gaje ibu ibu ọrụ nke nhọrọ ya. N’ụzọ bụ isi, Pọl adịghị esetịpụ ụkpụrụ nke a ga-etinye n’ọrụ megide iso onye na-ekweghị ekwe banye n’azụmahịa. Ma, e kwesịghị ileghara ndụmọdụ ya anya. Ndụmọdụ ahụ sitere ná mmụọ Chineke, ọ hụkwara na e dekọrọ ya na Bible maka abamuru anyị. Anyị ga-abụ ndị maara ihe ịṅa ntị na ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya